Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya
N’OZIZI Elu Ugwu ya, Jisọs Kraịst zoro aka n’oge mmadụ nile ga-ahụ ibe ha n’anya. N’ịmalite okwu ya, Jisọs hotara ihe e dere n’Abụ Ọma nke 37, na-asị: “Ngọzi na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi: n’ihi na ndị ahụ ga-eketa ụwa.” Abụ ọma ahụ dị na Bible na-akọwakwa otú a ga-esi mee ka ọnọdụ a magburu onwe ya dị, na-asị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala.”—Matiu 5:5; Abụ Ọma 37:9.
Lee mgbanwe dị ịrịba ama nke ahụ ga-abụ—iwepụsị ndị nile na-eme ihe ọjọọ n’ụwa, hapụkwa nanị ndị na-ahụ ibe ha n’anya! Olee otú nke ahụ pụrụ isi nnọọ mee? Jisọs gara n’ihu n’ozizi ya a ma ama igosi otú ọ ga-esi mee mgbe ọ kụziiri anyị ikpe ekpere: “Ka alaeze Gị bịa. Ka e mee ihe Ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:10) Rịba ama ebe a ga-eme uche Chineke. Ọ bụghị nanị n’eluigwe. “Anyị na-ekpe ekpere sị, ka e mee uche gị, n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe,” ka otu ihe odide dị na magazine bụ́ The Christian Century mesiri ike.
Ya mere, gịnịzi bụ Alaeze Chineke nke Jisọs kụziiri anyị ka anyị na-ekpe ekpere maka ya? N’ụzọ doro anya, ọ bụ gọọmenti dị adị n’ezie, nke na-achị site n’eluigwe. Ọ bụ ya mere e ji na-akpọ ya “Alaeze eluigwe.” (Matiu 10:7) Onye a họpụtara ịbụ Onye Ọchịchị nke Alaeze, ma ọ bụ gọọmenti a, bụ Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst.
Ogologo oge tupu Meri amụọ Jisọs, onye amụma Jehova bụ́ Aịsaịa buru amụma banyere ihe omume ọrụ ebube ahụ na ihe ga-emesị sochie ya: “A mụworo anyị otu nwa, otu nwa nwoke ka e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi ga-adịkwasịkwa n’ubu ya: a ga-akpọkwa aha ya Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke Nke bụ Dike, Nna Nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo. Ọ dịghị ọgwụgwụ ọ bụla ịba ụba nke ịbụ onyeisi Ya na udo Ya ga-agwụ.” (Aịsaịa 9:6, 7) Mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, o so Nna ya nọrọ n’eluigwe, na-echere ka e nye ya iwu ka ọ malite ịchị dị ka Eze.—Abụ Ọma 110:1, 2; Ndị Hibru 10:12, 13; Mkpughe 11:15.
N’ikpeazụ gịnị ga-emezi ụwa a ịkpọasị jupụtara na ya? Rịba ama otú Bible si zaa ajụjụ ahụ. Onye amụma Chineke bụ́ Daniel buru amụma, sị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
N’ụzọ doro anya, amụma Bible a na-ezo aka n’oké mgbanwe a ga-enwe n’ihe omume ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Usoro ihe a dum, nke na-agụnye ihe nke ụwa a nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ́ ndị jụwapụrụ isi ido onwe ha n’okpuru ịchịisi Chineke, bụ nke a ga-ewepụ n’ụwa! Tụlee ihe ga-anọchi ya.
Ndụ n’Ime Ụwa Ọhụrụ nke Ezi Omume
Mgbe ụwa ochie bịara ná njedebe, a ga-enwe ndị ga-adị ndụ. Bible na-akọwa, sị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Ee, ndị mere ihe Chineke na-achọ ga-adịrị ndụ banye n’ime ụwa ọhụrụ, ọbụna dị ka Noa na ezinụlọ ya dịịrị ndụ gabiga ọgwụgwụ nke ụwa nke oge ha. Pita onyeozi dere, sị: “Dị ka nkwa [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—2 Pita 3:5-7, 11-13.
Banyere oge ahụ mgbe nanị gọọmenti ga na-arụ ọrụ bụ Alaeze Chineke, Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) Ndị ezi omume ga-anụ ụtọ ndụ n’ime ụwa nke e mere ka ọ dị ọcha. Lee oge dị ebube nke ahụ ga-abụ! Ọ bụrụ na i mebeghị otú ahụ, biko nyochaa ngọzi ndị a kọwara na Bible bụ́ ndị e gosiri n’ihe osise dị na peji ndị bu ụzọ.
Ọ̀ bụ na ọ dịghị akpali obi gị ịmara na Onye Okike anyị na-ekwe nkwa ihe ndị dị otú ahụ dị ebube maka abamuru nke ndị na-efe ya ofufe? N’ezie, nke a bụ nzube Chineke mgbe o kere mmadụ abụọ mbụ ahụ ma debe ha na paradaịs elu ala! Rịba ama ihe Chineke gwara ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.”—Jenesis 1:27, 28.
Adam na Iv ga-amụ ụmụ, ka ndị a na-emekwa okenye karị, ha ga-ekere òkè n’ọrụ obi ụtọ nke ilekọta Paradaịs elu ala ahụ. Cheedị echiche banyere ọṅụ nke ịgbasa ókèala nke ubi Iden ahụ ka ezinụlọ ụmụ mmadụ na-amụba n’ọnụ ọgụgụ! N’ụzọ doro anya, ọ bụ nzube Chineke ka ụwa nile ghọọ paradaịs. Ọ̀ dị mgbe a ga-emezu nzube ahụ? Anyị pụrụ ijide n’aka na ọ dị, n’ihi na Chineke ekwuwo ya! Ọ na-ekwe nkwa, sị: “Ekwuwo m; . . . M ga-emekwa ya.”—Aịsaịa 46:11; 55:11.
Ị̀ ga-enwe mmasị ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs elu ala ahụ a kọwara n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e gosiri n’ihe osise ndị dị na peji ndị bu ụzọ? Dị ka a ga-atụ anya ya, ọ bụghị mmadụ nile ka a ga-enye ohere ịdị ndụ n’ebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ dị ihe ndị a chọrọ. Gịnị ka ha bụ?
Iru Eru Ịdị Ndụ Ebighị Ebi
Nke mbụ, ndị ga-adị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke aghaghị ịmụta ịhụ ibe ha n’anya, ọbụna dị ka Chineke na-akụziri anyị ka anyị mee. Bible na-ekwu, sị: “Unu onwe unu bụ ndị Chineke ziworo ịhụrịta ibe unu n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:9) Olee otú Chineke si ezi anyị nke a?
Karịsịa ọ bụ site n’Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible. Nke a pụtara na iji dị ndụ ebighị ebi, anyị aghaghị ịnakwere ozizi Chineke dị n’ime Bible. Onye mmụta Bible si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa kwuru, sị: “M na-atụ anya ịhụ mgbe, dị ka Bible kwere nkwa ya, mmadụ nile ga-amụtaworị ịhụ ibe ha n’anya.”
N’ekpere o kpegaara Nna ya, Jisọs mere ka a mata otu ihe dị mkpa a chọrọ. Ọ sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Broshuọ ahụ nwere peji dị 32 bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ga-enyere gị aka inweta ihe ọmụma a. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inwetakwu ihe ọmụma n’otú ị pụrụ isi nweta otu, dejupụta akụkụ ahụ a pụrụ ịdọpụta adọpụta dị na peji nke 32 ma zite ya na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị dị na peji nke 5.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 22-24]
Ihe Chineke Kwere ná Nkwa
Òtù Ụmụnna Zuru Ụwa Ọnụ nke Na-ahụ n’Anya
“Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
Mpụ Ma Ọ Bụ Agha Agaghị Adịkwa
“Ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa.”—Ilu 2:22.
“[Chineke] na-eme ka agha nile kwụsị ruo nsọtụ ụwa.”—Abụ Ọma 46:9.
Ezi Ihe Bara Ụba A Ga-eri
“Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile; mkpụrụ ya ga na-eme mkpatụ dị ka Lebanọn.”—Abụ Ọma 72:16.
Udo n’Etiti Ndị Mmadụ na Anụmanụ
“Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; . . . nwatakịrị ga na-edukwa ha.” —Aịsaịa 11:6.
E Wepụ Ọrịa, Ịka Nká, na Ọnwụ
“[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
Mbilite n’Ọnwụ nke Ndị A Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ n’Elu Ala
“Oge awa na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu [Jisọs], ha ga-apụtakwa.” —Jọn 5:28, 29.