Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Pụrụ Ịhụ Ibe Ha n’Anya?
OTU ọkàiwu ka kwusịrị na iji dị “ndụ ebighị ebi,” anyị aghaghị iji obi anyị dum hụ Chineke n’anya, hụkwa ndị agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị. Jisọs jara ọkàiwu ahụ mma wee sị ya: “Ị zara nke ọma: mee nke a, ị ga-adịkwa ndụ.” (Luk 10:25-28; Levitikọs 19:18; Deuterọnọmi 6:5) Ma nwoke ahụ, n’ịchọ igosi na ya bụ onye ezi omume jụrụ, sị: “Ònye bụkwa onye agbata obi m?”
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọkàiwu ahụ tụrụ anya ka Jisọs sị, “Ndị Juu ibe gị.” Ma Jisọs kọrọ otu akụkọ banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi, nke gosiri na ndị si mba ndị ọzọ na-abụghị nke anyị bụkwa ndị agbata obi anyị. (Luk 10:29-37; Jọn 4:7-9) N’oge ije ozi ya Jisọs mesiri ya ike na ịhụ Chineke n’anya na ịhụ onye agbata obi anyị n’anya bụ iwu ndị kasị mkpa sitere n’aka Onye Okike anyị.—Matiu 22:34-40.
Ma, ọ̀ dịtụwo mgbe ìgwè mmadụ ọ bụla hụrụ ndị agbata obi ha n’anya n’ezie? Ọ̀ ga-ekwe omume n’ezie mmadụ nile ịhụ ibe ha n’anya?
Ọrụ Ebube nke Narị Afọ Mbụ
Jisọs gwara ụmụazụ ya na a ga-eji ịhụnanya nke na-amaghị agbụrụ, mba, na ịkpa ókè ndị ọzọ nile mara ha. Ọ sịrị: “Iwu ọhụrụ ka M na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka M hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya.” O kwukwasịziri: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:34, 35; 15:12, 13.
Ozizi Jisọs banyere ịhụnanya, bụ́ nke e ji ihe nlereanya nke ya kwadoo, rụrụ ọrụ ebube na narị afọ mbụ. Ụmụazụ ya ṅomiziri Onyenwe ha, na-amụta ịhụ ibe ha n’anya n’ụzọ dọtara uche na mmasị nke ọtụtụ ndị. Tertullian, bụ́ onye edemede na narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A., hotara ihe ndị na-abụghị ndị Kraịst kwuru n’ịja ụmụazụ Jisọs mma, sị: ‘Lee otú ha si hụ ibe ha n’anya na otú ha si dị njikere ịnwụ maka ibe ha.’
N’ezie, Jọn onyeozi dere, sị: “Anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịtọgbọ ndụ anyị n’ihi ụmụnna anyị.” (1 Jọn 3:16) Jisọs ọbụna kụziiri ụmụazụ ya ka ha hụ ndị iro ha n’anya. (Matiu 5:43-45) Gịnị na-esi na ya apụta mgbe ndị mmadụ hụrụ ndị ọzọ n’anya n’ezie dị ka Jisọs kụziere ha ka ha na-eme?
Dị ka ihe àmà gosiri, otu prọfesọ na nkà mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị tụgharịrị uche n’ajụjụ ahụ. Ya mere ọ jụrụ, dị ka e dekọrọ na The Christian Century, sị: “Ọ̀ dị onye pụrụ ichetụ n’echiche Jisọs ịtụ ndị iro ya grenade, iji égbè ọwụ mgbọ eme ihe, iji ngwá agha na-awụ ọkụ eme ihe, ịtụ bọmbụ nuklia ma ọbụ ịgbapụ ICBM nke ga-egbu ma ọ bụ nye ọtụtụ puku ndị nne na ụmụaka nkwarụ?”
N’ịza ya, prọfesọ ahụ kwuru, sị: “Ajụjụ ahụ enweghị nnọọ isi nke na o kwesịtụghị ka a zaa ya.” Ya mere ọ jụrụ ajụjụ bụ́: “Ọ bụrụ na Jisọs apụghị ime nke a n’ihi ụdị onye ọ bụ, mgbe ahụ olee otú anyị pụrụ isi mee ya ma nọgide na-eguzosi ike n’ihe nye ya?” Ya mere, ọnọdụ nnọpụiche nke ụmụazụ Jisọs nke oge mbụ weere, bụ́ nke e dekọrọ nke ọma n’ọtụtụ akwụkwọ akụkọ ihe mere eme, ekwesịghị iju anyị anya. Tụlee nanị ihe atụ abụọ.
Akwụkwọ bụ́ Our World Through the Ages, nke N. Platt na M. J. Drummond dere na-ekwu, sị: “Àgwà ndị Kraịst dị nnọọ iche na nke ndị Rom. . . . Ebe Kraịst kwusaworo udo, ha jụrụ ịghọ ndị agha.” Akwụkwọ bụ́ The Decline and Fall of the Roman Empire, nke Edward Gibbon dere na-ekwukwa, sị: “[Ndị Kraịst oge mbụ] jụrụ ikere òkè ọ bụla pụtara ìhè n’ọchịchị obodo ma ọ bụ n’ọrụ agha nke ichebe alaeze ukwu ahụ. . . . Ọ bụkwa ihe na-agaghị ekwe omume na ndị Kraịst ahụ, n’ajụghị ọrụ dị nsọ karị, pụrụ ịnara ọrụ nke ịbụ ndị agha.”
Gịnị Banyere Taa?
Ọ̀ dị onye ọ bụla na-egosi ịhụnanya yiri nke Kraịst taa? Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia Canadiana na-ekwu, sị: “Ọrụ Ndịàmà Jehova bụ ntụte na nguzobeghachi nke Iso Ụzọ Kraịst oge gboo nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gbasoro . . . Ha nile bụ ụmụnna.”
Gịnị ka nke ahụ pụtara? Ọ pụtara na Ndịàmà Jehova adịghị ekwe ka ihe ọ bụla—ma ọ bụ agbụrụ, mba, ebo mmadụ si—mee ka ha kpọọ ndị agbata obi ha asị. Ha agaghịkwa egbu onye ọ bụla, n’ihi na ha akpụgharịwo mma agha ha n’ụzọ ihe atụ ịbụ mma ogè na ube ha ịbụ mma ịkwa osisi, dị ka Bible buru n’amụma na ezi ndị na-ejere Chineke ozi ga-eme.—Aịsaịa 2:4.
Ka a sịkwa ihe mere uche akwụkwọ akụkọ California bụ́ Sacramento Union ji kwuo, sị: “O zuru ezu ikwu na ọ bụrụ na ụwa nile ji ụkpụrụ okwukwe Ndịàmà Jehova ebi ndụ, mwụfu ọbara na mkpọrọmasị ga-akwụsị, ịhụnanya ga-achịkwa dị ka eze”!
N’otu aka ahụ, otu onye na-ede ihe na magazin Hungary bụ́ Ring kwuru, sị: “Abịawo m ná nkwubi okwu bụ na a sị na Ndịàmà Jehova agwụla ndị bi n’ụwa, agha agaghị adịkwa, nanị ọrụ ndị uwe ojii ga-enwe ga-abụkwa inye nduzi n’okporo ụzọ na inye akwụkwọ ikike ngafe.”
Na magazin chọọchị e dere n’asụsụ Italian bụ́ Andare alle genti, otu onye nọn Roman Katọlik dekwara n’ụzọ igosi mmasị n’ebe Ndịàmà nọ, sị: “Ha na-ajụ ụdị ọ bụla nke ime ihe ike, n’enupụghịkwa isi, ha na-anagide ọtụtụ ọnwụnwa a na-anwa ha n’ihi nkwenkwe ha . . . Lee ka ụwa ga-esi dị iche ma ọ bụrụ na anyị nile eteta ụra n’otu ụtụtụ kpebisie ike ịghara ibuli ngwá agha ọzọ, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ma ọ bụ ihe kpatara ya, dị nnọọ ka Ndịàmà Jehova!”
A ma Ndịàmà ama maka ibu ụzọ enyere ndị agbata obi ha aka. (Ndị Galetia 6:10) N’akwụkwọ ya bụ́ Women in Soviet Prisons, otu nwanyị bụ́ onye Latvia kwuru na ya dara oké ọrịa mgbe ya na-arụ ọrụ n’ogige ahụhụ dị na Potma n’etiti afọ ndị 1960. “N’oge nile m na-arịa ọrịa [Ndịàmà ahụ] bụ ndị nlekọta dị uchu. Ọ dịghị nlekọta ka mma m gaara achọ, karịsịa n’ọnọdụ na-adị n’ogige ahụhụ.” O kwukwasịrị: “Ndịàmà Jehova na-ewere ya dị ka ọrụ ha inyere onye ọ bụla aka, n’agbanyeghị okpukpe ma ọ bụ mba o si na ya.”
Na nso nso a, ndị mgbasa ozi nọ na Czech Republic chọpụtara omume dị otú ahụ nke Ndịàmà n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. N’ikwu okwu banyere ihe nkiri na-enye ihe ọmụma bụ́ “Ebe Obibi Furu Efu,” nke e mepụtara na Brno, akwụkwọ akụkọ bụ́ Severočeský deník kwuru, sị: “Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ọbụna ndị a a pụrụ ịtụkwasị obi ha na ha nọkọrọ [ndị Juu nke Czech na Slovakia bụ́ ndị lanarịrịnụ] ejiriwo mmasị dị ịrịba ama gbaa akaebe dị mma banyere ndị mkpọrọ bụ́ Ndịàmà Jehova. ‘Ha bụ ndị nwere nnọọ obi ike, ndị na-enyere anyị aka mgbe nile n’ụzọ ọ bụla ha nwere ike, ọ bụ ezie na ha na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e gburu,’ ka ọtụtụ kwuru. ‘Ha kpeere anyị ekpere, dị ka a ga-asị na anyị so n’ezinụlọ ha; ha gbara anyị ume ka anyị ghara ịda mbà.’”
Otú ọ dị, gịnị banyere ịhụ ndị kpọrọ gị asị n’ezie n’anya? Ọ̀ ga-ekwe omume?
Ịhụnanya Na-emeri Ịkpọasị
Ozizi Jisọs banyere ịhụ ndị iro n’anya kwekọrọ n’ilu Bible bụ́: “Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye na-akpọ gị asị, gị mee ka o rie nri; ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, gị mee ka ọ ṅụọ mmiri.” (Ilu 25:21; Matiu 5:44) Banyere mmetụta dị mma nke inweta nlekọta ịhụnanya site n’aka ndị e werebuuru dị ka ndị iro na-enwe, otu nwanyị bụ́ onye isi ojii, onye ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova na nso nso a dere, sị: “Site n’oge ruo n’oge obi m ejupụtawo ná mmetụta ịhụnanya ruo n’ókè nke ịgba anya mmiri a na-apụghị ịchịkwa achịkwa n’ihi inweta ezi ịhụnanya nke Ndịàmà bụ́ ndị ọcha, ndị m gaara egbu n’eleghị anya n’azụ ntakịrị oge tupu mgbe ahụ iji kwadoo ka e nwee mgbanwe ọchịchị.”
Otu Onyeàmà bụ́ onye France kọrọ na otu onye agbata obi ha kọọrọ ndị Gestapo banyere nne ya n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. “N’ihi ya, mama m nọrọ afọ abụọ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke Germany, bụ́ ebe ọ fọrọ nke nta ka ọ nwụọ,” ka nwa ya nwanyị kọwara. “Mgbe agha ahụ gasịrị, ndị uwe ojii nke France chọrọ ka mama m bịanye aka n’otu akwụkwọ ga-abụ ihe àmà na nwanyị a kwadoro ndị Germany. Ma mama m jụrụ.” Ka e mesịrị, onye agbata obi ahụ malitere ịrịa ọrịa cancer ga-egbu ya. Nwa nwanyị ahụ kwuru, sị: “Mama m tinyere ọtụtụ hour na-eme ka ọnwa ndị ikpeazụ nke ndụ ya dị ntụsara ahụ ruo n’ókè o kwere mee. Ọ dịghị mgbe m ga-echefu mmeri a ịhụnanya meriri ịkpọasị.”
N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, ndị mmadụ pụrụ ịmụta ịhụ ibe ha n’anya. Ndị bụbu ndị iro—ndị Tutsi na ndị Hutu, ndị Juu na ndị Arab, ndị Armenia na ndị Turk, ndị Japan na ndị America, ndị Germany na ndị Russia, ndị Protestant na ndị Katọlik—abụrụwo ndị eziokwu Bible jikọtachara!
Ebe ọtụtụ nde mmadụ bubu ịkpọasị n’obi hụrụ ibe ha n’anya ugbu a, n’ezie ụwa dum nke ụmụ mmadụ pụrụ ime ya. Otú ọ dị, n’eziokwu, a ga-achọ oké mgbanwe zuru ụwa ọnụ ma ọ bụrụ na mmadụ nile ga-ahụ ibe ha n’anya. Olee otú mgbanwe ahụ ga-esi mee?
[Foto dị na peeji nke 21]
Ndị ọcha na ndị isi ojii na South Africa
Ndị Juu na ndị Arab
Ndị Hutu na ndị Tutsi
N’ụzọ ihe atụ, Ndịàmà akpụgharịwo mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè