Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 24
  • Josef Elee Ụmụnne Ya Ule

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Josef Elee Ụmụnne Ya Ule
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Echefughị Josef
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “Ànọ M n’Ọnọdụ Chineke?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ụmụnne Josef Akpọ Ya Asị
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 24
Mgbe ndị Ijipt na-ejere Josef ozi hụrụ iko ọlaọcha Josef n’ime akpa otu nwanne ya

AKỤKỌ NKE 24

Josef Elee Ụmụnne Ya Ule

JOSEF chọrọ ịma ma ụmụnne ya iri ndị tọrọ ya hà ka bụ ndị obi tara mmiri na ndị obi ọjọọ. N’ihi ya, ọ sịrị ha: ‘Unu bụ ndị nledo. Unu bịara ịchọpụta ebe obodo anyị na-adịghị ike.’

Ha sịrị: ‘Ee e, anyị abụghị ndị nledo. Anyị bụ ndị ezigbo mmadụ. Anyị niile bụ ụmụnne. Anyị dị iri na abụọ. Ma otu nwanne anyị anọkwaghị, nke kasị nta na nna anyị nọ n’ụlọ.’

Josef mere ka à ga-asị na o kweghị ihe ha kwuru. O debere nwanne ya bụ́ Simiọn n’ụlọ mkpọrọ wee kwere ka ndị ọzọ buru ihe oriri laa. Ma ọ sịrị ha: ‘Mgbe unu ga-abịa ọzọ, unu hụ na unu kpọ nwanne unu ahụ nke kasị nta bịa.’

Mgbe ha laruru Kenan, ụmụnne Josef gwara nna ha bụ́ Jekọb ihe niile merenụ. O wutere Jekọb nke ukwuu. O wee na-ekwu ákwá ákwá, sị: ‘Josef anọkwaghị, ma ugbu a Simiọn anọkwaghị ya. M gaghị ekwe ka unu duru Benjamin nwa m nke kasị nta.’ Ma mgbe ihe oriri ha malitere ịgwụ, Jekọb kwere ka ha kpọrọ Benjamin gaa Ijipt iji nweta ihe oriri ọzọ.

Josef hụrụ ụmụnne ya ka ha na-abịa. Obi tọrọ ya ụtọ ịhụ Benjamin nwanne ya nke nta. Ọ dịghị onye n’ime ha matara na oké mmadụ ahụ bụ Josef. Josef mere otu ihe mgbe ahụ iji lee ụmụnne ya iri ahụ ule.

Ọ gwara ndị ohu ya ka ha tinyejuo ihe oriri n’akpa ha. N’emeghị ka ha mara, o mere ka e tinye iko ọlaọcha ya pụrụ iche n’ime akpa Benjamin. Mgbe ha hapụrụ wee jeruo ebe dịtụ anya, Josef zipụrụ ndị ohu ya ịchụ ha. Mgbe ha chụkwutere ha, ndị ohu ahụ sịrị: ‘Gịnị mere unu ji zuru iko ọlaọcha nke onyenwe anyị?’

Ụmụnne ya sịrị: ‘Anyị ezughị iko ya. Ọ bụrụ na unu achọta ya n’aka onye ọ bụla n’ime anyị, ka e gbuo onye ahụ.’

N’ihi ya, ndị ohu ahụ lere akpa ha niile, wee chọta iko ahụ n’ime akpa Benjamin, dị ka ị na-ahụ n’ebe a. Ndị ohu ahụ wee sị ha: ‘Ndị ọzọ niile pụrụ ịla, ma Benjamin ga-eso anyị laghachi.’ Gịnị ka ụmụnne iri ndị ọzọ ga-eme ugbu a?

Ha niile sooro Benjamin laghachi n’ụlọ Josef. Josef gwara ụmụnne ya, sị: ‘Unu niile pụrụ ịla, ma Benjamin ga-anọrịrị n’ebe a dị ka ohu m.’

Juda wee kwuo okwu, sị: ‘Ọ bụrụ na m laa hapụ nwa okoro a, nna m ga-anwụ n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya hie nne. Biko debe m n’ebe a dị ka ohu gị ma kwe ka nwa okoro a laa.’

Josef hụrụ na ụmụnne ya agbanwewo. Ha abụghị ndị obi tara mmiri na ndị obi ọjọọ ọzọ. Ka anyị chọpụta ihe Josef meziri.

Jenesis 42:9-38; 43:1-34; 44:1-34.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya