Ònye n’Ezie Na-achị Ụwa?
Ọtụtụ ndị ga-eji otu okwu—Chineke—zaa ajụjụ ahụ dị n’elu. Ma n’ụzọ dị ịrịba ama, ọ dịghị ebe Bible na-ekwu na ọ bụ Jisọs Kraịst ma ọ bụ Nna ya, bụ n’ezie ndị ọchịchị nke ụwa a. N’ụzọ megidere nke a, Jisọs kwuru, sị: “A ga-achụpụ onyeisi ụwa nke a.” O kwukwara, sị: “Onyeisi nke ụwa nke a na-abịa: ọ dịghịkwa ihe ọ bụla o nwere n’ime m.”—Jọn 12:31; 14:30; 16:11.
Ya mere, onye ọchịchị nke ụwa a na-emegide Jisọs. Ònye ka nke a pụrụ ịbụ?
Inweta Ihe Ọmụma Site n’Ọnọdụ Ụwa
N’agbanyeghị mgbalị dị iche iche nke ụmụ mmadụ nwere ezi nzube, ụwa atawo ahụhụ n’ụzọ dị ukwuu n’akụkọ dum nke ihe mere eme. Nke a na-eme ka ndị na-eche echiche nwee ihe ijuanya, dị ka David Lawrence, bụ́ onye nwụworo anwụ nke na-ede ihe n’uche akwụkwọ akụkọ nwere, wee sị: “‘Udo n’elu ụwa’—ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile chọrọ ya. ‘Mmetụta obi ọma n’ebe ndị mmadụ nọ’—ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile nọ n’ụwa nwere ya n’ebe ibe ha nọ. Gịnịzi gajọrọ? N’ihi gịnị ka e ji nwee ihe iyi egwu nke agha n’agbanyeghị ọchịchọ ebumpụta ụwa ndị ụmụ mmadụ nwere?”
O yiri ihe na-adabaghị adaba, ọ́ bụghị otú ahụ? Mgbe ọchịchọ ụmụ mmadụ bụ ibi n’udo, ha na-akpọrịtakarị onwe ha asị, na-egburịtakarịkwa onwe ha—na-ejikwa oké obi ọjọọ eme ya. Tụlee imebiga ihe ókè ndị e leziri anya jiri oké obi ọjọọ na-eme. Ụmụ mmadụ ejiwo ụlọ gas, ogige ịta ahụhụ, égbè ndị na-awụpụ ọkụ, bọmbụ napalm, na ụzọ ọjọọ ndị ọzọ mee ihe iji tarịta ibe ha ahụhụ ma gburịta ibe ha n’emeghị ebere.
Ì kwetara na ụmụ mmadụ, ndị na-achọsi udo na obi ụtọ ike, nwere ike n’onwe ha ime oké ihe ọjọọ dị otú ahụ megide ndị ọzọ? Ike ndị dị aṅaa na-akpali ụmụ mmadụ ime omume ndị a na-asọ oyi dị otú ahụ ma ọ bụ na-eduba ha n’ọnọdụ ndị na-amanye ha ime oké ihe ọjọọ? Ọ̀ dịwo mgbe i chetụrụ n’echiche ma è nwere ike dị njọ, nke a na-apụghị ịhụ anya na-akpali ụmụ mmadụ ime ihe ike ndị dị otú ahụ?
E Mee Ka A Mata Ndị Ọchịchị nke Ụwa
Ọ dịghị mkpa ka a kọwa nkọ n’okwu ahụ, n’ihi na Bible na-egosi n’ụzọ doro anya na onye nwere ọgụgụ isi, nke a na-adịghị ahụ anya, anọwo na-achị ma ndị mmadụ ma mba dị iche iche. Ọ na-asị: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” Bible na-emekwa ka a mata onye ọ bụ, na-asị: “Onye a na-akpọ Ekwensu na Setan . . . na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.”—1 Jọn 5:19; Mkpughe 12:9.
N’otu oge, mgbe ‘Ekwensu nwara’ Jisọs, Jisọs enweghị obi abụọ banyere ọkwá Setan nwere dị ka onye ọchịchị nke ụwa a. Bible na-akọwa ihe merenụ: “Ekwensu kuuru Ya gaa ugwu dị nnọọ oké elu, wee gosi Ya alaeze nile nke ụwa, na ebube ha; o wee si Ya, Ihe ndị a nile ka m ga-enye Gị, ọ bụrụ na Ị ga-ada n’ala kpọọ isiala nye m. Mgbe ahụ Jisọs sịrị ya, Laba, Setan.”—Matiu 4:1, 8-10.
Cheedị echiche banyere nke a. Setan nwara Jisọs site n’iche ya “alaeze nile nke ụwa” n’ihu. Ma, ihe Setan chere ya n’ihu ọ̀ gaara abụ ọnwụnwa n’ezie ma ọ bụrụ na Setan abụghị n’ezie onye ọchịchị nke alaeze ndị a? Ee e, ọ garaghị abụ. Rịbakwa ama, Jisọs ekwughị na ọchịchị nile ndị a nke ụwa abụghị nke Setan, bụ́ nke ọ gaara ekwu ma ọ bụrụ na ha adịghị n’ike aka Setan. Ya mere, Setan bụ́ Ekwensu bụ n’ezie onye ọchịchị a na-adịghị ahụ anya nke ụwa! N’ezie, Bible na-akpọ ya “chi nke oge a.” (2 Ndị Kọrint 4:4) Ma, olee otú ajọ onye dị otú a si bata abata n’ọkwá a dị elu?
Onye ahụ nke ghọrọ Setan bụrịị mmụọ ozi nke Chineke kere, ma o nwere anyaukwu n’ebe ọkwá Chineke dị. Ọ mara ịchịisi ruuru Chineke aka. Iji mee nke a, o jiri agwọ mee ihe dị ka ọnụ na-ekwuru ya iji duhie nwanyị mbụ, bụ́ Iv, n’ụzọ dịkwa otú a o nwetara ya na di ya, bụ́ Adam, ime ihe ọ chọrọ kama irubere Chineke isi. (Jenesis 3:1-6; 2 Ndị Kọrint 11:3) O kwukwara na ya pụrụ ime ka ụmụ Adam na Iv nile bụ́ ndị a na-amụbeghịdị amụ, wezụga onwe ha n’ebe Chineke nọ. Ya mere, Chineke nyere ohere ka Setan gbalịa ime ihe o kwuru, ma Setan enwebeghị ihe ịga nke ọma.—Job 1:6-12; 2:1-10.
N’ụzọ dị ịrịba ama, ọ bụghị nanị Setan na-achị ụwa. O nwere ihe ịga nke ọma n’ịrụgide ụfọdụ n’ime ndị mmụọ ozi ndị ọzọ isonyere ya n’inupụrụ Chineke isi. Ndị a ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ, ndị bụ́ mmụọ bụ ndị òtù ya. Bible na-ekwu banyere ha mgbe ọ na-agba ndị Kraịst ume, sị: ‘Guzogidenụ ihe nile Ekwensu na-ezupụta. N’ihi na ịgba mgba anyị abụghị imegide anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ imegide ndị onwe ụwa [“ndị ọchịchị ụwa,” NW] nke ọchịchịrị a, imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.’—Ndị Efesọs 6:11, 12.
Guzogide Ndị Ajọ Mmụọ
Ndị a a na-adịghị ahụ anya, bụ́ ajọ ndị ọchịchị ụwa kpebisiri ike iduhie ihe nile a kpọrọ mmadụ, ichigharị ha pụọ n’ife Chineke ofufe. Otu ụzọ nke ndị ajọ mmụọ si eme nke a bụ site n’ịkwalite echiche bụ na a na-adị ndụ mgbe a nwụsịrị, n’agbanyeghị na Okwu Chineke na-egosi n’ụzọ doro anya na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. (Jenesis 2:17; 3:19; Ezikiel 18:4; Abụ Ọma 146:3, 4; Eklisiastis 9:5, 10) Ya mere, ajọ mmụọ, n’iṅomi ụda olu nke onye nwụrụ anwụ, pụrụ isoro ndị ikwu ma o bụ ndị enyi dị ndụ nke onye ahụ kwurịta okwu, site n’aka onye na-ajụ mmụọ ase ma ọ bụ “olu” sitere n’ógbè a na-adịghị ahụ anya. “Olu” ahụ na-ada dị ka à ga-asị na ọ bụ onye ahụ nwụrụ anwụ, ma n’ezie ọ bụ onye mmụọ ọjọọ!
Ya mere, ọ bụrụ na ị nụ “olu” dị otú ahụ mgbe ọ bụla, ekwela ka e duhie gị. Jụ ihe ọ bụla ọ na-ekwu, ma kwughachi okwu Jisọs: “Laba, Setan.” (Matiu 4:10; Jemes 4:7) Ekwela ka ọchịchọ ịmata banyere ógbè ndị mmụọ mee ka gị na ndị ajọ mmụọ nwee mmekọrịta. A na-akpọ inwe njikọ dị otú ahụ mgbaasị, Chineke na-adọkwa ndị na-efe ya aka ná ntị megide ụdị ya nile. Bible na-akatọ “onye na-ajụ ase . . . ma ọ bụ onye na-ajụ mmụọ ihe, ma ọ bụ dibịa afa, ma ọ bụ onye na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ihe.”—Deuterọnọmi 18:10-12; Ndị Galetia 5:19-21; Mkpughe 21:8.
Ebe mgbaasị na-eme ka mmadụ nọrọ n’okpuru ike mmetụta ndị mmụọ ọjọọ, guzogide ihe omume ya nile n’agbanyeghị ókè ọ pụrụ iyi ka ha na-enyeru obi ụtọ, ma ọ bụ na-akpali akpali. Ihe omume ndị a gụnyere ilekwasị anya na bọl na-egbuke egbuke nke e ji akọ ọdịnihu, iji bọọdụ Ouija eme ihe, ESP (ihe ọmụma pụrụ iche nke karịrị ike mmadụ), inyocha akara ndị dị n’aka mmadụ (ịgụ akara aka), na ịgụ kpakpando. Ndị mmụọ ọjọọ emewokwa ka e nwee ụ̀zụ̀ na ihe ijuanya ndị ọzọ a pụrụ ịhụ anya n’ụlọ ndị ha ji mere ókèala ha.
Tụkwasị na nke a, ndị ajọ mmụọ na-elekwasị anya n’ọchịchọ ebumpụta ụwa mmadụ nke ime mmehie site n’ịkwalite akwụkwọ ọgụgụ, ihe omume sịnịma, na telivishọn ndị na-egosi omume rụrụ arụ na mmekọahụ na-adịghị ka e si kee mmadụ. Ndị mmụọ ọjọọ maara na ọ bụrụ na e wepụghị echiche ọjọọ n’uche, ọ ga-enwe mmetụta na-adịgide adịgide ma duje ụmụ mmadụ n’ime omume n’ụzọ rụrụ arụ—dị ka ndị mmụọ ọjọọ n’onwe ha.—Jenesis 6:1, 2; 1 Ndị Tesalọnaịka 4:3-8; Jud 6.
N’ezie, ọtụtụ ndị pụrụ ịkwa echiche ahụ bụ́ na ndị ajọ mmụọ na-achị ụwa a emo. Ma ekweghị ekwe ha abụghị ihe ijuanya, ebe Bible na-ekwu, sị: “Setan onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:14) Aghụghọ ya nke kasị dịrị irè abụwo ikpuchi anya ọtụtụ ndị pụọ n’eziokwu bụ na ya na ndị mmụọ ọjọọ ya dị adị n’ezie. Ma abụla onye e duhiere! Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya dị adị n’ezie, ọ dịkwa mkpa ka ị nọgide na-eguzogide ha.—1 Pita 5:8, 9.
N’ụzọ na-enye obi ụtọ, oge dị nso ugbu a mgbe Setan na ndị òtù ya na-agaghị adị ọzọ! “Ụwa [tinyere ndị ọchịchị ya bụ́ ndị mmụọ ọjọọ] na-agabiga,” ka Bible na-emesi anyị obi ike, “ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) Lee ahụ efe ọ ga-abụ iwepụ mmetụta ọjọọ ahụ! N’ihi ya, ka anyị soro ná ndị na-eme uche Chineke wee dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke.—Abụ Ọma 37:9-11, 29; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4.
Ọ gwụlakwa ma e gosịrị nsụgharị ọzọ, nhota Bible nile e mere sitere na Bible Nsọ nke Union Version, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a. N’ebe e dere NW ka ọ na-eso nhota okwu, ọ na-egosi na nsụgharị ahụ sitere na New World Translation of the Holy Scriptures—With References nke dị n’asụsụ Bekee.
[Ihe Osise dị na peeji nke 4]
Setan ọ̀ pụrụ inyeworị Jisọs ọchịchị ndị a nile nke ụwa ma ọ bụrụ na ha abụghị nke ya?