Isi Mbụ
Onye Amụma Oge Ochie nke Nwere Ozi Maka Oge A
1, 2. (a) Olee ọnọdụ ọjọọ ndị anyị na-ahụ n’ụwa taa? (b) Olee otú otu onye ome iwu na United States si kwupụta nchegbu ya banyere ndakpọ nke ọha mmadụ?
OLEE onye ọ na-adịghị agụsi agụụ ike taa inwere onwe ya pụọ ná nsogbu ndị na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu? Ma, lee ka ọchịchọ anyị sị bụrụ nke a na-adịghị emezu ọtụtụ mgbe! Udo na-agụsi anyị agụụ ike, ma agha na-akpa anyị aka ọjọọ. Anyị nwere mmasị dị ukwuu n’iwu na ịdị n’usoro, ma anyị apụghị ịkwụsị mmụba nke izu ohi, ndina n’ike, na igbu ọchụ na-amụba. Anyị chọrọ ịtụkwasị ndị agbata obi anyị obi, ma anyị aghaghị ịkpọchi ụzọ anyị maka nchebe. Anyị hụrụ ụmụ anyị n’anya ma na-agbalị ịkụnye n’ime ha ụkpụrụ omume ndị dị mma, ma ọtụtụ mgbe anyị na-anọ na-ele nanị n’anya ka ndị ọgbọ ha na-enwe mmetụta na-adịghị mma n’ahụ ha.
2 Anyị pụrụ nnọọ ikwenyere Job, bụ́ onye sịrị na ndụ mmadụ nke dị mkpirikpi ‘jupụtara n’ahụhụ.’ ( Job 14:1) Nke a yiri ka ọ dị otú ahụ taa karịsịa, n’ihi na ọha mmadụ na-adakpọsị n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-ahụtụbeghị mbụ. Otu onye ome iwu na United States kwuru, sị: “Ugbu a Agha Nzuzo ebiela, ma n’ụzọ dị oké njọ, e mewo ka ụwa bụrụ ebe dị mma karị maka ịbọ ọ́bọ̀ na inwe obi ọjọọ megide agbụrụ, ebo na okpukpe. . . . Anyị ewetulatawo ụkpụrụ omume anyị ruo n’ókè nke na ọtụtụ ndị ntorobịa anyị nọ ná mgbagwoju anya, nwee nkụda mmụọ ma nọrọ n’ezigbo nsogbu. Ọ rụpụtawo nleghara anya nke ndị nne na nna, ịgba alụkwaghịm, mmetọ ụmụaka, ntụrụ ime nke ndị nọ n’afọ iri na ụma, ndị kwụsịrị ịga akwụkwọ, ọgwụ ọjọọ, na okporo ámá ndị jupụtara n’ime ihe ike. N’ịbụ nke lanarịworo oké ala ọma jijiji anyị kpọrọ Agha Nzuzo, o yiri ka a ga-asị na àkị́kà na-erida ụlọ anyị ugbu a.”
3. Olee akwụkwọ Bible kasị enye olileanya banyere ọdịnihu?
3 Otú ọ dị, anyị nwere olileanya. Ihe dị ka afọ 2,700 gara aga, Chineke kpaliri otu nwoke si n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ibu ọtụtụ amụma ndị nwere ihe pụrụ iche ha pụtara maka oge anyị. E dekọrọ ozi ndị a n’akwụkwọ Bible bu aha onye amụma ahụ—Aịsaịa. Ònye bụ Aịsaịa, gịnịkwa mere anyị pụrụ iji kwuo na amụma ya, bụ́ nke e dekọrọ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ narị afọ iri atọ gara aga, na-enye ihe nile a kpọrọ mmadụ taa ìhè?
Nwoke Ezi Omume n’Oge Ọgba Aghara
4. Ònye bụ Aịsaịa, oleekwa mgbe o jere ozi dị ka onye amụma Jehova?
4 N’amaokwu mbụ n’akwụkwọ ya, Aịsaịa kọwara onwe ya dị ka “nwa Emọz,”a ọ gwakwara anyị na ya jere ozi dị ka onye amụma Chineke “n’ụbọchị Ụzaịa na Jotam na Ehaz na Hezekaịa, bụ́ ndị eze Juda.” (Aịsaịa 1:1) Nke a ga-apụta na Aịsaịa bụ onye amụma Chineke nye mba Juda ruo afọ 46 ma ọ dịkarịa ala, ma eleghị anya malite ná ngwụsị nke oge ọchịchị Ụzaịa—ihe dị ka n’afọ 778 T.O.A.
5, 6. Olee ihe na-aghaghị ịbụworị eziokwu banyere ndụ ezinụlọ Aịsaịa, n’ihi gịnịkwa?
5 N’iji ya tụnyere ihe anyị maara banyere ụfọdụ ndị amụma ọzọ, anyị amachaghị banyere ndụ Aịsaịa n’onwe ya. Anyị maara na ọ lụrụ nwanyị, na o zokwara aka n’ebe nwunye ya nọ dị ka ‘onye amụma nwanyị.’ (Aịsaịa 8:3) Dị ka Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature nke McClintock na Strong dere si kwuo, aha a na-egosi na alụmdi na nwunye Aịsaịa “abụghị nanị na o kwekọrọ n’ọrụ e kenyere ya, kama na e jikọtara ya na ya n’ụzọ chiri anya.” Ọ pụrụ nnọọ ịbụ na, dị ka ụfọdụ ụmụ nwanyị ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke n’Israel oge ochie, nwunye Aịsaịa nwere ọrụ ibu amụma nke ya.—Ndị Ikpe 4:4; 2 Ndị Eze 22:14.
6 Aịsaịa na nwunye ya mụrụ ụmụ abụọ ma ọ dịkarịa ala, na-enye nke ọ bụla aha nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ amụma. Nke ọkpara, bụ́ Shea-jashub, so Aịsaịa mgbe o jere zie ajọ Eze Ehaz ozi Chineke ziri. (Aịsaịa 7:3) O doro anya na Aịsaịa na nwunye ya mere ka ofufe Chineke bụrụ ihe omume ezinụlọ—ihe nlereanya dị mma nye ndị di na nwunye taa!
7. Kọwaa otú ọnọdụ dị na Juda n’oge Aịsaịa.
7 Aịsaịa na ezinụlọ ya biri ndụ n’oge ọgba aghara n’akụkọ ihe mere eme nke Juda. Nsogbu ọchịchị zuru ebe nile, iri ngo merụrụ òtù ndị ikpe, omume ihu abụọ bibikwara ntọala okpukpe nke ọha mmadụ ahụ. Elu ugwu dị iche iche jupụtara n’ebe ịchụàjà nye chi ụgha dị iche iche. Ọbụna ụfọdụ n’ime ndị eze ya kwalitere ịgọ mmụọ. Dị ka ihe atụ, Ehaz abụghị nanị na ọ gbachiri nkịtị n’ikpere arụsị nke ndị ọ na-achị kama ya onwe ya tinyere aka na ya, na-eme ka nwa nke ya “gabiga n’ime ọkụ” n’ịchụ àjà nye chi ndị Kenean bụ́ Molek.b (2 Ndị Eze 16:3, 4; 2 Ihe E Mere 28:3, 4) Ihe a nile mekwara n’etiti ndị ha na Jehova nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ!—Ọpụpụ 19:5-8.
8. (a) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Eze Ụzaịa na Eze Jotam setịpụrụ, ndị ahụ hà gbasokwara idu ndú ha? (b) Olee otú Aịsaịa si gosi anyaike n’etiti ndị na-enupụ isi?
8 N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ụfọdụ n’ime ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ—tinyere ndị ọchịchị ole na ole—gbalịrị ịkwalite ezi ofufe. Eze Ụzaịa, bụ́ onye mere “ihe ziri ezi n’anya Jehova,” so n’ime ha. N’agbanyeghị nke ahụ, n’oge ọchịchị ya ndị ahụ nọ “na-achụ àjà na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ebe dị elu nile.” (2 Ndị Eze 15:3, 4) Eze Jotam n’otu aka ahụ ‘mere ihe ziri ezi n’anya Jehova.’ Otú ọ dị, ndị ahụ “nọ na-ebibi onwe ha.” (2 Ihe E Mere 27:2) Ee, n’ihe dị ukwuu n’oge nile Aịsaịa nọ na-eje ozi amụma ya, alaeze Juda nọ n’ọnọdụ dị njọ n’ụzọ ime mmụọ na n’omume. N’ozuzu ha, ndị ahụ leghaara mmetụta ọ bụla dị mma sitere n’aka ndị eze ha anya. N’ụzọ kwere nghọta, izi ndị a dị isi ike ozi Chineke agaghị abụ ọrụ dị mfe. Ka o sina dị, mgbe Jehova jụrụ, sị, “Ònye ka M ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” Aịsaịa egbughị oge. O tiri, sị: “Lee m; ziga m.”—Aịsaịa 6:8.
Ozi Nzọpụta
9. Gịnị ka aha Aịsaịa pụtara, oleekwa otú nke a si emetụta isiokwu nke akwụkwọ ya?
9 Aha Aịsaịa pụtara “Nzọpụta nke Jehova,” a pụkwara nnọọ ịkpọ nke a isiokwu nke ozi ya. N’eziokwu, ụfọdụ n’ime amụma ndị Aịsaịa buru bụ okwu ikpe. N’agbanyeghị nke ahụ, okwu nzọpụta pụtara nnọọ ìhè n’ụzọ doro anya. Ugboro ugboro, Aịsaịa kọrọ otú Jehova ga-esi tọhapụ ụmụ Israel site n’ịbụ ndị e ji eji na Babilọn mgbe oge ya ruru, wee nye ihe fọdụrụnụ ohere ịlaghachi Zaịọn ma weghachi ala ahụ n’ebube ya mbụ. N’enweghị obi abụọ, ihe ùgwù nke ikwupụta na idetu amụma dị iche iche banyere mweghachi nke Jerusalem ọ hụrụ n’anya nyere Aịsaịa ọṅụ kasị ukwuu!
10, 11. (a) N’ihi gịnị ka akwụkwọ Aịsaịa ji adọrọ mmasị anyị taa? (b) Olee otú akwụkwọ Aịsaịa si adọrọ uche gaa n’ebe Mesaịa ahụ nọ?
10 Ma olee ihe gbasara anyị na ozi ikpe na nke nzọpụta ndị a? N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Aịsaịa adịghị ebu amụma nanị maka abamuru nke alaeze ebo abụọ nke Juda. Kama nke ahụ, ozi ya nwere ihe pụrụ iche ọ pụtara maka oge anyị. Aịsaịa na-enye nkọwa dị ebube banyere otú Alaeze Chineke ga-esi weta ngọzi dị ukwuu n’elu ụwa anyị n’oge na-adịghị anya. N’akụkụ a, ihe dị ukwuu n’ihe odide Aịsaịa lekwasịrị anya na Mesaịa ahụ e buru n’amụma, bụ́ onye ga-achị dị ka Eze nke Alaeze Chineke. (Daniel 9:25; Jọn 12:41) N’ezie, ọ bụghị ihe ndabata na aha bụ́ Jisọs na Aịsaịa na-enye ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu echiche ahụ, ebe aha ahụ bụ́ Jisọs pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”
11 Otú ọ dị, a mụghị Jisọs ruo ihe dị ka narị afọ asaa mgbe Aịsaịa nwụsịrị. Ma, amụma ndị dị n’akwụkwọ Aịsaịa banyere Mesaịa ahụ sara nnọọ mbara, ziekwa nnọọ ezie nke na ha na-ada ka ihe onye hụrụ Jisọs mgbe ọ nọ ndụ n’elu ala kọrọ. Otu akwụkwọ kwuru na n’ihi nke a, na a na-akpọ akwụkwọ Aịsaịa “Oziọma nke Ise.” N’ihi ya, ọ bụghị ihe ijuanya ma ọlị na Aịsaịa bụ akwụkwọ Bible Jisọs na ndị ozi ya kasị hota ihe e dere na ya iji mee ka a mata Mesaịa ahụ n’ụzọ doro anya.
12. N’ihi gịnị ka anyị ji jiri oké mmasị na-amalite ọmụmụ nke akwụkwọ Aịsaịa?
12 Aịsaịa ji okwu ndị mara mma kọwaa “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ebe ‘otu eze ga-abụ eze n’ezi omume,’ ebe ndị isi ga-abụkwa ndị isi n’ikpe ziri ezi. (Aịsaịa 32:1, 2; 65:17, 18; 2 Pita 3:13) Ya mere akwụkwọ Aịsaịa na-ezo aka n’olileanya ahụ na-enye obi ụtọ nke Alaeze Chineke, n’okpuru Mesaịa Jisọs Kraịst dị ka Eze e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze. Lee ihe agbamume ọ bụụrụ anyị ịdị ndụ kwa ụbọchị ka anyị ji ọṅụ na-atụ anya “nzọpụta [Jehova]”! (Aịsaịa 25:9; 40:28-31) Ya mere, ka anyị jiri oké mmasị nyochaa ozi dị oké mkpa nke dị n’akwụkwọ Aịsaịa. Ka anyị na-eme otú ahụ, a ga-eme ka obi ike anyị nwere ná nkwa Chineke sie ike nke ukwuu. Ọzọkwa, a ga-enyere anyị aka ikwenyesikwu ike na Jehova bụ n’ezie Chineke nke nzọpụta anyị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E kwesịghị ịghọtahie nna Aịsaịa, bụ́ Emọz, ịbụ Emọs, bụ́ onye buru amụma ná mmalite nke oge ọchịchị Ụzaịa na onye dere akwụkwọ Bible bu aha ya.
b Ụfọdụ na-ekwu na ‘ịgabiga n’ime ọkụ’ pụrụ nanị ịbụ ememe ime ka a dị ọcha. Otú ọ dị, n’ebe a o yiri ka nkebi ahịrịokwu ahụ ọ na-ezo aka n’àjà nkịtị. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị Kenean na ndị Israel si n’ezi ofufe dapụ jiri ụmụaka chụọ àjà.—Deuterọnọmi 12:31; Abụ Ọma 106:37, 38.
Igbe/Foto dị na peeji nke 7]
Ònye Bụ Aịsaịa?
IHE AHA YA PỤTARA: “Nzọpụta nke Jehova”
EZINỤLỌ YA: Ọ lụrụ nwanyị, mụta ụmụ nwoke abụọ ma ọ dịkarịa ala
EBE O BIRI: Jerusalem
AFỌ OLE O JERE OZI: Afọ 46 ma ọ dịkarịa ala, malite n’ihe dị ka n’afọ 778 T.O.A. ruo mgbe afọ 732 T.O.A. gafesịrị
NDỊ EZE JUDA HA NA YA DỊKỌRỌ NDỤ: Ụzaịa, Jotam, Ehaz, Hezekaịa
NDỊ AMỤMA HA NA YA DỊKỌRỌ NDỤ: Maịka, Hosea, Oded
[Foto dị na peeji nke 6]
Aịsaịa na nwunye ya mere ife Chineke ihe omume ezinụlọ