Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 2 p. 16-20
  • Akwụkwọ Ozi nke Si n’Aka Chineke Na-ahu n’Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akwụkwọ Ozi nke Si n’Aka Chineke Na-ahu n’Anya
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozi Ọma Ahụ Ò Si n’Aka Chineke n’Eziokwu?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Mụta Ihe n’Aka Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Chineke Nwere Aha
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Baịbụl Bụ Akwụkwọ Si n’Aka Chineke
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 2 p. 16-20

ISI NKE 2

Akwụkwọ Ozi nke Si n’Aka Chineke Na-ahu n’Anya

GWA M, olee akwụkwọ kasị amasị gị?— Ụmụaka ụfọdụ ga-ahọrọ nke na-akọ banyere ụmụ anụmanụ. Ndị ọzọ ga-ahọrọ akwụkwọ nwere ọtụtụ ihe osise n’ime ya. Ịgụ akwụkwọ ndị ahụ pụrụ ịbụ ihe na-atọ ụtọ.

Ma, akwụkwọ kasị mma n’ụwa nile bụ akwụkwọ ndị na-agwa anyị ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke. Otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ dị mkpa karịa ndị ọzọ nile. Ị̀ ma akwụkwọ ọ bụ?— Ọ bụ Bible.

Gịnị mere Bible ji dị oké mkpa otú a?— Ọ bụ n’ihi na o si n’aka Chineke bịa. Ọ na-agwa anyị banyere ya nakwa banyere ihe ọma ndị ọ ga-emere anyị. Ọ na-egosikwa anyị ihe anyị kwesịrị ime iji mee ihe ga-atọ ya ụtọ. Ọ dị ka akwụkwọ ozi nke si n’aka Chineke.

Chineke pụrụ ịnọworị n’eluigwe dee Bible dum ma nye ya ụmụ mmadụ. Ma, o meghị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ihe ndị e kwuru n’ime ya si n’aka Chineke, o ji ndị ohu ya nọ n’ụwa dee ihe ka ukwuu na Bible.

Olee otú Chineke si mee nke ahụ?— Iji ghọta otú o si mee ya, cheedị echiche. Mgbe anyị nụrụ olu mmadụ na redio, olu ahụ pụrụ ịbụ olu onye nọ n’ebe dị anya na-ekwu okwu. Mgbe anyị na-ekiri telivishọn, anyị pụrụ ịhụ onyinyo ndị mmadụ nọ ná mba ndị ọzọ n’ụwa, anyị pụkwara ịnụ ihe ha na-ekwu.

Ụmụ mmadụ pụrụ ọbụna iji ụgbọ mbara ígwé garuo n’ọnwa, ha pụkwara isi n’ebe ahụ zite ozi n’ụwa. Ị̀ ma na ha pụrụ ime otú ahụ?— Ọ bụrụ na mmadụ ga-emeli nke ahụ, Chineke ọ̀ pụrụ isi n’eluigwe zite ozi?— Eenụ, ọ pụrụ! O mekwara otú ahụ ogologo oge tupu ụmụ mmadụ emepụta redio ma ọ bụ telivishọn.

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Olee otú anyị si mara na Chineke pụrụ ịnọ n’ebe dị anya gwa anyị okwu?

Mozis bụ otu onye nụrụ kpọmkwem ka Chineke na-ekwu okwu. Mozis ahụghị Chineke, ma, ọ nụrụ olu Chineke. Ọtụtụ nde mmadụ nọ ebe ahụ mgbe o mere. N’ezie, n’ụbọchị ahụ, Chineke mere ka otu ugwu maa jijiji, e nwere égbè eluigwe, àmụ̀mà sekwara. Ndị ahụ ma na ọ bụ Chineke kwuru okwu, ma ezigbo ụjọ ji ha. Ya mere, ha sịrị Mozis: “Chineke akpanyerela anyị ụka, ka anyị wee ghara ịnwụ.” Mgbe e mesịrị, Mozis deturu ihe ndị ahụ Chineke kwuru. Ihe ndị Mozis deturu dịkwa n’ime Bible.—Ọpụpụ 20:18-21.

Mozis dere akwụkwọ ise mbụ dị n’ime Bible. Ma, ọ bụghị nanị ya dere Bible. Chineke ji ihe dị ka ndị ikom 40 dee akụkụ dị iche iche nke Bible. Ndị ikom ndị a dịrị ndụ ogologo oge gara aga, o wekwara ọtụtụ afọ tupu e dechaa Bible. Ee, o were ihe dị ka afọ 1,600! Ihe na-eju anya bụ na n’agbanyeghị na ụfọdụ n’ime ndị ikom a amaghị ibe ha, ihe nile ha dere kwekọrọ n’ụzọ zuru ezu.

[Foto ndị dị na peeji nke 19]

Gịnị bụ aha ndị a so dee Bible?

Ụfọdụ n’ime ndị ikom Chineke ji mee ihe n’ide Bible bụ ndị a ma ama. Ọ bụ ezie na Mozis bụbu onye ọzụzụ atụrụ, ọ ghọrọ onye ndú nke mba Izrel. Solomọn bụ eze nke bụ́ ma onye kasị mara ihe ma onye kasị baa ọgaranya n’ụwa. Ma, ndị ọzọ so dee Bible abụchaghị ndị a ma ama. Emọs bụ onye na-elekọta osisi na-amị mkpụrụ fig.

Ọzọkwa, otu onye so dee Bible bụ dọkịta. Ị̀ ma aha ya?— Aha ya bụ Luk. Onye ọzọ so dee Bible bụbu onye ọnaụtụ. Aha ya bụ Matiu. Onye ọzọkwa bụbu ọkàiwu, ọkachamara n’iwu okpukpe ndị Juu. O dere ọtụtụ akwụkwọ n’ime Bible karịa onye ọ bụla ọzọ. Ị̀ ma aha ya?— Aha ya bụ Pọl. Ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ Pita na Jọn, bụ́ ndị sokwa dee Bible, bụbu ndị na-akụ azụ.

Ọtụtụ n’ime ndị a so dee Bible dere banyere ihe dị iche iche Chineke ga-eme n’ọdịnihu. Olee otú ha si mara ihe ndị ahụ ọbụna tupu ha emee?— Chineke mere ka ndị ikom ahụ mara ihe ndị ahụ. Ọ gwara ha ihe gaje ime.

Ka ọ na-erule n’oge Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, nọ n’ụwa, e deworị akụkụ ka ukwuu nke Bible. Chetakwa na Onye Ozizi Ukwu ahụ bibu n’eluigwe. Ọ ma ihe Chineke meworo. Ò kwere na Bible si n’aka Chineke?— Ee, o kwere.

Mgbe Jizọs gwara ndị mmadụ okwu banyere ihe dị iche iche Chineke kere, ọ gụpụtara ha n’ime Bible. Mgbe ụfọdụ, ọ na-agwa ha ihe ndị ahụ site n’ihe o bu n’isi. Jizọs wetaara anyị ozi ndị ọzọ si n’aka Chineke. Jizọs sịrị: “Ihe ndị m nụrụ n’ọnụ ya ka m na-ekwu n’ụwa.” (Jọn 8:26) Jizọs anụwo ọtụtụ ihe n’ọnụ Chineke n’ihi na ya na Chineke biri. Oleekwa ebe anyị pụrụ ịgụta ihe ndị ahụ Jizọs kwuru?— Ọ bụ n’ime Bible. E deturu ha nile edetu ka anyị na-agụ ha.

Otú ọ dị, mgbe Chineke ji ndị mmadụ dee Bible, ha ji asụsụ ha na-eji eme ihe kwa ụbọchị dee ya. Ya mere, e dere ihe ka ukwuu na Bible n’asụsụ Hibru, dee ụfọdụ n’asụsụ Aramaic, deekwa ọtụtụ akụkụ ya n’asụsụ Grik. Ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa amaghị otú e si agụ asụsụ ndị ahụ, a sụgharịwo Bible n’asụsụ ndị ọzọ. Taa, a pụrụ ịgụ akụkụ ụfọdụ nke Bible n’ihe karịrị asụsụ 2,260. Cheedị echiche banyere nke ahụ! Bible bụ akwụkwọ ozi Chineke degaara ndị mmadụ nọ n’ebe nile. Ma, n’agbanyeghị asụsụ ole a sụgharịworo ya gaa na ha, ozi dị n’ime ya ka bụ ozi si n’aka Chineke.

Ihe Bible na-ekwu dị mkpa nye anyị. Ọ dịla ezigbo anya e dere ya. Ma ọ na-ekwu banyere ihe ndị na-eme taa. Ọ na-akọkwara anyị ihe Chineke ga-eme n’ọdịnihu dị nso. Ihe ọ na-ekwu na-adọrọ mmasị! Ọ na-enye anyị olileanya magburu onwe ya.

[Foto dị na peeji nke 20]

Olee ihe ndị ị pụrụ ịmụta site n’ịgụ Bible?

Bible na-agwakwa anyị otú Chineke chọrọ ka anyị si na-ebi ndụ. Ọ na-agwa anyị ihe bụ́ ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ọ dị gị mkpa, dịkwa mụ onwe m mkpa ịmata nke a. Ọ na-akọrọ anyị banyere ndị mere ihe ọjọọ na ihe mere ha, ka anyị wee nwee ike izere nsogbu bịaara ha. Ọ na-akọkwara anyị banyere ndị mere ihe ziri ezi nakwa ihe ọma ndị bịaara ha. E deturu ha nile edetu maka ọdịmma anyị.

Ma, iji rite uru kasị ukwuu na Bible, ọ dị anyị mkpa ịmata azịza nke otu ajụjụ. Ajụjụ ahụ bụ: Ònye nyere anyị Bible? Gịnị ka i nwere ịza?— Ee, Bible, n’ozuzu ya, si n’aka Chineke. Oleezi otú anyị pụrụ isi gosi na anyị bụ ndị maara ihe n’ezie?— Ọ bụ site n’ige Chineke ntị nakwa site n’ime ihe ọ na-ekwu.

Ya mere, ọ dị anyị mkpa iwepụta oge iji na-agụkọ Bible ọnụ. Mgbe anyị nwetara akwụkwọ ozi si n’aka onye anyị hụrụ n’anya nke ukwuu, anyị na-agụ ya ugboro ugboro. Anyị na-eji ya akpọrọ ihe nke ukwuu. Ọ bụ otú ahụ ka Bible kwesịrị ịdị anyị n’ihi na ọ bụ akwụkwọ ozi si n’aka Onye kasị hụ anyị n’anya. Ọ bụ akwụkwọ ozi si n’aka Chineke na-ahụ n’anya.

Were minit ole na ole ugbu a gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-egosi na Bible bụ Okwu Chineke n’ezie, nke e dere maka abamuru anyị: Ndị Rom 15:4; 2 Timoti 3:16, 17; nakwa 2 Pita 1:20, 21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya