Febụwarị
Tọzdee, Febụwarị 1
Ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya.—Jems 1:4.
Olee otú ntachi obi ga-esi rụzuo “ọrụ” ya n’ebe anyị nọ? Ọ ga-eme ka ‘anyị zuo ezu, gbasiekwa ike n’ụzọ niile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ anyị.’ (Jems 1:4) Ọnwụnwa bịaara anyị nwere ike ime ka anyị mata na anyị kwesịrị ịna-enwekwu ndidi, na-enwekwu obi ụtọ maka ihe e meere anyị, ma ọ bụ na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. Ka anyị na-atachi obi n’ọnwụnwa ahụ, anyị ga-amụtakwu àgwà ndị a, si otú ahụ mee ka anyị na-akpakwu àgwà ka Ndị Kraịst. Ebe ọ bụ na ntachi obi nwere ike ime ka anyị na-akpakwu àgwà ka Ndị Kraịst, anyị agaghị achọ imebi iwu Jehova naanị iji mee ka ọnwụnwa bịaara anyị bie. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ echiche rụrụ arụ ka gị na ya na-alụ, ekwela ka a nwata gị. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịjụ echiche ahụ na-ezighị ezi. È nwere onye ezinụlọ unu na-emegide gị? Adala mbà. Kpebisie ike na ị ga na-efe Jehova. Cheta na anyị ga-atachirịrị obi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Chineke mma.—Rom 5:3-5; Jems 1:12. w16.04 2:15, 16
Fraịdee, Febụwarị 2
N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.—Fil. 2:3.
Jehova anaghị ewere ya na onye ọ bụla ma ọ bụ ndị ọ bụla ka ibe ha mma. Anyị niile bụ otu n’anya ya. O doro anya na Jehova kere anyị ka anyị dị́ iche n’ibe anyị. Otú a o si mee ya dị anyị mma, na-emekwa anyị obi ụtọ. Ọ chọghị ka anyị hapụ omenala anyị. Ma, ọ chọghịkwa ka anyị chewe na anyị ka ndị ọzọ mma. (Rom 10:12) Anyị ekwesịghị iji mba anyị na-etu ọnụ nke na anyị ga-echewe na ọ ka nke ndị ọzọ mma. Anyị chewe otú ahụ, o nwere ike isiri anyị ike izere esemokwu ụwa a. Ụdị ihe a mere n’oge ndịozi Jizọs. Ụfọdụ ụmụnna ndị Hibru nọ na-eleghara ndị inyom Grik di ha nwụrụ anya. (Ọrụ 6:1) Olee otú anyị ga-esi ama ma ànyị amalitela iche na obodo anyị ka nke ndị ọzọ mma? Ọ bụrụ na nwanna si obodo ọzọ atụọrọ gị aro, ị̀ na-eche ozugbo, sị, ‘Otú anyị si eme ihe ebe a ka mma,’ gị ajụ aro ahụ ọ tụrụ? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta ndụmọdụ a dị mkpa Baịbụl nyere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. w16.04 4:12, 13
Satọdee, Febụwarị 3
Aghaghịkwa m izisara obodo ndị ọzọ ozi ọma alaeze Chineke.—Luk 4:43.
Jizọs kwusara “ozi ọma alaeze Chineke,” ọ chọkwara ka ndị na-eso ụzọ ya mee otú ahụ. Olee ndị na-ekwusa ozi ahụ ná “mba niile”? (Mat. 28:19) O doro anya na ọ bụ naanị Ndịàmà Jehova. Otu onye ụkọchukwu e zigara ná mba ọzọ gwara otu Onyeàmà Jehova na ya ebiela n’ọtụtụ mba nakwa na ya jụrụ Ndịàmà Jehova ná mba nke ọ bụla ihe ha na-ekwusa. Gịnị ka ha zara ya? Onye ụkọchukwu ahụ sịrị: “Otú ha niile si dị iberiibe mere ka ha zaa otu ihe, sị na ọ bụ ‘ozi ọma Alaeze Chineke.’” Ma, kama ‘ịdị iberiibe,’ Ndịàmà Jehova ahụ kwuru otu ihe, otú ahụ ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ikwu. (1 Kọr. 1:10) Ihe ahụ ha zara dabara adaba n’ihe na-adị n’Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova. E nwere magazin a na narị asụsụ abụọ na iri ise na anọ. A na-ebikwa nke ọ bụla ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde iri ise na itoolu, nke mere ka ọ bụrụ magazin a kacha ebipụta n’ụwa niile. w16.05 2:6
Sọnde, Febụwarị 4
Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya.—2 Kọr. 9:7.
Ebe anyị na-ekwusa Alaeze Chineke, anyị nwere ike ịchọ ịbụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Iji mee ya, anyị nwere ike iselata aka n’ịchụ ego. Ma, anyị nwere ike ịchọpụta na anyị na-echegbu onwe anyị ma ànyị ga na-enwekwa ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị enweghịzi ego otú anyị nwere na mbụ. O doro anya na o nweghị ebe Baịbụl nyere anyị iwu ka anyị bụrụ ndị ọsụ ụzọ. Anyị chọọ, anyị nwere ike bụrụ naanị ndị nkwusa kwesịrị ntụkwasị obi n’ozi anyị na-ejere Jehova. Ma, Jizọs kwere anyị nkwa na ndị hapụrụ ihe dị́ iche iche maka Alaeze Chineke ga-enweta ngọzi buru ibu. (Luk 18:29, 30) Ihe Baịbụl kwuru gosikwara na obi na-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-enye ya otuto sí anyị n’obi, jirikwa obi ụtọ na-eme ihe ọ bụla anyị ga-emeli iji kwado ofufe ya. (Ọma 119:108) Ihe ndị a Baịbụl kwuru na ikpe ekpere ka Jehova duzie anyị ọ́ naghị eme ka anyị ghọta uche ya? Ichebara ihe ndị a echiche ga-enyere anyị aka ikpebi ihe ga-abara anyị uru nakwa ihe ga-eme ka Nna anyị nke eluigwe gọzie anyị. w16.05 3:13
Mọnde, Febụwarị 5
Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa, tupu oge ọdachi erute.—Ekli. 12:1.
Ọ bụghị naanị ndị na-eto eto na-enwe ọtụtụ n’ime nsogbu ndị a na-ekwu banyere ha n’akwụkwọ ndị e bipụtara maka ndị na-eto eto. Anyị niile kwesịrị ịna-agbachitere ihe anyị kweere, ịna-ejide onwe anyị, na ịna-ezere mkpakọrịta ọjọọ na ntụrụndụ na-adịghị mma. Anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ndị ọzọ mee ka anyị mee ihe na-adịghị mma. A na-ekwu banyere ihe ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ n’akwụkwọ ndị e bipụtara maka ndị na-eto eto. Ndị Kraịst torola eto hà kwesịrị iche na ha etofeela ịgụ akwụkwọ ndị e bipụtara maka ndị na-eto eto? Mbanụ. Ọ bụ eziokwu na a na-ede akwụkwọ ndị ahụ otú ga-amasị ndị na-eto eto, ihe ndị e kwuru na ha si n’Okwu Chineke na-anaghị agbanwe agbanwe. Anyị niile nwekwara ike irite uru n’ihe ndị ahụ Jehova ji akụziri anyị ihe. E wezụga inyere ndị na-eto eto aka ná nsogbu ndị ha na-enwe, akwụkwọ anyị na-enyekwara ha aka ka okwukwe ha sie ike, ha na Jehova adịkwuo ná mma. O nwekwara ike ịbara Ndị Kraịst torola eto uru.—Ekli. 12:13. w16.05 5:15, 16
Tuzdee, Febụwarị 6
Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova. Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.—Diut. 6:4, 5.
“Jehova Chineke anyị bụ otu Jehova.” Ihe a Baịbụl kwuru na-emetụ n’ahụ́. O mere ka ndị Izrel nwee ike idi nsogbu ndị bịaara ha ka ha na-aga inweta Ala Nkwa ahụ. Ọ bụrụ na anyị eburu okwu ahụ n’uche, ọ ga-enyere anyị aka ịlanahụ oké mkpagbu na-abịanụ ma nye aka mee ka udo dịrị na Paradaịs. Ka anyị na-efe naanị Jehova, jiri obi anyị niile hụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi, na-agbakwa mbọ ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, obi ga-esi anyị ike na Jizọs ga-akpọ anyị atụrụ mgbe ọ ga-abịa ikpe ndị mmadụ ikpe. Anyị ga-eso ná ndị ọ ga-asị: “Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi, ketanụ alaeze ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.”—Mat. 25:34. w16.06 3:2, 20
Wenezdee, Febụwarị 7
Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ.—Jere. 17:9.
Mpako nwere ike mee ka anyị kwuwe na ihe ọjọọ anyị mere dị mma, nke ga-eme ka anyị dị ka ụrọ na-ekweghị ọkpụkpụ. È nwetụla mgbe iwe were gị n’ihi ihe nwanna mere gị ma ọ bụ n’ihi na a napụrụ gị ihe ùgwù ije ozi? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka i mere? Ò mere ka ị dịzie mpako? Ka ihe kacha gị mkpa ọ̀ bụ ka gị na nwanna gị mee udo nakwa ka ị na-erubere Jehova isi? (Ọma 119:165; Kọl. 3:13) Ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya na-eme mmehie, ma eleghị anya na-emedị ya na nzuzo, o nwere ike ime ka o siere ya ike ịnabata ndụmọdụ sí n’aka Chineke. O nwere ike ịna-adịziri ya mfe ime mmehie. Otu nwanna kwuru na ya megidere omume ọjọọ ruo mgbe ọ na-anaghịzi ewute ya. (Ekli. 8:11) Otu nwanna nke na-ele ndị gba ọtọ mechara kwuo, sị: “M maliteziri ịna-akatọ ndị okenye.” Ile ndị gba ọtọ mere ka ya na Jehova ghara ịdị ná mma. E mechara mata ihe ahụ ọ na-eme, ndị okenye enyere ya aka. O doro anya na anyị niile ezughị okè. Ma, anyị katọwa ụmụnna anyị ma ọ bụ kwuwe na ihe ọjọọ anyị na-eme adịghị njọ kama ịrịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị ma nyere anyị aka, o nwere ike ịbụ na obi anyị amalitela ịkpọchi. w16.06 2:5, 6
Tọzdee, Febụwarị 8
Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu.—Mat. 6:25.
Ndị mmadụ nọ na-echegbu onwe ha n’ihe ha na-ekwesịghị ịna-echegbu onwe ha maka ya. E nwere ezigbo ihe mere Jizọs ji gwa ha ka ha kwụsị ime otú ahụ. Ọ bụrụgodị na ihe mere mmadụ ji na-echegbu onwe ya bụ ihe dị mkpa, o nwere ike ime ka ọ ghara iji obi ya niile na-efe Chineke, nke bụ́kwanụ ihe kacha mkpa ná ndụ. Otú Jizọs si hụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya mere ka ọ dọọ ha aka ná ntị ugboro anọ ọzọ, mgbe ọ na-akụzi ihe n’elu ugwu, ka ha kwụsị ịna-echegbu onwe ha. (Mat. 6:27, 28, 31, 34) Jizọs ma ihe niile dị ndị mmadụ mkpa. Ọ makwa na “n’oge ikpeazụ,” ndị na-eso ụzọ ya ga-ebi ‘n’oge tara akpụ.’ (2 Tim. 3:1) Ụfọdụ n’ime nsogbu na-echi ọtụtu ndị ọnụ n’ala taa bụ enweghị ọrụ, ihe ịda oké ọnụ, ụkọ nri, na ịda ogbenye. Ma, Jizọs makwa na ndụ ‘dị mkpa karịa ihe oriri, na ahụ́ dịkwa mkpa karịa uwe.’ w16.07 1:8, 9
Fraịdee, Febụwarị 9
M ghọrọ onye ozi nke ihe a dị ka onyinye nke obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ si dị.—Efe. 3:7.
A sị na anyị na-emeta ihe niile dị́ Jehova mma n’emejọghị ihe, ọ gaara abụ na anyị rụtara obiọma ya n’ọrụ. Ma, anyị anaghị eme otú ahụ. Ọ bụ ihe mere Eze Sọlọmọn ji dee, sị: “E nweghị onye ezi omume n’ụwa nke na-eme naanị ezi ihe, nke na-adịghịkwa emehie.” (Ekli. 7:20) Pọl onyeozi kwukwara, sị: “Mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke” nakwa na ‘ụgwọ ọrụ mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.’ (Rom 3:23; 6:23a) Ọ bụ ihe anyị kwesịrị inweta. Ma, Jehova gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. O gosiri anyị obiọma ya na-enweghị atụ, nke na-erughịrị mmadụ. O zitere “Ọkpara ọ mụrụ naanị ya” ka ọ bịa nwụọ maka anyị. Ọ bụ ya bụ onyinye kachanụ o nyere anyị. (Jọn 3:16) N’ihi ya, Pọl kwuru na ‘e kpuwere Jizọs ebube na nsọpụrụ dị ka okpueze n’ihi na ọ nwụwo anwụ, ka o wee site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ detụ ọnwụ ire maka mmadụ niile.’ (Hib. 2:9) N’eziokwu, “onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”—Rom 6:23b. w16.07 3:3, 4
Satọdee, Febụwarị 10
M gaje imere ya onye inyeaka.—Jen. 2:18.
Alụmdi na nwunye abụghị ihe ọjọọ. Ịmata otú o si malite na ihe mere e ji malite ya ga-enyere anyị aka ịma otú anyị kwesịrị isi na-ele ya anya, ya abaakwara anyị uru. Mgbe Chineke kechara mmadụ mbụ bụ́ Adam, o mere ka ụmụ anụmanụ na-abịakwute ya ka ọ gụọ ha aha. “Ma mmadụ ahụ enweghị onye inyeaka nke ga-eme ka o zuo ezu.” Ọ bụ ya mere Chineke ji mee ka ezigbo ụra buru Adam, ya ewepụta otu ọgịrịga ya, were ya kpụọ nwaanyị, kpọrọ ya kpọtara Adam. (Jen. 2:20-24) N’ihi ya, ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye. Jizọs kwughachiri ihe Jehova kwuru, nke bụ́: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.” (Mat. 19:4, 5) Otú ahụ Chineke ji ọgịrịga Adam kee Iv kwesịrị ime ka ha abụọ ghọta na ha bụ otu. Jehova achọghị ka a na-agba alụkwaghịm ma ọ bụ na-alụ karịa otu di ma ọ bụ nwunye. w16.08 1:1, 2
Sọnde, Febụwarị 11
[Jizọs] si ebe ahụ gawa izi ihe na ikwusa ozi ọma n’obodo ha dị iche iche.—Mat. 11:1.
Jizọs gwara ndị mmadụ okwu n’otu n’otu banyere Alaeze Chineke. Dị ka ihe atụ, ya na otu nwaanyị kparịtara ụka n’akụkụ olulu mmiri Jekọb dị́ nso n’obodo Saịka. (Jọn 4:5-30) Onye ọzọ ọ gwara okwu bụ Matiu bụ́ ọnaụtụ, onye a kpọkwara Livaị. Baịbụl agwachaghị anyị ihe ha kwurịtara. Ma Jizọs gwara ya ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ ya, ya ekweta. Matiu mechara kpọọ Jizọs na ndị ọzọ ka ha bịa rie nri n’ụlọ ya. N’ebe ahụ, Jizọs gwara ọtụtụ ndị okwu. (Mat. 9:9; Luk 5:27-39) N’oge ọzọ, Jizọs weturu obi gwa Nataniel okwu n’agbanyeghị na Nataniel kwuru ihe na-adịghị mma banyere ndị Nazaret. Ma, ihe Jizọs kwuru mere ka ọ gbanwee ihe o chere. O kpebiri ịmụtakwu ihe Jizọs, bụ́ onye sí Nazaret, na-akụzi. (Jọn 1:46-51) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-akụziri ndị ọhụrụ otú ha ga-esi wetuo obi ma jiri obiọma na-agwa ndị mmadụ okwu. Anyị sí otú a na-enyere ndị ọhụrụ aka, obi ga-adị ha ụtọ ịhụ otú ndị nwere ezi obi si ege ha ntị n’ihi na ha ji obiọma gwa ha okwu ma gosi na ha nwere mmasị n’ebe ha nọ. w16.08 4:7-9
Mọnde, Febụwarị 12
Nwunye ekwesịghị ịhapụ di ya; . . . Di ekwesịghịkwa ịhapụ nwunye ya.—1 Kọr. 7:10, 11.
Ọ na-abụ ụfọdụ di na nwunye see ezigbo okwu, ha ekpebie ịgbasa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm. Mmadụ ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya abụghị ihe egwuregwu. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị ka ọ̀ ga-eme ka nsogbu kwụsị, ma ọ na-akpatakarị nsogbu ndị ọzọ. Mgbe Jizọs kwughachiri ihe Chineke kwuru gbasara mmadụ ịhapụ nna ya na nne ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya, ọ sịrị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mat. 19:3-6; Jen. 2:24) Ọ pụtakwara na di ma ọ bụ nwunye ekwesịghị ‘ịtọsa ihe Chineke kekọtara.’ Jehova chọrọ ka di na nwunye biri n’oge niile ha dị ndụ. (1 Kọr. 7:39) Ọ bụrụ na ha ana-echeta na onye ọ bụla ga-aza Jehova ajụjụ maka ihe o mere, ha ga na-agbalịsi ike idozi ihe ọ bụla seere ha tupu ihe aka njọ. w16.08 2:10, 11
Tuzdee, Febụwarị 13
Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị.—Rom 12:21.
Ndị iro anyị nwere ike ịlụso anyị ọgụ mgbe anyị na-atụghị anya ya ma ọ bụ mgbe ọ dị ka ike ọ̀ gwụwala anyị. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” Otú a Baịbụl sịrị anyị ‘ekwela ka ihe ọjọọ merie anyị’ gosiri na anyị ga-emerili ihe ọjọọ. Otú anyị ga-esi emeri ya bụ ịna-alụso ya ọgụ. Ma, ọ bụrụ na anyị echefuo onwe anyị ma kwụsị ịgbasi mgba ike, Setan, ụwa ọjọọ ya, na anụ ahụ́ anyị na-ezughị okè nwere ike imeri anyị. Ekwela ka Setan menye gị ụjọ, gị adaa mbà ma chịliere ya aka elu. (1 Pita 5:9) Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri na mgba a anyị na-agba, anyị ekwesịghị ichefu ihe mere anyị ji na-agba ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị́ Chineke mma, chọọkwa ka ọ gọzie anyị, anyị kwesịrị ịna-echeta ihe e kwuru ná Ndị Hibru 11:6. Ebe ahụ sịrị: “Onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” Ịchọsi Jehova ike pụtara na anyị ga na-agba ezigbo mbọ.—Ọrụ 15:17. w16.09 2:4, 5
Wenezdee, Febụwarị 14
Na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.—1 Kọr. 10:31.
Baịbụl nyere anyị ezigbo ndụmọdụ ga-enyere anyị aka ịna-ekpebi ihe ga-eme ka e too Chineke. Ma, ọ bụ anyị ga-ekpebi ụdị uwe anyị ga na-eyi. Nke dị́ anyị mma na nke aka anyị ruru nwere ike ịdị iche na nke ndị ọzọ. Ma, uwe anyị kwesịrị ịna-adị ọcha mgbe niile, dị́ mma n’anya, kwesịkwa ihe anyị gara. O kwesịrị ịbụ nke a na-anaghị ele anya ọjọọ n’ebe anyị bi. Anyị ma na ọ naghị adị mfe mgbe niile inweta uwe dị́ mma n’anya, nke na-enweghị ọrụ. Ihe a na-ahụ n’ọtụtụ ebe a na-ere efe bụ naanị uwe na-ewu ewu. N’ihi ya, ịchọta uwe dị́ mma n’anya, nke na-agaghị atapara n’ahụ́ nwere ike iwe oge. Ọ dịghịkwa mfe. Ma, ụmụnna anyị nwere ike ịmata na anyị na-agba mbọ inweta efe mara mma ma kwesị ekwesị, obi ga-adịkwa ha ụtọ maka ya. Obi ụtọ anyị na-enwe maka ime ka e too Nna anyị nke eluigwe karịrị mbọ ọ bụla anyị na-agba iji ejiji ga-eme ka e too ya. w16.09 3:15, 16
Tọzdee, Febụwarị 15
Ọ na-esetị ebe ugwu n’elu ebe tọgbọrọ chakoo, ọ dịghịkwa ihe o kokwasịrị ụwa na ya.—Job 26:7.
Ụmụaka na-ejikarị uche ha ahụ ihe a na-akọrọ ha. N’ihi ya, ndị nne na nna, jirinụ ihe atụ na-akụziri ụmụ unu ihe. I nwekwara ike iji ihe atụ kụziere nwa gị na ihe ọ bụla Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, gị na ya gụọ ihe a e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Olee otú ị ga-esi gosi na ọ bụ Jehova mere ka e dee amaokwu Baịbụl a? I nwere ike ikwu ya hoo haa. Kama ime otú ahụ, nyere nwa gị aka iche echiche. Gwa ya na n’oge Job, e chewebeghị echiche imepụta rọket ma ọ bụ onyokomita e ji ahụ ihe dị na mbara igwe. I nwere ike ịgwa nwa gị ka o gosi ihe mere ọ ga-eji siere ụfọdụ ndị ike ikweta na e nweghị ihe e kokwasịrị ụwa n’elu ya n’agbanyeghị na o buru oké ibu. Nwa gị nwere ike iji bọl ma ọ bụ nkume gosi na a tụlie ihe ọ bụla dịtụ arọ elu, ọ ga-adarịrị n’ala. Ihe ahụ o mere ga-eme ka ọ ghọta na ihe ahụ Jehova kwuru na Baịbụl ọtụtụ afọ tupu ndị mmadụ achọpụta ya bụ eziokwu.—Nehe. 9:6. w16.09 5:9, 12
Fraịdee, Febụwarị 16
Na-enwe okwukwe n’obi gị.—Rom 10:9.
Inwe okwukwe apụtaghị naanị ịghọta ihe bụ́ nzube Chineke, kama ọ pụtakwara na anyị ga-achọsi ike ime uche ya. Mmadụ nwee okwukwe n’onye Chineke ga-esi n’aka ya zọpụta ụmụ mmadụ, onye ahụ ga na-ezi ndị ọzọ ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke, o doro anya na anyị kwesịrị inwe okwukwe ma na-eme ka o sie ike. Okwukwe yiri ihe a kụrụ akụ e kwesịrị ịna-agba mmiri ka o nwee ike na-eto. Ihe a kụrụ akụ adịghị ka ihe a kpụrụ akpụ. Ihe a kụrụ akụ ga-akpọnwụ ma ọ bụrụ na a naghị agba ya mmiri. Otú ahụ ka okwukwe anyị dị. Anyị leghara ya anya, ọ ga-anyụ ka ọkụ. (Luk 22:32; Hib. 3:12) Ma, ọ bụrụ na anyị na-elebara okwukwe anyị anya, ọ ga na-ama pokopoko ka ihe a kụrụ akụ, ‘na-etokwa eto,’ anyị ‘anọgidesiekwa ike n’okwukwe.’—2 Tesa. 1:3; Taị. 2:2. w16.10 4:4, 5
Satọdee, Febụwarị 17
Onyeisi ndị na-eje ozi n’obí eze gbanwere aha ha. Ọ gụrụ Daniel Belteshaza.—Dan. 1:7.
Mgbe a dọọrọ Daniel na ndị enyi ya n’agha laa Babịlọn, ndị Babịlọn gbara mbọ ịmanye ha ka ha mewe omenala ha, kpewekwa okpukpe ha. Olee otú ha si mee ya? Ha kụziiri ha “asụsụ ndị Kaldia,” gụọkwa ha aha ndị Babịlọn. (Dan. 1:3-7) Aha a gụrụ Daniel si n’aha Bel, bụ́ chi ndị Babịlọn kacha efe. Ọ ga-abụ na Eze Nebukadneza chọrọ ime ka Daniel chee na chi ndị Babịlọn ka Jehova, bụ́ Chineke Daniel, ike. (Dan. 4:8) N’agbanyeghị na e nyere Daniel nri pụrụ iche eze na-eri, o “kpebisiri ike n’obi ya” na ọ gaghị ‘emerụ onwe ya.’ (Dan. 1:8) O mere ka okwukwe ya na-esikwu ike n’oge ahụ o bi ná mba ọzọ. Otú o si mee ya bụ ịna-amụ Akwụkwọ Nsọ e dere n’asụsụ Hibru. (Dan. 9:2) N’ihi ya, mgbe ọ nọrọ ihe dị ka afọ iri asaa na Babịlọn, a ka jikwa aha Hibru ya mara ya.—Dan. 5:13. w16.10 2:7, 8
Sọnde, Febụwarị 18
Ebe ọ bụla mmụọ nsọ chọrọ ka ha gaa, ha agaa.—Ezik. 1:20.
Ụfọdụ nwere ike iche na ha ga-ejili aka ha na-akọwa Baịbụl. Ma, ọ bụ naanị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi” ka Jizọs họpụtara ịna-enyeju ndị na-eso ụzọ ya afọ. (Mat. 24:45-47) Kemgbe afọ 1919, Jizọs họpụtara ohu ahụ ka ọ na-enyere ha aka ịghọta Okwu Chineke ma na-eme ihe o kwuru. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru, anyị ga-eme ka ọgbakọ na-adị ọcha, na-adị n’udo, na-adịkwa n’otu. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-erubere ndị Jizọs ji eduzi ndị na-eso ụzọ ya taa isi?’ Okwu Chineke bụ́ Baịbụl gwara anyị na Jehova hazikwara ndị na-efe ya n’eluigwe ahazi. Dị ka ihe atụ, n’ọhụụ e gosiri Ezikiel onye amụma, ọ hụrụ ụgbọ ịnyịnya nọchiri anya nzukọ Chineke n’eluigwe. (Ezik. 1:4-28) Ebe ọ bụ na ọ fọrọ obere ka Jizọs na ndị mmụọ ozi ya dị nsọ bibie ụwa ochie a, nzukọ Jehova na-aga n’ihu n’ike n’ike iji mee ka o doo anya na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị, meekwa ka e doo aha ya nsọ. w16.11 3:9, 10
Mọnde, Febụwarị 19
Ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.—Hib. 10:25.
Anyị na-ezukọ ka anyị mụọ banyere Jehova nakwa ka a gbaa anyị ume otú ahụ ndị mbụ soro ụzọ Jizọs mere. (1 Kọr. 14:31) E kwesịkwara ịna-agba ndị ferela Chineke ọtụtụ afọ ume. Chegodị banyere Jọshụa. O fere Chineke ọtụtụ afọ. Ma, Jehova gwara Mozis ka ọ gbaa ya ume. Ọ sịrị Mozis: “Mee Jọshụa onye ndú, gbaakwa ya ume ma mee ka ọ dị ike, n’ihi na ọ bụ ya ga-ebutere ndị a ụzọ mgbe ha na-agafe, ọ bụkwa ya ga-eme ka ha nweta ala ahụ ị ga-ahụ.” (Diut. 3:27, 28) Nnukwu ọrụ Jọshụa ga-arụ bụ idu ndị Izrel ka ha merie ndị bi n’Ala Nkwa ahụ ma nweta ya. Ọ ga-enwe nsogbu. Ọ dịkarịa ala, a ga-emeri ya otu ugboro. (Jọsh. 7:1-9) Ka a sịkwa ihe mere e ji kwesị ịgba Jọshụa ume, meekwa ka ọ dị ike. N’ihi ya, ka anyị na-agba ndị okenye na ndị nlekọta sekit ume, bụ́ ndị na-agbasi mbọ ike ilekọta atụrụ Chineke.—1 Tesa. 5:12, 13. w16.11 1:12, 13
Tuzdee, Febụwarị 20
M ga-egosi gị ikpe ahụ a mara oké nwaanyị akwụna ahụ nke nọ n’elu ọtụtụ mmiri.—Mkpu. 17:1.
Ndị Mmụta Baịbụl ghọtara na ihe ha kwesịrị ime abụghị naanị ịgwa ndị ikwu na ibe na ndị chọọchị ha na aka ha apụọla n’okpukpe ụgha. Ha kwesịrị ime ka ụwa niile mata na Babịlọn Ukwu ahụ bụ nwaanyị akwụna. N’ihi ya, n’agbata Disemba 1917 na mmalite afọ 1918, Ndị Mmụta Baịbụl dị puku ole na ole n’oge ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi kesaa nde traktị iri, nke isiokwu ya bụ “Babịlọn Adaala.” Traktị ahụ gbara ozizi ụgha Krisendọm n’anwụ. O kwesịghị iju anyị anya na ezigbo iwe were ndị ụkọchukwu. Ma, Ndị Mmụta Baịbụl akwụsịghị ịrụ ọrụ ahụ dị mkpa ha na-arụ. Ha kpebisiri ike ‘ịna-erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.’ (Ọrụ 5:29) Gịnị ka ihe a na-egosi? Ọ na-egosi na Babịlọn Ukwu ahụ adọọrọghị Ndị Kraịst ndị ahụ n’agha mgbe a na-alụ Agha Ụwa Mbụ. Kama, ha si n’okpukpe ụgha na-apụta, na-enyekwara ndị ọzọ aka ime otú ahụ. w16.11 5:2, 4
Wenezdee, Febụwarị 21
Ndị na-eme ihe anụ ahụ́ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe anụ ahụ́, ma ndị na-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ na-atụkwasị uche ha n’ihe mmụọ nsọ.—Rom 8:5.
Ụfọdụ ndị nwere ike iche na ebe ahụ na-ekwu banyere ihe dị iche ná ndị nọ n’ọgbakọ na ndị na-anọghị, ihe dị iche ná ndị bụ́ Ndị Kraịst na ndị na-abụghị. Ma, ndị Pọl degaara akwụkwọ ozi a bụ “ndị nọ na Rom bụ́ ndị Chineke hụrụ n’anya, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nsọ.” (Rom 1:7) N’ihi ya, Pọl na-ekwu banyere ihe dị iche ná Ndị Kraịst na-eme ihe anụ ahụ́ ha chọrọ na ndị na-eme ihe mmụọ nsọ chọrọ. Ihe Pọl kwuru gosiri na e nwere ihe jikọrọ ‘ime ihe dị ka anụ ahụ́ si chọọ’ na “ọchịchọ mmehie” nke ‘nọ na-akpa ike n’ahụ́ ha.’ (Rom 7:5) N’ihi ya, mgbe Pọl kwuru banyere ndị “na-atụkwasị uche ha n’ihe anụ ahụ́,” ọ na-ekwu banyere ndị anụ ahụ́ na-achị ma ọ bụ ndị uche ha niile dị n’ihe na-agụ ha agụụ na ihe ha chọrọ. Ha na-eme ihe ọ bụla batara ha n’obi na ihe ọ bụla gụrụ ha agụụ, ma ọ̀ bụ ihe gbasara mmekọahụ ma ọ bụ ihe ọzọ. w16.12 2:5, 7
Tọzdee, Febụwarị 22
Obi ụtọ na-adịrị onye a gbaghaara nnupụisi ya, onye e kpuchiri mmehie ya.—Ọma 32:1.
Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-echegbu onwe ha maka ihe ndị ha mejọrọ n’oge gara aga. Eze Devid chegburu onwe ya mgbe ụfọdụ banyere ihe ndị o mejọrọ. O kwuru, sị: “Ebigbọwo m n’ihi ịsụ ude nke obi m.” (Ọma 38:3, 4, 8, 18) Gịnị ka Devid kwesịrị ime mgbe ahụ? Gịnị ka o mere? Ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-emere ya ebere ma gbaghara ya. (Ọma 32:2, 3, 5) I nwekwara ike ịna-echegbu onwe gị n’ihi ihe ndị na-eme ugbu a. Dị ka ihe atụ, mgbe Devid na-ede Abụ Ọma nke iri ise na ise, ụjọ nọ na-atụ ya na ọ ga-anwụ. (Ọma 55:2-5) Ma, o kweghị ka nchegbu mee ka ọ kwụsị ịtụkwasị Jehova obi. O kpesiri ekpere ike rịọ Jehova ka o nyere ya aka ná nsogbu ya. Ma, ọ ghọtakwara na ya kwesịrị ime ihe gbasara nsogbu ya. (2 Sam. 15:30-34) Ihe i kwesịrị ịmụta n’ihe a Devid mere bụ na kama ịna-echegbu onwe gị maka nsogbu bịaara gị, mee ihe i nwere ike ime iji dozie ya, tụkwasịkwa Jehova obi na ọ ga-enyere gị aka. w16.12 3:14, 15
Fraịdee, Febụwarị 23
Emehiewo m Jehova.—2 Sam. 12:13.
Devid kwere ka Jehova nyere ya aka ka ya na ya dịkwa ná mma. Otú o si mee ya bụ na ọ nabatara ihe onye amụma Jehova, bụ́ Netan, gwara ya. Ihe ọzọ Devid mere bụ na o kpere ekpere, kwupụtara Chineke mmehie ya, gosikwa n’eziokwu na ọ chọrọ ka ya na Jehova dịghachi ná mma. (Ọma 51:1-17) Devid ekweghị ka obi na-ama ya ikpe mee ka ike gwụ ya. Kama, ọ mụtara ihe n’ihe o mejọrọ. N’eziokwu, o meghịkwa mmehie ndị ahụ dị oké njọ ọzọ. Ya na Chineke dịgidere ná mma ruo mgbe ọ nwụrụ ka ọtụtụ afọ gachara. Jehova ka na-echetakwa ya ka onye guzosiri ike n’ebe ọ nọ. (Hib. 11:32-34) Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Devid? Ọ bụrụ na anyị emee mmehie dị oké njọ, anyị kwesịrị iji obi anyị niile chegharịa, rịọkwa Jehova ka ọ gbaghara anyị. Anyị ga-ekwupụtarịrị mmehie anyị. (1 Jọn 1:9) Anyị kwesịkwara ịgakwuru ndị okenye, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ka anyị na Jehova dịkwa ná mma. (Jems 5:14-16.) Ọ bụrụ na anyị anabata aka Jehova na-enyere anyị, anyị na-egosi na obi siri anyị ike na ọ ga-agwọ anyị otú o kwere ná nkwa, gbagharakwa anyị. N’ihi ya, ka anyị gbaa mbọ mụta ihe n’ihe mere anyị, nọgide na-ejere Jehova ozi, nweekwa obi ike na ihe ga-adịrị anyị mma ọdinihu.—Hib. 12:12, 13. w17.01 1:13, 14
Satọdee, Febụwarị 24
Ekwela ka ohu gị mee omume mpako.—Ọma 19:13.
Olee omume ndị bụ́ omume mpako? Ọ bụrụ na mmadụ akaa anya mee ihe a na-enyeghị ya ikike ime, o meela omume mpako. Mgbe ụfọdụ, anyị niile na-eme omume mpako n’ihi na anyị ezughị okè. Ma, ọ bụrụ na anyị na-emekarị ihe na-erughịrị anyị, otú ahụ Eze Sọl mere, ka oge na-aga, ihe anyị ga na-ewe Chineke iwe. Abụ Ọma 119:21 kwuru na Jehova ‘na-abara ndị mpako mba.’ Gịnị mere Jehova ji abara ha mba? Mmadụ ime ihe na-erughịrị ya jọgbudịrị onwe ya karịa mmadụ imehie ihe n’amaghị ama. Otu ihe mere o ji jọgbuo onwe ya bụ na onye na-eme otú a anaghị ewere Jehova ka onye kwesịrị ịchị ya. Nke abụọ bụ na ọ bụrụ na anyị emee ihe na-erughịrị anyị, anyị na ndị ọzọ nwere ike ise okwu. (Ilu 13:10) Nke atọ bụ na anyị nwere ike imenye onwe anyị ihere, ma ọ bụkwanụ a chịwa anyị ọchị, ma ọ bụrụ na a mata na anyị mere ihe anyị na-ekwesịghị ime. (Luk 14:8, 9) O nweghị mgbe mmadụ ịrụ ọrụ na-erughịrị ya na-arụpụta ezigbo ihe. Ọ kacha mma ịdị umeala n’obi otú ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru. w17.01 3:4, 5
Sọnde, Febụwarị 25
Ha onwe ha emewo omume na-eweta mbibi; ha abụghị ụmụ ya, ọ bụ ha nwere ntụpọ.—Diut. 32:5.
Ebe Adam na-ezukwaghị okè, o nweghịzi ike iṅomi àgwà Chineke n’emehieghị. Ọ bụghị naanị na ọ tụfuru ihe magburu onwe ya ọ gaara enweta n’ọdịnihu, kama o bufeere ụmụ ya ezughị okè, mmehie, na ọnwụ. (Rom 5:12) O mere ka ụmụ ya ghara inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ihe ọzọ bụ na Adam na Iv enweghịzi ike ịmụta nwa zuru okè. E nweghịkwa nwa ha ga-amụtali nwa zuru okè. Kemgbe Setan bụ́ Ekwensu mechara ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi, ọ ka na-eduhie ụmụ mmadụ ruo n’oge anyị a. (Jọn 8:44) Ma, Chineke ka hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. N’agbanyeghị na Adam na Iv nupụụrụ ya isi, ọ chọrọ ka ya na ụmụ mmadụ dịrị ná mma. Ọ chọghị ka onye ọ bụla nwụọ. (2 Pita 3:9) N’ihi ya, ozugbo Adam na Iv nupụchaara ya isi, o mere ndokwa ka ya na ụmụ mmadụ nwee ike ịdịkwa ná mma n’emebighị iwu ya ziri ezi.—Jọn 3:16. w17.02 1:12-14
Mọnde, Febụwarị 26
Ndị na-agba izu na-enwe amamihe.—Ilu 13:10.
Ihe ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi bụ ma anyị ghọta ihe bụ́ ọrụ anyị n’ọgbakọ Jehova, na-elekwasịkwa anya n’ebe ndị ọzọ na-eme nke ọma. Kama ịchọwa ka a hụchata anyị, ma ọ bụkwanụ chọwa ịna-atụrụ ndị ọzọ ihe ha ga-eme, anyị ga-eji obi umeala na-ajụ ha ma hà nwere ndụmọdụ ha ga-enye anyị, na-emekwa ihe ha gwara anyị. Anyị ga-eso ha na-aṅụrị ọṅụ ma e nye ha ọrụ pụrụ iche. Anyị ga na-etokwa Jehova ka anyị na-ahụ otú o si na-agọzi “ụmụnna [anyị] niile ndị nọ n’ụwa.” (1 Pita 5:9) Ihe ọzọ bụ na anyị ga-enwe ike ikpebi ime ihe ndị ga-amasị Jehova ma ọ bụrụ na anyị amụta ịna-ele ihe anya otú o si ele ya. Ọ bụrụ na anyị ana-amụchi ihe anya, na-ekpe ekpere ma na-eme ihe anyị mụtara, ọ ga-eme ka anyị jiri nwayọọ nwayọọ zụọ akọnuche anyị nke ọma. (1 Tim. 1:5) Anyị ga-amụta ịna-ebute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. Anyị mee ike anyị, Jehova kwere nkwa na ya ‘ga-enyesị anyị ọzụzụ,’ nke ga-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi, na-emekwa ka ya.—1 Pita 5:10. w17.01 4:17, 18
Tuzdee, Febụwarị 27
Ka a gụọ ndị okenye bụ́ ndị na-arụ ọrụ nlekọta n’ụzọ dị mma ná ndị ruru eru inweta nsọpụrụ okpukpu abụọ, karịsịa, ndị na-arụsi ọrụ ike n’ikwu okwu na izi ihe.—1 Tim. 5:17.
Ụmụnna anyị so ná ndị anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ma na-akwanyere ùgwù, nke ka nke, ndị okenye ọgbakọ. Anyị na-asọpụrụ ha n’agbanyeghị obodo ha si, ebe ha gụruru akwụkwọ, ma ọ bụ otú ha nweruru ego. Baịbụl sịrị na ha bụ “onyinye n’ụdị mmadụ” nakwa na ha so ná ndị Chineke si n’aka ha na-elekọta ndị na-efe ya. (Efe. 4:8) Chegodị gbasara ndị okenye ọgbakọ, ndị nlekọta sekit, ndị so na Kọmitii Alaka na ndị so n’Òtù Na-achị Isi. Ụmụnna anyị n’oge ndịozi Jizọs na-asọpụrụ ndị Chineke họpụtara ka ha na-edu ha. Otú ahụ ka anyị na-emekwa taa. Anyị anaghị efe ndị a ma ama na-anọchite anya ọgbakọ Ndị Kraịst ma ọ bụ na-eme ha ka hà bụ ndị mmụọ ozi. Ma anyị na-asọpụrụ ha, na-akwanyekwara ha ùgwù maka otú ha si arụsi ọrụ ike na otú ha si dị umeala n’obi.—2 Kọr. 1:24; Mkpu. 19:10. w17.03 1:13
Wenezdee, Febụwarị 28
Gịnị mere i ji akpọ m ezi onye? Ọ dịghị onye bụ́ ezi onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.—Mak 10:18.
Jizọs emetụdịghị ka Herọd Agrịpa nke Mbụ, bụ́ onye mechara ghọọ eze Juda. N’otu ememme pụrụ iche, Herọd “yiiri uwe onye eze.” Mgbe ìgwè mmadụ hụrụ ya ma nụ olu ya, ha tiri mkpu, sị: “Ọ bụ olu chi, ọ bụghị olu mmadụ!” O doro anya na obi tọgburu Herọd atọgbu maka otú ha si too ya. Ma, “mmụọ ozi Jehova tiri ya ihe ozugbo, n’ihi na o nyeghị Chineke otuto ahụ; ikpuru tagburu ya, o wee kubie ume.” (Ọrụ 12:21-23) Ò nwere onye na-ekwu eziokwu ga-ahụcha ihe ahụ merenụ, ya asị na Herọd bụ onye Jehova họọrọ ịbụ onye ndú? Ma, Jizọs mere ka o doo ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ Chineke họpụtara ya. O toro Jehova mgbe niile, mee ka a ghọta na ọ bụ Chineke na-edu ndị ya. Jizọs agaghị abụ Onye Ndú naanị afọ ole na ole. Mgbe o si n’ọnwụ bilie, o kwuru, sị: “E nyewo m ikike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Ọ sịkwara: “Lee! m nọnyeere unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.”—Mat. 28:18-20. w17.02 3:20, 21