Mach
Sọnde, Mach 1
Ọ bụkwa gị na-achị ihe niile.—1 Ihe. 29:12.
Anyị gụwa isi nke mbụ na isi nke abụọ n’akwụkwọ Jenesis, anyị ga-achọpụta na Adam na Iv nweere onwe ha, bụ́ ụdị nnwere onwe ndị mmadụ na-achọ ka ha nweta taa. O nweghị ihe kọrọ ha, o nweghị ihe ha na-atụ ụjọ ya, o nweghịkwa onye na-emegbu ha. Adam na Iv anatụdịghị echegbu onwe ha maka nri, ọrụ, ọrịa ma ọ bụkwanụ ọnwụ. (Jen. 1:27-29; 2:8, 9, 15) Anyị kwesịrị iburu n’obi na ọ bụ naanị Jehova Chineke nwere ikike ime ihe ọ bụla masịrị ya. Maka gịnị? Maka na ọ bụ ya kere ihe niile, bụrụkwa Ọkaakaa eluigwe na ụwa. (1 Tim. 1:17; Mkpu. 4:11) Ma, ihe niile e kere eke n’eluigwe nakwa n’ụwa nweere onwe ha ime ihe ụfọdụ. Ha kwesịrị icheta na ọ bụ naanị Jehova Chineke nwere ikike inye iwu ndị kwesịrị ekwesị. Ihe a ka Jehova Chineke mere mgbe o kere mmadụ. w18.04 4 ¶4, 6
Mọnde, Mach 2
Lee ka o si maa mma . . . bụ́ ụkwụ nke onye na-eweta ozi ọma.—Aịza. 52:7.
Anyị na-edi nsogbu n’ụwa ochie a n’ihi na Jehova na-enyere anyị aka. (2 Kọr. 4:7, 8) Ma, chegodị banyere ndị ha na Chineke na-abụghị enyi. Ọ ga-esiri ha ezigbo ike ibi n’ụwa a ma ọ bụrụ na o nyereghị ha aka. Anyị na-enwere ha ọmịiko ka Jizọs ma na-ezi ha “ozi ọma nke ihe ka mma.” N’ihi ya, na-enwere ndị ị na-ezi ozi ọma ndidi. Cheta na o nwere ike ịbụ na ha echetụbeghị banyere ụfọdụ eziokwu Baịbụl anyị ma nke ọma. Ọtụtụ ejighị ihe ndị ha kweere egwu egwu. Ha nwere ike ịna-ewere ya na ihe ndị ha kweere n’okpukpe ha na-eme ka ha na ndị ezinụlọ ha na ndị bi n’ebe ha bi dịrị n’otu. Tupu anyị agwa ha ka ha hapụ ihe ochie ndị ha kweere ha na-anaghị eji egwu egwu, anyị nwere ike ibu ụzọ nyere ha aka ịmata eziokwu Baịbụl ha na-amaghị ma jiri ha kpọrọ ihe. Ọ bụzi mgbe ahụ ka ha ga-ahapụ ihe ochie ndị ahụ ha kweere. O nwere ike iwe oge tupu anyị enyere ndị mmadụ aka ime ụdị mgbanwe ndị ahụ.—Rom 12:2. w19.03 23 ¶10, 12; 24 ¶13
Tuzdee, Mach 3
Ihe gị masịrị m.—Mak 1:11.
Otú Jehova si gwa Ọkpara ya na ọ hụrụ ya n’anya na-eme ka anyị mata na anyị kwesịrị ịna-achọ ohere ndị anyị ga-eji na-aja ndị ọzọ mma. (Jọn 5:20) Obi na-atọgbu anyị atọgbu ma onye anyị hụrụ n’anya gosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya ma jaa anyị mma maka ihe ọma anyị mere. Anyị kwesịkwara ịna-ahụ ụmụnna anyị na ndị ezinụlọ anyị n’anya ma na-agbakwa ha ume. Ọ bụrụ na anyị ajaa ndị ọzọ mma, ọ ga-eme ka okwukwe ha sikwuo ike, meekwa ka ha jiri obi ha niile na-efe Chineke. Ndị nne na nna kwesịrị ịna-agba ụmụ ha ume. Ọ bụrụ na ndị nne na nna ejiri obi ha niile na-aja ụmụ ha mma ma gosi na ha hụrụ ha n’anya, ụmụ ha ga na-eme nke ọma. Ihe a Jehova gwara Jizọs, ya bụ, “ihe gị masịrị m” gosiri na obi siri ya ike na Jizọs ga-eme uche Nna ya. Ebe ọ bụ na obi siri Jehova ike na Ọkpara ya ga-eme uche ya, obi kwesịkwara isi anyị ike na Jizọs ga-emezu ihe niile Jehova kwere anyị ná nkwa. (2 Kọr. 1:20) Ọ bụrụ na anyị echebara ihe Jizọs mere echiche, ọ ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịmụta ihe n’aka ya ma na-eṅomi ya. Obi sikwara Jehova ike na ndị ohu ya ga na-amụta ihe n’aka Ọkpara ya.—1 Pita 2:21. w19.03 8 ¶3; 9 ¶5-6
Wenezdee, Mach 4
Iwu nke mmụọ nsọ ahụ nke na-enye ndụ n’ime Kraịst Jizọs emewo ka i si n’iwu nke mmehie na nke ọnwụ pụọ nwere onwe gị.—Rom 8:2.
Ọ bụrụ na mmadụ enye anyị onyinye dị oké ọnụ ahịa, anyị na-egosi onye ahụ na obi na-atọ anyị ụtọ maka ya. Ụmụ Izrel egosighị na obi dị ha ụtọ maka otú Jehova si mee ka ha nwere onwe ha mgbe ọ kpọpụtara ha n’ohu ha na-agbara ndị Ijipt. N’ime ọnwa ole na ole a kpọpụtara ha n’Ijipt, ihe ndị ha na-eri na ihe ndị ha na-aṅụ n’Ijipt malitere ịgụ ha agụụ, ha emewe mkpesa maka nri Jehova na-enye ha, mechaadị chọwa ịlaghachi Ijipt. Legodịnụ, ‘azụ̀, kukumba, wọtamelọn, lik, yabaasị na galik’ dị ha mkpa karịa nnwere onwe Jehova mere ka ha nwee iji fee ya. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji weso ha ezigbo iwe. (Ọnụ Ọgụ. 11:5, 6, 10; 14:3, 4) Ihe a na-akụziri anyị ezigbo ihe. Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị na ebe ọ bụ na Chineke esila n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst mee ka ha nwere onwe ha, ha kwesịrị iji nnwere onwe a kpọrọ ihe.—2 Kọr. 6:1. w18.04 9-10 ¶6-7
Tọzdee, Mach 5
Ọ hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya. Ụwa jupụtara n’obiọma Jehova.—Ọma 33:5.
Anyị niile chọrọ ka a hụ anyị n’anya, chọọkwa ka a na-emeso anyị ihe otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na a na-emegbukarị anyị ma ọ bụ ghara ịhụ anyị n’anya, o nwere ike ịdị anyị ka anyị abaghị uru. Jehova ma na anyị chọrọ ka a na-ahụ anyị n’anya ma ghara ịna-emegbu anyị. (Ọma 33:5) Obi kwesịrị isi anyị ike na Chineke anyị hụrụ anyị n’anya nke ukwuu ma chọọ ka a ghara ịna-emegbu anyị. Anyị tụlee Iwu Jehova si n’aka Mozis nye ụmụ Izrel, anyị ga-achọpụta na nke a bụ eziokwu. Ka anyị na-amụ gbasara Iwu Mozis, anyị ga-achọpụta otú obi na-adị Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova. (Rom 13:8-10) Anyị nwere ike ịchọpụta na ihe mere Jehova ji nye ndị Izrel iwu ndị ahụ bụ na ọ hụrụ ha n’anya, n’ihi na ọ bụ ịhụnanya mere o ji eme ihe niile ọ na-eme. (1 Jọn 4:8) E nwere iwu abụọ dị mkpa Iwu ahụ niile dabeere na ha. Ha bụ ịhụ Chineke n’anya na ịhụ onye agbata obi anyị n’anya. (Lev. 19:18; Diut. 6:5; Mat. 22:36-40) Nke ọ bụla n’ime narị iwu isii ahụ ma ọ bụ karịa e nyere ndị Izrel nwere ihe ọ na-akụziri anyị banyere otú Jehova si hụ anyị n’anya. w19.02 20-21 ¶1-4
Fraịdee, Mach 6
N’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.—Mat. 6:21.
Job kpachapụrụ anya n’otú o si kpaso ụmụ nwaanyị àgwà. (Job 31:1) Ọ ma na inwe mmasị n’ebe nwaanyị ọzọ nọ adịghị mma. Taa, ụwa anyị bi na ya na-eji ihe dị iche iche anwa anyị ka anyị chọwa inwe mmekọahụ. Dị ka Job, ànyị ga-ajụ inwewe mmasị n’ebe nwunye onye ọzọ nọ? Ànyị ga-ajụkwa ile foto ndị gba ọtọ ebe ọ bụla anyị hụrụ ha? (Mat. 5:28) Ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ na-ejide onwe anyị kwa ụbọchị, ọ ga-emekwu ka anyị na-ekwesị ntụkwasị obi. Otú Job si lee ihe onwunwe anya mekwara ka o rubere Chineke isi. Ọ ghọtara na ọ bụrụ na ya atụkwasị ihe onwunwe obi, na ya ga-eme ihe jọgburu onwe ya e kwesịrị iji maka ya taa ya ahụhụ. (Job 31:24, 25, 28) Taa, anyị bi n’ụwa ebe ihe onwunwe na-agba ndị mmadụ ara. Ọ bụrụ na anyị emee ihe Baịbụl kwuru gbasara ego na ihe onwunwe, ọ ga-eme ka anyị kpebisikwuo ike ịna-ekwesị ntụkwasị obi.—Ilu 30:8, 9; Mat. 6:19, 20. w19.02 6 ¶13-14
Satọdee, Mach 7
Dị nnọọ ka Nna m hụrụ m n’anya, mụ onwe m [hụkwara] unu n’anya.—Jọn 15:9.
Jizọs gosiri na ya hụrụ anyị n’anya ka Jehova n’ihe niile o mere. (1 Jọn 4:8-10) Nke kachanụ bụ na Jizọs ji obi ya niile nwụọ maka anyị. Ma ànyị bụ ndị e tere mmanụ ma ọ bụ “atụrụ ọzọ,” ịhụnanya Jehova na Ọkpara ya nwere n’ebe anyị nọ baara anyị uru n’ihi àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ. (Jọn 10:16; 1 Jọn 2:2) Cheekwa banyere achịcha na mmanya ahụ e ji mee Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha gosiri na Jizọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya ma na-eche banyere ha. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Jizọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ na ya hụrụ ha n’anya. Otú o si mee ya bụ na o ji ihe ole na ole malite Ncheta Ọnwụ ya ka ha hụ otú o si mee ya. Ka oge na-aga, ha kwesịrị ịna-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ, n’agbanyeghị ọnọdụ ha nọ na ya, ma n’ụlọ mkpọrọ. (Mkpu. 2:10) Hà merenụ ihe Jizọs gwara ha na-eme? À na-ajụkwa ajụ? Malite n’oge ndịozi Jizọs ruo taa, ezigbo Ndị Kraịst na-agba mbọ na-echeta ọnwụ Jizọs. w19.01 24 ¶13-15
Sọnde, Mach 8
Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.—Jọn 8:32.
Anyị na-ekele Jehova na anyị enwerela onwe anyị n’okpukpe ụgha, amaghị ihe Baịbụl kwuru, na nkwenkwe ụgha. N’ọdịnihu, anyị ga-enweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:21) I nwere ike irite uru ná nnwere onwe ahụ ugbu a ma ọ bụrụ na ị ‘nọgide n’okwu’ Kraịst ma ọ bụ n’ihe ndị ọ kụziri. (Jọn 8:31) I mee otú ahụ, ị “ga-amarakwa eziokwu ahụ,” ọ bụghị naanị na ị ga na-amụ gbasara ya, kama, ị ga na-emekwa ya eme. N’ụwa ochie a, ihe ndị mmadụ na-ewere ka ikpori ndụ anaghị adịte aka. Anyị amaghịkwa ihe echi ga-abụ. (Jems 4:13, 14) Ihe kacha mma anyị ga-eme ugbu a bụ ịnọsi ike n’ụzọ ahụ na-eduga ná “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie,” ya bụ, ndụ ebighị ebi. (1 Tim. 6:19) Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke anaghị amanye anyị ife ya. Ọ bụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme. Mee Jehova “òkè” gị. (Ọma 16:5) Jiri ‘ihe ọma’ niile o meere gị kpọrọ ihe. (Ọma 103:5) Nweekwa okwukwe na ọ ga-eme ka ‘ị ṅụrịjuo ọṅụ afọ . . . ruo mgbe ebighị ebi.’—Ọma 16:11. w18.12 28 ¶19, 21
Mọnde, Mach 9
Di ekwesịghịkwa ịhapụ nwunye ya.—1 Kọr. 7:11.
Ndị Kraịst niile kwesịrị ịgba mbọ na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù ka Jizọs na Jehova. Ma, ụfọdụ nwere ike ha agaghị eme otú ahụ, n’ihi na anyị ezughị okè. (Rom 7:18-23) N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya na ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge ndịozi nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye ha. Pọl kwuru na “nwunye ekwesịghị ịhapụ di ya.” Ma, ụdị ihe a mere mgbe ụfọdụ. (1 Kọr.7:10) Pọl ekwughị ihe mere ndị di na nwunye ahụ ji hapụ ibe ha. Dị ka ihe atụ, ihe kpatara ya abụghị na di na-akwa iko, ya emee ka nwunye ya nwee ihe o nwere ike iji gbaa ya alụkwaghịm ma lụọ onye ọzọ. Pọl kwuru na nwaanyị nke hapụrụ di ya kwesịrị ‘ịnọrọ n’alụghị di, ma ọ́ bụghị otú ahụ, ka ya na di ya kpezie.’ N’ihi ya, ha abụọ ka bụ di na nwunye n’anya Chineke. Pọl kwukwara na n’agbanyeghị ihe na-esere ha okwu, ọ bụrụ na otu n’ime ha akwaghị iko, ha kwesịrị ịgbalị kpezie. Ha abụọ nwere ike ịgwa ndị okenye ka ha jiri Baịbụl nyere ha aka. w18.12 13 ¶14-15
Tuzdee, Mach 10
Burunụ ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.—Mat. 6:33.
Taa, uche Chineke maka ndị ya bụ ka ha na ya bụrụ enyi, nakwa ka ha jiri ike ha niile jeere ya ozi. (Mat. 28:19, 20; Jems 4:8) Ụfọdụ ndị anyị na ha dị ná mma nwere ike ịgwa anyị ihe ga-eme ka anyị ghara ime ihe ndị a Chineke chọrọ. Dị ka ihe atụ, onye were gị n’ọrụ nwere ike ịchọ ibuli gị n’ọkwá, nke ga-eme ka ụgwọ ọnwa gị gbagota. Mana, ihe a nwere ike ime ka ị lawa azụ n’ọgbakọ. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na ị bụ nwa akwụkwọ, were ya na e nyere gị ohere ịga gụkwuo akwụkwọ n’ebe ọzọ. Mana, ọ ga-eme ka i si n’ụlọ unu kwaga ebe ahụ. Ọ̀ bụ mgbe ahụ ka ị ga-amalite kpewe ekpere, mewe nchọnchọ, gwawa ndị ọzọ, tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme? Ọ́ gaghị aka mma ka ị mata ihe bụ́ echiche Jehova n’ihe ndị a ugbu a ma mee ka echiche gị na ya bụrụ otu? Ọ bụrụzie na ụdị ihe ahụ adapụta, ọ gaghị abụrụ gị ọnwụnwa. I kpebie ihe ndị ị ga-eme n’ozi Jehova, uche gị adịrịkwa na ha mgbe niile, ọ ga-adịrị gị mfe ime ihe ndị ahụ i kpebiri. w18.11 27 ¶18
Wenezdee, Mach 11
Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị.—Ilu 4:23.
Sọlọmọn ghọrọ eze Izrel mgbe ọ bụ okorobịa. N’oge ọ malitere ịchị, Jehova gwara ya okwu ná nrọ, sị: “Rịọ ihe m ga-enye gị.” Sọlọmọn gwara ya, sị: “M ka bụkwa nwata. Amaghị m otú e si apụ apụ, amaghịkwa m otú e si abata abata. . . . Nye ohu gị obi na-erube isi iji kpee ndị gị ikpe.” (1 Eze 3:5-10) Ihe a Sọlọmọn rịọrọ Jehova, ya bụ, ka o nye ya “obi na-erube isi,” gosiri na ọ dị umeala n’obi. Ka a sịkwa ihe mere Jehova ji hụ ya n’anya. (2 Sam. 12:24) Ihe a Sọlọmọn zara Jehova tọrọ Chineke anyị ụtọ nke na o nyere ya “obi nwere amamihe na nke na-aghọta ihe.” (1 Eze 3:12) Jehova gọziri Sọlọmọn mmaji kwuru mmaji n’oge niile ọ nọ na-efe ya. Ọ rụrụ ụlọ nsọ maka “aha Jehova bụ́ Chineke Izrel.” (1 Eze 8:20) Ọ ghọrọ onye a ma ama n’ihi amamihe Chineke nyere ya. E dere ihe ndị o ji ike mmụọ nsọ Chineke kwuo n’akwụkwọ atọ dị na Baịbụl. Otu n’ime ha bụ akwụkwọ Ilu. w19.01 14 ¶1-2
Tọzdee, Mach 12
Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.—Rom 12:2.
Ụfọdụ ndị achọtụdịghị ka onye ọ bụla na-agwa ha ihe ha ga-eme. Ha na-asịkarị, “Ọ bụ mụnwa nwe onwe m.” Ọ ga-abụ na ha na-ekwu na ọ bụ hanwa na-ekpebiri onwe ha ihe, nakwa na ọ dịghị njọ ime otú ahụ. Ha achọghị ka mmadụ na-atụrụ ha ụka ma ọ bụ manye ha ime ka ndị ọzọ. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na iche echiche ka Jehova apụtaghị na anyị agaghịzi enwe ike ikpebiri onwe anyị ihe ma ọ bụ ikwu uche anyị. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 3:17, “ebe ọ bụla mmụọ Jehova dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.” Anyị nweere onwe anyị ịbụ ụdị ndị anyị chọrọ ịbụ na ịhọrọ ihe ndị na-amasị anyị. N’eziokwu, Jehova kere anyị ka anyị dịrị otú ahụ. Ma, ọ pụtaghị na anyị ga-emewezi ihe ọ bụla masịrị anyị. (1 Pita 2:16) A bịa n’okwu gbasara ikpebi ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, Jehova chọrọ ka anyị soro echiche nke ya na ihe Okwu ya kwuru. w18.11 19 ¶5-6
Fraịdee, Mach 13
Dimas agbahapụwo m n’ihi na ọ hụrụ usoro ihe dị ugbu a n’anya.—2 Tim. 4:10.
Mgbe mbụ anyị mụtara eziokwu, anyị ghọtara na ife Jehova ka mkpa karịa inweta ihe onwunwe, obi dịkwa anyị ụtọ na anyị hapụrụ ihe ndị ahụ niile n’ihi eziokwu. Ma ka oge na-aga, anyị nwere ike ịna-ahụ ndị ọzọ ka ha na-azụ ngwá elektrọniks ndị ọgbara ọhụrụ ma ọ bụ na-ekpori ndụ n’ihe ndị ọzọ. Anyị nwere ike na-eche na e nwere ihe na-efunahụ anyị. O nwere ike ime ka ihe ndị anyị nwere ghara ịna-eju anyị afọ. Inweta ihe onwunwe nwekwara ike dị anyị mkpa karịa ofufe Chineke. Ihe a na-echetara anyị gbasara Dimas. Otú o si hụ “usoro ihe dị ugbu a n’anya” mere ka ọ hapụ ozi ya na Pọl onyeozi na-eje. Gịnị mere o ji hapụ Pọl? Ma ọ̀ hụrụ ihe onwunwe n’anya karịa ịna-ejere Jehova ozi ma ọ̀ bụ na ọ chọghịzi ịhapụ ihe ụfọdụ ka ya na Pọl nwee ike ịna-eje ozi, Baịbụl agwaghị anyị. O doro anya na anyị achọghị ka anyị nwewekwa mmasị n’inweta ihe onwunwe, ma kwere ka ha mee ka anyị gharazie iji eziokwu kpọrọ ihe. w18.11 10 ¶9
Satọdee, Mach 14
Unu agaghị anwụ ma ọlị.—Jen. 3:4.
Ụgha ahụ Ekwensu ghaara Iv gosiri na Ekwensu dị obi ọjọọ. O doro ya anya na Iv kweta ihe o kwuru ma rie mkpụrụ osisi ahụ na ọ ga-anwụ. Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi ma mechaa nwụọ. (Jen. 3:6; 5:5) Ihe ọzọ bụ na mmehie a Adam mere mere ka ‘ọnwụ gbasaa ruo mmadụ niile.’ Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na “ọnwụ chịrị dị ka eze . . . , ọbụna chịa ndị na-emeghị mmehie nke yiri mmebi iwu Adam.” (Rom 5:12, 14) Ọ bụ ya mere na anyị ezughị okè, anyị anaghịkwa adị ndụ ebighị ebi bụ́ ihe Chineke bu n’obi kee anyị. Kama, anyị na-ebi naanị ihe dị ka ‘afọ iri asaa, ọ bụrụkwa na anyị enwee ike pụrụ iche, anyị na-adị afọ iri asatọ,’ ndụ anyị ‘jupụtakwara ná nsogbu na ihe ọjọọ.’ (Ọma 90:10) Ihe a niile mere n’ihi ụgha ahụ Ekwensu ghara. Jizọs kwuru banyere Ekwensu, sị: “O guzosighịkwa ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya.” (Jọn 8:44) Setan agbanwebeghị, n’ihi na ọ ka ji ụgha ya “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpu. 12:9) Anyị achọghị ka Setan duhie anyị. w18.10 6-7 ¶1-4
Sọnde, Mach 15
Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eme udo, n’ihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.—Mat. 5:9.
Ndị na-agbalị ka ha na-eme udo na-enwe obi ụtọ. Jems onye na-eso ụzọ Jizọs kwuru, sị: “A na-aghakwa mkpụrụ nke ezi omume n’ebe udo dị maka ndị na-eme udo.” (Jems 3:18) E nwee onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ nwanna anyị na ya nwere nghọtahie, anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka ime udo. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-enye anyị mmụọ ya nke ga-eme ka anyị na-akpa àgwà ka Ndị Kraịst ma na-enwe obi ụtọ. Jizọs kwuru na ọ dị mkpa ka anyị na-ebute ụzọ n’ime udo. Ọ sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà, i wee nọrọ n’ebe ahụ cheta na obi adịghị nwanne gị mma n’ebe ị nọ, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà gawa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ị bịaghachikwara, nye onyinye gị.”—Mat. 5:23, 24. w18.09 21 ¶17
Mọnde, Mach 16
Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya.—Jọn 13:34.
N’abalị ikpeazụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ, o kwuru banyere ịhụnanya ihe fọrọ obere ka o ruo ugboro iri atọ. Jizọs kwuru hoo haa na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ‘ịhụrịta ibe ha n’anya.’ (Jọn 15:12, 17) Otú ha si hụ ibe ha n’anya ga-eme ka ndị mmadụ mata na ha bụ ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 13:35) Ịhụnanya a abụghị naanị otú obi na-adị mmadụ. Ọ bụ ezigbo àgwà nke na-eme ka mmadụ na-eme ihe ndị ga-abara ndị ọzọ uru. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya. Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:13, 14) Otú ndị na-efe Jehova taa si hụ ibe ha n’anya ma dịrị n’otu na-eme ka ndị mmadụ mata na ha bụ ndị ohu Chineke. (1 Jọn 3:10, 11) Obi na-atọ anyị ụtọ na ndị ohu Jehova taa hụrụ ibe ha n’anya otú ahụ Jizọs kwuru, n’agbanyeghị obodo ha, agbụrụ ha, asụsụ ha ma ọ bụ otú e si zụlite ha. w18.09 12 ¶1-2
Tuzdee, Mach 17
Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị nke ya mkpa ha, karịsịa, ndị bụ́ ndị ezinụlọ ya, ọ jụwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.—1 Tim. 5:8.
Jehova chọrọ ka ndị ohu ya na-elekọta ndị ezinụlọ ha. Dị ka ihe atụ, i nwere ike na-arụ ọrụ iji nweta ego ị ga-eji na-akpa afọ ezinụlọ gị. Ọtụtụ ndị nne na-anọ n’ụlọ na-elekọta ụmụaka ha. Ụfọdụ ụmụ ndị torola eto nwere ike ịna-elekọta ndị nne na nna ha na-enwezighị ike ilekọta onwe ha. Ọrụ ndị a bara ezigbo uru. Ọ bụrụ na ị na-arụ ụdị ọrụ ndị a, o nwere ike isiri gị ike iwepụta oge jekwuoro Jehova ozi otú ị gaara achọ ijere ya. Ma, nwee obi ike. Obi na-atọ Jehova ụtọ ma ị na-akpa afọ ezinụlọ gị. (1 Kọr. 10:31) Ọ bụrụ na i nweghị ibu ezinụlọ gị na ya na-alụ, ì nwere ike inyere ụmụnna ndị ahụ́ na-adịghị na ndị merela agadi aka, ma ọ bụ nyere ndị nwere mkpa ndị ọzọ aka? Ì nwekwara ike inyere ndị na-elekọta ha aka? Legharịa anya n’ọgbakọ unu ka ị chọpụta ndị e kwesịrị inyere aka. Mgbe ị na-eme ihe ndị a, o nwere ike ịbụ na gị na Jehova na-arụkọ ọrụ ịza mmadụ ekpere.—1 Kọr. 10:24. w18.08 24 ¶3, 5
Wenezdee, Mach 18
Chineke nọnyeere ya. Ọ napụtakwara ya ná mkpagbu ya niile.—Ọrụ 7:9, 10.
Josef dị ihe dị ka afọ iri na asaa mgbe ụmụnne ya rere ya ka ọ gbawa ohu n’ihi anyaụfụ ha nweere ya. Tupu mgbe ahụ, nna Josef hụrụ ya n’anya karịa ụmụnne ya niile. (Jen. 37:2-4, 23-28) N’ime ihe dị ka afọ iri na atọ, Josef gbara ohu n’Ijipt, mechaakwa gaa mkpọrọ. Nna ya Jekọb ọ hụrụ n’anya anọghị ya nso. Olee ihe mere ka Josef ghara ịtụ ụjọ, meekwa ka obi ghara ịjọ ya njọ? Mgbe Josef nọ na-ata ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ, ọ ga-abụ na ọ na-eche ihe ndị gosiri na Jehova na-agọzi ya. (Jen. 39:21; Ọma 105:17-19) Ọ ga-abụkwa na nrọ ndị ọ rọrọ mgbe ọ na-eto eto mekwara ka obi sie ya ike na Jehova kwụ ya n’azụ. (Jen. 37:5-11) O nwere ike ịbụ na ọ kọọrọ Jehova otú obi dị ya ugboro ugboro. (Ọma 145:18) Jehova zara ekpere ya, mee ka obi sie ya ike na ọ “nọnyeere ya” n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara ya. w18.10 28 ¶3-4
Tọzdee, Mach 19
Onye dara ogbenye ka mmadụ ibe ya na-akpọ asị, ma ndị enyi ọgaranya na-adị ọtụtụ.—Ilu 14:20.
Otú mmadụ si baa ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye nwere ike ikpebi otú anyị si ele onye ahụ anya. Ma, olee otú mmadụ ịba ọgaranya ma ọ bụ ịda ogbenye nwere ike isi mee ka anyị kpebie otú anyị si were onye ahụ? Mmụọ nsọ mere ka Sọlọmọn kwuo ihe e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Olee ihe ilu a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya, anyị nwere ike chọọ imete ụmụnna ndị bụ́ aka ji akụ̀ enyi ma hapụ ndị dara ogbenye. Gịnị mere o ji dị njọ iji otú mmadụ si baa ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye ekpebi otú anyị ga-esi were ya? N’ihi na ọ ga-eme ka nkewa dịrị n’ọgbakọ. Ụdị ihe a mere n’ụfọdụ ọgbakọ n’oge ndịozi. Jems dọkwara Ndị Kraịst aka ná ntị gbasara ya. (Jems 2:1-4) Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ụdị ihe a ghara ime n’ọgbakọ anyị taa ma hụ na anyị anaghị eji ihe mmadụ nwere ekpebi otú anyị ga-esi ewere ya. w18.08 10 ¶8-10
Fraịdee, Mach 20
Nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ.—1 Pita 4:8.
Ihe na-egosi na anyị ji adịm ná mma anyị na Chineke kpọrọ ezigbo ihe bụ otú anyị si emeso ụmụnna anyị ihe. Ha bụkwa nke Jehova. Ọ bụrụ na anyị eburu nke a n’obi, anyị ga na-ahụ ụmụnna anyị n’anya, jirikwa obiọma na-emeso ha ihe. (1 Tesa. 5:15) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Malakaị kwuru na mgbe ndị Jehova nọ na-ekwurịta okwu na Jehova nọ “na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu.” (Mal. 3:16) N’eziokwu, Jehova “maara ndị bụ́ ndị ya.” (2 Tim. 2:19) Ọ ma ihe niile anyị na-ekwu, ma na-eme. (Hib. 4:13) Ọ bụrụ na anyị ejighị obiọma na-emeso ụmụnna anyị ihe, Jehova na-ahụ ya. Obi kwesịkwara isi anyị ike na Jehova na-ahụkwa mgbe anyị na-ele ụmụnna anyị ọbịa, na-emesapụrụ ha aka, na-agbaghara ha, ma jiri obiọma na-emeso ha ihe.—Hib. 13:16. w18.07 26 ¶15,17
Satọdee, Mach 21
N’ahụ́ [Jehova] ka ị ga-araparakwa.—Diut. 10:20.
Ọ bara uru ijidesi Jehova aka ike. O nweghị onye siri ike, mara ihe, ma ọ bụ hụ anyị n’anya karịa Chineke. Ò nwere onye n’ime anyị na-agaghị achọ ịdịnyere ya? (Ọma 96:4-6) Ma, ụfọdụ ndị ohu Chineke hapụrụ ịdịnyere Chineke mgbe ha kwesịrị ime otú ahụ. Chegodị banyere Ken. O nweghị onye ọzọ o kwuru na ya na-efe ma ọ bụghị Jehova. Ma, Chineke anabataghị ofufe ya. Jehova hụrụ na Ken nọ na-eche ihe ọjọọ n’obi ya. (1 Jọn 3:12) Ọ dọrọ Ken aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ị gbanwee mewe ezi ihe, ọ̀ bụ na a gaghị ebuli gị elu? Ma ọ bụrụ na ị gbanweghị mewe ezi ihe, lee, mmehie makpu n’ọnụ ụzọ, ọ bụkwa gị ka ọ na-achọsi ike inweta; ma gị onwe gị, ị̀ ga-emeri ya?” (Jen. 4:6, 7) Ihe Jehova na-agwa Ken bụ, “Ọ bụrụ na i chegharịa ma kwụsie ike n’ebe m nọ, m ga-anọnyere gị.” Ma Ken emeghị ihe Jehova gwara ya. w18.07 17 ¶1, 3; 18 ¶4
Sọnde, Mach 22
Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ.—Mat. 5:16.
Otu ụzọ anyị si eme ka ìhè anyị na-enwu bụ ịna-ekwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Àgwà anyị na-emekwa ka e too Jehova. Ndị anyị na-ezi ozi ọma na ndị na-agafe agafe na-ahụ àgwà anyị. Otú anyị si amụmụ ọnụ ọchị na otú anyị si ekele ndị mmadụ na-egosi ụdị ndị anyị bụ, nakwa ụdị Chineke anyị na-efe. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mgbe unu na-abanye n’ụlọ, keleenụ ndị ezinụlọ ahụ.” (Mat. 10:12) N’ebe Jizọs na ndịozi ya kwusara ozi ọma, ndị mmadụ na-anabatakarị ndị ha na-amaghị n’ụlọ ha. Ọ dịghị otú ahụ n’ọtụtụ ebe taa. Ma, otú i si meda obi na otú i si mesapụ ihu kwuo ihe mere i ji bịa nwere ike ime ka ahụ́ ruo onyenwe ụlọ ala. Otú kacha mma ị ga-esi malite izi mmadụ ozi ọma bụ ịmụmụ ọnụ ọchị. Ụmụnna anyị na-emekwa otú ahụ ma ha jiri ihe a na-akwagharị akwagharị na-ezi ozi ọma. I nwere ike ịchọpụta na ị mụmụọrọ ndị mmadụ ọnụ ọchị ma ọ bụ kelee ha, o nwere ike ime ka ha nwee mmasị. w18.06 22 ¶4-5
Mọnde, Mach 23
Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.—Ọrụ 10:34.
Ọ bụ naanị ndị Juu ka ha na Pita onyeozi na-anọkarị. Ma mgbe Chineke mechara ka o doo anya na Ndị Kraịst ekwesịghị ịkpa ókè, Pita ziri Kọnịliọs onye agha Rom ozi ọma. (Ọrụ 10:28, 35) Mgbe nke ahụ gachara, Pita so Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu rie nri. Ma mgbe afọ ụfọdụ gachara, Pita kwụsịrị iso Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu bi n’Antiọk eri nri. (Gal. 2:11-14) Pọl gbaziri Pita, Pita anabatakwa aka a o nyeere ya. N’akwụkwọ ozi mbụ Pita degaara Ndị Kraịst bụ́ ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu nọ n’Eshia Maịnọ, ọ gwara ha ka hụ òtù ụmụnna dum n’anya. (1 Pita 1:1; 2:17) O doro anya na ndịozi Jizọs mụtara ịhụ “ụdị mmadụ niile” n’anya n’aka Jizọs. (Jọn 12:32; 1 Tim. 4:10) Ha gbanwere otú ha si eche echiche, n’agbanyeghị na o were ha oge. Ndị Kraịst oge mbụ yikwasịrị “mmadụ ọhụrụ ahụ,” ya emee ka ha were mmadụ niile ka ndị hà otu n’anya Chineke.—Kọl. 3:10, 11. w18.06 11 ¶15-16
Tuzdee, Mach 24
Guzosienụ ike . . . yirinụ ihe mgbochi obi bụ́ ezi omume.—Efe. 6:14.
N’oge ndịozi Jizọs, a na-eji ibé ígwè arụ ụfọdụ ihe mgbochi obi onye agha Rom na-eyi. Ọ ga na-elebara ya anya ka ọ mara ma ibé ígwè ndị ahụ hà dịkwa otú ha kwesịrị ịdị ka o nwee ike igbochi mma agha ma ọ bụ akụ́ ịmaba ya n’obi, nakwa n’akụkụ ahụ́ ya ọzọ dị mkpa. E nwere ike iji iwu Jehova nke na-echebe obi anyị tụnyere ihe mgbochi obi. (Ilu 4:23) Onye agha agaghị anwa anwa were ihe mgbochi obi ya e ji ígwè bụ́ ọkpọka rụọ gbanwere nke a na-ejighị ezigbo ígwè rụọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị agaghị anwa anwa hapụ ime ihe Jehova kwuru mewe ihe anyị chere na ọ dị mma. Anyị agaghị echebeli obi anyị n’onwe anyị. (Ilu 3:5, 6) Kama nke ahụ, anyị ga na-agba mbọ iji hụ na “ihe mgbochi obi” Jehova nyere anyị ka na-echebe obi anyị. Ka anyị na-eji eziokwu Chineke na-akụziri anyị kpọrọ ihe, ka ọ na-adịkwuru anyị mfe iyiri “ihe mgbochi obi” anyị, ya bụ, ịna-eme ihe Chineke kwuru.—Ọma 111:7, 8; 1 Jọn 5:3. w18.05 28 ¶3-4, 6-7
Wenezdee, Mach 25
Ha wee sesa Mozis okwu.—Ọnụ Ọgụ. 20:3.
N’agbanyeghị otú Mozis si jiri obi ya niile duo ndị Izrel ọtụtụ afọ, ha ka nọ na-eme mkpesa. Ha mere mkpesa, ọ bụghị naanị maka mmiri, kama banyere Mozis, ka à ga-asị na ọ bụ ya mere na ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ. (Ọnụ Ọgụ. 20:1-5, 9-11) Mozis were ezigbo iwe ma kwụsị ịdị umeala n’obi. Kama ịgwa nkume ahụ okwu otú ahụ Jehova gwara ya, o ji iwe gwa ụmụ Izrel okwu ma kwuo na ya ga-arụ ọrụ ebube. Ọ kụziri nkume ahụ ihe ugboro abụọ, mmiri buru ibu agbapụta. Iwe na mpako mere ka o mejọọ ihe. (Ọma 106:32, 33) Mozis abanyeghị n’Ala Nkwa ahụ n’ihi na ọ kwụsịtụrụ ịdị umeala n’obi. (Ọnụ Ọgụ. 20:12) E nwere ezigbo ihe anyị ga-amụta n’akụkọ a. Nke mbụ, anyị ga na-agbasi mbọ ike ka anyị nọgide dịrị umeala n’obi. Ọ bụrụ na anyị akwụsịtụ ịdị umeala n’obi, anyị nwere ike dịwa mpako, ya emee ka anyị kwuwe ma ọ bụ mewe ihe na-adịghị mma. Nke abụọ, anyị nwee ihe na-echegbu anyị, o nwere ike isiri anyị ike ịdị umeala n’obi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbasị mbọ ike na-adị umeala n’obi ma mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị. w19.02 12-13 ¶19-21
Tọzdee, Mach 26
A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.—Mat. 24:14.
Ozi ọma Jizọs gwara anyị na-ekwusa ọ̀ bụụrụ anyị ibu arọ? Mbanụ. Mgbe Jizọs mechara ihe atụ banyere osisi vaịn, o kwuru na anyị ga-enweta ọṅụ n’ozi ọma Alaeze anyị na-ekwusa. (Jọn 15:11) O mesiri anyị obi ike na anyị ga-enweta ụdị ọṅụ ọ na-enwe. Olee otú anyị ga-esi enwe ya? Jizọs ji onwe ya tụnyere osisi vaịn, jirikwa ndị na-eso ụzọ ya tụnyere alaka ya. (Jọn 15:5) Ọ bụ n’osisi vaịn ahụ ka alaka ndị ahụ dị. Ọ bụrụhaala na alaka ndị ahụ adịgide n’osisi ahụ, ọ ga na-enye ha mmiri na ihe ga-eme ka ha dịrị ndụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụ na anyị na Kraịst adịrị n’otu ma na-eṅomi ya, anyị ga-enwe ụdị ọṅụ ọ na-enwe n’ihi ime uche Nna ya. (Jọn 4:34; 17:13; 1 Pita 2:21) Hanne, onye sụrụla ụzọ ihe karịrị afọ iri anọ, kwuru, sị: “Ọṅụ m na-enwe ma m gachaa ozi ọma lọta na-eme ka m nọgide n’ozi Jehova.” N’eziokwu, ezigbo ọṅụ anyị na-enwe na-eme ka anyị nwee ume ịna-ekwusa ozi ọma ma mgbe ọtụtụ ndị na-anaghị ege anyị ntị.—Mat. 5:10-12. w18.05 17 ¶2; 20 ¶14
Fraịdee, Mach 27
[A họpụtara m] ịbụ . . . onye ozizi nke ndị mba ọzọ n’ihe banyere okwukwe na eziokwu.—1 Tim. 2:7.
N’oge ndịozi, ọ ga-abụ Pọl onyeozi kacha gbaa Ndị Kraịst ume. Mmụọ nsọ zigara ya ka o kwusaara ndị Gris na ndị Rom, nakwa ndị ọzọ na-efe ọtụtụ chi, ozi ọma. (Gal. 2:7-9) Pọl gara ebe dị iche iche n’ebe a na-akpọ Tọki ugbu a, nakwa na Gris na Ịtali, kwusaara ndị na-abụghị ndị Juu bi n’obodo ndị ahụ ozi ọma, ma hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst. Ndị a ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ ‘tara ahụhụ n’aka ndị obodo ha,’ n’ihi ya, e kwesịrị ịgba ha ume. (1 Tesa. 2:14) N’ihe dị ka afọ 50, Pọl degaara ọgbakọ ọhụrụ e hiwere na Tesalonaịka akwụkwọ ozi, sị: “Anyị na-ekele Chineke mgbe niile mgbe anyị na-echeta unu niile n’ekpere anyị, n’ihi na anyị na-eburu n’uche mgbe niile ọrụ unu ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ na ndọgbu unu ji ịhụnanya na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ntachi obi unu.” (1 Tesa. 1:2, 3) Ọ gwakwara ha ka ha mee ka ibe ha sie ike. Ọ gwara ha, sị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu.”—1 Tesa. 5:11. w18.04 18-19 ¶16-17
Satọdee, Mach 28
A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma ahụ ná mba niile.—Mak 13:10.
Onye na-eto eto anaghị eji ozi ọma eti epele ma o lekwasị anya n’ịchọ ime ihe dị Jehova mma. Ebe ọ bụ na e kwesịrị ikwusa ozi ọma n’egbughị oge, o kwesịrị ịbụ ihe kacha mkpa anyị kwesịrị ịna-eme. Ì nwere ike iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma? Ì nwere ike ịsụ ụzọ? Ọ bụrụkwanụ na ịga ozi ọma anaghị atọcha gị ụtọ? Olee ihe ị ga-eme ka ị mụtakwuo otú ị ga-esi na-ezi ozi ọma? E nwere ihe abụọ ga-enyere gị aka: Kwadebe nke ọma, adala mbà ịgwa ndị ọzọ ihe ị ma banyere Jehova. I mee ihe ndị a, ị ga-ahụ otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’ozi ọma. I nwere ike ibu ụzọ kwadebe azịza ajụjụ ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe gị nwere ike ịjụ gị, dị ka “Olee ihe mere i ji kwere na Chineke dị?” E nwere isiokwu ndị dị na jw.org/ig ga-enyere ndị na-eto eto aka ịza ajụjụ ahụ. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ akwụkwọ ị ga-eji edetu ihe nke isiokwu ya bụ, “Olee Ihe Mere M Ji Kwere na Chineke Dị?” Ọ ga-enyere gị aka ịkwadebe ihe ị ga-aza ma a jụọ gị ajụjụ a. w18.04 27 ¶10-11
Sọnde, Mach 29
Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba.—Jen. 1:28.
Ọ bụ eziokwu na Adam na Iv nweere onwe ha ime ọtụtụ ihe, ma e nwere ihe ndị ha na-enweghị ike ịsị na ha agaghị eme. Ụfọdụ n’ime ha bụ ihe ahụ́ ha ga na-asị ha mee n’ihi otú e si kee ha. Dị ka ihe atụ, ha ma na ha kwesịrị iku ume, iri nri, ihi ụra, nakwa ime ihe ndị ọzọ ka ha nwee ike ịdị ndụ. Nke a, ọ̀ pụtara na ha enwereghị onwe ha? Mbanụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova mere ka ime ihe ndị ahụ na-atọ ha ụtọ. (Ọma 104:14, 15; Ekli. 3:12, 13) Jehova gwara Adam na Iv hoo haa ka ha mụjuo ụwa, ma na-elekọta ya. Iwu a Chineke nyere ha, ò mere ka ha ghara inwere onwe ha? Mbanụ. Jehova nyere ha iwu a ka ha nwee ike imezu ihe o bu n’obi. Ọ chọrọ ka ha mee ka ụwa niile bụrụ paradaịs ka ụmụ mmadụ zuru okè biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 127:3; Aịza. 45:18) A sị na Adam na Iv gere Chineke ntị, ha gaara enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha, nakwa n’ezinụlọ ha ruo mgbe ebighị ebi. w18.04 4-5 ¶7-8
Mọnde, Mach 30
Ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị kwere ekwe.—Ọrụ 13:48.
Ọ bụrụ na anyị ana-enwere ndị mmadụ ndidi n’ozi ọma, anyị agaghị atụ anya ka ha ghọta ma ọ bụ nabata eziokwu Baịbụl na nke mbụ ha nụrụ ya. Dị ka ihe atụ, ka anyị legodị ụzọ anyị nwere ike isi nyere mmadụ aka ịghọta banyere olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs n’ụwa. Ọtụtụ ndị kweere na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, nke ya agwụla, ma ọ bụkwanụ na-eche na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe. Otu nwanna kwuru otú ya na-esi enyere ndị mmadụ aka ịghọta olileanya anyị nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ọ na-ebu ụzọ agụrụ onye nwe ụlọ Jenesis 1:28. Ọ gụchaa ya, ya ajụọ ya ebe o chere na Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ biri nakwa otú ọ chọrọ ka ihe dịrị ha. Ọtụtụ ndị na-aza ya, sị: “Ọ bụ n’ụwa. Ọ chọkwara ka ha na-enwe obi ụtọ.” Nwanna ahụ na-agụkwara ha Aịzaya 55:11 ma jụọ ha ma nzube Chineke ọ̀ gbanweela. Ọtụtụ mgbe, ha na-asị mba, na ọ gbanwebeghị. N’ikpeazụ, ọ na-agụrụ ha Abụ Ọma 37:10, 11 ma jụọ ha otú ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Nwanna a esila otú a nyere ọtụtụ ndị aka ịghọta na Chineke chọrọ ka ndị ezi omume dịrị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa. w19.03 24 ¶14-15; 25 ¶19
Tuzdee, Mach 31
Geenụ ya ntị.—Mat. 17:5.
Jehova mere ka o doo anya na ya chọrọ ka anyị na-ege Ọkpara ya ntị ma na-eme ihe ndị ọ gwara anyị. Jizọs medara obi kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú e si ezi ozi ọma, chetakwara ha ọtụtụ ugboro ka ha na-eche nche. (Mat. 24:42; 28:19, 20) Ọ gwara ha ka ha jiri ike ha niile rụọ ọrụ ahụ nakwa ka ha ghara ịda mbà. (Luk 13:24) Jizọs mere ka o doo ndị na-eso ụzọ ya anya na ha kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya, dịrị n’otu ma na-edebe iwu ya. (Jọn 15:10, 12, 13) Ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya baara ha ezigbo uru. Ọ na-abakwara anyị uru taa. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke dịnyeere eziokwu na-ege ntị n’olu m.” (Jọn 18:37) Anyị na-egosi na anyị na-ege ntị n’olu Jizọs ma anyị ‘na-ediri ibe anyị ihe ma na-agbaghara ibe anyị kpamkpam.’ (Kọl. 3:13; Luk 17:3, 4) Ụzọ ọzọ anyị si egosi na anyị na-ege Jizọs ntị bụ iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma ‘n’oge dị mma ma n’oge nsogbu.’—2 Tim. 4:2. w19.03 10 ¶9-10