Eprel
Wenezdee, Eprel 1
[Jizọs sịrị Pita]: “Gaa m n’azụ,Setan! . . . Ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.”—Mat. 16:23.
Oleekwanụ maka anyịnwa? Ànyị na-eche echiche ka Chineke, ka ànyị na-eche echiche ka ụwa a? O nwere ike ịbụ na anyị agbaala mbọ na-akpa àgwà dị Chineke mma. Ma, oleekwanụ banyere ihe anyị na-eche n’obi anyị? Ànyị na-agbalị ime ka otú anyị si eche echiche daba n’otú Jehova si eche echiche? Anyị ga-agbalịsi ike iji mee ya. Ma, ọ dị ezigbote mfe mmadụ ịmụta iche echiche ka ụwa. Ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na mmụọ nke ụwa a juru ebe niile. (Efe. 2:2) Ihe ọzọ bụ na mmụọ nke ụwa a na-agba ndị mmadụ ume ịchọ ọdịmma nke onwe ha. Ọ bụ ya mere o ji amasị ọtụtụ ndị. N’eziokwu, o siri ezigbo ike ịmụta iche echiche ka Chineke. Ma, ịmụta iche echiche ka ụwa a dị mfe. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka ụwa kpụgharịa echiche anyị ka ọ dị ka nke ha, anyị ga-abụ ndị na-achọkarị ọdịmma onwe anyị na ndị na-achọ ịna-eme ihe masịrị anyị. (Mak 7:21, 22) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị mụta “echiche Chineke,” ọ bụghị “nke mmadụ.” w18.11 18 ¶1; 19 ¶3-4
Tọzdee, Eprel 2
Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.—Mat. 3:17.
Jehova si n’eluigwe kwuo okwu ugboro atọ iji mee ka Ọkpara ya mata na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ ga-abụrịrị na ihe a gbara Jizọs ezigbo ume. Obere oge e mechara ya baptizim n’Osimiri Jọdan, Jehova kwuru ihe dị n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. O nwere ike ịbụ na ọ bụ naanị Jọn Onye Na-eme Baptizim nụrụ ihe a Jehova kwuru. Ihe dị ka otu afọ tupu Jizọs anwụọ, ndịozi Jizọs atọ nụrụ ka Jehova kwuru gbasara Jizọs, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m; geenụ ya ntị.” (Mat. 17: 5) N’ikpeazụ, ụbọchị ole na ole tupu Jizọs anwụọ, Jehova sikwa n’eluigwe gwa Ọkpara ya okwu. (Jọn 12:28) N’agbanyeghị na Jizọs ma na ọ ga-anwụ ọnwụ ihere, e bo ya ebubo na o kwuluru Chineke, o kpere ekpere ka uche Jehova mee, ọ bụghị uche nke ya. (Mat. 26:39, 42) Baịbụl sịrị na “o diri osisi ịta ahụhụ, leghara ihere anya,” n’ihi na ọ chọrọ ka naanị Nna ya kwanyere ya ùgwù, ọ bụghị ụwa.—Hib. 12:2. w18.07 10-11 ¶15-16
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 9) Mak 14:3-9
Fraịdee, Eprel 3
Nna, ọ bụrụ na ị chọọ, wepụ iko a n’ebe m nọ.—Luk 22:42.
Obere oge Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, o mere ihe gosiri na ya nwere obi ike. Olee otú o si mee ya? O kwetara ime ihe Chineke bu n’obi ka o mee, ọ bụ eziokwu na ọ ma na ime otú ahụ pụtara na ọ ga-anwụ ọnwụ ihere maka na ha boro ya ebubo na o kwuluru Chineke. (Mat. 26:65, 66) Jizọs nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi iji kwanyere aha Chineke ùgwù, igosi na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị nakwa iji mee ka ụmụ mmadụ chegharịrị echegharị nweta ndụ ebighị ebi. Ihe ọzọ bụ na o mere ka ọ kwadebe ndị na-eso ụzọ ya maka nsogbu ga-abịara ha n’oge na-adịghị anya. Ụzọ ọzọ Jizọs si gosi na ya nwere obi ike bụ na ọ nọghị na-echegbu onwe ya maka nsogbu ndị ọ ga-abụ na o nwere, o lekwasịkwara anya ná mkpa ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi. Ncheta Ọnwụ ya ahụ ọ malitere mgbe Judas pụrụ, ga-echetara ndị ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ uru ọbara ya o ji chụọ àjà bara nakwa iso n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.—1 Kọr. 10:16, 17. w19.01 22 ¶7-8
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 9) Mak 11:1-11
Satọdee, Eprel 4
Nna, mee ka aha gị dị ebube.—Jọn 12:28.
Nna Jizọs si n’eluigwe kwuo, sị: “Emewo m ka ọ dị ebube, m ga-emekwa ka ọ dị ebube ọzọ.” Jizọs nọ na-echegbu onwe ya maka otú ọ ga-esi kwesị ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ. Ihe a abụghịkwanụ obere ọrụ. Jizọs ma na ya ga-ata nnukwu ahụhụ ma nwụọ. (Mat. 26:38) Ihe kacha Jizọs mkpa bụ ime ka aha Nna ya dị ebube. E boro Jizọs ebubo na ọ na-ekwulu Chineke. Ọ na-echegbukwa onwe ya na ọnwụ ya ga-eme ka a kọchaa aha Chineke. Dịkwa ka Jizọs, nkọcha a na-akọcha aha Jehova nwere ike ịna-echu anyị ụra. O nwere ike ịbụ na a na-emegide anyị dị ka e megidere Jizọs. O nwekwara ike ịbụ na akụkọ ụgha ndị na-emegide anyị na-akọsa banyere anyị na-enye anyị nsogbu n’obi. Anyị nwekwara ike ịna-eche otú akụkọ ndị ahụ si mee ka a na-akọcha Jehova. N’oge ndị ahụ, ihe ahụ Jehova kwuru na ya ga-eme ka aha ya dị ebube ga-akasi anyị obi. Jehova ga-emerịrị ka aha ya dị ebube.—Ọma 94:22, 23; Aịza. 65:17. w19.03 11-12 ¶14-16
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 10) Mak 11:12-19
Sọnde, Eprel 5
Jizọs Kraịst bidoro igosi ndị na-eso ụzọ ya na ya . . . [ga-ata] ọtụtụ ahụhụ . . . [e gbuokwa] ya.—Mat. 16:21.
Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gbara ha gharịị. Ha nọ na-atụ anya na Jizọs ga-abịa weghachiri mba Izrel alaeze ya. Ma, Jizọs bịara gwa ha na n’oge na-adịghị anya, na ya ga-ata ahụhụ ma nwụọ. Pita onyeozi gwara ya, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị; ihe a agaghị eme gị ma ọlị.” Ma, Jizọs baara Pita mba, sị ya: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị bụụrụ m ihe ịsụ ngọngọ, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama nke mmadụ.” (Mat. 16:22, 23; Ọrụ 1:6) Jizọs ji ihe ahụ ọ gwara Pita gosi na echiche Chineke dị nnọọ iche n’echiche ụwa a Ekwensu na-achị. (1 Jọn 5:19) Ihe a Pita kwuru bụ ihe e ji mara ụwa Setan a na-achọkarị ọdịmma onwe ha. Ma, Jizọs ma na ihe Nna ya na-eche dị iche. O ji ihe ahụ ọ zara Pita gosi na ya anabataghị echiche ụwa, kama na ọ bụ echiche Chineke ka ya nabatara. w18.11 18 ¶1-2
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 11) Mak 11:20–12:27, 41-44
Mọnde, Eprel 6
Na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.—1 Kọr. 11:26.
Chegodị ihe Jehova na-ahụ ma ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa niile zukọta maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị ma ọ bụ Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ihe ọ na-ahụ abụghị naanị ìgwè mmadụ zukọtaranụ, kama ọ na-ahụ onye ọ bụla bịaranụ n’otu n’otu. Dị ka ihe atụ, ọ na-ahụ ndị niile na-abịa kwa afọ. Ọtụtụ n’ime ha nwere ike ịbụ ndị na-abịa n’agbanyeghị na a na-emekpọ ha ọnụ. E nwere ndị nke na-anaghị abịachi ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ anya, ma ha ejighị ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs egwu egwu. Jehova na-ahụkwa ndị o nwere ike ịbụ na nke a bụ nke mbụ ha ịbịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, ikekwe ha chọrọ ịma ihe a na-eme na ya. N’eziokwu, obi na-atọ Jehova ụtọ ịhụ na ọtụtụ ndị na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. (Luk 22:19) Ma, ihe bụ́ mkpa ya bụ ihe mere ha ji bịa. Anyị na-achọ ka Jehova na nzukọ ya na-akụziri anyị ihe.—Aịza. 30:20; Jọn 6:45. w19.01 26 ¶1-3
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 12) Mak 14:1, 2, 10, 11; Matiu 26:1-5, 14-16
Ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs
Mgbe Anyanwụ Dachara
Tuzdee, Eprel 7
Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.—Rom 5:8.
Jizọs dị njikere ịnwụ n’ihi ndị na-eso ụzọ ya, nakwa ibi ndụ ya kwa ụbọchị otú na-egosi na ọ na-ebute ọdịmma ha ụzọ. Dị ka ihe atụ, ọ gakwuuru ndị na-eso ụzọ ya ma mgbe ike gwụchara ya ma ọ bụ mgbe obi na-erughị ya ala. (Luk 22:39-46) O lekwasịkwara anya n’ihe o nwere ike imere ndị ọzọ, ọ bụghị ihe o nwere ike inweta n’aka ha. (Mat. 20:28) Ọ bụ naanị anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst e nwere n’ụwa niile. Anyị na-agbalịkwa eji oge buru ibu agwa ndị ọzọ ka ha bịa soro anyị na-efe Jehova. Ma ndị anyị kwesịrị inyere aka karịchaa bụ “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe,” bụ́ ndị kwụsịrị ịga ozi ọma ma ọ bụ ọmụmụ ihe. (Gal. 6:10) Otú anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya bụ ịna-agba ha ume ka ha na-abịa ọmụmụ ihe, nke ka nke, Ncheta Ọnwụ Jizọs. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ otú ọ na-atọ Jehova na Jizọs ma ndị kwụsịrị ịga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma laghachikwute Jehova.—Mat. 18:14. w19.01 29 ¶12, 14; 30 ¶15
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 13) Mak 14:12-16; Matiu 26:17-19 (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 14) Mak 14:17-72
Wenezdee, Eprel 8
Nke a pụtara ahụ́ m. . . . Nke a pụtara “ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ.”—Mat. 26:26-28.
Mgbe Jizọs malitere Ncheta Ọnwụ ya, o weere naanị achịcha na mmanya Ememme Ngabiga ha nwere n’ebe ahụ mee ya. Ọ gwara ndịozi ya na ihe abụọ a nọchiri anya ahụ́ ya na ọbara ya zuru okè ọ ga-eji chụọ àjà maka ha n’oge na-adịghị anya. O nwere ike ịbụ na o jughị ndịozi ya anya na o jighị ọtụtụ ihe mee ya. N’ihi gịnị? Ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, Jizọs gara n’ụlọ ezigbo ndị enyi ya aha ha bụ Lazarọs, Mata na Meri. Mgbe ya na ha nọ, ọ malitere izi ha ihe. Mata nọkwa ebe ahụ, ma ọ nọ na-agbakeri ala n’ihi ọtụtụ nri ọ na-esiri onye ọbịa ya pụrụ iche. Mgbe Jizọs hụrụ ihe Mata na-eme, o ji obiọma gbazie ya, si otú ahụ nyere ya aka ịghọta na ọ bụghị mgbe ọ bụla ka isi elu na ala dị mkpa. (Luk 10:40-42) Ka ọ fọrọ awa ole na ole tupu Jizọs ejiri ndụ ya chụọ àjà, o mere ihe ahụ ọ gwara Mata. O ji ihe ole na ole mee Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. w19.01 20-21 ¶3-4
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 14) Mak 15:1-47
Tọzdee, Eprel 9
Nna, mee ka m nwee ebube n’akụkụ gị, bụ́ ebube m nwere . . . mgbe ụwa na-adịbeghị.—Jọn 17:5.
Jehova kwanyeere Jizọs ùgwù otú ọ na-atụghị anya ya. Mgbe Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, o mere ka ọ nọrọ “n’ọkwá ka elu,” n’eluigwe. O mekwara ka ọ bụrụ mmụọ na-anaghị anwụ anwụ n’eluigwe, bụ́ ihe onye ọ bụla na-enwetatụbeghị mbụ. (Fil. 2:9; 1 Tim. 6:16) Ihe a bụ ụzọ magburu onwe ya Jehova si gọzie Jizọs n’ihi otú o si rubere ya isi. Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịchọ ịbụ ndị a ma ama n’ụwa? Buru n’obi na Jehova ji ndị niile na-efe ya kpọrọ ihe mgbe niile. Ọ na-agọzikwa ha otú ha na-atụghị anya ya. Ònye manụ ihe ọma ndị anyị na-atụghị anya ha Jehova ga-emere anyị n’ọdịnihu? Ma, ka ọ dị ugbu a, mgbe anyị na-edi ihe isi ike na ọnwụnwa ndị na-abịara anyị n’ụwa ọjọọ a, anyị kwesịrị ịna-echeta na ụwa a na-agabiga agabiga. (1 Jọn 2:17) Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova ‘abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ anyị na ịhụnanya anyị gosiri maka aha ya.’—Hib. 6:10 w18.07 11 ¶17-18
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 15) Matiu 27:62-66 (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 16) Mak 16:1
Fraịdee, Eprel 10
M na-arịọ arịrịọ . . . ka ha niile wee bụrụ otu.—Jọn 17:20, 21.
Ná nri ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya riri, ihe nọ na-echegbu ya bụ otú ndịozi ya ga-esi adị n’otu. Mgbe ya na ha na-ekpe ekpere, ọ sịrị na ọ chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya dịrị n’otu otú ahụ ya na Nna ya si dịrị n’otu. Ha dịrị n’otu, ọ ga-eme ka o doo ndị mmadụ anya na ọ bụ Jehova zitere Jizọs n’ụwa ka o mee uche Chineke. Ọ bụ ịhụnanya ka a ga-eji mara ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ọ ga-emekwa ka ha dịrịkwuo n’otu. (Jọn 13:34, 35) E nwere ihe mere Jizọs ji kwusie okwu ike banyere ịdị n’otu. Ná nri ikpeazụ ya na ndịozi ya riri, ọ chọpụtara na ha na ibe ha adịghị n’otu. Dị ka ha si eme, ha nọ na-arụrịta ụka n’etiti onwe ha banyere “onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu.” (Luk 22:24-27; Mak 9:33, 34) N’oge ọzọ, Jems na Jọn rịọrọ Jizọs ka o nye ha ọkwá ndị dị mkpa n’Alaeze ya.—Mak 10:35-40. w18.06 8 ¶1-2
Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 16) Mak 16:2-8
Satọdee, Eprel 11
Nwoke [ga-ahapụ] nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.—Jen. 2:24.
Jehova chọrọ ka di na nwunye na-ahụ ibe ha n’anya nke ukwuu nke na ha ga na-eme otú ahụ ruo ọnwụ. (Mat. 19:3-6) Di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko bụ otu n’ime ihe kacha njọ mmadụ ga-eme nke gosiri na ọ hụghị di ma ọ bụ nwunye ya n’anya. Ọ bụ ya mere iwu nke asaa n’ime Iwu Iri ahụ ji kwuo ka a ghara ịkwa iko. (Diut. 5:18) Ọ bụ mmadụ ‘imehie Chineke’ na ime di ya ma ọ bụ nwunye ya ihe na-agbawa obi. (Jen. 39:7-9) Onye di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko anaghị echefu ya echefu ruo ọtụtụ afọ. Jehova chọkwara ka ụmụaka na-enwe obi ụtọ, chọọkwa ka e chebe ha. Jehova gwara ndị nne na nna ka ha na-egboro ụmụ ha mkpa ha, nakwa ka ha nyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ chọrọ ka ndị nne na nna nyere ụmụ ha aka ka ha ghọta Iwu Jehova ma jiri ya kpọrọ ihe, chọọkwa ka ha nyere ha aka ịhụ ya n’anya. (Diut. 6:6-9; 7:13) Ndị nne na nna ekwesịghị iwere ụmụ ha ka ndị ha ga na-emeso ihe otú masịrị ha. Kama, ha kwesịrị iwere ha ka onyinye si n’aka Jehova ha kwesịrị iji kpọrọ ihe.—Ọma 127:3. w19.02 21 ¶5, 7
Sọnde, Eprel 12
Chineke ga-amarakwa na m na-eguzosi ike n’ezi ihe.—Job 31:6.
Ihe nyeere Job aka ikwesị ntụkwasị obi bụ na o nwere olileanya na Chineke ga-agọzi ya. Ọ ma na Chineke ejighị isi ọ na-erubere ya egwu egwu. N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara ya, obi siri ya ike na Jehova ga-emecha gọzie ya. Ihe a nyeere ya aka ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. Obi tọrọ Jehova ezigbo ụtọ maka ikwesị ntụkwasị obi ya nke na ọ gọziri ya nke ukwuu n’agbanyeghị na o zughị okè. (Job 42:12-17; Jems 5:11) Chineke ka ga-agọzikwu ya n’ọdịnihu. Chineke anyị agbanwebeghị. (Mal. 3:6) Ọ bụrụ na anyị echeta na Chineke ejighị isi anyị na-erubere ya egwu egwu, ọ ga-eme ka obi anyị dịgide n’olileanya magburu onwe ya anyị nwere maka ọdịnihu. (1 Tesa. 5:8, 9) Mgbe ụfọdụ, i nwere ike na-eche na ọ bụ naanị gị na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe i bi. Ma, e nweghị mgbe ọ ga-abụ naanị gị. Ị ga-esonye n’ọtụtụ nde mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ụwa niile. Ị ga-esonyekwa n’ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị fere Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ma mgbe ha nọ n’ọnụ ọnwụ.—Hib. 11:36-38; 12:1 w19.02 7 ¶15-16
Mọnde, Eprel 13
Nweenụ otu obi, ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi, nweenụ ịhụnanya ụmụnna, nweenụ obi ọmịiko, dịrịnụ umeala n’obi.—1 Pita 3:8.
Ka Ncheta Ọnwụ Jizọs na-agwụ, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị a: ‘Olee otú m nwere ike isi hụ ndị ọzọ n’anya ka Jizọs? M̀ na-echebara mkpa ụmụnna m echiche karịa mkpa nke m? M̀ na-atụ anya ka ụmụnna m mee ihe ha na-agaghị emeli, ka m̀ ma ihe ha na-agaghị emeli?’ Ka anyị na-eme ka Jizọs mgbe niile ma na-egosi na ‘ihe banyere onye ọzọ na-emetụ anyị n’obi.’ Ncheta Ọnwụ Jizọs a gwara anyị na-eme ga-akwụsị otu ụbọchị. Mgbe Jizọs ‘ga-abịa’ n’oge oké mkpagbu, ọ ga-achịkọta “ndị ọ họọrọ” laa n’eluigwe, mgbe ahụ, agaghịkwa na-eme Ncheta Ọnwụ ya. (1 Kọr. 11:26; Mat. 24:31) Mgbe a kwụsịrị icheta ọnwụ Jizọs, obi kwesịrị isi anyị ike na ndị na-efe Jehova ga-eji obi ụtọ na-echeta mgbe ha na-echeta ọnwụ Jizọs n’ihi na ọ nọchiri anya ụdị ịdị umeala n’obi, obi ike na ịhụnanya kachanụ mmadụ gositụrụla anyị. w19.01 25 ¶17-19
Tuzdee, Eprel 14
Eziokwu nke dị n’ime obi mmadụ na-atọ gị ụtọ; meekwa ka m mata amamihe n’ime obi m.—Ọma 51:6.
Ka anyị tụlee otú ahụ́ ịgbasi anyị ike si egosi na ụdị onye anyị bụ n’ime dị ezigbo mkpa. Nke mbụ, ka ahụ́ nwee ike ịgbasi anyị ike, anyị kwesịrị ịna-eri ezigbo nri, na-emegakwa ahụ́ mgbe niile. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma a bịa n’ihe gbasara ofufe Chineke. Ka anyị nwee ike ichebe obi anyị, anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị na akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, na-egosikwa na anyị nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ mgbe niile. Otú anyị si egosi na anyị nwere okwukwe bụ ịna-eme ihe ndị anyị na-amụta, nakwa ịgwa ndị ọzọ ihe ndị anyị kweere. (Rom 10:8-10; Jems 2:26) Nke abụọ, anyị lee onwe anyị anya n’elu ahụ́, anyị nwere ike iche na ahụ́ gbasiri anyị ike, n’agbanyeghị na o nwere ọrịa anyị nwere n’ime ahụ́. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe gbasara okwukwe anyị. Anyị nwere ike na-eche na okwukwe anyị siri ike n’ihi ihe ndị anyị na-eme n’ofufe Chineke, ma agụụ ihe ọjọọ nwere ike jiri nwayọọ nwayọọ na-agba mgbọrọgwụ n’obi anyị. (1 Kọr. 10:12; Jems 1:14, 15) Anyị kwesịrị icheta na Setan ga-achọ ime ka anyị na-eche echiche otú o si eche. w19.01 15 ¶4-5
Wenezdee, Eprel 15
Gawa, gị onwe gị, na-emekwa otú ahụ.—Luk 10:37.
Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-eme otú ahụ? M̀ na-eme ihe onye Sameria ahụ nwere ọmịiko mere?’ (Luk 10:30-35) ‘Mgbe ndị ọzọ na-ata ahụhụ, m̀ na-emetere ha ebere? M̀ nwere ike imekwu ihe iji nyere ha aka? Dị ka ihe atụ, oleekwanụ maka ndị agadi nọ n’ọgbakọ anyị, ụmụ nwaanyị isi mkpe, na ụmụaka ndị mụrụ ha na-abụghị Ndịàmà Jehova? M̀ nwere ike inyere ha aka? M̀ nwere ike ‘ịgụgụ mkpụrụ obi dara mbà’?’ (1 Tesa. 5:14; Jems 1:27) Mgbe anyị meere ndị mmadụ ebere, anyị na-enye ihe. Jizọs kwuru na inye ihe ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. Nke kachanụ bụ na anyị na-eme ihe dị Jehova mma. (Ọrụ 20:35; Hib. 13:16) Eze Devid kwuru banyere onye na-eme ebere, sị: “Jehova ga-eche ya nche ma chebe ya ndụ. A ga-akpọ ya onye obi ụtọ n’ụwa.” (Ọma 41:1, 2) Ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị mmadụ ebere ma na-enwere ha ọmịiko, Jehova ga-emere anyị ebere, anyị ga-enwekwa obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.—Jems 2:13. w18.09 19 ¶11-12
Tọzdee, Eprel 16
Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.—Aịza. 41:10.
A gwara otu nwanna nwaanyị kwesịrị ntụkwasị obi aha ya bụ Yoshiko ihe na-emenye ụjọ. Dọkịta ya gwara ya na ọ ga-anwụ n’ime ọnwa ole na ole. Olee ihe o mere? Yoshiko chetara amaokwu Baịbụl na-amasịkarị ya, ya bụ, amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si na ya. O ji nwayọọ gwa dọkịta ya na ụjọ anaghị atụ ya, n’ihi na Jehova jidesiri ya ike. Ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ahụ, bụ́ nke na-akasi anyị obi, nyeere nwanna anyị nwaanyị aka ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. Amaokwu Baịbụl ahụ ga-eme ka anyị ghara ịtụ ụjọ mgbe anyị na nsogbu ndị bịaara anyị na-alụ. Jehova bu ụzọ mee ka Aịzaya dee okwu ndị ahụ iji kasie ndị Juu obi, bụ́ ndị a ga-emecha dọrọ n’agha laa Babịlọn. Ma, Jehova mere ka e chebe okwu ndị ahụ ka ha baara ma ndị Juu a dọọrọ n’agha ma ndị ohu ya niile dịrịla ndụ kemgbe ahụ ruo ugbu a uru. (Aịza. 40:8; Rom 15:4) Taa, anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ,’ n’ihi ya, okwu ndị na-agba ume dị n’akwụkwọ Aịzaya dị anyị mkpa.—2 Tim. 3:1. w19.01 2 ¶1-2
Fraịdee, Eprel 17
Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-ekweghị ekwe chọrọ ịpụ, ya pụwa.—1 Kọr. 7:15.
Ọ bụrụ na nwaanyị ahapụ di ya n’ihi ihe di ya na-eme ya, ha ka bụ di na nwunye. Ọ bụrụgodi na ha bi iche iche, onye ọ bụla n’ime ha ga-enwe nsogbu. Pọl onyeozi kwuru ihe mere di na nwunye ji kwesị ịghara ịhapụ ibe ha. O kwuru, sị: “E dowo di ahụ na-ekweghị ekwe nsọ n’ihi nwunye ya, e dowokwa nwunye ahụ na-ekweghị ekwe nsọ n’ihi nwanna ahụ; ma ọ́ bụghị ya, ụmụ unu ga-abụ ndị na-adịghị ọcha n’ezie, ma ugbu a, ha dị nsọ.” (1 Kọr. 7:14) Ọtụtụ Ndị Kraịst ekpebiela na ha agaghị ahapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Onye Kraịst n’agbanyeghị nsogbu ọ na-enye ha. Ha ahụla na ime otú ahụ abaarala ha uru n’ihi na di ha ma ọ bụ nwunye ha ahụ esorola ha fewe Jehova. (1 Kọr. 7:16; 1 Pita 3:1, 2) Taa, n’ụwa niile, e nwere ọtụtụ ndị di na nwunye n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-enwe obi ụtọ n’alụmdi na nwunye ha. I nwere ike ịhụ ọtụtụ n’ime ha n’ọgbakọ gị. Ha bụ ezigbo ụmụnna ndị hụrụ nwunye ha n’anya nakwa ndị nwunye ji obi ha niile hụ di ha n’anya ma na-asọpụrụ ha. Ha niile na-egosi na alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ ihe a ga-akwanyere ùgwù.—Hib. 13:4. w18.12 14 ¶18-19
Satọdee, Eprel 18
Jehova bụ́ Chineke [kụrụ] ubi n’Iden, . . . ọ bụ n’ebe ahụ ka o mere ka mmadụ ahụ ọ kpụrụ nọrọ.—Jen. 2:8.
Ihe Iden pụtara bụ “Obi Ụtọ.” N’eziokwu, ogige ahụ mara ezigbo mma. Nri bụ atụrụ tawa na ya, ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ bikwa n’udo. (Jen. 1:29-31) Okwu Hibru e si sụgharịa “ogige” ka a sụgharịrị Pa·raʹdei·sos n’asụsụ Grik. Akwụkwọ ọkọwa okwu, nke M’Clintock na Strong dere, kwuru na onye Grik nụ banyere pa·raʹdei·sos, ihe ga-agbata ya n’obi bụ nnukwu ogige mara mma na-enweghị ihe ọ bụla nwere ike imerụ mmadụ ahụ́, nke nwere nnukwu osisi ndị na-amị ụdị mkpụrụ dị iche iche, nweekwa ọtụtụ ezigbo iyi ahịhịa juru n’akụkụ ya, bụ́ ebe ìgwè ele na atụrụ nwere ike ịna-ata nri. (Tụlee Jenesis 2:15, 16) Chineke mere ka Adam na Iv biri n’ogige ahụ a kpọrọ paradaịs, ma ha nupụụrụ Chineke isi, ya emee ka ha ghara iruzi eru ibi na ya. Otú a ka Paradaịs si kwaa ma ha ma ụmụ ha. (Jen. 3:23, 24) Ọ bụ eziokwu na e nweghịzi onye bi na Paradaịs ahụ, o yiri ka ọ nọgidere ruo Iju Mmiri ahụ e nwere n’oge Noa. w18.12 3-4 ¶3-5
Sọnde, Eprel 19
Mụ onwe m, Jehova, bụ . . . Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.—Aịza. 48:17.
Ndị nne na nna na-agba mbọ akụziri ụmụ ha ezigbo àgwà. Ọ bụrụ na ụmụaka ekpebie ịna-akpa ezigbo àgwà ndị ahụ ha mụtara n’aka nne na nna ha, ha ga-enwe ike ime ezigbo mkpebi ndị ha na-agaghị emecha kwaara mmakwaara. Ha agaghịkwa adaba n’ọtụtụ nsogbu ndị mmadụ na-eji aka ha akpatara onwe ha. Jehova bụ ezigbo Nna. Ọ chọrọ ka ihe gaziere ụmụ ya. (Aịza. 48:18) Ọ bụ ya mere o ji akụziri anyị ime omume ọma na ịna-akpaso ndị ọzọ àgwà ọma. Ọ chọrọ ka anyị na-eche echiche ka ya ma na-ele ihe anya otú o si ele ya. Ihe ndị a anaghị ekegide anyị, kama ha na-enyere anyị aka ịna-eche echiche nke ọma. (Ọma 92:5; Ilu 2:1-5; Aịza. 55:9) Iche echiche ka Chineke agaghị egbochi anyị iji aka anyị na-ekpebiri onwe anyị ihe ụfọdụ na-amasị anyị, kama ọ ga-eme ka anyị na-eme mkpebi ndị ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. (Ọma 1:2, 3) N’eziokwu, iche echiche ka Jehova ga-abara anyị ezigbo uru. w18.11 19-20 ¶7-8
Mọnde, Eprel 20
Ha . . . na-ekwujọ unu.—1 Pita 4:4.
Ka anyị nwee ike ịna-eje ije n’eziokwu, anyị ekwesịghị ikwe ka nsogbu ndị ọzọ na-enye anyị mee ka anyị hapụ ofufe Chineke. Mgbe anyị malitere ife Jehova, anyị gbanwere otú anyị na ndị enyi anyị na ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova si emekọrịta ihe. E nwere ndị nke na-anaghị enye anyị nsogbu, nweekwa ndị na-achọghị iji anya ahụ anyị. Ndị ezinụlọ anyị, ndị ọrụ ibe anyị, nakwa ụmụ akwụkwọ ibe anyị nwere ike ịchọ ka anyị soro ha n’ememme ndị ha na-eme. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara iso ha na-eme ememme ndị ahụ na-adịghị Chineke mma? Otú anyị nwere ike isi eme ya bụ iburu n’obi ihe mere Jehova ji kwuo na ememme ndị ahụ adịghị mma. Ime nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ndị kwuru otú ememme ndị ahụ si malite ga-enyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị amata ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mere na anyị ekwesịghị ime ememme ndị ahụ, ọ ga-edo anyị anya na anyị na-eme “ihe dị Onyenwe anyị mma.” (Efe. 5:10) Ịtụkwasị Jehova obi na iji Okwu ya nke eziokwu kpọrọ ihe, ga-echebe anyị ka anyị ghara “ịtụ mmadụ egwu.”—Ilu 29:25. w18.11 11 ¶10, 12
Tuzdee, Eprel 21
Jehova nọnyeere Josef, Jehova na-emekwa ka ihe ọ na-eme na-aga nke ọma.—Jen. 39:23.
Ọ bụrụ na ọnọdụ anyị agbanwee na mberede, anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị maka ọdịnihu. Ụdị ihe a gaara eme Josef. Kama ikwe ka o mee ya, o doro anya na o ji ohere ahụ mee ihe bara uru ma si otú ahụ mee ihe mere ka Jehova gọzie ya. N’agbanyeghị na Josef nọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ gbara mbọ rụọ ọrụ ọ bụla onyeisi na-elekọta ụlọ mkpọrọ nyere ya otú ahụ o mere mgbe ọ na-arụrụ Pọtịfa ọrụ. (Jen. 39:21, 22) Ọnọdụ anyị na-enweghị ike ime ihe ọ bụla maka ya nwere ike ịbịara anyị otú ahụ ọ bịaara Josef. Ma, ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ jiri oge ahụ na-eme ihe bara uru, Jehova ga-agọzi anyị. (Ọma 37:5) N’eziokwu, anyị nwere ike nọrọ ná “mgbagwoju anya” mgbe ụfọdụ, ma dị ka Pọl onyeozi si kwuo, anyị agaghị anọ “n’enwetụghị ụzọ mgbapụ.” (2 Kọr. 4:8) Ọ bụrụ na anyị ejiri ozi anyị kpọrọ ihe, Jehova ga-emere anyị ihe a Pọl kwuru. w18.10 29 ¶11, 13
Wenezdee, Eprel 22
Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.—Hib. 6:10.
Olee otú ọ na-adị gị ma onye ị ma nke ọma ma na-akwanyere ùgwù chefuo aha gị ma ọ bụdị ghara ịmata gị? Ụdị ihe a nwere ike iwute gị nke ukwuu. Maka gịnị? Ọ bụ maka na onye ọ bụla n’ime anyị chọrọ ka a mara ya. Ọ bụghị naanị na anyị chọrọ ka ndị mmadụ mata anyị, anyị chọkwara ka ha mata ụdị mmadụ anyị bụ na ihe ndị anyị merela ná ndụ. (Ọnụ Ọgụ. 11:16; Job 31:6) Ma ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya, anyị nwere ike chọọ ka a mata anyị gabiga ókè. Ụwa Setan nwere ike ime ka anyị chọọ ịbụ ndị a ma ama na ndị dị mkpa. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, ọ ga-eme ka anyị ghara ịmata Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke nke ọma, nakwa ife ya otú ọ chọrọ.—Mkpu. 4:11. w18.07 7 ¶1-2
Tọzdee, Eprel 23
Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.—1 Jọn 5:19.
O jughị anyị anya na Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eme ka ndị ọnụ na-eru n’okwu “na-ekwu okwu ụgha.” (1 Tim. 4:1, 2) Ọ jọgburu onwe ya ma ndị isi okpukpe na-aghara ndị mmadụ ụgha. Maka gịnị? Ọ bụ maka na mmadụ kwere n’ozizi ụgha ha na-akụzi ma na-eme ihe Chineke kpọrọ asị, o nwere ike ime ka ndụ ebighị ebi kwaa onye ahụ. (Hos. 4:9) Jizọs ma na ndị isi okpukpe e nwere n’oge ya nọ na-eduhie ndị mmadụ. Ọ gwara ha okwu ihu na ihu, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! n’ihi na unu na-agafe oké osimiri na ala akọrọ iji tọghata otu onye, mgbe ọ ghọkwara onye a tọghatara, unu na-eme ka o jiri okpukpu abụọ ghọọ onye a ga-atụba na Gehena [ya bụ, mbibi ebighị ebi] karịa unu.” (Mat. 23:15) Jizọs katọsiri ndị isi okpukpe ụgha ndị ahụ ike. N’eziokwu, ha ‘si ná nna ha bụ́ Ekwensu, bụ́ ogbu mmadụ.’—Jọn 8:44. w18.10 7 ¶5-6
Fraịdee, Eprel 24
Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu . . . n’ihi m. —Mat. 5:11.
Gịnị ka ihe a Jizọs kwuru pụtara? O kwukwara, sị: “Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe; n’ihi na otú ahụ ka ha kpagburu ndị amụma bu unu ụzọ.” (Mat. 5:12) Mgbe a pịara ndịozi ihe ma nye ha iwu ka ha ghara ikwusa ozi ọma, “ha si n’ihu Sanhedrin ahụ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị na ihe a pịara ha tọrọ ha ụtọ. Ma, ha ṅụrịrị ọṅụ “n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha [Jizọs].” (Ọrụ 5:41) N’oge anyị a, ndị na-efe Jehova na-eji ọṅụ edi ahụhụ a na-ata ha n’ihi aha Jizọs, na-ejikwa ọṅụ edi ọnwụnwa tara akpụ bịaara ha. (Jems 1:2-4) Ọ naghị atọ anyị ụtọ ka anyị na-ata ahụhụ ma ọ bụ ka a na-akpagbu anyị otú ahụ ọ na-atọghị ndịozi Jizọs. Ma, ọ bụrụ na anyị anọgide na-efe Chineke n’agbanyeghị mkpagbu, ọ ga-enye anyị ike anyị ga-eji na-edi ya. Mgbe ihe anyị na-amasị “Chineke bụ́ onye obi ụtọ,” obi ga na-atọ anyị ụtọ n’agbanyeghị mmegide a na-emegide anyị n’ihi okpukpe anyị ma ọ bụ na ndị ezinụlọ anyị na-emegide anyị.—1 Tim. 1:11 w18.09 21 ¶18-20
Satọdee, Eprel 25
Ha jupụtara ná nsogbu na ihe ọjọọ.—Ọma 90:10.
Anyị bi ‘n’oge dị oké egwu.’ Ọtụtụ ndị na-atagbu onwe ha n’ahụhụ nke na ha chọrọ ka ọnwụ bịa gburu ha. (2 Tim. 3:1-5) Ihe karịrị narị puku mmadụ asatọ na-egbu onwe ha kwa afọ. Ihe ọ pụtara bụ na ihe dị ka otu mmadụ na-egbu onwe ya n’ime tịnkọm tịnkọm iri anọ ọ bụla. Ọ dị mwute na ụfọdụ ụmụnna anyị achọọla ka ọnwụ bịa gburu ha, ha emechaa gbuo onwe ha. Ọ bụrụgodị na ụmụnna anyị anaghị eche echiche igbu onwe ha, ọtụtụ n’ime ha nọ n’ezigbo nsogbu, anyị kwesịkwara ịna-egosi ha na anyị hụrụ ha n’anya. A na-emekpọ ụfọdụ n’ime ha ọnụ, na-akwakwa ha emo. E nwekwara ndị nke a na-akparị n’ebe ha na-arụ ọrụ ma na-eji ha agba asịrị, ma ọ bụ na ike gwụkasịrị ha ahụ́ n’ihi na ha rụrụ ọrụ ọtụtụ awa ma ọ bụkwanụ na ha rụrụ ọrụ karịrị akarị ka ha nwee ike ịrụpụta ya mgbe a chọrọ ya. A ka nwere ndị nke nwere nnukwu nsogbu n’ezinụlọ ha. O nwere ike ịbụ na di ha ma ọ bụ nwunye ha anọghị n’ọgbakọ, ya ana-akatọ ha mgbe niile. N’ihi nsogbu ndị a na ndị ọzọ, ike ụwa na-agwụ ọtụtụ ụmụnna anyị, ya emee ka ha na-eche na ha abaghịzi uru. w18.09 13 ¶3, 5
Sọnde, Eprel 26
Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.—3 Jọn 4.
Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na Jehova na-arụkọ ọrụ mgbe ha na-enyere ụmụ ha aka ka ha kpebie ihe ndị ha ga-eme n’ozi Jehova. Ọtụtụ ndị nne na nna emeela otú ahụ. Nke a emeela ka ụmụ ha mechaa kpebie ije ozi oge niile n’ebe dị anya. Ụfọdụ bụ ndị ozi ala ọzọ, ndị ọzọ abụrụ ndị ọsụ ụzọ na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị nkwusa. E nwekwara ndị nke na-eje ozi na Betel. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ụmụ anọrọ ebe dị anya na-eje ozi, ha na ndị mụrụ ha agaghị na-anọrị otú ha si chọọ. Ma, ndị nne na nna ndị na-achọ ihe ga-abara ndị ọzọ uru na-agba ụmụ ha ume ịnọgide na-eje ozi ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na obi na-atọ ha ụtọ na ụmụ ha bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Ọ na-adị ọtụtụ ndị nne na nna otú ahụ ọ dị Hana, bụ́ onye kwuru na ya ‘gbazinyere’ Samuel nwa ya Jehova. Ha weere ya na ihe a ha mere bụ ùgwù Jehova kwanyeere ha.—1 Sam. 1:28. w18.08 24 ¶4
Mọnde, Eprel 27
Ọ ga-abụ ihe siri ike onye bara ọgaranya ịba n’alaeze eluigwe.—Mat. 19:23.
Jizọs ekwughị na ọ gaghị ekwe omume. Ọ sịkwara: “Obi ụtọ na-adịrị unu ndị ogbenye, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke unu.” (Luk 6:20) Ma nke a apụtaghị na ndị niile dara ogbenye gere Jizọs ntị, a gọzie ha. Ọtụtụ n’ime ha esoghị Jizọs. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ekwesịghị ikwu na mmadụ na Jehova dị ná mma n’ihi ihe ndị o nwere. Ná nzukọ Jehova, e nwere ụmụnna ndị bara ọgaranya na ndị dara ogbenye. Ha niile hụrụ Jehova n’anya ma jiri obi ha niile na-efe ya. Baịbụl gwara ndị bara ọgaranya “ka ha nweekwa olileanya, ọ bụghị n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka, kama n’ebe Chineke nọ.” (1 Tim. 6:17-19) Baịbụl gwakwara ndị Chineke niile, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye ka ha ghara ịhụ ego n’anya. (1 Tim. 6:9, 10) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ana-ele ụmụnna anyị anya otú Jehova si ele ha anya, anyị agaghị eji ihe ha nwere ekpebi otú anyị ga-esi were ha. w18.08 10-11 ¶11-12
Tuzdee, Eprel 28
Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke.—Jems 4:7.
O doro anya na anyị chọsiri ike igosi Jehova na obi dị anyị ụtọ maka ùgwù ọ kwanyeere anyị ka anyị bụrụ ndị ya. Anyị ma na mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, ọ bụ ihe kacha mma anyị kwesịrị ime. Anyị kpebisiri ike na anyị ga-ezere ihe ọ bụla Jehova kpọrọ asị. Anyị hụkwara ụmụnna anyị n’anya, na-akwanyekwara ha ùgwù n’ihi na ha bụkwa nke Jehova. (Rom 12:10) Baịbụl kwuru, sị: “Jehova agaghị ahapụ ndị ya.” (Ọma 94:14) Obi siri anyị ike na n’agbanyeghị ọdachi ọ bụla nwere ike ịdakwasị anyị, Jehova ga-anọnyere anyị. Ọnwụ enwedịghị ike ime ka Jehova kwụsị ịhụ anyị n’anya. (Rom 8:38, 39) “Ma ànyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.” (Rom 14:8) Anyị na-atụsi anya ike ịhụ mgbe Jehova ga-akpọlite ndị enyi ya niile n’ọnwụ. (Mat. 22:32) Ka ọ dị ugbu a, Jehova na-agọzi anyị mmaji kwuru mmaji. Baịbụl kwuru na “obi ụtọ na-adịrị mba nke Jehova bụ Chineke ya, bụ́ ndị ọ họọrọ ịbụ ihe nketa ya.”—Ọma 33:12. w18.07 26 ¶18-19
Wenezdee, Eprel 29
Iwu kwadoro ihe niile; ma ọ bụghị ihe niile bara uru. Iwu kwadoro ihe niile; ma ọ bụghị ihe niile na-ewuli elu.—1 Kọr. 10:23.
Ọtụtụ ndị nwere ike iche na ebe ọ bụ ha ga-eji aka ha kpebie ebe ha ga-agụru akwụkwọ, ụdị ọrụ ha ga-arụ na ihe ndị ọzọ, na ha nwere ike ime ihe ọ bụla ha chọrọ ọ bụrụhaala na akọnuche ha anaghị enye ha nsogbu. Ọ ga-abụ na ha chetara ihe Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt banyere nri. Ọ gwara ha, sị: “Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ na akọ na uche onye ọzọ na-ekpe nnwere onwe m ikpe?” (1 Kọr. 10:29) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ anyị ga-ekpebi ebe anyị ga-agụru akwụkwọ ma ọ bụ ụdị ọrụ anyị ga-arụ, anyị kwesịrị icheta na anyị enwereghị onwe anyị ime ihe ọ bụla masịrị anyị, nakwa na mkpebi ọ bụla anyị mere nwere ike ịbara anyị uru ma ọ bụ ghọ anyị ahịa. Ọ bụ ya mere Pọl ji buru ụzọ kwuo ihe a e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Ihe a na-enyere anyị aka ịmata na mgbe ọ bụla anyị chọrọ iji ikike e nyere anyị ekpebi ihe anyị chọrọ ime ná ndụ, na e nwere ihe ndị ka mkpa anyị kwesịrị ibu ụzọ chebara echiche. w18.04 10 ¶10
Tọzdee, Eprel 30
Lọghachikwutenụ m, m ga- alọghachikwutekwa unu.—Mal. 3:7.
Taa, Onye Kraịst nwere ike na-eme ihe ọjọọ ma na-ekwu na ya na-efe Chineke. (Jud 11) O nwere ike ịna-ejechi ozi ọma na ọmụmụ ihe anya. Ma, n’otu mgbe ahụ, o nwere ike na-eche omume rụrụ arụ na otú ọ ga-esi baa ọgaranya n’obi ya. O nwekwara ike ịkpọ nwanna ya asị n’obi ya. (1 Jọn 2:15-17; 3:15) Ihe ndị a ọ na-eche nwere ike ime ka o mee mmehie. Ndị ọzọ nwere ike ha agaghị ama ihe ndị anyị na-eche ma ọ bụ na-eme, ma Jehova na-ahụ ihe niile. Ọ makwa ma ànyị ji obi anyị niile na-efe ya. (Jere. 17:9, 10) Jehova anaghị ajụ anyị ozugbo anyị mere ihe ọjọọ. Mgbe mmadụ na-eme ihe ga-eme ka ọ hapụ Jehova, Jehova na-agwa onye ahụ, sị: ‘Lọghachikwute m.’ Jehova ma na e nwere àgwà ọjọọ ndị anyị na ha na-alụ. Ma ọ chọrọ ka anyị kwụsị ha. (Aịza. 55:7) Anyị mee otú ahụ, o kwuru na ọ ga-enyere anyị aka ma nye anyị ike anyị ga-eji merie ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ.—Jen. 4:7. w18.07 18 ¶5-6