Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es20 p. 57-67
  • Jun

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jun
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
  • Isiokwu Nta
  • Mọnde, Jun 1
  • Tuzdee, Jun 2
  • Wenezdee, Jun 3
  • Tọzdee, Jun 4
  • Fraịdee, Jun 5
  • Satọdee, Jun 6
  • Sọnde, Jun 7
  • Mọnde, Jun 8
  • Tuzdee, Jun 9
  • Wenezdee, Jun 10
  • Tọzdee, Jun 11
  • Fraịdee, Jun 12
  • Satọdee, Jun 13
  • Sọnde, Jun 14
  • Mọnde, Jun 15
  • Tuzdee, Jun 16
  • Wenezdee, Jun 17
  • Tọzdee, Jun 18
  • Fraịdee, Jun 19
  • Satọdee, Jun 20
  • Sọnde, Jun 21
  • Mọnde, Jun 22
  • Tuzdee, Jun 23
  • Wenezdee, Jun 24
  • Tọzdee, Jun 25
  • Fraịdee, Jun 26
  • Satọdee, Jun 27
  • Sọnde, Jun 28
  • Mọnde, Jun 29
  • Tuzdee, Jun 30
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
es20 p. 57-67

Jun

Mọnde, Jun 1

Nna m [ga-enye] unu ihe ọ bụla unu rịọrọ ya n’aha m, ihe ọ sọkwara ya bụrụ.​—Jọn 15:16.

Ọ ga-abụ na ihe a Jizọs gwara ndịozi ya gbara ha ezigbo ume. Ọ bụ eziokwu na ndịozi ahụ aghọtachaghị na obere oge, Jizọs ga-anwụ, ma a gaghị ahapụ ha n’enweghị onye ga-enyere ha aka. Jehova dị njikere ịza ekpere ha ma nyere ha aka n’ozi ọma Alaeze ha na-ekwusa. Jehova mekwara otú ahụ. Obere oge Jizọs nwụchara, ha rịọrọ Jehova ka o mee ka ha nwee obi ike. Jehova zakwara ekpere ha. (Ọrụ 4:​29, 31) Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị taa. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma, anyị ga na-abụ ndị enyi Jizọs. Ihe ọzọkwa bụ na obi ga-esi anyị ike na Jehova dị njikere ịza ekpere anyị na-ekpe ka o nyere anyị aka imeri nsogbu ndị anyị na-enwe n’ikwusa ozi ọma Alaeze. (Fil. 4:13) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova na-aza anyị ekpere, nakwa na anyị na Jizọs bụ enyi. Ihe ndị a Jehova nyere anyị na-eme ka anyị nọgide na-amị mkpụrụ.​—Jems 1:17. w18.05 21 ¶17-18

Tuzdee, Jun 2

Ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.​—Hib. 10:​24, 25.

N’ihe na-erughị afọ ise Pọl kwuchara ihe a, ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst bi na Jeruselem ga-ahụ ka ‘ụbọchị Jehova’ na-abịa. Ha ghọtara na ha kwesịrị isi n’obodo ahụ gbapụ, otú ahụ Jizọs gwara ha mee. (Ọrụ 2:​19, 20; Luk 21:​20-22) Ụbọchị Jehova ahụ bịara n’afọ 70, mgbe ndị Rom bibiri Jeruselem. Taa, o doro anyị anya na ‘oké ụbọchị Jehova, nke dịkwa oké egwu,’ dị nso. (Joel 2:11) Zefanaya onye amụma kwuru, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso. Ọ dị nso, o jikwa oké ọsọ na-abịa.” (Zef. 1:14) Amụma a gbasakwara anyị taa. N’ihi otú ụbọchị Jehova si dịrị nso, Pọl gwara anyị ka anyị “na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” (Hib. 10:24) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-echebakwuru ụmụnna anyị echiche, ka anyị nwee ike ịna-agba ha ume mgbe ọ dị mkpa. w18.04 20 ¶1-2

Wenezdee, Jun 3

Nwee obi ike, dịkwa ike. Amala jijiji, atụkwala ụjọ, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọnyeere gị ebe ọ bụla ị na-aga.​—Jọsh. 1:9.

Ihe a Jehova gwara Jọshụa tupu ụmụ Izrel abanye n’ala ahụ o kwere ha ná nkwa gbara ya ume. Ọ bụghị naanị na Jehova na-agba ndị ya ume n’otu n’otu, kama, ọ na-agbakwa ha ume n’ìgwè. Dị ka ihe atụ, Jehova ma na e kwesịrị ịgba ndị Juu a dọọrọ n’agha laa Babịlọn ume. Ọ gwara ha ihe ga-agba ha ume. Ọ sịrị: ‘Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere unu. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke unu. M ga-eme ka unu dị ike. M ga-enyere unu aka. M ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie unu ike.’ (Aịza. 41:10) Jehova gbakwara Ndị Kraịst oge ochie ume, ọ na-agbakwa anyị ume taa. (2 Ndị Kọrịnt 1:​3, 4) Jehova gbakwara Ọkpara ya ume. Mgbe e mechara Jizọs baptizim, ọ nụrụ olu si n’eluigwe kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Mat. 3:17) Okwu ahụ Chineke gwara Jizọs gbara ya ume n’oge niile o jere ozi ya n’ụwa. w18.04 16 ¶3-5

Tọzdee, Jun 4

Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.​—Jen. 2:17.

Ọtụtụ ndị taa gụọ iwu ahụ Jehova nyere Adam, ha echee na iwu ahụ mere ka Adam ghara inwere onwe ya ime ihe ndị ọ chọrọ ime. Iche otú ahụ na-egosi na ha aghọtaghị na mmadụ iji aka ya na-ekpebi ihe ndị ọ ga-eme dị iche na mmadụ iji aka ya ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Adam na Iv nweere onwe ha ikpebi ma hà ga-ege Chineke ntị ma ọ bụkwanụ na ha agaghị ege ya ntị. Ma, ọ bụ naanị Jehova ka ọ dịịrị ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. “Osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ” ahụ dị n’ogige Iden na-echetara Adam na Iv na ọ bụ naanị Chineke ka ọ dị n’aka ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Jen. 2:9) Jehova ji iwu ahụ kụziere Adam na Iv na ha ga-erubere ya isi ma ha chọọ inweta ezigbo nnwere onwe. Nne na nna anyị mbụ mechara nupụrụ Chineke isi. Ihe a Adam na Iv mere, ò mere ka ha nwerekwuo onwe ha? Mbanụ. Iji aka ha na-ekpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ emeghị ka ha nwerekwuo onwe ha. w18.04 5-6 ¶9-12

Fraịdee, Jun 5

N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.​—Aịza. 63:9.

Ihe Jehova na-eme abụghị naanị inwere ndị ohu ya na-ata ahụhụ ọmịiko. Ọ na-eme ihe iji nyere ha aka. Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụ Izrel na-ata ahụhụ n’ihi ohu ha na-agba n’Ijipt, Jehova ghọtara ihe ha na ya na-alụ ma mee ihe iji nyere ha aka. Jehova gwara Mozis, sị: “N’ezie, ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m . . . , anụwokwa m mkpu ákwá ha na-eti . . . n’ihi na m maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe. M na-agbada ịga napụta ha n’aka ndị Ijipt.” (Ọpụ. 3:​7, 8) Ebe ọ bụ na Jehova nweere ndị ohu ya ọmịiko, ọ napụtara ha n’ohu ha na-agba. Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, mgbe ụmụ Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ, ndị iro ha lụsowere ha agha. Gịnị ka Jehova mere maka ya? O wutere ya “na ha na-asụ ude n’ihi ndị na-emegbu ha na ndị na-akwagharị ha.” Obi ebere Jehova nwere maka ndị ya mere ka o nyere ha aka. O zitere ndị ikpe ka ha napụta ndị Izrel n’aka ndị iro ha.​—Ikpe 2:​16, 18. w19.03 15 ¶4-5

Satọdee, Jun 6

Nwaanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara, nke na ọ gaghị emere nwa ọ mụrụ ebere? Ọbụna ndị inyom a nwere ike ichefu, ma mụ onwe m agaghị echefu gị.​—Aịza. 49:15.

Iwu abụọ mbụ n’ime Iwu Iri ahụ kwuru ka ndị Izrel na-efe naanị Jehova, kwuokwa ka ha ghara ikpere arụsị. (Ọpụ. 20:​3-6) Ọ bụghị Jehova ka iwu ndị ahụ baara uru. Kama, ọ bụ ndị ya ka ha baara uru. Mgbe ha fere chi ndị mba ọzọ, ha tara ahụhụ. Ma, Jehova gọziri ndị ya mgbe ha rubeere ya isi ma na-emeso ibe ha ihe otú dị mma. (1 Eze 10:​4-9) E kwesịghị ịta Jehova ụta ma ndị na-ekwu na ha na-efe ya mebie iwu ya ma na-emegbu ndị ya. Ma, Jehova hụrụ anyị n’anya, marakwa mgbe a na-emegbu anyị. Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ ya n’ahụ́ karịa otú ahụhụ nwatakịrị na-ata si emetụ nne ya n’ahụ́. Ọ bụ eziokwu na Jehova nwere ike ghara ime ihe ozugbo, mgbe oge ya zuru, ọ ga-ekpe ndị mere mmehie na-achọghị ichegharị ikpe n’ihi otú ha si meso ndị ọzọ ihe. w19.02 22 ¶13-15

Sọnde, Jun 7

Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.​—Luk 22:42.

Izu ole na ole tupu Ncheta Ọnwụ Jizọs, ọmụmụ ihe anyị na-elekwasị anya n’ihe ndị Jizọs mere nakwa otú o si gosi na ọ dị umeala n’obi n’ihi iji ndụ ya chụọ àjà. Ọ na-eme ka anyị na-adị umeala n’obi ka Jizọs ma na-eme uche Jehova ma mgbe ime otú ahụ siiri anyị ike. Chegodị otú o si gosi na ya nwere obi ike n’ụbọchị ole na ole tupu ọnwụ ya. O doro ya anya na n’oge na-adịghị anya, ndị iro ya ga-eme ya ihe ọchị, pịa ya ihe, ma gbuo ya. (Mat. 20:​17-19) N’agbanyeghị ya, o ji obi ya niile kweta ịnwụ. Mgbe oge ahụ ruru, ọ gwara ndịozi ya, bụ́ ndị ya na ha nọ na Getsemeni, sị: “Bilienụ, ka anyị pụọ. Lee! Onye ga-arara m nye abịawo nso.” (Mat. 26:​36, 46) Mgbe ìgwè mmadụ ji ngwá agha bịara ijide ya, ọ gakwuuru ha ma kwuo na ọ bụ ya bụ Jizọs. Ọ gwara ndị agha nọ ebe ahụ ka ha hapụ ndịozi ya ka ha laa. (Jọn 18:​3-8) Ihe a o mere gosiri na o nwere obi ike. Taa, Ndị Kraịst e tere mmanụ na atụrụ ọzọ na-agbalị iṅomi Jizọs n’inwe obi ike. w19.01 27-28 ¶7-8

Mọnde, Jun 8

Chọọnụ ịdị umeala n’obi.​—Zef. 2:3.

Onye na-ese ihe na-eji ihe ndị nwere ụcha dị iche iche ese ihe ka ihe ọ na-ese nwee ike ịma mma. Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị inwe ezigbo àgwà dị iche iche ka anyị nwee ike ịdị umeala n’obi. Ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ bụ nrubeisi, obiọma, na obi ike. Ọ bụ naanị ndị dị umeala n’obi ga na-eme uche Chineke. Ihe so n’uche Chineke bụ ka anyị na-adị nwayọọ n’obi. (Mat. 5:5; Gal. 5:23) Ọ bụrụ na anyị emee uche Chineke, iwe na-ewe Setan. Ọ bụ ya mere na n’agbanyeghị na anyị dị nwayọọ, ndị bụ́ nke Setan na-akpọ anyị asị. (Jọn 15:​18, 19) N’ihi ya, anyị kwesịrị inwe obi ike ka anyị nwee ike imeri Setan. Onye na-adịghị umeala n’obi na-adị mpako, na-ewe oké iwe, ọ naghịkwa erubere Jehova isi. Ọ bụ àgwà ndị a ka e ji mara Setan. Ka a sịkwa ihe mere na ọ chọghị iji anya ahụ ndị dị umeala n’obi. Àgwà ọma ha na-akpa na-eme ka ndị mmadụ mata na ọ bụ onye obi ọjọọ n’ihi na o nweghị àgwà ndị ahụ. Ihe ọzọ bụ na àgwà ndị a na-egosi na ọ bụ onye ụgha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na n’agbanyeghị ihe ọ bụla ọ na-ekwu ma ọ bụ na-eme, ọ gaghị akwụsịli ndị dị umeala n’obi ife Jehova.​—Job 2:​3-5. w19.02 8-9 ¶3-5

Tuzdee, Jun 9

Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.​—Aịza. 41:10.

Jehova ma na ụjọ ga-ejide ndị Babịlọn. Ndị agha Midia na Peshia bụ́ azụ eru ala ga-alụso ndị Babịlọn ọgụ. Jehova ga-eji ndị agha a napụta ndị ya n’aka ndị Babịlọn dọọrọ ha n’agha. (Aịza. 41:​2-4) Mgbe ndị Babịlọn na mba ndị ọzọ matara na ndị iro ha na-abịa, ha gbara mbọ kata obi ma gwa ibe ha, sị: “Dị ike.” Ha mekwara ọtụtụ arụsị, ma na-atụ anya na arụsị ndị ahụ ga-echebe ha. (Aịza. 41:​5-7) Ma, Jehova mere ka obi ruo ndị Juu a dọọrọ n’agha ala. Ọ gwara ha, sị: “Ma gị onwe gị, Izrel, [unu adịghị ka ndị agbata obi unu] bụ ohu m. . . Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.” (Aịza. 41:​8-10) Ị̀ hụrụ na Jehova kwuru, sị: “Abụ m Chineke gị”? Jehova ji okwu ndị a na-eme ka obi sie ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi ike na ya ahapụbeghị ha, nakwa na ha ka bụ ndị ya. Ọ gwara ha, sị: ‘M ga na-eku unu, meekwara unu ụzọ mgbapụ.’ O doro anya na okwu ndị a Jehova ji kasie ndị Juu a dọọrọ n’agha obi mere ka okwukwe ha sikwuo ike.​—Aịza. 46:​3, 4. w19.01 4 ¶8

Wenezdee, Jun 10

Otu olu wee si n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.”​—Mak 1:11.

Mak 1:​9-11 bụ ebe mbụ n’ime ebe atọ Jehova si n’eluigwe kwuo okwu na Baịbụl. Jehova kwuru, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya; ihe gị masịrị m.” Ọ ga-abụrịrị na okwu ahụ Jehova gwara Jizọs iji gosi na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na ọ tụkwasịrị ya obi ruru ya n’obi. Ihe a Jehova kwuru gosiri ihe atọ dị mkpa gbasara Jizọs. Nke mbụ, Jizọs bụ Ọkpara ya. Nke abụọ, Jehova hụrụ Ọkpara ya n’anya. Nke atọ, ihe Jizọs masịrị Jehova. Jehova ji okwu ndị a bụ́ “Ị bụ Ọkpara m” mee ka o doo anya na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ga-enwe ọrụ ọhụrụ ọ ga-arụ. Mgbe Jizọs nọ n’eluigwe, ọ bụ ọkpara Chineke bụ́ mmụọ. Ma mgbe e mere ya baptizim, Jehova jizi mmụọ nsọ tee ya mmanụ. N’oge ahụ, Jehova mere ka a mata na Jizọs, bụ́ Ọkpara Ya e tere mmanụ, nweziri olileanya ịlaghachi eluigwe ịbụ Eze na Nnukwu Onye Nchụàjà Chineke họpụtara. (Luk 1:​31-33; Hib. 1:​8, 9; 2:17) Ọ bụ ya mere na mgbe e mere Jizọs baptizim, Nna ya kwuru, sị: “Ị bụ Ọkpara m.”​—Luk 3:22. w19.03 8 ¶3-4

Tọzdee, Jun 11

Ọ dịghị amamihe . . . ọ bụla nke pụrụ iguzogide Jehova.​—Ilu 21:30.

Ndụmọdụ ọjọọ malitere kemgbe oge Adam na Iv, mgbe Setan nyere Iv ndụmọdụ ọjọọ. Ọ gwara Iv na ha ga na-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha ejiri aka ha na-ekpebiri onwe ha ihe ndị masịrị ha. (Jen. 3:​1-6) Setan bu ọdịmma nke ya n’obi nye Iv ndụmọdụ ahụ. Ihe ọ chọrọ bụ ka Adam na Iv na ụmụ ha na-efe ya, kama ife Jehova. Ma, ọ bụ Jehova nyere ha ihe niile ha ji biri. Ọ bụ ya mere ka ha bụrụ di na nwunye, dowe ha n’ogige mara mma, nyekwa ha ahụ́ zuru okè nke ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ma, ọ dị mwute na Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, si otú ahụ kewapụ onwe ha n’ebe Chineke nọ. Anyị ma na nsogbu ọ kpatara abụghị ihe e ji ọnụ akọ. Dị ka okooko osisi a kụtara n’osisi ya, ha ji nwayọọ nwayọọ kaa nká ma nwụọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ụmụ ha. (Rom 5:12) N’agbanyeghị ihe ndị a, ọtụtụ ndị taa anaghị asọpụrụ Chineke otú ahụ Adam na Iv na-asọpụrụghị ya. Ha na-ebi ndụ otú masịrị ha. (Efe. 2:​1-3) Ihe mechara mee gosiri na ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si bụ eziokwu. w18.12 20 ¶3-4

Fraịdee, Jun 12

Anyị ejighị okwu e ji amamihe mmadụ kụzie na-ekwu ya, kama anyị ji okwu e ji mmụọ nsọ kụzie na-ekwu ya, na-ejikọta ihe ime mmụọ na okwu ime mmụọ.​—1 Kọr. 2:13.

Pọl onyeozi bụ nwoke maara ihe, ọ gụkwara akwụkwọ. Ọ dịkarịa ala, ọ na-asụ asụsụ abụọ. (Ọrụ 5:34; 21:​37, 39; 22:​2, 3) Ma, mgbe o ruru n’ikpebi ihe ọma na ihe ọjọọ, o kweghị ka echiche ụwa a duzie ya. Kama, o ji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru mee mkpebi ya. (Ọrụ 17:2; 1 Kọr. 2:​6, 7) Ihe a mere ka ozi ya gaa nke ọma, ya enweekwa olileanya inweta ụgwọ ọrụ ga-adịru ebighị ebi. (2 Tim. 4:8) O doro anya na echiche Chineke karịrị echiche nke ụwa a. Anyị soro echiche Chineke, anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ, ihe agaziekwara anyị. Ma, Jehova agaghị amanye anyị ka anyị soro echiche ya. “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na ndị okenye anaghịkwa amanye anyị ka anyị mee otú ahụ. (Mat. 24:45; 2 Kọr. 1:24) Onye Kraịst nke ọ bụla ga-eji aka ya mee ka echiche ya daba n’echiche Chineke. w18.11 20-21 ¶12-13

Satọdee, Jun 13

Iru uju na ịsụ ude ga-agbafu.​—Aịza. 35:10.

Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo na mgbe ndị Izrel laghachiri n’obodo ha, na udo ga-adị. E nweghị onye ga na-atụ ụjọ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ imerụ ya ahụ́. O nweghịkwa ihe ga-eme ma onye ukwu ma onye nta. (Aịza. 11:​6-9; 35:​5-10; 51:3) Aịzaya kwukwara na n’ụwa niile, ọ bụghị naanị ná mba Izrel, na “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.” Ihe ọzọ Aịzaya kwuru bụ na ndị mmadụ ma ọ bụ ụmụ anụmanụ agaghị emerụ ndị Izrel si na Babịlọn laghachi n’ala ha ahụ́. Ala ha ga-amị ezigbo mkpụrụ, n’ihi na ọ ga na-enweta mmiri zuru ezu, otú ahụ ọ dị n’ogige Iden. (Jen. 2:​10-14; Jere. 31:12) Ọ̀ bụ naanị mgbe ahụ ka amụma a mezuru? E nweghị ihe gosiri na a gwọrọ ndị Izrel laghachirinụ ọrịa ha. Dị ka ihe atụ, e meghị ka ndị ìsì hụwa uzọ. N’ihi ya, Chineke ji amụma a na-egosi na ya ga-agwọ ndị mmadụ ọrịa ha n’ọdịnihu. w18.12 5 ¶11-12

Sọnde, Jun 14

Na-eje ije n’eziokwu ahụ.​—3 Jọn 3.

Ije ije n’eziokwu bụ ihe anyị ga na-eme mgbe niile. Anyị nwere olileanya ịna-eme ya ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide ná mkpebi anyị mere ịna-eje ije n’eziokwu? Anyị kwesịrị ịnọgide na-amụ eziokwu nke Okwu Chineke magburu onwe ya ma na-echebara ihe ndị anyị mụtara echiche. Anyị kwesịrị ịzụta eziokwu. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-ewepụta oge na-amụ Okwu Chineke mgbe niile. Ime otú a ga-eme ka anyị jiri eziokwu kpọrọkwuo ihe, meekwa ka anyị nọgide ná mkpebi anyị mere na anyị agaghị ahapụ ya. E wezụga ịzụta eziokwu, Ilu 23:23 kwukwara na anyị kwesịrị ịzụta “amamihe na ịdọ aka ná ntị na nghọta.” Mmadụ ịmụta eziokwu dị na Baịbụl abụghị ebe okwu biri. Anyị ga na-eme eziokwu ndị ahụ anyị mụtara eme. Anyị ghọta eziokwu, anyị etinyekọta ya n’ihe ndị anyị mụtara nakwa n’ihe ndị anyị ma. Amamihe na-eme ka anyị na-eme ihe ndị ahụ anyị ma. Mgbe ụfọdụ, a na-eji eziokwu adọ anyị aka ná ntị, na-eme ka anyị mata ebe anyị kwesịrị ịgbanwe ihe ná ndụ anyị. Anyị kwesịrị ịna-anabata aka ná ntị a na-adọ anyị ma mee ihe ozugbo banyere ya. Uru ọ ga-abara anyị karịrị ọlaọcha.​—Ilu 8:10. w18.11 9 ¶3; 11 ¶13-14

Mọnde, Jun 15

Zụta eziokwu, erekwala ya.​—Ilu 23:23.

Olee ihe i nwere nke kacha gị mkpa? Ị̀ ga-achọ iji ya gbanwere ihe na-adịchaghị gị mkpa? Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova nyefere ya onwe anyị, azịza ajụjụ ndị a ataghị akpụ. Otu ihe kacha anyị mkpa anyị nwere bụ adịm ná mma anyị na Jehova. Anyị agaghị achọ iji ya gbanwere ihe ọ bụla ọzọ. Ihe ọzọ kacha anyị mkpa bụ eziokwu dị na Baịbụl, n’ihi na ọ bụ ya mere ka anyị na Nna anyị nke eluigwe dịrị n’ezigbo mma. (Kọl. 1:​9, 10) Chegodị ihe niile Onye Ozizi Ukwu anyị na-akụziri anyị na Baịbụl. Ọ na-akụziri anyị mkpa aha ya dị nakwa àgwà ya ndị magburu onwe ha. Ọ na-agwa anyị na ya hụrụ anyị n’anya nke na o nyere anyị Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. Jehova na-akụzikwara anyị banyere Alaeze Mesaya na olileanya ibi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ Paradaịs. Ọ na-akụziri anyị otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ. Anyị ji eziokwu ndị a kpọrọ ihe n’ihi na ha na-eme ka anyị na-abịaru Onye Okike anyị nso, na-emekwa ka ndụ anyị nwee isi. w18.11 3 ¶1-2

Tuzdee, Jun 16

Unu adịla na-aghara ibe unu ụgha.​—Kọl. 3:9.

Ndị na-aghọ aghụghọ enweghị ike ịghọgbu Jehova, n’ihi na “ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe” n’anya ya. (Hib. 4:13) Di ka ihe atụ, Ananayas na Safaịra kpara nkata n’obi ha ịghọgbu ndịozi. Ha rere ụfọdụ ihe onwunwe ha ma wetara ndịozi ụfọdụ ego ha retara. Ha chọrọ ka a na-eto ha n’ọgbakọ, n’ihi ya, ha gwara ndịozi na ha wetachara ego niile ha retara. Ma, Jehova ma na ha ghara ụgha, ma gbuo ha. (Ọrụ 5:​1-10) Olee otú Jehova si ele ịgha ụgha anya? Ndị ụgha niile obi tara mmiri, bụ́ ndị na-achọghị ichegharị, ga-aba “n’ime ọdọ ọkụ” ka Setan. (Mkpu. 20:10; 21:8; Ọma 5:6) Anyị ma na Jehova “abụghị mmadụ nke na ọ ga-agha ụgha.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ‘ọ gaghị ekwe omume Chineke ịgha ụgha.’ (Ọnụ Ọgụ. 23:19; Hib. 6:18) ‘Jehova kpọrọ ire na-agha ụgha asị.’ (Ilu 6:​16, 17) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị ya mma, anyị kwesịrị ikwu eziokwu mgbe niile. w18.10 8 ¶10-13

Wenezdee, Jun 17

Na-echebara ihe ndị a echiche.​—1 Tim. 4:15.

Ka e were ya na onye were gị n’ọrụ sị gị soro tụọ ego a ga-eji eme ememme ndị okpukpe ụgha. Gịnị ka ị ga-eme? Kama ichere ka ụdị ihe ahụ mee tupu gị ekpebie ihe ị ga-eme, ọ ka mma ka i chebara ha echiche ugbu a iji mata otú Jehova si ele ụdị ihe ndị ahụ anya. Ọ bụrụzie na ụdị ihe ndị ahụ ebilite, ọ ga-adịrị gị mfe ime mkpebi dị mma. Ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ kpebie na o nweghị ihe ga-eme ka anyị mebie iwu Jehova, ọ ga-enyekwara anyị aka ma ọ bụrụ na e bugara anyị ụlọ ọgwụ. Ọ bụ eziokwu na anyị kpebisiri ike na anyị agaghị ekwe ka a mịnye anyị ọbara ma ọ bụ ihe anọ bụ́ isi dị n’ọbara, ma, e nwere ihe ndị ọzọ metụtara ọbara anyị ga-eji ihe anyị mụtara na Baịbụl kpebie ihe anyị ga-eme. (Ọrụ 15:​28, 29) O doro anya na oge kacha mma iji mee ụdị mkpebi a abụghị mgbe anyị nọ n’ụlọ ọgwụ, ahụ́ ana-enye anyị nsogbu, ya adịkwa mkpa ka anyị mee mkpebi ngwa ngwa. Ọ bụ ugbu a ka anyị kwesịrị iwepụta oge mee nchọnchọ, dejupụta fọm iwu kwadoro anyị ji kwuo otú anyị chọrọ ka e si gwọọ anyị ọrịa, ma gwa dọkịta anyị banyere ya. w18.11 24 ¶5; 26 ¶15-16

Tọzdee, Jun 18

Onye na-ege m ntị ga-ebi n’obi iru ala.​—Ilu 1:33.

Jehova bụ onye ọzụzụ atụrụ hụrụ ndị ya n’anya ma na-echebe ha n’aka ndị iro ha. Nke a na-eme ka obi sie anyị ezigbo ike n’ihi na ọ fọrọ obere ka Jehova bibie ụwa Setan a. Jehova ka ga na-elekọta ndị ya ruo oké mkpagbu a ga-enwe n’oge na-adịghị anya. (Mkpu. 7:​9, 10) N’ihi ya, ma hà bụ nwata ma hà bụ agadi, ma ahụ́ ọ̀ gbasiri ha ike ma hà nwere nkwarụ, ụjọ agaghị atụ ndị ohu Chineke n’oge oké mkpagbu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ha ga-emedị ihe dị iche. Ha ga-echeta ihe a Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Guzonụ kwem ma welie isi unu elu, n’ihi na nnapụta unu na-eru nso.” (Luk 21:28) Obi ga na-esi ha ike na Jehova ga-echebe ha ma mgbe Gọg, bụ́ ọtụtụ mba dị ike gbakọrọ aka ọnụ ga-alụso ha ọgụ. (Ezik. 38:​2, 14-16) Gịnị mere obi ga-eji na-esi ndị ohu Chineke ike? Ha ma na Jehova anaghị agbanwe agbanwe. Ọ ga na-egosi na ya bụ Onye Nzọpụta nke hụrụ ndị ya n’anya ma na-echebe ha.​—Aịza. 26:20. w18.09 26 ¶15-16

Fraịdee, Jun 19

Ị dị oké ọnụ ahịa n’anya m . . . m hụkwara gị n’anya.​—Aịza. 43:4.

Chegodị otú obi dị ndị Izrel mgbe Jehova gwara ha ihe e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Ebe ị bụ ohu Jehova, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu. Baịbụl gwara ndị na-efe Chineke, sị: “Dị ka Dike, ọ ga-azọpụta gị. Ọ ga-enwe aṅụrị n’ihi gị.” (Zef. 3:​16, 17) Jehova kwere ndị ohu ya nkwa na ya ga-akasi ha obi, meekwa ka ha dị ike n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara ha. Baịbụl kwuru, sị: “Unu ga-aṅụkwa ara. A ga-eku unu n’akụkụ, a ga-ekukwasị unu n’ikpere, na-adịda unu aka. Dị ka nwoke nke nne ya na-akasi obi, otú ahụ ka mụ onwe m ga na-akasi unu obi.” (Aịza. 66:​12, 13) Chegodị otú obi na-esi atọ nwatakịrị ụtọ mgbe nne ya ku ya ma ọ bụ na-egwusa ya egwú. Jehova hụrụ gị n’anya nke ukwuu ma chọọ ka obi na-atọ gị ụtọ. Ka obi sie gị ike na ọ hụrụ gị n’anya ma jiri gị kpọrọ ihe.​—Jere. 31:3. w18.09 13 ¶6-7

Satọdee, Jun 20

Ònye n’ime unu na-ewepụta onwe ya iwetara Jehova onyinye taa?​—1 Ihe 29:5.

N’oge gara aga, ndị Izrel nwere ọtụtụ ụzọ ha si wepụta onwe ha rụọ ọrụ. (Ọpụ. 36:2; Nehe. 11:2) Taa, e nwekwara ọtụtụ ụzọ i nwere ike isi jiri oge gị, ihe ndị i nwere, na nkà gị nyere ụmụnna gị aka. Obi ga na-atọ gị ụtọ, Jehova ga-agọzikwa gị mmaji kwuru mmaji. Ndị na-ewepụta onwe ha arụ ọrụ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova na-emetakarị ndị enyi ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Margie so na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ruo afọ iri na asatọ. N’afọ niile ahụ, o metere ọtụtụ ụmụnna nwaanyị na-eto eto enyi ma kụziere ha ọrụ. O kwuru na ime ihe ndị a bụ ụzọ magburu onwe ya ha si na-agbarịta ibe ha ume. (Rom 1:12) Mgbe nwanna nwaanyị a nwere nsogbu, ndị enyi o metere mgbe ha na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze gbara ya ume. Ì wepụtatụla onwe gị rụọ ụdị ọrụ a? w18.08 25 ¶9, 11

Sọnde, Jun 21

Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya n’ihi na ị bụ okorobịa. Kama nke ahụ, bụụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ihe nlereanya, n’ikwu okwu, n’omume, n’ịhụnanya, n’okwukwe, n’ịdị ọcha.​—1 Tim. 4:12.

Mgbe Pọl degaara Timoti akwụkwọ a, o nwere ike ịbụ na Timoti dị ihe dị ka afọ iri atọ. Ma, Pọl nyere ya ọrụ ndị dị mkpa ọ ga na-arụ. N’agbanyeghị ihe mere o ji nye ya ndụmọdụ a, ihe o kwuru doro anya. Anyị ekwesịghị iji afọ ndụ nwanna ekpebi otú anyị ga-esi ewere ya. Anyị kwesịrị icheta na Onyenwe anyị Jizọs jechara ozi niile o jere n’ụwa mgbe ọ dị afọ iri atọ na atọ. O nwere ike ịbụ na anyị si n’obodo a na-eledakarị ndị na-eto eto anya. Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike isiri ndị okenye ike ịtụ aro ka a họpụta nwa okorobịa na-eme nke ọma n’ọgbakọ ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. Ndị okenye niile kwesịrị icheta na Baịbụl ekwughị afọ ole nwanna ga-eru tupu a tụọ aro ka a họpụta ya ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi.​—1 Tim. 3:​1-10, 12, 13; Taị. 1:​5-9. w18.08 11-12 ¶15-16

Mọnde, Jun 22

Na-agbakụta . . . ihe . . . a na-akpọ “ihe ọmụma” n’ụzọ ụgha [azụ].​—1 Tim. 6:20.

Ka anyị nwee ike ime mkpebi dị mma, anyị kwesịrị ịmata nke bụ́ eziokwu. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịsa anya ná mmiri họrọ ihe ndị anyị ga-agụ. (Fil. 4:​8, 9) Anyị ekwesịghị iji oge anyị na-agụ akụkọ ụwa n’ebe a na-enyo enyo n’Ịntanet ma ọ bụ na-agụ ozi iimel a na-amaghị ma hà mere eme. Anyị kwesịrị izere ebe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-agbasa ozi n’Ịntanet. Ihe bụ́ mkpa ha bụ ime ka okwukwe ndị ohu Chineke ghara isi ike na ime ka ndị mmadụ kwere ihe ndị na-abụghị eziokwu. Ọ bụrụ na anyị ana-agụ akụkọ ndị anyị na-amaghị ma hà bụ eziokwu, ọ ga-eme ka anyị mee mkpebi ndị na-adịghị mma. Anyị ekwesịghị iche na o nweghị ihe akụkọ ndị na-abụghị eziokwu anyị nụrụ ga-eme anyị. N’oge Mozis, e zipụrụ mmadụ iri na abụọ ka ha gaa ledoo Ala Nkwa ahụ. Mmadụ iri n’ime ha kọọrọ ndị Izrel akụkọ ọjọọ. (Ọnụ Ọgụ. 13:​25-33) Otú ha si tinye akụkọ ha nnu na ose mere ka ezigbo ụjọ tụọ ndị Jehova. (Ọnụ Ọgụ. 14:​1-4, 6-10) Kama ha ga-agbalị mata nke bụ́ eziokwu ma tụkwasị Jehova obi, ha kweere akụkọ ọjọọ ahụ. w18.08 4 ¶4-5

Tuzdee, Jun 23

Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.​—1 Kọr. 15:33.

Ọtụtụ ndị taa nwere ụfọdụ àgwà ọma ndị ha na-akpa. Ọtụtụ ndị na-anọghị n’ọgbakọ anaghị eme ihe ọjọọ mgbe niile. O nwere ike ịbụ na ị ma ụfọdụ n’ime ha. Nke a ọ̀ pụtara na gị na ha kwesịrị ịna-akpa? Jụọ onwe gị ma gị na ha na-akpa, hà ga-emebi adịm ná mma mụ na Jehova ka hà ga-eme ka mụ na ya dịrịkwuo ná mma? Gịnị ka ha na-eche n’obi ha? Dị ka ihe atụ, hà na-ekwukarị gbasara ejiji, ego, ngwá elektrọniks, ntụrụndụ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ yiri ha? Hà na-akatọkarị ndị ọzọ ma ọ bụ na-ekwu okwu rụrụ arụ? Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Mat. 12:34) Ọ bụrụ na ị chọpụta na ndị gị na ha na-akpa na-emebi adịm ná mma gị na Jehova, mee ihe ozugbo. Selata aka n’otú gị na ha si akpa. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa, kwụsị gị na ha ịna-akpa.​—Ilu 13:20. w18.07 19 ¶11

Wenezdee, Jun 24

Mozis dị nnọọ umeala n’obi karịa mmadụ niile nọ n’elu ala.​—Ọnụ Ọgụ. 12:3.

Mgbe Mozis dị afọ iri asatọ, Jehova nyere ya ọrụ ịnapụta ndị Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt. (Ọpụ. 3:10) Ọtụtụ ugboro, Mozis kwuru ihe gosiri na ya achọghị ịrụ ọrụ ahụ. Ma, Jehova nọgidere na-enwere ya ndidi. O nyedịrị ya ikike ịrụ ọrụ ebube. (Ọpụ. 4:​2-9, 21) Ọ gaara eyi Mozis egwu ka o mee ihe ọ gwara ya ozugbo. Kama, Jehova nweere Mozis ndidi ma gosi ya obiọma. O mekwara ka obi sie ohu ya a dị umeala n’obi ike na ọ ga-anọnyere ya. Ihe Jehova mere ọ̀ baara Mozis uru? À na-ajụkwa ajụ? Mozis ghọrọ ezigbo onye ndú. Ọ gbalịrị iji nwayọọ na-emeso ndị ọzọ ihe ma na-echebara ha echiche otú ahụ Jehova si meso ya ihe. Ọ bụrụ na e nwere ndị e nyere gị ikike ilekọta, ọ dị mkpa ka ị na-eṅomi Jehova. Otú ị ga-esi eme ya bụ ịna-echebara ndị ị na-elekọta echiche, ịna-egosi ha obiọma, ma na-enwere ha ndidi mgbe ị na-emeso ha ihe. (Kọl. 3:​19-21; 1 Pita 5:​1-3) Ọ bụrụ na ị gbalịa na-eṅomi Jehova na Jizọs Kraịst, bụ́ Mozis nke Ka Ukwuu, ọ ga-adịrị ndị ọzọ mfe ịna-abịakwute gị, gị ana-agbakwa ha ume.​—Mat. 11:​28, 29. w18.09 24-25 ¶7-10

Tọzdee, Jun 25

Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ mgbe ụmụnne bikọtara ọnụ n’ịdị n’otu!​—Ọma 133:1.

Gbalịa ka ị na-akpaso ụmụnna gị àgwà ọma. Ọ ga-eme ka ọgbakọ dịrịkwuo n’otu. Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, anyị na-aja gị mma. Ì nwere ike ịgba mbọ na-amatakwu ụmụnna gị na ha nọ n’ọgbakọ? (2 Kọr. 6:​11-13) I kwesịkwara ịgbakwu mbọ mee ka ìhè nke eziokwu Baịbụl na-enwu n’ebe i bi. Otú i si eji olu ọma agwa ndị mmadụ okwu n’ebe i bi na ihe ọma ndị ị na-emere ha nwere ike ime ka onye agbata obi gị bata n’ọgbakọ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú ndị agbata obi m si ele m anya? Ụlọ m na gburugburu ya, ọ̀ na-adị ọcha? Ọ̀ na-eme ka ebe m bi dịkwuo mma n’anya? M̀ na-enyere ndị ọzọ aka?’ Ọ bụrụ na gị na ụmụnna ndị ọzọ ekwurịtawa okwu, i nwere ike ịjụ ha otú àgwà ọma ha si baara ndị ọzọ uru. O nwere ike ịbụ ndị agbata obi ha, ndị ọrụ ha, ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha. I nwere ike ịnụ ihe ndị nwere ike ịgba gị ume.​—Efe. 5:9. w18.06 24 ¶13-14

Fraịdee, Jun 26

Oge awa na-abịa mgbe onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ya jeere Chineke ozi dị nsọ.​—Jọn 16:2.

Otú ahụ ka ndị gburu Stivin onye na-eso ụzọ Jizọs chere. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị ọzọ. (Ọrụ 6:​8, 12; 7:​54-60) Kemgbe ụwa, ọtụtụ ndị bú okpukpe ha n’isi na-eme ihe jọgburu onwe ha, dị ka igbu ọchụ, ma na-eche na ọ bụ Chineke ka ha meere ya. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ihe a ha mere megidere iwu Chineke. (Ọpụ. 20:13) O doro anya na akọnuche ha duhiere ha. Gịnị ka anyị ga-eme ka akọnuche anyị na-arụ ọrụ nke ọma? Iwu na ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke ‘bara uru iji zie ihe, iji dọọ mmadụ aka ná ntị, iji mee ka ihe guzozie, na iji nye ọzụzụ n’ezi omume.’ (2 Tim. 3:16) N’ihi ya, anyị ga na-amụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche ma na-eme ha eme. Anyị mee otú ahụ, anyị ga-azụ akọnuche anyị ka anyị nwee ike ịna-eche echiche otú Chineke si eche. Ọ ga-emekwa ka akọnuche anyị na-eduzi anyị nke ọma. w18.06 16-17 ¶3-4

Satọdee, Jun 27

Narakwanụ . . . mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke.​—Efe. 6:17.

Mgbe Pọl dere akwụkwọ ozi a, mma agha ndị agha Rom na-eji alụ agha na-adị ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ amaụkwụ abụọ n’ogologo. Ihe mere ha ji eji ya alụ agha nke ọma bụ n’ihi na ha na-amụ otú e si eji ya alụ agha kwa ụbọchị. Pọl ji Okwu Chineke tụnyere mma agha Jehova nyere anyị. Ma, anyị kwesịrị ịgbalị bụrụ aka ochie n’iji Okwu Chineke agbachitere ihe anyị kweere ma ọ bụ iji ya agbanwe echiche na-adịghị mma anyị nwere. (2 Kọr. 10:​4, 5; 2 Tim. 2:15) Anyị ekwesịghị ịtụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya egwu. Ha siri ike, ma Jehova ka ha ike. Ha agaghị adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. N’oge na-adịghị anya, n’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, a ga-atụ ha mkpọrọ ka ha ghara ịna-eduhie ndị mmadụ ọzọ. E mechaa, a ga-ebibi ha. (Mkpu. 20:​1-3, 7-10) Anyị ma onye iro anyị, otú o si alụso anyị ọgụ, nakwa ihe ndị o bu n’obi ime. Jehova ga-enyere anyị aka iguzogide ya. w18.05 30 ¶15; 31 ¶19-21

Sọnde, Jun 28

Agwọ ahụ wee sị nwaanyị ahụ: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.”​—Jen. 3:4.

Adam ma na agwọ enweghị ike ikwu okwu. Ọ ga-abụ na ọ ghọtara na ọ bụ otu mmụọ mere ka agwọ ahụ gwa Iv okwu. (Jen. 3:​1-6) Adam na Iv amachaghị onye mmụọ a bụ. N’agbanyeghị nke ahụ, Adam kpachaara anya hapụ Nna ya nke eluigwe ma sonyere mmụọ a nupụrụ Chineke isi. (1 Tim. 2:14) Ozugbo ahụ, Jehova mere ka a matawa banyere onye iro a mere ka Adam na Iv nupụrụ ya isi, kwekwa nkwa na ọ ga-emecha bibie ya. Ma, Jehova kwuru na ka ọ dị ugbu a, mmụọ ahụ mere ka agwọ kwuo okwu ga-emegide ndị hụrụ Chineke n’anya. (Jen. 3:15) Jehova agwaghị anyị aha mmụọ ozi ahụ nupụụrụ ya isi. Ọ bụ mgbe puku afọ abụọ na narị ise gachara e nupụụrụ ya isi ka o mere ka a mata onye ọ bụ.​—Job 1:6. w18.05 22 ¶1-2

Mọnde, Jun 29

Ndị ahụ . . . bụ ndị . . . [ji] ntachi obi na-amị mkpụrụ.​—Luk 8:15.

Ọ bụrụ na ị datụla mbà n’obi n’ihi ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị egekarị ntị, ị ga-aghọta otú obi dị Pọl onyeozi n’oge ya. O jere ozi ihe dị ka afọ iri atọ, nyekwara ọtụtụ ndị aka ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. (Ọrụ 14:21; 2 Kọr. 3:​2, 3) Ma, o meghị ka ndị Juu niile fewe Chineke. Kama nke ahụ, ọtụtụ ndị egeghị ya ntị, ndị ọzọ mesidịrị ya ike. (Ọrụ 14:19; 17:​1, 4, 5, 13) Olee otú obi dị ya n’ihi otú ndị Juu si meso ya ihe? Ọ sịrị: “Eziokwu ka m na-ekwu n’ime Kraịst, . . . m nwere oké iru uju na ihe mgbu na-adịghị akwụsị akwụsị n’ime obi m.” (Rom 9:​1-3) Gịnị mere obi ji dịrị Pọl otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na obi ya niile dị n’ikwusa ozi ọma. Ihe mere o ji kwusaara ndị Juu ozi ọma bụ n’ihi na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. N’ihi ya, o wutere Pọl na ha jụrụ ebere Chineke meere ha. Ihe mere anyị ji na-ezi ndị mmadụ ozi ọma bụ n’ihi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi otú ahụ ihe banyere ndị mmadụ metụrụ Pọl n’obi.​—Mat. 22:39; 1 Kọr. 11:1. w18.05 13 ¶4-5

Tuzdee, Jun 30

Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya, ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.​—Ilu 12:25.

Ihe Pọl kwuru gosiri na onye na-agba ndị ọzọ ume kwesịkwara ka a gbaa ya ume. O degaara Ndị Kraịst bi na Rom akwụkwọ ozi, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu, ka m wee nyetụ unu onyinye ime mmụọ, ka e wee mee ka unu guzosie ike; ma ọ bụ, kama nke ahụ, ka anyị wee gbarịta ibe anyị ume, onye ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya, ma nke unu ma nke m.” (Rom 1:​11, 12) N’ihi ya, e kwesịkwara ịgba Pọl ume mgbe ụfọdụ. (Rom 15:​30-32) E kwesịrị ịja ụmụnna ndị hapụrụ ihe ụfọdụ ka ha nwee ike ijekwuru Jehova ozi, mma. Ụmụnna anyị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi na ha chọrọ ime ihe Baịbụl kwuru, nke bụ́ ka anyị lụọ “naanị n’ime Onyenwe anyị,” bụkwa ndị ọzọ anyị kwesịrị ịgba ume. (1 Kọr. 7:39) Ndị Kraịst a na-akpagbu ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa ma ha anọgide na-efe Jehova, kwesịkwara ka a gbaa ha ume.​—2 Tesa. 1:​3-5. w18.04 21 ¶3-5

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya