Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es20 p. 67-77
  • Julaị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Julaị
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
  • Isiokwu Nta
  • Wenezdee, Julaị 1
  • Tọzdee, Julaị 2
  • Fraịdee, Julaị 3
  • Satọdee, Julaị 4
  • Sọnde, Julaị 5
  • Mọnde, Julaị 6
  • Tuzdee, Julaị 7
  • Wenezdee, Julaị 8
  • Tọzdee, Julaị 9
  • Fraịdee, Julaị 10
  • Satọdee, Julaị 11
  • Sọnde, Julaị 12
  • Mọnde, Julaị 13
  • Tuzdee, Julaị 14
  • Wenezdee, Julaị 15
  • Tọzdee, Julaị 16
  • Fraịdee, Julaị 17
  • Satọdee, Julaị 18
  • Sọnde, Julaị 19
  • Mọnde, Julaị 20
  • Tuzdee, Julaị 21
  • Wenezdee, Julaị 22
  • Tọzdee, Julaị 23
  • Fraịdee, Julaị 24
  • Satọdee, Julaị 25
  • Sọnde, Julaị 26
  • Mọnde, Julaị 27
  • Tuzdee, Julaị 28
  • Wenezdee, Julaị 29
  • Tọzdee, Julaị 30
  • Fraịdee, Julaị 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
es20 p. 67-77

Julaị

Wenezdee, Julaị 1

Nọgidenụ na-aghọta ihe uche Jehova bụ.​—Efe. 5:17.

Anyị bi n’oge “dị oké egwu, nke tara akpụ.” Ihe ga na-esikwu ike tupu Jehova ebibie ụwa ochie a, ma mee ka udo dịrị n’ụwa a. (2 Tim. 3:1) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ònye ka m na-elekwasị anya ka o duzie m ma nyere m aka?’ Ọtụtụ narị afọ gara aga, otu ọbụ abụ kwuru na anyị kwesịrị ilekwasị Jehova anya ka o nyere anyị aka mgbe anyị nọ ná nsogbu. (Ọma 123:​1-4) O ji otú anyị si elekwasị Jehova anya tụnyere otú ohu si elekwasị nna ya ukwu anya. Olee ihe ihe a ọbụ abụ ahụ kwuru pụtara? Ohu na-elekwasị nna ya ukwu anya ka o nye ya nri nakwa ka o chebe ya. Ọ na-elekwasịkwa ya anya ka ọ ghọta ihe ndị ọ chọrọ ka o meere ya, ma mee ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị kwesịrị imeda obi na-amụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ka anyị mata ihe Jehova chọrọ ka anyị mee, ma mee ya. Ime ihe ndị a ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka mgbe anyị chọrọ ka o nyere anyị aka. w18.07 12 ¶1-2

Tọzdee, Julaị 2

Ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga- enwere onwe unu n’ezie.​—Jọn 8:36.

Jizọs na-ekwu gbasara ime ka ndị mmadụ gharazie “ịbụ ohu nke mmehie,” bụ́ ihe kacha kee ha agbụ ma na-emekpọ ha ọnụ kemgbe. (Jọn 8:34) Ọ bụghị naanị na mmehie nwere ike ime ka anyị na-eme ihe ọjọọ, kama, o nwekwara ike ime ka anyị ghara ịna-eme ihe anyị ma na o ziri ezi, ma ọ bụ mee ka anyị ghara ime ihe anyị nwere ike imeli. Nke a mere ka anyị bụrụ ohu nke mmehie, ya emezie ka ike ụwa na-agwụ anyị, anyị ana-ata ahụhụ, n’ikpeazụ, anyị anwụọ. (Rom 6:23) Ọ bụ naanị mgbe a tọhapụrụ anyị n’agbụ nke mmehie ka anyị ga-enwere onwe anyị otú ahụ Adam na Iv nwere tupu ha enupụrụ Chineke isi. Mgbe Jizọs sịrị, “ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m,” ihe ọ na-ekwu bụ na e nwere ihe a chọrọ ka anyị mee, ka o mee ka anyị nwere onwe anyị. (Jọn 8:31) Ebe ọ bụ na anyị enyefeela Chineke onwe anyị, anyị ajụla onwe anyị ma kpebie ịna-eme ihe Kraịst na-akụzi ebe ọ bụ na anyị bụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 16:24) Dị ka Jizọs kwere anyị ná nkwa, anyị ga-enwere onwe anyị n’eziokwu ma anyị rite uru zuru ezu n’ihe mgbapụta ahụ. w18.04 7 ¶14-16

Fraịdee, Julaị 3

N’ihi na ọ bụ naanị gị maara obi ụmụ mmadụ nke ọma.​—2 Ihe 6:30.

Jehova na-echebara ndị ohu ya echiche, ma mgbe ihe ha na-eche na-ekwesịchaghị ekwesị. Chegodị gbasara Jona. Chineke ziri onye amụma a ka ọ gaa gwa ndị Ninive na ya ga-ebibi ha. Mgbe ha chegharịrị, Chineke kpebiri na ya agaghịzi ebibi ha. Ma, obi adịghị Jona mma maka ihe a Jehova kpebiri ime. O wewere ‘iwe dị ọkụ’ n’ihi na amụma o buru na a ga-ebibi Ninive emezughị. Jehova nweere Jona ndidi ma nyere ya aka iche echiche otú kwesịrị ekwesị. (Jona 3:10–4:11) Ka oge na-aga, Jona ghọtara ihe Chineke na-akụziri ya. Jehova jikwa ya dee akụkọ a ka anyị mụta ihe na ya. (Rom 15:4) Otú Jehova si emeso ndị ohu ya ihe na-eme ka obi sie anyị ike na ọ na-enwere ndị ohu ya ọmịiko. Ọ ma ihe ya na onye ọ bụla n’ime anyị na-alụ. Ọ ma ihe niile anyị na-eche, otú obi na-adị anyị, na ihe ndị anyị ga-emeli. “Ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa [anyị] gabiga ihe [anyị] pụrụ idi.” (1 Kọr. 10:13) Okwu a na-akasi anyị obi. w19.03 16 ¶6-7

Satọdee, Julaị 4

Ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.​—Hib. 4:13.

N’Iwu Mozis, ndị okenye Izrel ga-ekpe ikpe ndị gbasara ofufe Jehova, kpeekwa ikpe ndị gbasara esemokwu na ime mpụ. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ. Ọ bụrụ na onye Izrel egbuo mmadụ, a gaghị egbu ya ozugbo. Ndị okenye obodo ya ga-achọpụta ihe merenụ tupu ha ekpebie ma à ga-egbu ya. (Diut. 19:​2-7, 11-13) Ndị okenye ga-ekpekwa ikpe ndị gbasara ọtụtụ ihe ndị Izrel na-eme kwa ụbọchị, ya bụ, ma idozi esemokwu ndị a na-enwe n’ihi ihe onwunwe ma nke di na nwunye. (Ọpụ. 21:35; Diut. 22:​13-19) Mgbe ndị okenye kpere ikpe ziri ezi, ndị Izrel emeekwa ihe Iwu kwuru, ọ na-abara mmadụ niile uru, meekwa ka a na-eto Jehova. (Lev. 20:​7, 8; Aịza. 48:​17, 18) Ihe a na-egosi anyị na ihe niile anyị na-eme ná ndụ dị Jehova mkpa. Ọ chọrọ ka anyị na-emeso ndị ọzọ ihe otú kwesịrị ekwesị iji gosi na anyị hụrụ ha n’anya. Ọ na-ahụ ihe ndị anyị na-eme, na-anụkwa ihe ndị anyị na-ekwu ma mgbe naanị anyị nọ. w19.02 23 ¶16-18

Sọnde, Julaị 5

O kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́; ma o mepeghị ọnụ ya.​—Aịza. 53:7.

Ọ na-esiri anyị ike ịdị umeala n’obi ma anyị na-echegbu onwe anyị. Anyị nwere ike ịgwa ndị mmadụ okwu ọjọọ ma ọ bụ meso ha ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Ọ bụrụ na e nwetụla mgbe i chegburu onwe gị, ihe Jizọs mere ga-enyere gị aka. Mgbe ọ fọrọ ọnwa ole na ole ka Jizọs nwụọ, e nwere ihe ndị nọ na-echegbu ya. Ọ ma na a ga-egbu ya nakwa na ọ ga-ata nnukwu ahụhụ. (Jọn 3:​14, 15; Gal. 3:13) Ọnwa ole na ole tupu ọnwụ ya, o kwuru na e nwere ihe na-ewute ya. (Luk 12:50) Mgbe ọ fọrọ ụbọchị ole na ole ka ọ nwụọ, o kwuru, sị: “Ọ dị ihe na-echegbu mkpụrụ obi m.” Ihe ndị o kwuru mgbe ọ na-agwa Chineke otú obi dị ya n’ekpere gosiri na ọ dị umeala n’obi ma na-erubere Chineke isi. (Jọn 12:​27, 28) Mgbe oge ahụ ruru, Jizọs ji obi ike nyefee ndị iro Chineke onwe ya, ha emee ka ọ taa ahụhụ tupu ya anwụọ ma menye ya ihere. N’agbanyeghị ihe ndị ahụ, Jizọs mere uche Chineke. N’ihi ya, obi siri anyị ike ikwu na Jizọs bụ onye kacha dịrị umeala n’obi mgbe e nwere ihe na-echegbu ya.​—Aịza. 53:10. w19.02 11 ¶14-15

Mọnde, Julaị 6

Ka anyị [na-echebara] ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.​—Hib. 10:24.

Ka anyị nwee ike ịna-agachi ọmụmụ ihe anya, anyị kwesịrị igosi na anyị nwere obi ike ma mgbe anyị nọ n’ọnọdụ tara akpụ. Ụfọdụ ụmụnna anyị na-abịa ọmụmụ ihe n’agbanyeghị na ha dara mbà n’obi, na-eru uju ma ọ bụ na-arịa ọrịa. Ndị ọzọ na-eji obi ike abịa ya n’agbanyeghị na ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ọchịchị na-emekpọ ha ọnụ. Chegodị otú obi ike anyị nwere si eme ka ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. (Hib. 13:3) Ha nụ na anyị nọgidere na-efe Jehova n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara anyị, ọ na-agba ha ume ịnọgide na-efe Chineke, meekwa ka ha na-enwe obi ike ma na-ekwesị ntụkwasị obi. Mgbe Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Rom, obi tọrọ ya ụtọ mgbe ọ bụla ọ nụrụ na ụmụnna ya ka na-efe Chineke. (Fil. 1:​3-5, 12-14) Obere oge tupu a tọhapụ ya ma ọ bụ obere oge a tọhapụchara ya, o degaara ndị Hibru, bụ́ Ndị Kraịst akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ gwara ha ka ha ghara ịhapụ nzukọ ha.​—Hib. 10:25. w19.01 28 ¶9

Tuzdee, Julaị 7

Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.​—1 Jọn 5:19.

Setan chọrọ ka anyị dị ka ya. Ọ bụ onye nnupụisi na-anaghị eji ihe Jehova kwuru kpọrọ ihe. Ihe mere o ji eme ya bụ na ọ na-eme ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Ndị juru n’ụwa a bụ ndị o mebirila obi ha. Ọ chọrọ ka anyị na ha na-akpa, ka ha “na-emebi” otú anyị si eche echiche nakwa otú anyị si akpa àgwà. (1 Kọr. 15:33) Otú ọzọ Setan si agbalị imebi obi anyị bụ ime ka anyị tụkwasị amamihe mmadụ obi kama iche echiche otú Chineke si eche echiche. (Kọl. 2:8) Ka anyị tụlee otu echiche Setan na-eme ka ndị mmadụ na-enwe. Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-eche na ịba ọgaranya kwesịrị ịbụ ihe kacha mkpa ná ndụ. Ndị na-eche ụdị echiche a nwere ike ịba ọgaranya, ha nwekwara ike ha agaghị aba. Nke ọ bụla ọ bụ, ha nọ ná nsogbu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha nwere ike itinye isi n’ịchụ ego nke na ha anaghị achọ ịma ihe banyere ahụ́ ike ha, mmekọrịta ha na ndị ezinụlọ ha, na adịm ná mma ha na Jehova naanị ka ha nweta ego. (1 Tim. 6:10) Obi kwesịrị ịtọ anyị ụtọ na Nna anyị nke eluigwe, bụ́ onye maara ihe, na-enyere anyị aka ile ego anya otú kwesịrị ekwesị.​—Ekli. 7:12; Luk 12:15. w19.01 15 ¶6; 17 ¶9

Wenezdee, Julaị 8

I mere nke ọma, ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi! I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe. Soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.​—Mat. 25:21.

Tupu Ọkpara Chineke abịa n’ụwa ma gosi otú e si agba ndị mmadụ ume, ndị ohu Jehova ma na ha kwesịrị ịgba ndị ọzọ ume. Mgbe ndị Asiria chọrọ ibuso ndị bi na Jeruselem agha, Hezekaya kpọkọtara ndị isi agha na ndị bi na Jeruselem ka ọ gbaa ha ume. Baịbụl sịrị: “Ha wee malite inwe obi ike n’ihi ihe Hezekaya eze Juda kwuru.” (2 Ihe 32:​6-8) Anyị nwere ike ịmụta otú anyị nwere ike isi gbaa ndị ọzọ ume n’aka Job. Ọ bụ eziokwu na e kwesịrị ịgba ya ume, ọ kụziiri ndị ọzọ otú e si agba mmadụ ume. Ọ gwara ndị bịara ịkasi ya obi na ọ bụrụ na ọ bụ ya chọrọ ịgba ha ume, na ya ‘gaara eji okwu ọnụ ya mee ka ha dị ike, okwu ngụgụ obi nke si n’egbugbere ọnụ ya ga-ebelatakwa ihe mgbu ha.’ (Job 16:​1-5) N’ikpeazụ, ma Elaịhu ma Jehova gbara Job ume.​—Job 33:​24, 25; 36:​1, 11; 42:​7, 10. w18.04 16 ¶6; 17 ¶8-9

Tọzdee, Julaị 9

M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.​—Aịza. 41:10.

Aịzaya bu ụzọ kwuo otú Jehova ga-esi eme ka ndị ya dị ike. Ọ sịrị: “Jehova ga-abịa dị ka onye dị ike. Ogwe aka ya ka ọ ga-eji na-achị.” (Aịza. 40:10) Baịbụl na-ejikarị okwu bụ́ “ogwe aka” akọwa ike. N’ihi ya, mgbe Baịbụl kwuru na Jehova ga-eji ‘ogwe aka ya na-achị,’ ihe ọ pụtara bụ na Jehova bụ Eze dị ike. O ji ike ya na-enweghị atụ nyere ndị ya aka n’oge gara aga, ọ ka na-ejikwa ya na-echebe ma na-eme ka ndị tụkwasịrị ya obi dị ike taa. (Diut. 1:​30, 31; Aịza. 43:10.) Mgbe Jehova kacha emezu nkwa a, ya bụ, “M ga-eme ka ị dị ike,” bụ mgbe ndị iro anyị na-emegide anyị. N’ebe ụfọdụ n’ụwa taa, ndị iro anyị na-agbasi mbọ ike ka ha kwụsị anyị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ machibido anyị iwu. N’agbanyeghị ya, ụjọ anaghị atụ anyị n’ihi ihe ndị ahụ ha na-eme anyị. Jehova gwara anyị ihe mere ka anyị dị ike, obi esiekwa anyị ike. O kwuru, sị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.”​—Aịza. 54:17. w19.01 5-6 ¶12-13

Fraịdee, Julaị 10

Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.​—Mat. 5:3.

Ụmụ anụmanụ enweghị mkpa maka ife Chineke. Ma, anyịnwa ma na ọ dị mkpa ife ya. (Mat. 4:4) Ọ bụrụ na anyị egee Chineke ntị, anyị ga-enwe nghọta, amamihe na obi ụtọ. Chineke na-esi n’Okwu ya nakwa ọtụtụ ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ewepụtara anyị na-eme ka okwukwe anyị sie ike. (Mat. 24:45) N’eziokwu, Chineke na-akụziri anyị ọtụtụ ihe, ha na-abakwara anyị ezigbo uru. (Aịza. 65:​13, 14) Ihe Chineke na-akụziri anyị ga-eme ka anyị nweta amamihe, meekwa ka anyị na-eche echiche nke ọma. Ihe ndị a ga-echebe anyị n’ụzọ dị iche iche. (Ilu 2:​10-14) Dị ka ihe atụ, ha ga-eme ka ị mata nkụzi ụgha dị iche iche, dị ka ụgha kwuru na o nweghị Onye Okike dịnụ. Ha ga-emekwa ka ị ghara ikwere n’ụgha ahụ bụ́ na ihe ga-akacha eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ inwe ego na ọtụtụ ihe onwunwe. Ha ga-enyekwara gị aka ịmata na izere ọchịchọ ọjọọ na àgwà ndị nwere ike ịkpatara gị nsogbu. N’ihi ya, na-achọ amamihe Chineke na ikike iche echiche ma were ha ka akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. w18.12 20 ¶6-7

Satọdee, Julaị 11

Dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ.​—Aịza. 65:22.

È nwere mgbe anyị ga-anọ ogologo ndụ otú ahụ “osisi si anọ ogologo ndụ”? Ụfọdụ osisi na-anọ ọtụtụ puku afọ. Ka ndị mmadụ nwee ike ịdị ogologo ndụ otú ahụ, ahụ́ ga-agbasi ha ezigbo ike. Ọ bụrụ na ha ga-ebi n’ebe mara mma udo dị na ya otú ahụ Aịzaya kwuru, ọ ga-abụ paradaịs a na-atụ anya ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka amụma ahụ ga-emezu. Chegodị otú nkwa ndị ahụ si gosi na a ga-enwe paradaịs n’ọdịnihu. Chineke ga-agọzi ndị mmadụ n’ụwa niile. E nweghị onye ụmụ anụmanụ ma ọ bụ ndị mmadụ na-eme ka anụ ọhịa ga-emerụ ahụ́. Ndị ìsì ga-ahụ ụzọ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe, ndị ngwọrọ ga-agakwa ije. Ndị mmadụ ga-ewu ụlọ nke ha, na-akọkwa ezigbo nri ndị ha ga na-eri. Ha ga-adị ogologo ndụ karịa osisi. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị nwere ihe ndị Baịbụl kwuru gosiri na ihe ndị a ga-eme n’ọdịnihu. Ma ụfọdụ ndị anyị na-ezi ozi ọma nwere ike ịna-ekwu na amụma ndị ahụ apụtachaghị na a ga-enwe paradaịs n’ụwa n’ọdịnihu. Olee ezigbo ihe mere i ji na-atụ anya na a ga-enwe paradaịs n’ụwa a? Jizọs, bụ́ nwoke kacha ukwuu nke bitụrụla n’ụwa a, gwara anyị ihe mere anyị ji na-atụ anya ya.​—Luk 23:43. w18.12 5 ¶13-15

Sọnde, Julaị 12

Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ.​—Rom 12:2.

Anyị ka nwere ike ịgbanwe otú anyị si eche echiche. Ihe ga-akacha ekpebi ma ọ̀ ga-agbanwe bụ ụdị ihe anyị na-ekwe ka ọ bata anyị n’obi na ụdị ihe anyị na-eche n’obi anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-eche ihe ndị kwekọrọ n’echiche Chineke, anyị ga-achọpụta na echiche Chineke ziri ezi. Mgbe ahụ, ọ ga na-agụ anyị agụụ iche echiche ka Chineke. Mana, marakwa na iji nwee ike ịna-eche echiche ka Chineke, anyị kwesịrị ‘ịkwụsị ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.’ Ihe ọ pụtara bụ na anyị ga-akwụsị ile, ịgụ, na igere ihe ọ bụla na-adabaghị n’echiche Chineke. Iji mee ka ihe a dokwuo anya, ka anyị jiri nri mee ihe atụ. Onye chọrọ inwe ezigbo ahụ́ ike nwere ike ikpebi ịna-eri nri ndị na-edozi ahụ́. Ma, ọ gaghị enwe ezigbo ahụ́ ike ma ọ bụrụ na ọ na-eri nri mebiri emebi mgbe niile. Otú ahụ ka ọ dịkwa onye nabatara echiche Jehova, ma ya ejiri echiche ụwa a na-emerụ obi ya. Ọ gaghị abara ya uru ọ bụla. w18.11 21 ¶14-15

Mọnde, Julaị 13

Guzosienụ ike, werenụ eziokwu kee úkwù unu.​—Efe. 6:14.

Anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme ihe ndị anyị na-amụta na Baịbụl n’ihe ọ bụla anyị na-eme kwa ụbọchị. Ka anyị jiri eziokwu kee úkwù anyị. N’oge Baịbụl, ájị̀ onye agha na-eke n’úkwù ya na-enyere ya aka ma na-echebe úkwù ya nakwa akụkụ ahụ́ ya ndị dị n’ime. Ka ájị̀ a nwee ike ichebe ya, ọ ga-ekesi ya ike. Ọ bụrụ na o kesighị ya ike, ọ gaghị echebe ya. Olee otú eziokwu ahụ anyị kere n’úkwù anyị ga-esi chebe anyị? Ọ bụrụ na anyị ekee eziokwu n’úkwù anyị otú ahụ onye agha si eke ájị̀ n’úkwù ya, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-eche echiche na-adịghị mma, nyekwara anyị aka ime ka anyị na-eme mkpebi ndị ziri ezi. Ọnwụnwa bịara anyị, ọ ga-eme ka anyị nọgide ná mkpebi anyị mere ime ihe ziri ezi. Otú ahụ onye agha na-agaghị eche echiche ịga agha n’ekeghị ájị̀ n’úkwù ya, ka anyị ga-agbalị hụ na anyị ahapụghị eziokwu anyị mụtara. Kama, anyị ga-agbalịsi ike ime ya eme ná ndụ anyị. w18.11 12 ¶15

Tuzdee, Julaị 14

Zụta eziokwu, erekwala ya.​—Ilu 23:23.

Anyị ga-agba ezigbo mbọ tupu anyị amụta eziokwu dị n’Okwu Chineke. Anyị ga-adị njikere ịhapụ ihe ọ bụla a chọrọ ka anyị hapụ ka anyị nwee ike ịmụta ya. Onye amamihe dere Ilu kwuru na anyị “zụta eziokwu,” ya bụ, mụta “eziokwu,” anyị ga-akpachara anya ka anyị ghara ‘ire ya,’ ya bụ, ịhapụ ya. Ihe e nyere anyị n’efu nwere ike ifu anyị ihe. Okwu Hibru e si sụgharịa “ịzụ” n’Ilu 23:23 nwere ike ịpụta “inweta.” Okwu abụọ a pụtara mmadụ ịgba mbọ ma ọ bụ inye ihe ka o nwee ike inweta ihe dị ya mkpa. Ka anyị mee ihe atụ otú e nwere ike isi zụta eziokwu. Ka e were ya na a mara ọkwa n’ahịa na a ga-enye anyị “Osikapa n’Efu.” Osikapa ahụ ọ̀ ga-efere efere bata na nke anyị? Mbanụ. Anyị ga-aga ahịa ka anyị nwee ike inweta ya. È nyere anyị ya n’efu? Ee. Ma anyị ga-agba mbọ ma wepụta oge gaa ahịa. Otú ahụ ka ọ dịkwa eziokwu. Anyị ekwesịghị ịzụ ya azụ. Ma anyị ga-agba mbọ tupu anyị amụta ya. w18.11 4 ¶4-5

Wenezdee, Julaị 15

Ihu ya na-achakwa ka anyanwụ, uwe elu ya na-enwu gbaa.​—Mat. 17:2.

Jizọs gwara Pita, Jems, na Jọn ka ha duga ya n’ugwu dị oké elu. Mgbe ha nọ ebe ahụ, ha hụrụ ọhụụ dị ịtụnanya. Ihu Jizọs nwuru gbaa dị ka ìhè, uwe ya ana-egbukekwa egbuke. Ihe abụọ yiri mmadụ, nke nọchiri anya Mozis na Ịlaịja, malitere ịgwa Jizọs okwu banyere ọnwụ ọ na-aga ịnwụ na otú a ga-esi akpọlite ya n’ọnwụ. (Luk 9:​29-32) Ígwé ojii malitere ikpuchi ha, ha anụkwa otu oké olu si n’ígwé ojii ahụ. Ọ bụ olu Chineke. Ọhụụ ahụ mere ka anyị matatụ gbasara ebube na ike Jizọs ga-enwe n’ọdịnihu dị ka Eze Alaeze Chineke. O doro anya na ọhụụ a gbara Jizọs ume ma mee ka o nwee ike ọ ga-eji die ahụhụ na ọnwụ ahụhụ ọ na-aga ịnwụ. Ọhụụ ahụ mekwara ka okwukwe ndị na-eso ụzọ ya sikwuo ike, meekwa ka ha jikere maka ọrụ ndị siri ike ha ga-arụ nakwa mmegide a ga-emegide ha n’ọdịnihu. Mgbe ihe dị ka afọ iri atọ gachara, Pita onyeozi kwuru gbasara ọhụụ ahụ iji gosi na ya ka na-echeta banyere ya.​—2 Pita 1:​16-18. w19.03 10 ¶7-8

Tọzdee, Julaị 16

Anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke, . . . site n’okwu bụ́ eziokwu.​—2 Kọr. 6:​4, 7.

Olee otu ụzọ ezigbo Ndị Kraịst si dị iche ná ndị nọ n’okpukpe ụgha? Ọ bụ n’ihi na anyị ‘na-agwa ibe anyị eziokwu.’ (Zek. 8:​16, 17) Anyị ga na-agwa ndị anyị na-amaghị ndị ha bụ, ndị ọrụ ibe anyị, ndị enyi anyị na ndị anyị hụrụ n’anya eziokwu. Ị̀ bụ onye na-eto eto chọrọ ka ị dị ka ndị enyi gị? Kpachara anya ka ị ghara ịna-eme ihe ọjọọ na nzuzo, ma ọ bụ na-eme ka ezigbo mmadụ ma gị na ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị ọgbakọ gị nọrọ ma na-akpa àgwà ọjọọ ma gị na ndị enyi gị ndị ụwa nọrọ ma ọ bụ mgbe ị nọ n’Ịntanet. Ime otú ahụ ga-abụ ịghara ndị mụrụ gị, ụmụnna gị, nakwa Jehova ụgha. (Ọma 26:​4, 5) Jehova ma mgbe anyị ‘ji egbugbere ọnụ anyị na-asọpụrụ ya, ma obi anyị dị nnọọ anya n’ebe ọ nọ.’ (Mak 7:6) Ọ kacha mma ime ihe a Ilu kwuru. Ọ sirị: “Ka obi gị ghara inwere ndị mmehie anyaụfụ, kama na-atụ egwu Jehova ogologo ụbọchị dum.”​—Ilu 23:17. w18.10 9 ¶14-15

Fraịdee, Julaị 17

Chineke bụ ịhụnanya, Chineke na onye nọgidere n’ịhụnanya na-adị n’otu, onye ahụ n’onwe ya na Chineke na-adịkwa n’otu.​—1 Jọn 4:16.

Ndị na-efe Chineke n’ụwa niile bụ otu ezinụlọ hụrụ ibe ha n’anya. (1 Jọn 4:21) Mgbe ụfọdụ, ha na-ahapụ ihe ụfọdụ dị ha mkpa n’ihi ụmụnna ha. Ma ọtụtụ mgbe, ha na-esi n’ụmụ obere ihe ha na-emere ụmụnna ha egosi na ha hụrụ ha n’anya. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịgwa ụmụnna ha okwu ọma ma ọ bụ jiri obiọma meso ha ihe. Ọ bụrụ na anyị echebara ndị ọzọ echiche, anyị na-eṅomi Nna anyị nke eluigwe. (Efe. 5:1) Jizọs ṅomiri Nna ya nke ọma. Ọ sịrị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume . . . , n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.” (Mat. 11:​28, 29) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Jizọs ma anyị “na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe,” Nna anyị nke eluigwe ga-agọzi anyị, anyị ga na-enwekwa ezigbo obi ụtọ. (Ọma 41:1) Ka anyị na-echebara ndị ọzọ echiche n’ezinụlọ, n’ọgbakọ, nakwa n’ozi ọma si otú ahụ gosi na anyị hụrụ ha n’anya. w18.09 28 ¶1-2

Satọdee, Julaị 18

Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.​—1 Kọr. 3:9.

Mgbe e nwere ọdachi, ndị ohu Chineke na-eji ohere ahụ enyere ụmụnna ha aka ma si otú ahụ na-eme ka ha na Chineke na-arụkọ ọrụ. Dị ka ihe atụ, ha na-enye ego iji nyere ndị ọdachi dakwasịrị aka. (Jọn 13:​34, 35; Ọrụ 11:​27-30) Ụzọ ọzọ bụ inye aka na-ehicha ma ọ bụ na-emezigharị ụlọ ndị ọdachi mebiri. Obi tọrọ otu nwanna nwaanyị onye Poland aha ya bụ Gabriela ụtọ mgbe ụmụnna ndị si n’ọgbakọ dị nso bịara inyere ya aka mgbe ọdachi mebiri ụlọ ya. Mgbe o chetara ihe ahụ mere ya, o kwuru na ya achọghị ichegbu onwe ya banyere ihe ndị funahụrụ ya, kama na ya na-elekwasị anya n’uru o ritere. O kwuru, sị: “Ihe a mere m emeela ka obi sie m ike na ịnọ ná nzukọ Jehova bụ ihe ùgwù pụrụ iche na ihe na-eme obi ụtọ.” Ọtụtụ ụmụnna ndị e nyeere aka mgbe ọdachi mebichara ihe ha na-ekwukwa otu ihe ahụ. Ndị ha na Jehova na-arụkọkwa ọrụ inyere ụmụnna ha aka na-enwe ezigbo obi ụtọ.​—Ọrụ 20:35; 2 Kọr. 9:​6, 7 w18.08 26 ¶12

Sọnde, Julaị 19

Chebe obi gị.​—Ilu 4:23.

Ka anyị nwee ike ichebe obi anyị, anyị kwesịrị ịmata ihe ndị ga-eduba anyị ná nsogbu ma mee ihe ngwa ngwa ichebe onwe anyị. Okwu a sụgharịrị “chebe” na-echetara anyị ọrụ onye nche na-arụ. N’oge Eze Sọlọmọn, ndị nche na-akwụrụ ná mgbidi obodo iji na-eche obodo ahụ nche. Ma ha hụ ka nsogbu na-abịa, ha emee ka ndị nọ n’ime obodo mara. Anyị buru ihe atụ a n’obi, ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe anyị ga-eme ka Setan ghara imebi echiche anyị. N’oge ochie, ndị nche na ndị nche ọnụ ụzọ ámá na-arụkọ ọrụ. (2 Sam. 18:​24-26) Ha na-enye aka eme ka e chebe obodo. Otú ha si eme ya bụ ịhụ na ha mechiri ọnụ ụzọ ámá mgbe ọ bụla ndị iro na-eru nso. (Nehe. 7:​1-3) Akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ nwere ike ịbụrụ anyị onye nche. Ọ na-adọ anyị aka ná ntị mgbe Setan na-agbalị imebi obi anyị, ya bụ, mgbe ọ na-agba mbọ ka o mebie otú anyị si eche echiche, otú obi na-adị anyị, ihe anyị bu n’obi ime ma ọ bụ ihe na-agụ anyị agụụ. Mgbe ọ bụla akọnuche anyị na-adọ anyị aka ná ntị banyere ihe nwere ike ime ka anyị banye ná nsogbu, anyị kwesịrị ige ya ntị ma mee ihe niile anyị nwere ike ime iji zere ihe ahụ. w19.01 17 ¶10-11

Mọnde, Julaị 20

Ka ha jeekwa ozi dị ka ndị ozi, ebe ha bụ ndị a na- adịghị ebo ebubo.​—1 Tim. 3:10.

E kwesịrị iji ihe Baịbụl kwuru tụlee ma nwa okorobịa nọ n’ọgbakọ ò ruru eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ọ bụghị ihe mmadụ chere ma ọ bụ omenala obodo. (2 Tim. 3:​16, 17) Ọ bụrụ na a hapụ ihe Baịbụl kwuru a ga-eji ahọpụta mmadụ ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, o nwere ike ime ka a ghara ịhọpụta ụmụnna ruru eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. N’otu mba, e nyere otu ohu na-eje ozi ruru eru ọrụ ndị dị mkpa n’ọgbakọ. Ọ bụ eziokwu na ndị okenye ọgbakọ ahụ kwuru na o ruru ihe Baịbụl kwuru a ga-eji ahọpụta okenye, ha atụghị aro ka a họpụta ya. Ụfọdụ ndị okenye kwuru na ọ dị obere ịbụ okenye. Ọ dị mwute na a họpụtaghị nwanna ahụ naanị n’ihi na ọ dị obere. O yiri ka ọtụtụ ndị okenye na-eche otú ahụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị jiri Baịbụl na-ekpebi ihe anyị na-eme, kama iji ihe anyị chere. Ime otú ahụ bụ ụzọ anyị ga-esi erubere Jizọs isi ma kwụsị iji otú mmadụ dị ekpebi otú anyị si ewere ya.​—Jọn 7:24. w18.08 12 ¶16-17

Tuzdee, Julaị 21

Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.​—Ilu 18:13.

E nwere nsogbu dị n’izigara ndị ọzọ ozi anyị nwetara ozugbo. E nwere obodo ndị a machiri anyị iwu ime ihe ụfọdụ, nweekwa ndị nke machiri anyị iwu kpamkpam. N’obodo ndị ahụ, ndị na-emegide anyị nwere ike ịma ụma gbasaa akụkọ nwere ike ime ka ụjọ tụwa anyị ma ọ bụkwanụ mee ka anyị ghara ịtụkwasị ibe anyị obi. Chegodị ihe mere n’ebe bụbu Sọviet Yuniọn. Ndị uwe ojii nzuzo kwuru na ọtụtụ ụmụnna a ma ama na-agbazi ndị ohu Jehova mgba okpuru. Ọ dị mwute na ọtụtụ ụmụnna kweere n’akụkọ ahụ, ya emee ka ha pụọ n’ọgbakọ. Ọtụtụ n’ime ha mechara lọghachi, ma ụfọdụ alọghachighị. Akụkọ ahụ mere ka okwukwe ha kpuo ka ụgbọ. (1 Tim. 1:19) Olee otú anyị nwere ike isi zere ụdị ihe a? Anyị ekwesịghị izigara ndị ọzọ ozi na-adịghị mma ma ọ bụ ndị anyị na-amaghị ma hà bụ eziokwu. Anyị ekwesịghịkwa ikwere ihe ọ bụla anyị nụrụ, kama anyị kwesịrị ịchọpụta nke bụ́ eziokwu. w18.08 4 ¶8

Wenezdee, Julaị 22

N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.​—Luk 23:43.

Na Baịbụl ndị mbụ e nwere taa, bụ́ ndị e dere n’asụsụ Grik, e nwere ebe ndị e nwere akara edemede, nweekwa ebe ndị a na-enweghị ha. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ, sị: “Ihe Jizọs na-ekwu, ọ̀ bụ, “Ana m asị gị, taa mụ na gị ga-anọ na Paradaịs”? Ka ihe ọ na-ekwu, ọ̀ bụ, “Ana m asị gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs”? Cheta na Jizọs bu ụzọ gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nwa nke mmadụ ga-anọ n’ime ala ụbọchị atọ, ehihie na abalị.” (Mat. 12:40; 16:21; 17:​22, 23; Mak 10:34; Ọrụ 10:​39, 40) N’ihi ya, Jizọs agaghị na Paradaịs n’ụbọchị ahụ ya na onye omekome ahụ nwụrụ. Jizọs nọ “n’ili [ma ọ bụ “Hedis”]” ruo ụbọchị ụfọdụ, Chineke akpọlitezie ya n’ọnwụ. (Ọrụ 2:​31, 32.) Onye omekome ahụ amaghị na Jizọs na ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi agbaala ndụ na ya na ha ga-anọ n’Alaeze eluigwe. (Luk 22:29) Ihe ọzọ bụ na onye omekome ahụ emebedịghị baptizim. (Jọn 3:​3-6, 12) N’ihi ya, ihe Jizọs kwere onye omekome ahụ nkwa ya bụ paradaịs a ga-emecha nwee n’ụwa a. w18. 12 6 ¶17-18, 20-21

Tọzdee, Julaị 23

Meere anyị chi nke ga na-ebutere anyị ụzọ, n’ihi na Mozis a, bụ́ onye dupụtara anyị n’ala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.​—Ọpụ. 32:1.

Obere oge, ụmụ Izrel malitere ife nwa ehi ọlaedo. N’agbanyeghị na ha dara iwu Jehova, ha na-eche na ha ka na-efe ya, ma si otú ahụ ghọọ onwe ha aghụghọ. Erọn kpọdịrị nwa ehi ahụ ha na-efe, “ememme a ga-emere Jehova.” Olee ihe Jehova mere? O weere ya na ha gbara ya mgba okpuru. Ọ gwara Mozis na ndị Izrel “emewo omume na-eweta mbibi,” nakwa na ha ‘ahapụla ụzọ o nyere ha n’iwu ka ha na-agbaso.’ O wesoro ha “iwe dị ọkụ,” ma chewe echiche ibibi mba Izrel. (Ọpụ. 32:​5-10) Ma, Jehova kpebiri na ya agaghị ebibi ndị Izrel. (Ọpụ. 32:14) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Erọn kpụrụ nwa ehi ahụ, o chegharịrị ma soro ndị Livaị ndị kwuru na ha dịnyeere Jehova. Ọtụtụ puku ndị Izrel nwụrụ n’ihi ikpere arụsị. Ma, Jehova kwere ndị niile dịnyeere ya nkwa na ya ga-agọzi ha.​—Ọpụ. 32:​26-29. w18.07 20 ¶13-16

Fraịdee, Julaị 24

Lezienụ anya maka ndị odeakwụkwọ bụ́ ndị ọ na-amasị . . . ka a na-ekele ha n’ọma ahịa, ka ha na-anọkwa n’oche . . . ndị kasị ùgwù ná nri anyasị.​—Luk 20:46.

Olee otú kacha mma anyị chọrọ ka e si mara anyị? Anyị achọghị ka e si n’agụmakwụkwọ, n’achụmnta ego, nakwa n’egwuregwu mara anyị otú ọtụtụ ndị si chọọ ka e si na ha mara ha. Pọl kọwara otú kacha mma e kwesịrị isi mara anyị. Ọ sịrị: “Ugbu a unu maara Chineke, ma ọ bụkwanụ ebe unu bụ ndị Chineke maara, olee otú unu si na-agaghachi n’ihe mbụ ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị isi ma na-achọ ka unu bụrụ ohu ha ọzọ?” (Gal. 4:9) O nweghị ihe karịrị ịbụ onye “Chineke maara,” bụ́ Onye Ọchịchị Kachanụ n’Eluigwe na n’Ụwa. Jehova ma onye anyị bụ, ọ hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị na ya bụrụ enyi. O kere anyị ka anyị na ya bụrụ enyi.​—Ekli. 12:​13, 14. w18.07 8 ¶3-4

Satọdee, Julaị 25

M na-atụgharị uche n’ihe ncheta gị.​—Ọma 119:99.

Ka iwu Chineke nwee ike ịbara anyị uru, anyị ga-eji ha kpọrọ ihe. (Emọs 5:15) Ma, olee otú anyị ga-esi eme ya? Anyị ga-amụta ile ihe anya otú Jehova si ele ihe anya. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ọ na-esiri gị ike ihi ụra nke ọma. Dọkịta agwa gị ụdị nri ị ga na-eri, otú ị ga-esi na-emega ahụ́, na ihe ndị ọzọ ị ga-agbanwe ná ndụ gị. Mgbe i mechara ihe ndị a, gị achọpụta na o nyeere gị aka. O doro anya na ị ga-ekele dọkịta ahụ n’ihi otú o si nyere gị aka ka ahụ́ dị gị mma. Onye kere anyị enyekwala anyị iwu ndị ga-eme ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu, meekwa ka ndụ anyị ka mma. Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ịgha ụgha, ịghọ aghụghọ, izu ohi, ịkwa iko, ime ihe ike, na ime mgbaasị. Chegodị uru ọ ga-abara anyị ma anyị gbaara ihe ndị a ọsọ. (Ilu 6:​16-19; Mkpu. 21:8) Ọ bụrụ na Jehova agọzie anyị n’ihi na anyị rubeere ya isi, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ya n’anya, jirikwa iwu ya kpọrọkwuo ihe. w18.06 17 ¶5-6

Sọnde, Julaị 26

Ị̀ bụ eze ndị Juu?​—Jọn 18:33.

Ọ ga-abụ na Paịlet na-atụ ụjọ na Jizọs ga-eme ka ndị mmadụ nupụrụ ndị Rom isi. Jizọs zara ya, sị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) Jizọs jụrụ itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ihi na Alaeze ya dị n’eluigwe. Ọ gwara Paịlet na ihe mere o ji bịa n’ụwa bụ ka ọ “gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Anyị ghọta ihe bụ́ ọrụ anyị nke ọma otú ahụ Jizọs si ghọta nke ya, anyị agaghị akwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla ma n’obi anyị. Ma, o nwere ike isi ike. Otu onye nlekọta sekit kwuru, sị: “N’ebe m bi, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-agbazi ndị mmadụ ara. Ha na-ewere ya na ndị obodo ha ka ndị ọzọ mma, nakwa na ihe ga-aka mma ma ha jiri aka ha na-achị onwe ha. Obi dị m ụtọ na ụmụnna lekwasịrị anya n’ikwusa ozi ọma Alaeze ma si otú ahụ dịrị n’otu. Ha tụkwasịrị Chineke obi na ọ bụ ya ga-eme ka ikpe ziri ezi dịrị n’ụwa, meekwa ka nsogbu anyị ndị ọzọ bie.” w18.06 4-5 ¶6-7

Mọnde, Julaị 27

Na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.​—Jems 4:7.

Ọ bụ naanị akwụkwọ atọ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ka a kpọrọ Setan aha. Ha bụ 1 Ihe E Mere, Job, na Zekaraya. Gịnị mere e ji kwuo obere ihe banyere onye iro a tupu Mesaya abịa? Jehova ekwughị ọtụtụ ihe gbasara Setan na ihe ndị ọ na-eme n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ihe mere o ji mee ka e dee Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ ka e jiri ya mata Mesaya ma duru ndị Chineke gakwuru ya. (Luk 24:44; Gal. 3:24) Mgbe Mesaya bịara, Jehova ji ya na ndị na-eso ụzọ ya mee ka a mata ọtụtụ ihe anyị ma taa banyere Setan na ndị mmụọ ozi so ya nupụrụ ya isi. Ihe a Chineke mere dabara adaba ebe ọ bụ na Jehova ga-eji Jizọs na ndị ga-eso ya achị bibie Setan na ndị na-akwado ya. (Rom 16:20; Mkpu. 17:14; 20:10) Ma, cheta na e nwere ihe ndị Ekwensu na-agaghị emeli. Jehova, Jizọs na ndị mmụọ ozi kwụ anyị n’azụ. Ha ga-enyere anyị aka imeri onye iro anyị. w18.05 22-23 ¶2-4

Tuzdee, Julaị 28

Ọ na-ewepụ alaka ọ bụla dị na m nke na-adịghị amị mkpụrụ.​—Jọn 15:2.

Jehova na-ewere anyị ka ndị na-efe ya naanị ma anyị na-amị mkpụrụ. (Mat. 13:23; 21:43) N’ihe atụ ahụ dị na Jọn 15:​1-5, mkpụrụ Onye Kraịst ọ bụla ga-amịrịrị abụghị mmadụ ole o nyeere aka ha aghọọ ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19) Ọ bụrụ otú ahụ, Ndịàmà Jehova ndị na-enweghị onye ha nyeere aka ha aghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ihi na ha na-eje ozi n’ebe ndị mmadụ na-anaghị egecha ntị, ga-adịzi ka alaka ndị ahụ na-anaghị amị mkpụrụ n’ihe atụ ahụ Jizọs mere. Ma, anyị ekwesịghị iche otú ahụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị anaghị amanye ndị mmadụ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ebe ọ bụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ gaghị asị na anyị abaghị uru n’ihi na anyị emeghị ihe anyị na-agaghị emeli. Ihe ọ bụla Jehova sị anyị mee bụ ihe anyị ga-emeli. (Diut. 30:​11-14) Gịnịzi bụ mkpụrụ ahụ anyị ga-amị? O doro anya na mkpụrụ ahụ ga-abụ ọrụ onye ọ bụla n’ime anyị ga-arụli. Olee ọrụ ga-eme ka anyị “na-amị mkpụrụ”? Ọ bụ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.​—Mat. 24:14. w18.05 14 ¶8-9

Wenezdee, Julaị 29

Unu sitere ná nna unu bụ́ Ekwensu, . . . ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ụgha.​—Jọn 8:44.

E nwere ọtụtụ ndị isi okpukpe n’ụwa taa. E nwere ike ịna-akpọ ha ndị pastọ, ndị ụkọchukwu, ndị rabaị, ma ọ bụ utu aha ndị ọzọ. Ha dị ka ndị isi okpukpe e nwere n’oge ndịozi Jizọs. Ha “na-ekpuchi eziokwu” si n’Okwu Chineke, ma ‘jiri eziokwu nke Chineke gbanwere okwu ụgha.’ (Rom 1:​18, 25) Ha na-akụziri ndị mmadụ ozizi ụgha ndị dị ka “onye a zọpụtara, a zọpụtachaala ya,” mkpụrụ obi anwụghị anwụ, na ịlọ ụwa. Ha na-akụzikwara ndị mmadụ echiche iberiibe bụ́ na Chineke kwadoro ka nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị na-enwe mmekọahụ, kwadokwa nwoke ịlụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ịlụ nwaanyị. Ndị ọchịchị na-aghara ndị mmadụ ụgha iji megharịa ha anya. Otu n’ime okpookpo ụgha ha ga-agha n’oge na-adịghị anya bụ na ha emeela ka e nwee “udo na obi iru ala.” Ma “mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya.” N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwere ihe ahụ ndị ọchịchị ga na-ekwu. Ha agaghị na-agwa ndị mmadụ eziokwu na ụwa a nọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị “maara nke ọma na ụbọchị Jehova na-abịa kpọmkwem dị ka onye ohi si abịa n’abalị.”​—1 Tesa. 5:​1-4. w18.10 7-8 ¶6-8

Tọzdee, Julaị 30

Unu aghaghị inyere ndị na-adịghị ike aka, unu aghaghịkwa iburu okwu Onyenwe anyị Jizọs n’uche, mgbe ya onwe ya sịrị, ‘A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.​—Ọrụ 20:35.

Jizọs si n’aka ụmụnna ya e tere mmanụ nakwa “ndị isi,” ya bụ, ndị okenye so n’atụrụ ọzọ na-agba ndị dara mbà n’obi ume ma na-eduzi ha n’oge a ihe siri ike. Ndị okenye ndị a abụghị “ndị nwe” okwukwe anyị, kama ha bụ “ndị ọrụ ibe” anyị, ndị na-eme ka anyị na-enwe ọṅụ. (Aịza. 32:​1, 2; 2 Kọr. 1:24) Pọl onyeozi mere ihe ndị okenye kwesịrị iṅomi. O degaara Ndị Kraịst a na-akpagbu na Tesalonaịka akwụkwọ ozi, sị: “Ebe anyị nwere ịhụnanya dị ukwuu n’ebe unu nọ, ọ masịrị anyị ọ bụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kamakwa inye unu mkpụrụ obi anyị, n’ihi na unu ghọrọ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Tesa. 2:8) Ihe mere Pọl ji gwa ndị okenye nọ n’Efesọs ihe a e dere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa bụ iji gosi na ịgwa mmadụ okwu iji gbaa ya ume abụghị naanị ihe anyị kwesịrị ime. w18.04 21-22 ¶6-8

Fraịdee, Julaị 31

Jehova bụ Mmụọ ahụ; ebe ọ bụla mmụọ Jehova dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.​—2 Kọr. 3:17.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwere onwe anyị, anyị ga-alaghachi n’ebe Jehova nọ, ya bụ, anyị na ya ga-adị ná mma. (2 Kọr. 3:16) Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, ha eleghị ihe anya otú Jehova si ele ihe anya. O yiri ka obi ha ọ̀ kpọchiri akpọchi. Ha chọrọ iji nnwere onwe ha nwere ugbu a mee ihe na-agụ anụ ahụ́ ha agụụ. (Hib. 3:​8-10) Nnwere onwe nke mmụọ Jehova na-eme ka anyị nwee karịrị mmadụ inwere onwe ya n’ịgba ohu. Mmụọ Jehova na-eme ka anyị nwere onwe anyị karịa mbọ ndị mmadụ na-agba ka ha nwere onwe ha. Ọ na-eme ka anyị nwere onwe anyị n’aka mmehie na ọnwụ, nakwa n’aka okpukpe ụgha na ihe ndị ha na-eme. (Rom 6:23; 8:2) E nweghị ihe a ga-eji tụnyere ụdị nnwere onwe a. Ụdị nnwere onwe a na-abara mmadụ uru a sịgodị na ọ bụ ohu ma ọ bụ na a tụrụ ya mkpọrọ.​—Jen. 39:​20-23. w18.04 9 ¶3-5

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya