Umeala n’Obi
ỊDỊ nwayọọ n’obi, n’enweghị mpako ma ọ bụ ibuli onwe onye elu. Ọnọdụ uche nke na-eme ka mmadụ nwee ike iji ndidi nagide mmerụahụ, n’enweghị mgbakasị ahụ, iwe, ma ọ bụ mmụọ nke ịchọ imegwara ihe. O nwere njikọ chiri anya n’ebe àgwà ọma ndị ọzọ dị ka iweda onwe onye n’ala, inwe uche dị umeala, na ịdị nwayọọ dị, a dịghị ahụkebekwa ebe e kewapụrụ ya na ha. Okwu Hibru nke a sụgharịrị ịbụ “ịdị umeala n’obi” (‛a·nawʹ) sitere na mkpọrọgwụ okwu bụ ‛a·nahʹ, nke pụtara “mekpaa ahụ, weda n’ala, menye ihere.”
N’ime Bible, a na-ebu ụzọ kwusie okwu ike banyere ịdị umeala n’obi dị ka ọnọdụ echiche mmadụ n’ebe Chineke nọ, e mesịa n’ebe ihe e kere eke ibe ya nọ. Dị ka ihe atụ, e dere, sị: “Ndị dị umeala n’obi ga-atụkwasịkwa ihe n’ọṅụ ha n’ime Jehova.” (Aịsaịa 29:19) Ndị dị umeala n’obi bụ ndị a pụrụ izi ihe—Jehova “na-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ ya” (Abụ Ọma 25:9)—ha na-adịkwa njikere inwe ntachi obi n’okpuru ọzụzụ ma ọ bụ ahụhụ nke sitere n’aka Chineke, ọ bụ ezie na nke a na-abụ ihe na-egbu mgbu n’oge ahụ a na-enye ya. (Ndị Hibru 12:4-11) Ịdị umeala n’obi na-eme ka ndị mmadụ chere Jehova ka o dozie ihe ndị na-ezighị ezi na mmerụahụ ndị a na-enweta n’ihi ikpe na-ezighị ezi, kama ịbụ onye a kpasuru iwe nke ukwuu. (Abụ Ọma 37:8-11) Ụdị ndị ahụ adịghị enwe nkụda aka n’ihi na onye Jehova họpụtara, bụ́ ‘ome nke sitere n’ógwè osisi Jesi,’ ga-aba mba n’ezi omume banyere “ndị dị obi umeala n’obi n’ụwa.”—Aịsaịa 11:1-4.
Mosis
Mosis bụ nnọọ ụdị mmadụ ahụ, onye “dị umeala n’obi nke ukwuu, karị mmadụ nile ndị nọ n’elu ala,” onye pụrụ ịnara nkatọ n’eweghị iwe. (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Mgbe e kwuru okwu nke a banyere ịdị umeala n’obi ya bụ mgbe ahụ Miriam na Erọn tamụrụ ntamụ megide Mosis. N’eziokwu, ọ bụ mkpesa nke na-enweghị ezi ihe kpatara ya megide Jehova, bụkwa nke ọ hụtara, bakwa mba banyere ya n’egbughị oge.—Ọnụ Ọgụgụ 12:1-15.
Ụfọdụ ndị na-enye nkọwa na-ekwu na Mosis idekọ nhota nke a e hotara ịdị umeala n’obi ya bụ inye onwe onye otuto n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Ndị nkatọ ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ onye ọzọ mesịrị denye okwu ahụ, ebe ndị ọzọkwa na-enye nke a dị ka ihe àmà nke na-egosi na ọ bụghị Mosis dere Pentateuch (akwụkwọ ise ndị mbụ nke Bible) ahụ. Otú ọ dị, akwụkwọ Commentary nke Cook dere na-ekwu banyere okwu ndị a, sị: “Mgbe anyị na-ele ha anya dị ka ndị Mosis kwuru ọ bụghị ‘proprio motu [site n’echiche nke onwe ya],’ kama ọ bụ n’okpuru nduzi nke Mmụọ Nsọ nke dịkwasịrị ya (tụlee xi. 17), ha na-egosipụta ‘ikwu ihe otú ọ dị n’ezie,’ nke bụkwa ihe àmà n’otu mgbe ahụ nye izi ezi ha nakwa eziokwu ahụ nke bụ na ha sitere n’ike mmụọ nsọ. E nwere n’okwu ndị a, dịkwa ka e nwere n’ebe ndị ahụ Mosis dekọrọ n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya ihe banyere adịghị ike ndị nke ya onwe ya (tụlee xx. 12 sqq.; Ọpụ. iv. 24 sqq.; Deut. i. 37), ịdị mfe nke onye na-agba àmà banyere onwe ya, ọ bụghị nye onwe ya (tụlee St Mat. xi. 28, 29). E tinyere okwu ndị ahụ iji kọwaa ụzọ o si bụrụ na Mosis emeghị ihe ọ bụla iji wepụ onwe ya n’ụta, na ihe mere Onyenwe anyị ji jiri n’ihi nke a mee ihe n’egbughị oge ọ bụla.”
Jisọs Kraịst
Jisọs gosipụtara ịdị umeala n’obi site n’ịnagide ụdị nile nke mmerụahụ onwe onye n’emeghị mkpesa ọ bụla, ọbụna na-ekwere ka e duru ya jee n’ebe a ga-egbu ya dị ka nwa atụrụ n’emepeghị ọnụ ya n’ime mkpesa. (Ndị Filipaị 2:5-8; Ndị Hibru 12:2; Ọrụ 8:32-35; Aịsaịa 53:7) Onye nke a ka Mosis ukwuu mekwara ka ndị ọzọ mara ya dị ka onye dị umeala n’obi ma ọ bụ onye dị nwayọọ n’obi. (Matiu 11:28, 29, AS, KJ, ED, NW, Ro) Dị ka Aịsaịa 61:1 buru n’amụma, e ji mmụọ Jehova tee ya mmanụ “izi ndị e wedara n’ala ozi ọma.” Mgbe ọ gụsịrị amụma nke a n’ihu ụlọ nzụkọ dị n’obodo ya, bụ́ Nazaret, Jisọs kwupụtara, sị: “Taa ka e mezuworo ihe a e dere n’akwụkwọ nsọ ná ntị unu.” (Luk 4:16-21) N’isi otú a zite Ọkpara ọ hụrụ n’anya ka ọ kụziere ndị dị umeala n’obi ihe banyere nzọpụta, Chineke na-egosi ha amara pụrụ iche n’ezie.—Abụ Ọma 149:4; Ilu 3:34.
Ọ Na-eweta Abamuru
Òkù ahụ nke Zefanaịa onye amụma kwuru okwu ya ka a ka na-akpọ ndị dị umeala n’obi nọ n’ụwa taa: “Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe o kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi [ma ọ bụ, iweda onwe onye ala; inwe obi umeala]: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” (Zefanaịa 2:3) Karịa nke ahụ, e nwere nkwa ndị ọzọ dị ebube e debeere ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe atụ: “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:11) Ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ, “ndị dị umeala n’obi ga-eri ihe, rijuokwa afọ.”—Abụ Ọma 22:26.
Ya mere, n’ụzọ na-eyighị ndị ajọ omume, bụ́ ndị na-eduhie ndị dị umeala n’obi, na-achọkwa ibibi ha (Emọs 2:7; 8:4), Jehova na-ege ntị n’ọchịchọ sitere n’ala ala obi ha site n’ịza ekpere ha; olileanya ha nwere n’ebe Jehova nọ abụghị n’efu. (Abụ Ọma 10:17; 9:18) Ilu ahụ ziri ezi nke bụ, “Ọ dị mma inwe mmụọ dị ala n’etiti ndị e wedara n’ala, karịa isoro ndị mpako kesaa ihe a kwatara n’agha.”—Ilu 16:19.