Osisi Ịta Ahụhụ
Ọ Bụ Osisi Yiri Nke Ahụ A Kpọgburu Jisọs Kraịst N’elu Ya. (Matiu 27:32-40; Mak 15:21-30; Luk 23:26; Jọn 19:17-19, 25) N’asụsụ Grik Mgbe Ochie, Okwu Ahụ (stau·ros΄) Nke A Sụgharịrị Ịbụ “Osisi Ịta Ahụhụ” Na New World Translation Pụtara N’ụzọ Bụ Isi Osisi Kwụ Ọtọ, Ma Ọ bụ Ógwè Osisi, E Nweghịkwa Ihe Àmà Na-egosi Na Ndị So Dee Akwụkwọ Nsọ Grik Ji Ya Mee Ihe Igosipụta Osisi A Tụhiere Osisi N’elu ya.
Akwụkwọ Bụ The Non-christian Cross, Nke John Denham Parsons Dere, Na-ekwu, Sị: “Ọ Dịghị Otu Ahịrị Okwu Ọ bụla Dị N’ọtụtụ Ihe Odide Ndị Mejupụtara Agba Ọhụrụ, Nke, N’asụsụ Grik Mbụ, Na-egosi N’ụzọ Na-apụtaghị Ìhè Ihe Àmà Ọ bụla Na Stauros Ahụ E Ji Mee Ihe N’ọnọdụ Jisọs Bụ Ihe Ọzọ Na-abụghị Stauros Nkịtị; Ma Ya Fọdụzie Ikwu Na Ihe Mejupụtara Ya, Abụghị Otu Ógwè Osisi, Kama Ógwè Osisi Abụọ E Ji Ntụ Kụkọta Ọnụ N’ụdị Nke Obe. . . . Ọ bụghị Nduhie Dị Nta N’akụkụ Ndị Nkụzi Anyị Ịsụgharị Okwu Ahụ Bụ Stauros Dị Ka ‘Obe’ Mgbe Ha Na-asụgharị Akwụkwọ Chọọchị Nke E Dere N’asụsụ Grik Gaa N’asụsụ Ala Anyị, Nakwa Ịkwado Omume Ahụ Site N’itinye ‘Obe’ N’akwụkwọ Ọkọwa Okwu Anyị Dị Ka Ihe Stauros Pụtara N’ejighị Nlezianya Kọwaa Na E Kwuwe Ekwuwe Nke Ahụ Abụghị Ihe Okwu Ahụ Pụtara N’ụzọ Bụ Isi N’oge Ndị Ozi, Ọ bụghịkwa Ihe Ọ Pụtara N’ụzọ Bụ Isi Ruo Mgbe Ogologo Oge Ụfọdụ Gasịrị, Mgbe Ahụkwa Ọ Ghọrọ Nke Ahụ, Ma Ọ Dịghị Ihe Ọzọ, Nanị N’ihi Na, N’agbanyeghị Na E Nweghị Ihe Àmà Gbara Ọkpụrụkpụ, E Ji N’ihi Ihe Ụfọdụ Ma Ọ bụ Ihe Ndị Ọzọ Chee Na Stauros Ahụ E Gburu Jisọs N’elu Ya Kpọmkwem Dị Otú Ahụ Kpọmkwem.”—London, 1896, P. 23, 24.
Ihe Mere Jisọs Ji Nwụọ N’elu Osisi
N’oge Ahụ Jehova Chineke Nyere Ndị Israel Iwu Ya, Ha Nakweere Ibu Ọrụ Ahụ N’onwe Ha Nke Ime Ihe Ndị Ọ Chọrọ Ha N’aka. (Ọpụpụ 24:3) Otú Ọ Dị, Dị Ka Ndị Bụ Ụmụ Onye Mmehie Bụ́ Adam, Ha Enweghị Ike Ime Otú Ahụ N’ụzọ Zuru Okè. N’ihi Nke A Ha Banyere N’ọbụbụ Ọnụ Nke Iwu Ahụ. Iji Wepụ Ọbụbụ Ọnụ Nke A Pụrụ Iche N’ebe Ha Nọ, A Kwụbara Jisọs N’elu Osisi Dị Ka Onye Omempụ A Bụrụ Ọnụ. Banyere Nke A Pọl Onyeozi Dere, Sị: “Ka Ha Hà Bụ́ Ndị Sitere N’ọrụ Nke Iwu, Ha Nọ N’okpuru Ọbụbụ Ọnụ: N’ihi Na E Dewo Ya N’akwụkwọ Nsọ, Sị, Onye A Na-abụ Ọnụ Ka Ọ bụ, Bụ́ Onye Ọ bụla Nke Na-anọgideghị N’ihe Nile E Deworo N’akwụkwọ Iwu, Ime Ha. . . . Kraịst Gbapụtara Anyị N’ọbụbụ Ọnụ Nke Iwu Ahụ, Ebe Ọ Ghọrọ Ọbụbụ Ọnụ N’ọnọdụ Anyị: N’ihi Na E Dewo Ya N’akwụkwọ Nsọ, Sị, Onye A Na-abụ Ọnụ Ka Ọ bụ, Bụ́ Onye Ọ bụla Nke A Na-akwụba N’elu Osisi.”—Ndị Galetia 3:10-13.