Ị̀ Pụrụ Inwe Obi Ụtọ Mgbe I Nwere Ọtụtụ Ihe Ị Ga-eme?
IHE ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị na-ebi ndụ ịrụsi ọrụ ike, ọtụtụ mgbe, ndụ ezughị ike. Nrụgide ndị na-adịghị agwụ agwụ nke ibi ndụ n’oge ugbu a chọrọ ka anyị nọgide na-etinye mgbalị n’esepụghị aka nanị iji nọgide na-esoro ndị ọzọ na-aga ụkwụ na ụkwụ. Ndị bụ di na nna aghaghị ibu ibu ọrụ ndị na-arụgide arụgide nke ezinụlọ, nke ndị were mmadụ n’ọrụ, na ihe ndị ọzọ. Ndị bụ nwunye na nne aghaghị ilekọta mkpa ezinụlọ ha nwere n’ụlọ, ọtụtụ mgbe kwa ọ dị mkpa na ha ga-arụ ọrụ ego. Ndị na-eto eto nọkwa ná nrụgide ilekọta ibu ọrụ ụfọdụ nke ezinụlọ mgbe ha na-enweta agụmakwụkwọ nke ga-akwadebe ha maka ibi ndụ bara uru n’usoro ọha na eze.
Ma gịnị banyere anyị onwe anyị ndị rarawooro ndụ anyị nye Jehova Chineke ma bụrụ Ndịàmà ya e mere baptism? Tinyere ihe ndị ọzọ a chọrọ ka anyị mee, anyị nwere okwu iwu nke a nke Pọl onyeozi: “Ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike, bụrụnụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ, ndị na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:58) Ee, ọtụtụ ibu ọrụ ndị ọzọ so n’ihe ndị a chọrọ maka ezi ofufe. Olee otú anyị pụrụ isi mezuo ibu ọrụ ndị a ma nwee udo nke uche na ọnọdụ obi ụtọ?
Nrụzu Ihe Na-eweta Obi Ụtọ
Obi ụtọ—mmetụta nke ahụ ịdị mma ma ọ bụ afọ ojuju—bụ nke e jikọrọ n’ụzọ chiri anya ya na inwe ihe ịga nke ọma n’ibu ibu ọrụ nile nke ndụ. Ọ bụrụ na anyị nwere ike imezu ihe dịịrị anyị n’ụbọchị n’ụzọ dị nnọọ irè, na-eme ihe n’oge na n’ụzọ a haziri nke ọma, anyị na-enwe mmetụta nke inwe ihe a rụzuru na afọ ojuju. Otú ahụ ka o kwesịrị ka ihe dịrị, ihe ọ na-arụpụta na-etinyekwa ihe n’obi ụtọ anyị.
Ọ dịghị mgbe Jehova Chineke zubere na imezu ibu ọrụ anyị kwesịrị ịbụ oké ibu arọ nke na-egbu mgbu. Kama nke ahụ, ọ nọgidewo na-abụ ọchịchọ ya siri ike ka anyị ‘ṅụrịa ma na-ahụ ezi ihe ná ndọgbu nile anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ.’ (Eklisiastis 3:12, 13) Mgbe anyị nwere obi ụtọ n’ọrụ anyị, anyị na-arụpụtakarị ihe. Anyị na-adị njikere ịnara ntụziaka ma soro ndị ọzọ na-adị n’udo. N’aka nke ọzọ, ma ànyị enweghị obi ụtọ, ọrụ anyị na-eyi ihe na-adịghị enye ọṅụ—ihe na-agwụ ike, na-atụ ọbọ, ọbụna na-ebogbu ọnọdụ uche. Nke a na-eduba n’àgwà ọrụ na-adịghị arụpụta ihe na ọnọdụ uche na-ezighị ezi. Ndụ na-abụ ihe ịgba mgba kwa ụbọchị ka anyị na-anwa imezu ihe nile a chọrọ ka anyị mee. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị pụrụ ịchọta ụzọ isi nọgide na-enwe obi ụtọ n’ihe anyị na-eme, anyị ga-anọkarị n’ọnọdụ nke ibi ndụ na-akwụghachi ụgwọ na nke afọ ojuju.
Nwee Ezi Nhazi
Ọ bụrụ na anyị ga-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị inwe ọtụtụ ihe ime, ọ dị anyị mkpa inwe ezi nhazi. Ma gịnị bụ ezi nhazi? Ọ bụ “ịkwụrụsi ike n’uche na ná mmetụta.” Onye nwere ezi nhazi na-agbalịsi ike ime ihe omume ya nile n’usoro. Ọ na-eme atụmatụ maka oge dị n’ihu, na-ezere iwezuga ime ihe ruo n’oge dị n’ihu, na-emerukwa ihe n’ókè n’àgwà ya dum. Ọ na-egosipụta njide onwe onye ná nri, ihe ọṅụṅụ, mmesapụ ahụ, egwuregwu, na ná ntụrụndụ, N’ezie, ọ “na-ejidekwa onwe ya n’ihe nile”!—1 Ndị Kọrint 9:24-27; tụlee Taịtọs 2:2.
Ekpere na-ekere òkè dị oké mkpa n’ịnọgide na-enwe ezi nhazi onye Kraịst. Onye na-ejere Jehova ozi pụrụ ikpe ekpere maka mmụọ nsọ Chineke na enyemaka ya nke Nna ya nke eluigwe n’ịzụlite mkpụrụ ya, gụnyere njide onwe onye. (Luk 11:13; Ndị Galatia 5:22, 23) Karịsịa, onye Kraịst kwesịrị ịgakwuru Chineke n’ekpere mgbe ule ndị na-achọ ịkpaghasị ezi nhazi ya dakwasịrị ya. Onye ọbụ abụ ahụ bụ Devid sịrị, “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ; tụkwasịkwa ya obi, ya onwe ya ga-emekwa ya.” (Abụ Ọma 37:5) Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa mgbe ụfọdụ ikpe ekpere dị ka Devid mere mgbe ọ rịọrọ sị: “Chineke, bịakwute m ọsọ ọsọ: onye inye aka m na Onye na-eme ka m gbapụ ka ị bụ; Jehova, anọla ọdụ.” (Abụ Ọma 70:5) Echefula mgbe ọ bụla na site n’ekpere, ọ ga-ekwe omume ịnọgide na-enwe ezi nhazi ma na-enwe ‘udo nke Chineke nke kachasị uche nile ma na-eche obi na echiche uche anyị nche.’—Ndị Filipaị 4:6, 7.
N’ihi na ọ dabeere na Jehova ma na-enwe udo nke Chineke, onye Kraịst nwere ezi nhazi na-adị ndụ nke uche zuru okè. (Taịtọs 2:11, 12) A na-enweta nke a site n’inwe ezi nghọta nke ụkpụrụ nile nke Bible na site n’itinye ha ná ndụ ya. Onye dị otú ahụ adịghị eme ihe n’ihu abụọ, ọ dịghịkwa ekpe ikpe ngwa ngwa. Ezi uche na-egbochi ya isi ọnwụ n’echiche nke ya ma ọ bụ ikwesi olu ike. Ọ na-anọgide na-ele onwe ya na ikike ya dum anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, nke a na-enyekwara ya aka iso ndị ọzọ mekọọ ihe. (Maịka 6:8) Ọ bụ ihe dị mmasị ịhụ na, àgwà ndị na-enyere mmadụ aka inwe ezi nhazi sokwa n’àgwà ndị a chọrọ n’aka ndị a họpụtara ije ozi dị ka ndị nlekọta n’ọgbakọ ndị Kraịst.—1 Timoti 3:2, 3.
Anyị pụrụ itinye ihe dị ukwuu n’obi ụtọ anyị site n’ịgbalịsi ike inwe ezi nhazi karị n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị. Site n’igosipụta àgwà ndị e jikọrọ ha na ezi nhazi, anyị pụrụ imezu ihe ndị dị mkpa n’enweghị oké nrụgide anụ ahụ ma ọ bụ ọnọdụ uche. Ụzọ ndụ anyị ga-egosipụta nguzosi ike ka ukwuu, anyị ga-arụzukwa ihe dị ukwuu karị. Ndị ọzọ ga-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’isonyere anyị, anyị ga-enwekwa afọ ojuju na ọṅụ ka ukwuu. Ma olee ụzọ ụfọdụ dị irè isi nọgide na-enwe ezi nhazi?
Ụzọ Ndị Dị Irè Isi Nọgide Na-enwe Ezi Nhazi
Iji nọgide na-enwe ezi nhazi, anyị kwesịrị ịnwa ịdị na-eme ihe n’oge ma hazie ihe nke ọma n’ihe ndị metụtara anyị onwe anyị. Ọ dị anyị mkpa ime atụmatụ maka ọdịnihu, na-elekọta ihe dị iche iche n’ụzọ a haziri ahazi na n’usoro. Ndị na-enweghị ezi nhazi ma na-achọ iwezụga ime ihe ruo n’oge dị n’ihu na-eji ọ̀tụ̀tụ̀ nrụgide na nchekasị ndị e mere ka ha ka elu bogbuo ndụ ha. Ihe ịga nke ọma n’akụkụ nke a nke ndụ ga-enyere anyị aka inwe mmetụta nke na anyị na-achịkwa ihe nke ọma kama inwe mmetụta nke ịbụ ndị na-apụghị ime ihe ọ bụla banyere ihe ndabara nile nke ọnọdụ dị iche iche.
Anyị ekwesịghị ịnwa ime ihe nile n’onwe anyị. Ndị na-achọghị ịnakwere enyemaka ndị ọzọ na-akwụkarị ụgwọ dị elu site n’oké ike ọgwụgwụ na nkụda mmụọ. E nwere ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ pụrụ ilekọta. Ya mere, ọ bụ ihe amamihe dị na ya iji ikike ndị dị njikere inye aka mee ihe. E wezụga ime ka ibu anyị bu ka mfe, nke a pụrụ ịbụ ihe agbamume nye ndị ahụ na-achọ ịbịaru anyị nso.
Amamihe adịghị n’iji onwe anyị tụnyere ndị ọzọ bụ́ ndị pụrụ inwe ike ime ihe karị. Ịnwa ịdị ka ndị o yiri ka ha na-arụpụta ihe karịa anyị pụrụ ịkpata nkụda aka, na-eme ka anyị yie ndị dị ala na ndị na-abaghị uru. Echiche dị otú ahụ na-eweta mbibi, na-emebi mkpebi na obi ike anyị. Pọl dere sị, “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ.” (Ndị Galetia 6:4) Cheta na onye ọrụ a kasị jiri kpọrọ ihe bụ onye nke na-agbaso ntụziaka, nke guzosiri ike ma kwesị ịdabere n’ebe ọ nọ, na-arụkwa ọrụ dị nnọọ mma. Ọ bụrụ na anyị dị otú ahụ, a ga-enwe mmasị n’ozi ndị anyị na-eje, ọtụtụ ndị ga-achọkwa ya.—Ilu 22:29.
Ọ dị anyị mkpa ilekọta ahụ ike anyị nke ọma. Ọ bụ otu n’ime ihe onwunwe anyị ndị kasị baa uru, n’ihi na ọ bụrụ na anyị enweghị ya, anyị pụrụ ịrụpụta nanị ihe dị nnọọ nta. Ya mere, anyị kwesịrị ịnọgide na-eri nri na-edozi ahụ. Anyị kwesịrị inweta ezumike dị anyị mkpa, na-alakpu ụra n’oge dị mma n’abalị. Mgbe ike gwụrụ anyị nke ukwuu ma ọ bụ ọ dị ka ọrịa na-achọ ijide anyị, anyị ekwesịghị ịdị na-amanye onwe anyị ime ihe; anyị pụrụ ịkwụ ụgwọ dị elu n’ihi ya.
Ọ dị mkpa iche nche megide ịzụlite mmụọ nke ime mkpesa. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eche echiche na-ezighị ezi, anyị pụrụ ịchọta ihe na-adịghị mma n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile ma ọ bụ mmadụ nile. Nke a bụ ụzọ doro anya isi napụ onwe anyị na ndị ọzọ ọṅụ. Kama ịdị na-agba ásị̀rị̀ ma ọ bụ na-eme mkpesa banyere ihe anyị chere na ọ dịghị mma, anyị kwesịrị ime ka ndị ọ bụ ọrụ ha ilekọta okwu ahụ mata, wee hapụrụ ya ha idozi. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 1:10-12.) Ọ bụụrụ anyị ihe amamihe ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi, mgbe nile na-achọ ma na-atụ anya ịchọta ihe ọma n’ebe ndị ọzọ nọ na n’ihe omume ndị na-akpụzi ndụ anyị.—Tụlee Jud 3, 4, 16.
N’ime atụmatụ ihe omume anyị dị iche iche, anyị kwesịrị icheta na ime ihe n’ọkụ n’ọkụ pụrụ ịrụpụta ihe akụkọ, ma a dịghị enwekarị ike ịnọgide na-eme ya ruo ogologo oge. Ọ bụghị nanị na ịnọgide na-arụbiga ọrụ ókè na-eduba n’oké ike ọgwụgwụ, kamakwa ọ pụkwara iweta nkụda aka nke pụrụ imebi mkpebi anyị ịnọgide na-aga n’ihu. Ya mere, ka anyị gbasoo ụzọ ime ihe nke anyị pụrụ ịnọgide na ya ruo mgbe a na-akaghị aka. Dị ka ihe atụ, ọ dị mma iguzobe usoro ihe omume maka ikere òkè mgbe nile n’ọrụ nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na n’akụkụ ndị ọzọ nke ozi ndị Kraịst. Ọ dị anyị mkpa iwepụta oge maka ntụsara ahụ na ntụrụndụ na-ewuli elu. Anyị ga-ahụkwa na ọ bụ ihe bara uru isoro ndị agadi nwere ahụmahụ ọtụtụ afọ kwurịta okwu, n’ihi na ọ pụrụ ịbụ na ha amụtawo ime ihe ndị dị mkpa ma ghara inwe oké ike ọgwụgwụ n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ ná mmetụta.
Jiri Ezi Uche Mee Ihe
O kwesịrị ekwesị inwe mmetụta nke ịbụ ndị nwere ọrụ na ọchịchọ siri ike maka imezu ibu ọrụ nile e kenyere anyị, gụnyere ndị anyị nwere n’ime ọgbakọ ndị Jehova. Ndị ọrụ dị uchu, ndị a pụrụ ịdabere na ha, na-amasị Chineke. (Tụlee Matiu 25:21; Taịtọs 2:11-14.) Ma Akwụkwọ nsọ na-agba ume sị: “Chebe nzube ihe na izuzu.” (Ilu 3:21) Itinye amamihe Bible n’ọrụ ga-abara anyị uru, ọ dịkwa anyị mkpa iji echiche nke ihe anyị maara na ezi echiche na-eme ihe, na-eji nlezianya na-eme atụmatụ ma na-anọgide mgbe nile n’ókè nile nke ume anyị.
Okwu agbamume ahụ bụ ka mmadụ nwee ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị aghaghị ịbụ nke e ji ịdọ aka ná ntị dị n’Eklisiastis 9:4 hazie. Ebe ahụ na-agụ, sị: “Ọ dịịrị nkịta dị ndụ mma karịa ọdụm nwụrụ anwụ.” Ee, nkịta dị ndụ, ọ bụ ezie na ụfọdụ na-asọ ya oyi, ka ọdụm nwụrụ anwụ mma, bụ́ anụ ọtụtụ ndị na-ele anya dị ka eze. Ọ bụrụ na anyị egosipụta ezi nhazi ma lekọta ahụ ike anyị nke ọma, anyị ga-adị ndụ ma nọgide na-eme ihe dị iche iche. Ndị anwụrụ anwụ enwekwaghị òkè ọ bụla n’ọrụ ọ bụla. Ezi echiche pụrụ inyere anyị aka inwe nhazi ezi uche dị na ya nke na-enye anyị ohere imezu ihe ndị dị mkpa n’atụfughị ọṅụ anyị.
Ya mere, inwe ọtụtụ ihe ime apụtaghị na anyị apụghị inwe obi ụtọ. Ndị kasị jide ọrụ n’aka pụrụ iso ná ndị kasị nwee obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha nwere ezi uche, na-enwe ọnọdụ uche dị mma, ma na-eji ezi uche eme ihe ka ha wee nwee ezi nhazi. Anyị pụrụ inwe obi ụtọ kasị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị egosipụta amamihe, rụọ ọrụ ọma, tụkwasịkwa olileanya anyị n’ebe Jehova Chineke nọ.—1 Timoti 6:17-19.