Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 5/15 p. 12-17
  • “Kpọọ Ndị Okenye”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Kpọọ Ndị Okenye”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Enyemaka Dị Adị
  • ‘Onyinye Ndị Dị na Mmadụ’
  • Ibute Ụzọ
  • Ụzọ “Ndị Okenye” Si Enye Aka
  • Ibu Ọrụ Onwe Onye na Ekpere
  • “Onyinye n’Ụdị Mmadụ” Iji Lekọta Atụrụ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “Kpọọ Ndị Okenye”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Inwe Ekele Maka “Onyinye n’Ụdị Mmadụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • ‘Na-akwanyerenụ Ndị Na-arụsi Ọrụ Ike N’etiti Unu Ùgwù’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 5/15 p. 12-17

“Kpọọ Ndị Okenye”

“Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike? Ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya.”​—⁠JEMES 5:⁠14.

1, 2. (a) N’ọnọdụ dị aṅaa dị egwu ka ndị ohu Jehova na-achọta onwe ha ugbu a, oleekwa ihe pụrụ ịbụ mmetụta ha? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka a zaa ugbu a?

“OGE dị oké egwu” dị ugbu a. Ndị mmadụ na-eme omume n’ụzọ ịchọ ọdịmma onwe ha, n’ụzọ ịhụ ihe onwunwe n’anya, n’ụzọ mpako, ọtụtụ mgbe na-akpali ọgba aghara na “mgbe ikpeazụ” ndị a. (2 Timoti 3:​1-⁠5) Dị ka ndị Kraịst na-ebi n’ajọ usoro ihe dị ugbu a, anyị nọ n’egwu nke na-abịa site n’ihe ize ndụ atọ: Setan bụ́ Ekwensu, ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ na-adịghị asọpụrụ Chineke, na ọchịchọ ime mmehie nke anyị bu pụta ụwa.​—⁠Ndị Rom 5:12; 1 Pita 5:8; 1 Jọn 5:19.

2 N’ịbụ ndị ihe ize ndụ ndị a na-eyi egwu, mgbe ụfọdụ anyị pụrụ iche na ọ dịghị ihe anyị pụrụ ime. Ebe ọ dị otú ahụ, olee ebe anyị pụrụ inweta nkwado iji nyere anyị aka ịtachi obi n’ikwesị ntụkwasị obi? Ònye ka anyị ga-ejekwuru maka nduzi mgbe anyị zutere mkpebi ndị metụtara ọrụ ndị Kraịst anyị na ofufe anyị?

Enyemaka Dị Adị

3. N’aka ònye ka anyị pụrụ inweta nkasi obi na-emesi obi ike, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

3 Ịmara na Jehova bụ Isi Iyi nke ike anyị na-enye nkasi obi na-emesi obi ike. (2 Ndị Kọrint 1:​3, 4; Ndị Filipaị 4:13) Onye ọbụ abụ bụ́ Devid, bụ́ onye nwetara enyemaka Chineke, kwupụtara, sị: “Kpọree ụzọ gị ruo Jehova ahụ; tụkwasịkwa ya obi, ya onwe ya ga-emekwa ya.” “Tụkwasị Jehova ihe o nyeworo gị dị ka ibu, ya onwe ya ga-anagidekwa gị: ọ gaghị ekwe ka e wezụga onye ezi omume n’ọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:5; 55:22) Lee aha obi ekele anyị pụrụ inwe maka nkwado dị otú ahụ!

4. Olee ụzọ ma Pita ma Pọl si nye nkasi obi?

4 Anyị pụkwara inweta nkasi obi site n’ịmara na ọ bụghị nanị anyị na-eche ọnwụnwa na ihe ize ndụ ihu. Pita onyeozi gbara ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Na-eguzogidenụ [Setan bụ́ Ekwensu], n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu, ebe unu matara na a na-emezu otu ahụhụ ahụ n’ahụ ndị bụ òtù ụmụnna unu ndị nọ n’ụwa.” (1 Pita 5:9) N’ezie, ndị Kraịst nile na-achọ iguzosi ike n’okwukwe. N’eziokwu, ọtụtụ mgbe anyị pụrụ iche na “a na-akpagbu anyị n’akụkụ nile,” dị ka Pọl onyeozi chere. Ma, a ‘dịghị akpagbubiga ya ókè.’ Dị ka ya, anyị pụrụ inwe obi abụọ “ma anyị adịghị enwebiga obi abụọ ókè.” Ọbụna ma à sị na e sogbuo anyị, “a dịghị ahapụ nanị” anyị. Ọ bụrụ na “a na-atụda anyị n’ala,” a “dịghị ala anyị n’iyi.” N’ihi nke ahụ, “ike agwụghị anyị n’obi.” Anyị na-agba mbọ ‘ile anya, ọ bụghị n’ihe a na-ahụ anya, kama n’ihe a na-adịghị ahụ anya.’ (2 Ndị Kọrint 4:​8, 9, 16, 18) Olee ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a?

5. Enyemaka dị aṅaa dị ụzọ atọ ka Jehova na-enye?

5 Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” na-enye ihe enyemaka dị ụzọ atọ. (Abụ Ọma 65:2; 1 Jọn 5:14) Nke mbụ, ọ na-enye ntụziaka site n’Okwu ya e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible. (Abụ Ọma 119:105; 2 Timoti 3:16) Nke abụọ, mmụọ nsọ ya na-enye ike ime uche ya. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 4:​29-⁠31.) Nke atọ, nzukọ elu ala Jehova dị njikere mgbe nile inyere anyị aka. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nata enyemaka?

‘Onyinye Ndị Dị na Mmadụ’

6. Enyemaka dị aṅaa ka Jehova nyere na Tabera, n’ụzọ dịkwa aṅaa?

6 Otu ihe mere n’oge Mosis onye amụma na-enyere anyị aka ịghọta nchegbu ịhụnanya Jehova n’iwepụtara ndị ohu Ya enyemaka. Ihe ahụ mere na Tabera, nke pụtara “ịgba ọkụ; ọkụ ọgbụgba; ọkụ orire.” N’ógbè ebe a nke dị n’ọzara nke Saịnaị, Chineke mere ka ọkụ repịa ndị Israel ahụ na-atamu ntamu. “Ìgwè ndị gwara ọgwa” bụ́ ndị so ndị Israel pụta n’Ijipt esonyeworo ha n’ikwupụta enweghị afọ ojuju banyere ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha. N’ịrịba ama iwe Chineke na inwe mmetụta nke ịbụ onye ibu ọrụ ya n’ebe ndị ya nakwa mkpa ha dị na-anyịgbu, Mosis tiri mkpu, sị: “Apụghị m, nanị mụ onwe m, ikuru ndị nke a nile, n’ihi na ọ karịrị m arọ. Ma ọ bụrụ na otú a ka gị onwe gị na-eme m, biko, gbusie m, ọ bụrụ na ahụtawo m amara n’ihu gị; ka m gharakwa ilekwasị ihe ọjọọ m anya.” (Ọnụ Ọgụgụ 11:​1-⁠15) Olee ụzọ Jehova si zaghachi? Ọ họpụtara ‘ndị ikom iri asaa sitere ná ndị okenye Israel’ wee tinye mmụọ ya n’ahụ ha ka ha wee nwee ike isoro Mosis kere òkè nke ọma n’ọrụ nlekọta. (Ọnụ Ọgụgụ 11:​16, 17, 24, 25) Site n’inwe ndị ikom dị otú ahụ ruru eru e kenyere ọrụ, enyemaka dịrị ngwa ngwa nye ndị Israel na “ìgwè gwara ọgwa” ahụ.​—⁠Ọpụpụ 12:38.

7, 8. (a) Olee ụzọ Jehova siri nye “onyinye dị iche iche n’etiti mmadụ” n’Israel oge ochie? (b) Olee ụzọ Pọl si jiri Abụ Ọma 68:18 mee ihe na narị afọ mbụ?

7 Mgbe ndị Israel nọworo n’Ala Nkwa ahụ ruo ọtụtụ afọ, Jehova rịgoro n’Ugwu Zaịọn n’ụzọ ihe atụ wee mee Jerusalem isi obodo nke otu alaeze nnọchianya nke nwere Devid dị ka eze ya. N’inye Chineke otuto, bụ́ “Onye Nke Pụrụ Ime Ihe Nile,” Devid weliri olu ya ịbụ abụ, sị: “Ị rịgoruwo n’ebe dị elu, dọta usuu ndị a dọtara n’agha n’agha; ị natawo onyinye dị iche iche n’etiti mmadụ.” (Abụ Ọma 68:​14, 18) N’ezie, ndị ikom a dọtara n’agha n’oge e meriri Ala Nkwa ahụ ghọrọ enyemaka dị adị nye ndị Livaị n’ọrụ ha.​—⁠Ezra 8:20.

8 Na narị afọ mbụ O.A., onye Kraịst bụ Pọl onyeozi kpọtụrụ uche ná mmezu amụma nke okwu onye ọbụ abụ ahụ. Pọl dere, sị: “Ọ bụ anyị nile n’otu n’otu ka e nyere amara ahụ dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ nke onyinye Kraịst si dị. N’ihi nke a ọ sịrị, Mgbe ọ rịgoro n’elu, ọ dọtara usuu ndị a dọtara n’agha n’agha, nyekwa mmadụ onyinye dị iche iche. Ma okwu nke a, ọ rịgoro, gịnị ka ọ bụ ma ọ bụghị na ọ rịdakwara n’ime akụkụ ụwa dịkarịrị ala? Onye rịdara bụkwa onye ahụ nke rịgoro n’ebe kachasị eluigwe nile nke ukwuu, ka o wee mezuo ihe nile.” (Ndị Efesọs 4:​7-⁠10) Ònye bụ “onye” nke a? Ọ bụghị onye ọzọ e wezụga onye nnọchianya Jehova, bụ́ Devid ahụ Ka Ukwuu na Eze Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Ọ bụ onye ahụ Chineke kpọlitere n’ọnwụ wee bulie ya “elu nke ukwuu.”​—⁠Ndị Filipaị 2:​5-⁠11.

9. (a) Olee ndị bụ onyinye ndị dị na mmadụ na narị afọ mbụ? (b) Olee ndị bụ onyinye ndị dị na mmadụ n’oge a?

9 Mgbe ahụ, olee ndị bụ ‘onyinye ndị dị ná mmadụ’ ndị a (ma ọ bụ, “nke mmadụ mejupụtara”)? Pọl kọwara na Onye Isi Nnọchianya Chineke “nyekwara ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ozi; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi; ime ka ndị nsọ zuo okè ịrụ ọrụ nke ije ozi, iwuli ahụ nke Kraịst elu dị ka ụlọ.” (Ndị Efesọs 4:​11, 12) Ndị nile na-eso ụzọ Kraịst bụ́ ndị jere ozi dị ka ndị ozi, ndị amụma, ndị na-ezisa ozi ọma, ndị ọzụzụ atụrụ, na ndị ozizi mere otú ahụ n’okpuru ntụziaka ọchịchị Chineke. (Luk 6:​12-⁠16; Ọrụ 8:12; 11:27, 28; 15:22; 1 Pita 5:​1-⁠3) N’oge anyị a, ndị okenye ime mmụọ ruru eru a họpụtara site ná mmụọ nsọ na-eje ozi dị ka ndị nlekọta n’ihe dị ka 70,000 ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile. Ha bụ onyinye ndị dị na mmadụ nke anyị nwere. (Ọrụ 20:28) Site ná mmụba zuru ụwa ọnụ nke ọrụ nkwusa Alaeze nọgidere na-amụba, ọtụtụ ụmụnna nwoke “na-agbaso” ma na-ebu ibu ọrụ ndị e jikọtara ha na ‘ọnọdụ onye nlekọta.’ (1 Timoti 3:1) Mgbe a họpụtara ha, ha na-aghọkwa onyinye ndị dị na mmadụ.

10. Olee ụzọ nkọwa nke Aịsaịa banyere “ndị isi” si kwekọọ n’ọrụ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye n’oge a?

10 Ndị Kraịst ndị a bụ́ ndị okenye, ma ọ bụ onyinye ndị dị na mmadụ, kwekọrọ ná nkọwa Aịsaịa onye amụma nyere mgbe ọ na-ebu amụma banyere ọrụ “ndị isi,” bụ́ ndị nlekọta n’okpuru ọchịchị Alaeze. Onye ọ bụla n’ime ha aghaghị ịdị “ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:​1, 2) Nke a na-ekpughe aha nkwado nke nlekọta ịhụnanya ndị ikom ndị a a họpụtara ahọpụta kwesịrị ịbụ. Olee ụzọ ị pụrụ isi rite uru na ya n’ụzọ kasị zuo ezu?

Ibute Ụzọ

11. Mgbe anyị dara mbà n’ime mmụọ, olee ụzọ anyị pụrụ isi nata enyemaka?

11 Onye mmiri na-eri adịghị ama mgbe ọ na-eti mkpu maka enyemaka. A dịghị egbu oge. Mgbe ndụ nọ n’ihe ize ndụ, ọ dịghị onye na-achọ ka a kpalie ya ịkpọ òkù maka enyemaka. Ọ̀ bụ na Eze Devid akpọghị òkù maka enyemaka sitere n’aka Jehova mgbe mgbe? (Abụ Ọma 3:4; 4:1; 5:1-⁠3; 17:1, 6; 34:6, 17-⁠19; 39:12) Mgbe anyị dara mbà n’ime mmụọ, ma eleghị anya na-abami ná ndakpọ olileanya, n’otu aka ahụ anyị na-agakwuru Jehova n’ekpere ma na-arịọ ya ka o duzie anyị site ná mmụọ nsọ ya. (Abụ Ọma 55:22; Ndị Filipaị 4:​6, 7) Anyị na-achọ nkasi obi site n’Akwụkwọ Nsọ. (Ndị Rom 15:4) Anyị na-agụ akwụkwọ ndị Kraịst nke Watch Tower Society bipụtara iji nweta ndụmọdụ ndị dị irè. Nke a na-enyere anyị aka ọtụtụ mgbe ịgwọta nsogbu anyị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na o yie ka ihe isi ike ọ̀ na-anyịgbu anyị, anyị pụkwara ịchọ ndụmọdụ nke ndị okenye ọgbakọ a họpụtara ahọpụta. N’ezie, a pụrụ inwe oge mgbe ọ dị mkpa n’ezie ka a “kpọọ ndị okenye.” N’ihi gịnị ka a ga-eji kpọọ ndị okenye? Olee ụzọ ha pụrụ isi nyere ndị nọ ná mkpa enyemaka ime mmụọ aka?

12-14. (a) Olee ụzọ amamihe nke a ga-agbaso mgbe mmadụ na-arịa ọrịa? (b) Dị ka Jemes 5:14 si kwuo, gịnị ka a dụrụ ndị Kraịst “na-adịghị ike” ọdụ ime? (ch) Ụdị ọrịa dị aṅaa ka Jemes 5:14 na-ezo aka na ya, n’ihi gịnịkwa ka i ji zaa otú ahụ?

12 Mgbe anyị na-arịa ọrịa, anyị na-ezu ike iji nye ike ndị nke ahụ nwere ịgbake, ohere ịrụ ọrụ. Ma ọ bụrụ na ọrịa anyị anọgide na-aga n’ihu, anyị na-eji amamihe chọọ enyemaka ahụ ike ruru eru. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na anyị adaa mbà n’ụzọ ime mmụọ?

13 Rịba ama ndụmọdụ nke Jemes onye na-eso ụzọ nyere anyị n’akụkụ nke a. Ọ sịrị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike? Ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya; ka ha kpeekwa ekpere n’isi ya, na-ete ya mmanụ olive n’aha Onyenwe anyị.” (Jemes 5:14) Ụdị ọrịa dị aṅaa ka Jemes na-ezo aka na ya n’ebe a? Ụfọdụ ndị na-akọwa ihe dị na Bible na-ekwubi na ọ bụ ọrịa nkịtị, na-atụgharị uche na ite mmanụ bụ ihe a na-emekarị maka ahụ ike n’oge ahụ. (Luk 10:34) Ha kwekwara na Jemes bu n’uche ọgwụgwọ ọrụ ebube site n’onyinye nke ịgwọ ọrịa. Otú ọ dị, gịnị ka ihe a na-atụle na gburugburu ya na-egosi?

14 E gosiri ọdịiche dị n’etiti ‘inwe obi ụtọ’ na ‘ịhụju anya.’ Nke a na-egosi na Jemes na-atụle ọrịa ime mmụọ. (Jemes 5:13) “Ndị okenye nke nzukọ Kraịst,” ọ bụghị ndị dọkịta ma ọ bụ ọbụna ndị nwere onyinye ọrụ ebube nke ịgwọ ọrịa, bụ ndị a gaje ịkpọ. Gịnịkwa ka ha ga-eme? Jemes sịrị: “Ka ha kpeekwa ekpere n’isi ya. . . . Ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike.” (Jemes 5:​14, 15; tụlee Abụ Ọma 119:​9-⁠16.) Ịnwapụta n’ụzọ na-enweghị mgbagha na Jemes na-ezo aka n’ọrịa ime mmụọ bụ eziokwu nke bụ na ọ gbara ume ikwupụta mmehie n’ihe banyere ọgwụgwọ nke a na-ele anya ya. O dere, sị: “Na-ekwupụtanụ mmehie nile unu gwarịta ibe unu, na-ekpekwa ekpere n’ihi ibe unu, ka e wee mee ka ahụ dị unu ike.” Ọ bụrụ na ajọ mmehie bụ ihe kpatara ọrịa ime mmụọ ahụ, a pụrụ ịtụ anya ka onye ọrịa ahụ gbakee nanị ma ọ nabata agbamume dabeere n’Okwu Chineke, chegharịa, ma si n’ụzọ mmehie ya pụọ.​—⁠Jemes 5:16; Ọrụ 3:19.

15. Ụdị ihe omume dị aṅaa ka a tụrụ aro ya na Jemes 5:​13, 14?

15 E nwere ihe ọzọ a ga-arịba ama na ndụmọdụ ahụ Jemes nyere. Mgbe ọ na-ahụju anya, onye Kraịst kwesịrị ‘ikpe ekpere.’ Ọ bụrụ na ọ na-enwe obi ụtọ, “ya bụọ abụ ọma.” Ọnọdụ nke ọ bụla​—⁠ma mmadụ ọ̀ na-ahụju anya ma ọ bụ na-enwe obi ụtọ⁠—​chọrọ ihe omume. Ekpere dị mkpa n’otu akụkụ, abụ obi ụtọ n’akụkụ nke ọzọ. Ya mere, ebe ọ dị otú ahụ, gịnị ka anyị kwesịrị ịtụ anya ya mgbe Jemes jụrụ, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike?” Ọzọ ọ tụrụ aro ime ihe ziri ezi, ee, ibute ụzọ. “Ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya.”​—⁠Abụ Ọma 50:15; Ndị Efesọs 5:19; Ndị Kọlọsi 3:16.

Ụzọ “Ndị Okenye” Si Enye Aka

16, 17. Olee ụzọ ndị okenye na-esi enyere anyị aka itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ?

16 Mgbe ụfọdụ ọ na-esiri anyị ike ịmara ụzọ isi tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’ọnọdụ anyị nọ n’ime ya. N’ebe a, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ ịbụ isi iyi nke enyemaka dị oké ọnụ ahịa. Dị ka ihe atụ, ha na-ekpe ekpere n’isi onye na-arịa ọrịa ime mmụọ ma ‘na-ete ya mmanụ n’aha Jehova’ site n’iji ụzọ nkà jiri ndụmọdụ sitere n’Okwu Chineke mee ihe. Ndị okenye pụrụ isi otú a nye aka n’ọtụtụ ụzọ ná mgbake ime mmụọ anyị. (Abụ Ọma 141:5) Ọtụtụ mgbe, nanị ihe dị anyị mkpa bụ imesi anyị obi ike na anyị na-eche echiche n’ụzọ ziri ezi. Isoro onye Kraịst bụ́ okenye tụlee okwu ahụ ga-emesi mkpebi anyị ike ime ihe ziri ezi.​—⁠Ilu 27:17.

17 Mgbe a kpọrọ ha òkù ime nleta, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye kwesịrị ‘ịgụgụ ndị dara mbà n’obi.’ Ha ‘ga-enyekwara ndị na-adịghị ike aka, nweekwa ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Mmekọrịta dị otú ahụ dị omimi, nke nghọta dị na ya n’etiti “ndị okenye” na “ndị dara mbà n’obi” na-eme ka o kwe omume karị inwe mgbake zuru ezu nke ahụ ike ime mmụọ.

Ibu Ọrụ Onwe Onye na Ekpere

18, 19. Òkè dị aṅaa ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ekere n’ihe banyere Ndị Galetia 6:​2, 5?

18 Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye aghaghị ibu ibu ọrụ ha n’ebe ìgwè atụrụ Chineke nọ. Ha aghaghị ịbụ ndị na-enye nkwado. Dị ka ihe atụ, Pọl sịrị: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị. Na-eburịtanụ ibu na-anyị ibe unu, na-edebezukwanụ iwu Kraịst n’ụzọ dị otú a.” Onyeozi ahụ dekwara, sị: “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.”​—⁠Ndị Galetia 6:​1, 2, 5.

19 Olee ụzọ anyị pụrụ isi buo ibu na-anyịgbu ibe anyị ma na-ebukwa ibu nke onwe anyị? Ọdịiche dị n’ihe okwu Grik ndị ahụ pụtara ndị a sụgharịrị ịbụ “ibu na-anyị” na “ibu” na-ewepụta azịza ya. Ọ bụrụ na onye Kraịst abanye n’ihe isi ike ime mmụọ nke na-anyịgbu ya, ndị okenye na ndị kwere ekwe ibe ya ga-enyere ya aka, si otú a na-enyere ya aka ibu “ibu na-anyị” ya. Otú ọ dị, a tụrụ anya ka onye ahụ n’onwe ya na-ebu “ibu” ọrụ nke ya n’ebe Chineke nọ.a Ndị okenye na-eji ọṅụ na-ebu “ibu na-anyị” ụmụnna ha site n’agbamume, ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ, na ekpere. Ma, ndị okenye adịghị anapụ anyị “ibu” ọrụ ime mmụọ nke onwe anyị.​—⁠Ndị Rom 15:1.

20. N’ihi gịnị ka a na-agaghị eji leghara ekpere anya?

20 Ekpere dị mkpa, e kwesịghịkwa ileghara ya anya. Ma ọ na-esiri ọtụtụ ndị Kraịst na-arịa ọrịa ime mmụọ ike ikpe ekpere. Mgbe ndị okenye na-ekpe ekpere nke okwukwe n’isi onye na-arịa ọrịa n’ime mmụọ, gịnị bụ nzube ya? “Onyenwe anyị ga-emekwa ka o bilie,” dị ka isi ná nhụjuanya pụta, ọ ga-agbakwa ya ume ịgbaso ụzọ nke eziokwu na ezi omume. Onye Kraịst na-arịa ọrịa ime mmụọ pụrụ inwe àgwà na-ezighị ezi ma ọ pụrụ ịbụ na ọ dịbeghị ajọ mmehie o mere, n’ihi na Jemes na-asị: “Ọ bụrụkwa na o mehieworo, a ga-agbaghara ya mmehie ahụ.” Ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ nke ndị okenye, tinyere ekpere sitere n’obi na-akpali onye dara mbà n’ime mmụọ mgbe ụfọdụ ikwupụta ajọ mmehie nke ọ pụrụ imeworị na igosipụta mmụọ nchegharị. Nke a, n’aka nke ya, na-akpata mgbaghara n’akụkụ nke Chineke.​—⁠Jemes 5:​15, 16.

21. (a) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ụfọdụ ji ala azụ ịkpọ ndị okenye? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu naesonụ?

21 N’ịbụ ndị ihe ịma aka nke ilekọta ọtụtụ ìgwè ndị ọhụrụ na-abata n’ime ọgbakọ ndị Kraịst chere ihu, ndị okenye na-elezi anya nwere ọtụtụ ihe ime n’inye nlekọta zuru ezu. N’ezie, onyinye ndị a dị na mmadụ bụ ndokwa mara mma site n’aka Jehova iji nyere anyị aka ịtachi obi n’oge ndị a dị egwu. Ma, ụfọdụ ndị Kraịst na-ala azụ ịkpọ òkù maka enyemaka ha, na-eche na ụmụnna ndị a ji ọrụ dị ukwuu n’aka ma ọ bụ bụrụ ndị nsogbu na-anyịgbu. Isiokwu na-esonụ ga-enyere anyị aka ịghọta na ndị ikom ndị a na-enwe obi ụtọ inyere anyị aka, n’ihi na ha ji ọchịchọ obi ha na-eje ozi dị ka ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru n’ọgbakọ ndị Kraịst.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Akwụkwọ bụ́ A Linguistic Key to the Greek New Testament, nke Rienecker dere, kọwara phor·tiʹon dị ka “ibu nke a tụrụ anya ka mmadụ buo,” na-ekwukwa, sị: “E ji ya mee ihe dị ka okwu ndị agha maka akpa ibu mmadụ ma ọ bụ ihe onye agha ji kwanye ngwongwo ya.”

Olee Ụzọ Ị Ga-esi Zaa?

◻ Mgbe enyemaka dị anyị mkpa, enyemaka dị aṅaa dị ụzọ atọ ka Jehova na-enye?

◻ Olee ndị bụ onyinye ndị dị na mmadụ nke oge a?

◻ Olee mgbe anyị kwesịrị ịkpọ ndị okenye?

◻ Enyemaka dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ya site n’aka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye?

[Foto dị na peeji nke 15]

Ị̀ na-erite uru ime mmụọ nke ekpere, ọmụmụ Bible, na enyemaka sitere n’aka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya