Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 4/1 p. 20-24
  • Ndụ Bara Uru, Na-akwụghachi Ụgwọ n’Ije Ozi Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Bara Uru, Na-akwụghachi Ụgwọ n’Ije Ozi Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Uhuruchi nke Gbanwere Ndụ M
  • Ije Ozi Anyị n’Afọ Ndị Mbụ
  • Mgbanwe nke Lere Okwukwe Anyị Ule
  • Mgbe Ndị E Ji Ihe Nta Gbanahụ Ọdachi
  • Inye Aka n’Otu Okwu Ikpe
  • Agha Ebie​—⁠Ije Ozi Anyị Agaa n’Ihu
  • Ụzọ nke Jehova Bụ Ụzọ Kasị Mma Isi Bie Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Anyị Kpebisiri Ike Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ije Ozi n’Okpuru Aka Ịhụnanya Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 4/1 p. 20-24

Ndụ Bara Uru, Na-akwụghachi Ụgwọ n’Ije Ozi Jehova

DỊ KA LEO KALLIO SI KỌỌ

Ọ bụ afọ 1914, otu ụbọchị mara mma n’ọgwụgwụ oge okpomọkụ na-agwụkwa n’obodo nta anyị nke Turku, otu obodo dị na Finland. Na mberede, e mebiri ịdị jụụ site n’akụkọ banyere otu agha ukwu nke tiwapụworo. Ngwa ngwa okporo ámá nile jupụtara ná ndị na-eche ihe ihe ndị na-eme pụtara. Ihu ndị tachiri atachi nke ndị meworo okenye mere ka anyị bụ ụmụntakịrị na-eche banyere ihe ga-eme. Agbara m afọ itoolu, m na-echetakwa na egwuregwu dị n’udo nke ụmụntakịrị gbanwere wee bụrụ egwuregwu nke agha.

ỌBỤ ezie na Finland etinyeghị aka n’Agha Ụwa nke Mbụ (1914-1918), agha obodo mebisịrị mba ahụ na 1918. Ndị ikwu na ndị bụbu enyi chịliri ngwá agha megide ibe ha n’ihi ọdịiche n’echiche ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ezinụlọ anyị nke mmadụ asaa detụkwara ịkpọasị nke a irè. Nna m, onye na-ekwupụta echiche ya hoo haa, ka e jidere ma maa ya ikpe ịga mkpọrọ afọ asaa. E mesịa a tọhapụrụ ya sị na ikpe amaghị ya, ma mgbe ahụ e mebiwo ahụ ike ya.

Ezinụlọ anyị hụjuru anya n’ihi agụụ na ọrịa n’ime oge a dị oké njọ. Atọ n’ime ụmụnne m nwanyị ndị m tọrọ nwụrụ. Nwanne nna m, onye bi n’obodo ukwu bụ́ Tampere, nụrụ banyere nhụsianya anyị wee kpọọ nne m na nna m na anyị ụmụntakịrị abụọ fọrọ afọ iso ya biri.

Ka ọtụtụ afọ gasịrị, mgbe m ka bi na Tampere, ezutere m otu nwa agbọghọ mara mma a na-akpọ Sylvi. O nwere ọnọdụ ntolite yiri nke m. E gburu nna ya n’agha obodo ahụ, e mesịakwa otu ezi enyi nke ezinụlọ ya, Kaarlo (Kalle) Vesanto sitere n’obodo ukwu bụ́ Pori, kpọọrọ ya, nwanne ya nwanyị, na nne ya. O mere ndokwa ka nne Sylvi nweta ọrụ nakwa ka ụmụ agbọghọ ndị ahụ gaa akwụkwọ. E mesịa Sylvi kwagara Tampere inweta ọrụ, ọ bụkwa ebe ahụ ka anyị zutere.

Otu Uhuruchi nke Gbanwere Ndụ M

Na 1928, Sylvi ghọrọ onye m kwere nkwa ọlụlụ, otu ụbọchị kwa anyị gara Pori ije leta Kalle Vesanto na ezinụlọ ya. Ọ dịbeghị ihe ọzọ metụtara ndụ n’ụzọ siri ike otú a. Kalle bụbu onye nwere ma jirikwa ịnyịnya ịsọ mpi ịgba ọsọ eme ihe ma ọ hapụwo ọrụ ahụ. Ya na nwunye ya aghọwo ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke ozi ọma Alaeze Chineke. Akwụkwọ 1990 Yearbook of Jehovah’s Witnesses kọwara otú o siri kwụọ ndị mmadụ ụgwọ ide okwu ndị ahụ bụ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị” n’azụ mgbidi nke ụlọ elu ya dị okpukpu abụọ. Ihe odide ahụ buru ibu nke na ọ dị mfe isite n’ụgbọ okporo ígwè ji oké ọsọ na-agbafe gụọ ya.

N’abalị ahụ mụ na Kalle kwurịtara okwu ruo n’ime nderi. “N’ihi gịnị? N’ihi gịnị? N’ihi gịnị?” ka m na-ajụ, Kalle na-akọwakwa. N’ụzọ nkịtị amụtara m eziokwu Bible ndị bụ isi n’otu abalị. Edeturu m akụkụ akwụkwọ nsọ ndị kọwara ozizi dị iche iche. E mesịa, mgbe m lọtara ụlọ, ewetara m otu akwụkwọ ma detuo ihe dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ nile kpọmkwem dị ka e dere ha. N’ihi na amatabeghị m Bible nke ọma, eji m akwụkwọ a na-agbara ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ n’ebe a na-ewu ihe owuwu àmà. Mgbe m na-ekpughe ozizi dị iche iche nke okpukpe ụgha, ana m achọtakarị onwe m ikwughachi okwu ndị Kalle kwuru: “A ghọgbuwo unu n’ezie, ụmụ ibe!”

Kalle nyere m adres nke otu ụlọ nta dị na Tampere ebe ihe dị ka 30 Ndị Mmụta Bible na-enwe nzukọ ha. N’ebe ahụ m ga-agwọrọ n’ala n’otu akụkụ dị nso n’ọnụ ụzọ n’akụkụ Nwanna Andersson, bụ́ onye nwe ụlọ nta ahụ. Adịghị m abịachikebe nzukọ anya, ma ekpere nyere nnọọ aka. Mgbe m na-enwe nsogbu siri ike n’ebe ọrụ, ekpere m ekpere otu mgbe, sị: “Biko, Chineke, ọ bụrụ na i nyere m aka imeri ihe isi ike ndị a, ana m ekwe nkwa ịdị na-ejezu nzukọ nile.” Ma ihe kawanyere nnọọ njọ. Mgbe ahụ aghọtara m na m na-eme ka ozi m na-ejere Jehova dabere n’ọnọdụ ụfọdụ, ya mere agbanwere m ekpere m ka ọ bụrụ: “N’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, ana m ekwe nkwa ịdị na-ejezu nzukọ nile.” Mgbe ahụ ihe isi ike nyetụrụ ohere, m wee bụrụkwa onye na-ejechi nzukọ anya.​—⁠1 Jọn 5:14.

Ije Ozi Anyị n’Afọ Ndị Mbụ

Na 1929, mụ na Sylvi lụrụ di na nwunye, na 1934 anyị abụọ gosipụtakwara nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova site na baptism ime mmiri. N’oge ndị ahụ, ije ozi anyị metụtara iji ígwè phonograph na rekọd na-eje n’ebe obibi ndị mmadụ jirikwa obi ọma na-ajụ ma ànyị pụrụ ịgwa ha okwu Bible n’anaghị ha ego ọ bụla. Ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-anabata anyị ngwa ngwa, mgbe ha gesịkwara ntị n’okwu ahụ e tinyere na rekọd, ha na-ekere òkè ná mkparịta ụka ma nara ụfọdụ n’ime akwụkwọ anyị.

Site ná nkwado nke ndị ọchịchị, anyị na-akpọghachi okwu Bible ndị a na-eji ígwè ndị na-eme ka okwu daa ụda mee ihe n’ogige ntụrụndụ dị iche iche. N’ógbè nta dị iche iche kwa anyị na-ekowe ígwè okwu ndị ahụ n’elu ụlọ ma ọ bụ n’elu ebe anwụrụ ọkụ si apụ n’elu ụlọ. N’oge ndị ọzọ anyị na-akpọ ha n’akụkụ ọdọ mmiri ebe ọtụtụ ndị obodo na-ezukọta n’ìgwè bara ụba. Anyị na-eburu ígwè ahụ na-eme ka okwu daa ụda n’ime ụgbọ mmiri ma were nwayọọ nwayọọ na-akpa ụgbọ n’ụsọ mmiri ahụ. N’ụbọchị ndị bụ Sunday anyị na-eji bọs jee n’ime ime obodo, na-eji ígwè anyị na-eme ka okwu daa ụda nke dị oké mkpa na ọtụtụ akwụkwọ kwadebe onwe anyị.

Mgbanwe nke Lere Okwukwe Anyị Ule

Na 1938, abanyere m n’ozi oge nile dị ka onye ọsụ ụzọ, ma m nọgidekwara na-arụ ọrụ dị ka onye na-edo blọkụ. N’oge opupu ihe ubi na-esochi, anatara m ịkpọ òkù site n’alaka ụlọ ọrụ Society ịbụ onye ozi na-ejegharị ejegharị, nke a na-akpọ onye nlekọta sekit ugbu a. Mkpebi nke ịnara ya abụghị nke dị mfe n’ihi na m na-enwe obi ụtọ isoro ọgbakọ m dị na Tampere na-arụ ọrụ. Ọzọkwa, anyị nwere ebe obibi nke aka anyị; anyị nwere otu nwa nwoke dị afọ isii, Arto, bụ́ onye ga-amalite akwụkwọ n’oge na-adịghị anya; Sylvi nwekwara obi ụtọ n’ọrụ ya dị ka onye na-ere ihe n’otu ụlọ ahịa. Ma, mgbe anyị tụlekọsịrị ya, anakwere m ihe ùgwù ọzọ nke a nke ije ozi Alaeze.​—⁠Matiu 6:33.

Mgbe ahụ oge ihe isi ike ọzọ malitere. Agha tiwapụrụ na November 30, 1939, mgbe ndị agha Soviet zọbatara ụkwụ na Finland. Agha ahụ, bụ́ nke a kpọrọ Agha Oge Oyi, ka a lụrụ ruo na March 1940, mgbe e mere ka Finland kwenye ná nkwekọrịta nke udo. O yiri ọbụna ka ọnọdụ ihu igwe so lụọ agha, n’ihi na nke ahụ bụ oge oyi kasị tụọ oyi bụ́ nke m pụrụ icheta. Eji m ịnyịnya ígwè na-eme njem site n’otu ọgbakọ ruo n’ọzọ ka akara thermometer gbadara ruo ihe karịrị -22° degree Fahrenheit!

Na 1940 a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova n’iwu na Finland. E mesịa a tụbara ọtụtụ ndị Finland na-eto eto bụ́ Ndịàmà n’ụlọ mkpọrọ ma manye ha ịnọgide n’ebe ahụ n’okpuru ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, enwere m ike ileta ọgbakọ dị iche iche n’oge nile nke agha ụwa nke abụọ site na 1939 ruo 1945. Nke a na-achọkarị na m ga-anọ n’ahụghị Sylvi na Arto ruo ọnwa ole na ole n’otu oge. Ọzọkwa, e nwere iyi egwu mgbe nile nke ịbụ onye e jidere maka ịnọgide na-arụ ọrụ nke a machibidoworo iwu.

Ọ ghaghị ịbụ na a na-ele m anya dị ka onye dị iche, na-agba ịnyịnya ígwè nke e bokwasịrị otu akpa ukwu, otu akpa akwụkwọ na otu ígwè phonograph na rekọd dị iche iche. Otu ihe kpatara m ji na-ebu rekọd phonograph bụ iji gosi, ma ọ bụrụ na e jide m, na abụghị m onye a ga-ele anya dị ka onye si n’ụgbọ elu fedata nke na-eme nledo maka ndị Russia. Ya bụ na apụrụ m ịrụ ụka na ọ bụrụ na m bụ onye si n’ụgbọ elu fedata, rekọd ndị ahụ gaara agbajiworị mgbe m na-awụtu.

Otú ọ dị, otu oge mgbe m na-eme nleta n’agbata obi ebe a dọworo aka ná ntị banyere otu onye nledo, otu ezinụlọ nke Ndịàmà ghọtahiere m dị ka otu n’ime ha. Akụrụ m aka n’ọnụ ụzọ ha n’otu abalị gbara ọchịchịrị nke oge oyi, egwu jikwa ha nke ukwuu imepe ụzọ. Ya mere anọrọ m abalị ahụ nile n’ime ọba, jiri ahịhịa kpuchie onwe m ná mgbalị m iji zere oyi. N’ụtụtụ na-esochi a ghọtara onye m bụ, aghaghịkwa m ikwu na n’ime oge nleta m fọdụrụ, ndị òtù nke ezinụlọ ahụ gosiri m oké ile ọbịa pụrụ iche!

N’ime afọ ndị ahụ a lụrụ agha, nanị mụ na Nwanna Johannes Koskinen letara ọgbakọ ndị dị n’etiti na n’ebe ugwu Finland. Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ebe buru ibu ọ ga-elekọta, ihe dị ka 600 kilomita n’ogologo. Anyị nwere ọtụtụ ọgbakọ ileta nke na anyị pụrụ isoro ọgbakọ ọ bụla nọrọ nanị ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ. O siri ike ụgbọ okporo ígwè ịbịa n’oge, ụgbọ ala bọs dịkwa ole na ole ma na-ejupụta ná mmadụ nke na ọ bụ ihe ịtụnanya ịhụ na anyị ruru ebe anyị na-aga.

Mgbe Ndị E Ji Ihe Nta Gbanahụ Ọdachi

Otu mgbe, ná mmalite Agha Oge Oyi ahụ, agara m alaka ụlọ ọrụ dị na Helsinki wee bute nnukwu katọn anọ nke akwụkwọ a machibidoro iwu bụ́ nke m ga-etinye n’ụgbọ okporo ígwè wee kesaara ọgbakọ dị iche iche. Mgbe m nọ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè dị na Riihimäki, mgbịrịgba na-agba àmà maka mwakpo agha ụgbọ elu kụrụ. Ndị agha ndị nọ n’ụgbọ okporo ígwè ahụ yinyere uwe oyi ha, a gwakwara ndị njem ka ha pụọ n’ụgbọ okporo ígwè ahụ n’egbughị oge ma jee ná mbara ala tọgbọrọ nkịtị nke dị ná ncherịta ihu ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ.

Agwara m ndị agha ahụ ka ha bute katọnụ m, na-agwa ha ịdị mkpa ha. Nke ọ bụla n’ime ha buuru otu katọn, anyị gbakwara ọsọ ihe dị ka 200 mita n’elu mbara ala ahụ snow kpuchiri. Anyị dara n’ala, otu onye kpọkukwara m na-asị: “Lee anya, onye nkịtị a, emegharịkwala ahụ ma ọlị! Ọ bụrụ na ndị na-atụpụ bọmbụ ahụ emegharịa ahụ ma ọlị, ha ga-atụ anyị bọmbụ.” Enwere m oké ọchịchọ ịmata ihe na-eme nke na m weere nwayọọ tụgharịa ihu m ile ihu igwe anya, ebe m gụtara 28 ụgbọ elu!

Na mberede ala mara jijiji n’ihi bọmbụ ndị na-agbawa. Ọ bụ ezie na a tụghị bọmbụ n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ, ma a tụrụ ụgbọ okporo ígwè nke bu anyị bata bọmbụ. Lee ka o si bụrụ ihe na-akpata ụjọ ile ụgbọ okporo ígwè na okporo ígwè ndị ahụ gbagọsịrị agbagọsị anya! N’ụtụtụ na-esonụ apụrụ m ịmaliteghachi njem m na-ebukwa katọn ndị ahụ, ndị agha ahụ gakwara n’ihu ná njem ha, na-eji ụgbọ okporo ígwè ọzọ. Otu n’ime ha ghọrọ Onyeàmà mgbe agha biri, ọ gwakwara m na ndị agha ahụ mesịrị kwuo okwu banyere onye nkịtị ahụ a na-amaghị onye ọ bụ na katọn ya.

Mgbe oge ụfọdụ gasịrị e jidere Nwanna Koskinen, tupu o si n’ụgbọ okporo ígwè rịtuo, mgbe ọ na-eme njem ileta otu ọgbakọ nta dị ka Rovaniemi dị n’ebe ugwu Finland. E tinyere ya n’ụlọ mkpọrọ, bụ́ ebe e mesoro ya n’ụzọ dị oké njọ. Mgbe oge ruru ka m jee leta otu ọgbakọ nta ahụ, emere m ndokwa isi n’ụgbọ okporo ígwè ahụ rịtuo n’otu ọdụ ụgbọ okporo ígwè nta nke Koivu. N’ebe ahụ Nwanna Nwanyị Helmi Pallari mere ndokwa ka m jiri otu ụgbọ ala na-ebu mmiri ara ehi jetọpụ nke fọrọ. Nleta o letara Ọgbakọ Rovaniemi gara nke ọma. Otú ọ dị, mgbe m na-apụ adabara m ná nsogbu.

Mgbe m na-eje n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, mụ na onye mụ na ya so zutere ndị agha abụọ ndị na-enyocha akwụkwọ nkọwa nke onye ọ bụla na-agafe. “Elela ha anya. Legide anya gị n’ihu,” ka m kwuru. Anyị gafere n’etiti ha ka à ga-asị na ha anọghị ebe ahụ. Mgbe ahụ ha malitere ịchụso anyị. N’ikpeazụ, n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ahụ, apụrụ m ịgbanahụ ha n’etiti ìgwè mmadụ ahụ wee wụba n’otu ụgbọ okporo ígwè na-apụ apụ. A dịghị enwe ụkọ nke ihé mkpali n’ọrụ njegharị n’oge ndị ahụ!

N’otu oge e jidere m ma kpụga m n’ụlọ ọrụ ebe a na-edebanye aha maka ọrụ agha. Ihe e zubere bụ iziga m n’ihu agha. Ma fon kụrụ, onye agha ahụ nke chọrọ ịgba m ajụjụ ọnụ zara. Apụrụ m ịnụ olu onye na-ekwu na telifon ka ọ na-eti mkpu, sị: “Ọ̀ bụ gịnị mere i ji nọgide na-ezite ndị a na-arịa ọrịa, na-abaghị uru? Nanị ihe anyị pụrụ ime bụ izighachi ha. Ihe dị anyị mkpa bụ ndị ikom gbasiri ike maka ọrụ!” Ọ bụ ihe obi ụtọ na m ji akwụkwọ nkọwa ahụ ike nke na-ekwu banyere otu nsogbu ahụ ike m nwere. Mgbe m gosiri nke a, ha hapụrụ m ka m laa wee gaa n’ihu n’ọrụ m n’ọgbakọ dị iche iche n’enweghị mgbochi!

Inye Aka n’Otu Okwu Ikpe

Ọgba aghara agha ahụ nọgidere na-aga n’ihu, e jidere enyi m bụ Ahti Laeste. Nwunye ya kpọrọ m. Mgbe m ruru ụlọ ha, achọtara m n’etiti akwụkwọ ya otu akwụkwọ ikike nke sitere n’aka ndị uwe ojii nọ n’ógbè ahụ nke na-enye Ahti ikike ịkpọsa okwu ndị e tinyere n’ígwè okwu n’ogige ntụrụndụ ọha na eze ndị dị n’obodo ahụ. Anyị ji akwụkwọ nkọwa ahụ garuo ụlọ ikpe. Mgbe ha gụpụtasịrị iwu ndị ọ dara, enyere m Nwanna Laeste akwụkwọ nkọwa ahụ. Onye ọkà ikpe ahụ mere ka otu onye agha weta ígwè okwu phonograph na ọtụtụ okwu Bible ndị e tinyere na tepu ka ndị nọ n’ụlọ ikpe wee nụ. Mgbe o gesịrị ntị n’okwu nke ọ bụla, ọkà ikpe ahụ sịrị na ya apụghị ịhụ ihe ọ bụla dị njọ n’ihe ndị e kwuru.

Mgbe ahụ e zipụrụ mụ na Ahti na nwunye ya na paseji ichere mkpebi nke ụlọ ikpe ahụ. Ebe ahụ ka anyị guzo n’amaghị ihe ga-emesị mee. N’ikpeazụ anyị nụrụ otu olu ka ọ na-asị: “Onye ahụ e boro ebubo, biko bata n’ime ụlọ ikpe.” A tọhapụrụ Nwanna Laeste dị ka onye ikpe na-amaghị! Obi anyị jupụtara n’ekele nye Jehova n’ezie ka anyị gara n’ihu n’ọrụ anyị, Nwanna Nwoke na Nwanyị Laeste gara n’ihu n’ọrụ ha n’ọgbakọ ha, m gakwara n’ihu n’ọrụ njegharị m.

Agha Ebie​—⁠Ije Ozi Anyị Agaa n’Ihu

E wepụrụ mmachibido a machibidoro ọrụ nkwusa anyị mgbe agha biri, a tọhapụkwara ụmụnna site n’ụlọ mkpọrọ. N’ime ọtụtụ afọ nke ije ozi m, e mewo ka ọrụ ụmụnna nwanyị ndị Kraịst na-arụ n’ọrụ Alaeze nakwa n’ịkwado di ha nwee mmetụta dị omimi n’obi m. Enwere m ekele karịsịa maka ịchụ àjà na nkwado nke Sylvi. N’ihi ya, enwere m ike ịnọgide n’ọrụ njegharị n’akwụsịtụghị ruo 33 afọ ma mesịakwa na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Mụ na Sylvi gbara Arto ume ịmalite ịsụ ụzọ mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, ịmụ asụsụ Bekee, nakwa ije ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na United States. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Gilead na 1953. E mesịa ọ lụrụ Eeva, ha abụọ ekerewokwa òkè n’akụkụ dị iche iche nke ozi oge nile, na-agụnye ọrụ sekit, ozi Betel, na ịsụ ụzọ pụrụ iche. Na 1988 ha kwagara na Tampere, obodo nke ebe obibi anyị, iji nye aka n’ilekọta mụ na Sylvi ka ha nọgidere na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche.

Mụ na Sylvi amawo ụtọ ndụ bara uru nke e jikwa ọtụtụ ihe ncheta ndị ga-agba anyị ume gọzie, ọ bụ ezie na ike anyị ebelatawo n’ụzọ dị ukwuu ugbu a. Ọ bụ ihe na-akwụghachi ụgwọ nke ukwuu icheta uto ndị anyị hụworo. Mgbe m malitere ileta ọgbakọ dị iche iche na 1939, e nwere 865 ndị nkwusa Alaeze na Finland, ma ugbu a ha karịrị 18,000!

Ọ dịghị mgbe m chere echiche mgbe m malitere ozi oge nile laa azụ na 1938 na m ka ga na-ekere òkè na ya mgbe 55 afọ gasịrị. N’agbanyeghị ịka nká, site n’ike Jehova anyị na-aga n’ihu, na-elepụ anya maka nkwụghachi ụgwọ e kwere anyị ná nkwa. Anyị tụkwasịrị obi n’okwu onye ọbụ abụ ahụ: “Jehova dị mma; ruo mgbe ebighị ebi ka ebere Ya dị; ruo ọgbọ nile ka ikwesị ntụkwasị obi Ya dịkwa.”​—⁠Abụ Ọma 100:5.

[Foto dị na peeji nke 21]

Leo na Sylvi Kallio gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Jehova na 1934

[Foto dị na peeji nke 23]

Foto Leo na Sylvi sere n’oge na-adịbeghị anya ka ha na-eru nso 60 afọ nke ije ozi a raara nye

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya