Anọ M Nanị M Ma A Hapụghị M
DỊ KA ADA LEWIS SI KỌỌ
M nọwo na-enwe àgwà nke ịnọrọ onwe m mgbe nile. M na-enwekwa mkpebi siri ike—mgbe ụfọdụ ndị ọzọ na-akpọ ya ime isi ike—n’ihe nile m na-eme. M makwaara otú ọ na-esi adị mfe inwe nkwuwa okwu, àgwà nke a akpatawokwara m nsogbu n’afọ ndị a nile.
MA, ENWERE m ekele na Jehova Chineke ajụbeghị m n’ihi ntụpọ ọdịdị mmadụ m. Site n’ịmụ Okwu ya, enwewo m ike imezi ọdịdị m wee si otú a jee ozi maka ọdịmma Alaeze ya ruo ihe dị ka 60 afọ. Kemgbe m nọ na nwata, abụwo m onye nwere mmasị n’ịnyịnya, enyemaka Chineke kwa n’ịchịkwa ịgba isi akwara m mgbe mgbe echetaworo m otú a pụrụ isi eji bridle achịkwa ịnyịnya.
A mụrụ m na nso ọdọ mmiri mara mma na-acha anụnụ anụnụ n’Ugwu Gambier na South Australia na 1908. Ndị mụrụ m nwere ugbo mmiri ara ehi, abụkwa m ada n’ime ụmụ asatọ. Nna anyị nwụrụ mgbe anyị nile ka dị nnọọ ntakịrị. Nke ahụ hapụụrụ m ọtụtụ ibu ọrụ nke ilekọta ugbo ahụ, ebe ọ bụ na ọ dị mkpa ka ụmụnne m ndị nwoke abụọ tọrọ m pụọ n’ụlọ gaa rụọ ọrụ iji wetara ezinụlọ anyị ego. Ndụ n’ugbo chọrọ ndọlị, ọrụ siri ike.
Mgbe M Zutere Eziokwu Bible na nke Mbụ Ya
Ezinụlọ anyị gara Chọọchị Presbyterian, anyị bụkwa ndị òtù ya ji ya kpọrọ ihe, na-agachi ya anya. M ghọrọ onye nkụzi Sunday school ma jiri ibu ọrụ nke ịkụziri ụmụaka ihe m kwere bụ ihe ziri ezi n’ime mmụọ na n’omume kpọrọ ihe.
Na 1931 nna m ochie nwụrụ, n’ime ihe ndị o nwekwara bụ ọtụtụ akwụkwọ nke onye bụ mgbe ahụ onye isi oche nke Watch Tower Society bụ́ J. F. Rutherford dere. M malitere ịgụ The Harp of God na Creation, ka m na-agụkwu ha, otú ahụ ka m na-enwekwu ihe ijuanya ịmụta na ọtụtụ ihe m kwenyere ma nọworị na-akụziri ụmụaka ahụ enweghị nkwado Bible.
Ọ mara m ahụ jijiji ịmụta na mkpụrụ obi mmadụ abụghị ihe na-adịghị anwụ anwụ, na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị mmadụ agaghị aga eluigwe mgbe ha nwụrụ, nakwa na e nweghị ntaramahụhụ ebighị ebi ọ bụla n’ọkụ ala mmụọ maka ndị ajọ omume. O nyekwara m nsogbu n’obi ịchọpụta na idebe ụbọchị izu ike Sunday abụghị ihe a chọrọ ndị Kraịst n’aka. Ya mere echere m mkpebi siri ike ihu: ịrapara n’ozizi ndị na-ewu ewu na Krisendọm ma ọ bụ ịmalite ịkụzi eziokwu Bible. O weghị m ogologo oge ikpebi ịhapụ mmekọrịta nile nke mụ na Chọọchị Presbyterian.
Ugbu A Anọ M Nanị M n’Ezie
Ezinụlọ m, ndị enyi m, na ndị mụ na ha na-akpakọrịtabu na chọọchị enwetụghị obi ụtọ mgbe m mara ọkwa nzube m ịhapụ chọọchị ahụ, gharakwa ịkụzi Sunday school ọzọ. Mgbe ha chọpụtakwara na m na-esonyere ndị ahụ a kpọrọ ndị Judge Rutherford, nke ahụ nanị wụnyekwuru mmanụ ọkụ n’oké ọkụ nke ịgba asịrị ahụ. A kpapụghị m iche n’ezie, kama ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ezinụlọ m na ndị bụbu ndị enyi m enwekwaghị mmasị n’ebe m nọ, n’ikwu ya n’ụzọ dịkarịsịrị nta.
Ka m na-amụkwu ihe ma na-enyocha akụkụ akwụkwọ nsọ e depụtasịrị n’akwụkwọ ahụ m na-agụ, otú ahụ ka m na-ahụkwu mkpa nke ime nkwusa ihu ọha. M mụtara na Ndịàmà Jehova na-aga n’ụlọ ruo n’ụlọ dị ka akụkụ nke ozi ihu ọha ha. Ma n’oge ahụ e nweghị Ndịàmà n’ógbè anyị. Ya mere, ọ dịghị onye gbara m ume ma ọ bụ gosi m otú e si ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) M nwere nnọọ mmetụta nke onye nọ nanị ya.
N’agbanyeghị nke ahụ, iwu Bible nke ikwusara ndị ọzọ ozi ọma nọgidere na-abata m n’uche, m kpebikwara na m ghaghị ịmalite ime nkwusa n’ụzọ ụfọdụ. Mgbe m kpesịrị ọtụtụ ekpere, m kpebiri ịmalite ịga n’ụlọ nke ndị agbata obi nanị ịgwa ha ihe m mụtaworo n’ọmụmụ ihe m ma gbalịa igosi ha ihe ndị a site na Bible ndị nke ha. Ụlọ nke mbụ m gara bụ nke onye bụbu onye nlekọta Sunday school mụ. Nzaghachi ya jụrụ oké oyi na okwu na-ezighị ezi ya banyere nhapụ m hapụrụ chọọchị ahụ abụghị n’ezie mmalite na-agba ume. Ma enwere m ikpo ọkụ na ume nke ime ahụ pụrụ iche ka m na-ahapụ ụlọ ya ma gaa n’ihu ịkpọtụrụ ụlọ ndị ọzọ.
N’ezie e nweghị mmegide bịaara m ihu n’ihu, ma enwere m ịtụnanya n’omume enweghị mmasị nke ndị mụ na ha na-akpakọrịtabu na chọọchị n’ozuzu ha mgbe m kpọtụụrụ ha. N’ịbụrụ m ihe ijuanya na mmechuihu, anatara m mmegide kasị sie ike site n’aka nwanne m nwoke tọsịrị anyị, na-echetara m okwu Jisọs: “Ọbụna ndị mụrụ unu, na ụmụnne unu, na ndị ikwu unu, na ndị enyi unu, ga-arara unu nye . . . Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.”—Luk 21:16, 17.
Aghọwo m onye na-anya ịnyịnya nke nwere ahụmahụ na nwata, ya mere m kpebiri na ụzọ kasị ngwa m ga-esi ruo ebe obibi ndị mmadụ bụ n’azụ ịnyịnya. Nke a nyeere m aka ịga ebe ndị dị anya karị n’ókèala ime ime obodo dị nso. Otú ọ dị, otu ehihie ịnyịnya m zọhiere ụkwụ ma daa n’okporo ụzọ na-amị amị, ọkpụkpụ isi m gbawakwara nke ọjọọ. Ruo oge ụfọdụ, ụjọ dị na m gaghị enwe ike ịlanarị. Mgbe m dasịrị ada ahụ, ọ bụrụ na okporo ụzọ adị mmiri mmiri ma ọ bụ na-amị amị, m na-eme njem n’ụgbọ nwere ụkwụ abụọ ịnyịnya na-adọkpụ kama ịbụ n’azụ ịnyịnya.
Izute Nzukọ Ahụ
N’otu oge mgbe ihe ọghọm m ahụ gasịrị, otu ìgwè nke ndị nkwusa oge nile, nke a na-akpọ ugbu a ndị ọsụ ụzọ, letara ógbè Ugwu Gambier. N’ihi ya, na nke mbụ ya, enwere m ike isoro ndị kwere ekwe ibe m kwurịta okwu. Tupu ha ahapụ, ha gbara m ume idegara alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society akwụkwọ ma jụọ ha banyere otú m pụrụ isi kere òkè n’ọrụ nkwusa ihu ọha n’ụzọ a haziri ahazi karị.
Mgbe m degasịịrị Society akwụkwọ, m natara akwụkwọ, akwụkwọ nta, na kaadị akaebe e biri ebi maka mụ iji ya akọwa onwe m n’ọnụ ụzọ. M nwere mmetụta ịnọkwu ụmụnna m ndị nwoke na ndị nwanyị ime mmụọ nso n’ihi akwụkwọ ozi m na-anata site n’alaka ụlọ ọrụ ahụ. Ma mgbe ìgwè ndị ọsụ ụzọ ahụ hapụrụ ma gaa n’obodo ọzọ, adị m ka onye nọ nanị ya karịa mgbe ọ bụla ọzọ.
Dị ka ihe si n’ịgba àmà m na-eme ọtụtụ ugbo kwa ụbọchị na-apụta—n’ụzọ bụ isi na-eji ụgbọ nwere ụkwụ abụọ nke ịnyịnya na-adọkpụ—aghọrọ m onye a maara nke ọma n’ógbè ahụ. N’otu oge ahụ, enwere m ike ilekọta ọrụ m na-arụ n’ugbo. Na mgbe ahụ ezinụlọ m anakwerewo usoro ihe omume a ma gharakwa itinye mgbalị ọ bụla igbochi m. Ruo afọ anọ m jere ozi n’ụzọ dị otú a dị ka onye na-ekwusa ozi ọma a na-emebeghị baptism nke nọpụrụ anọpụ.
Mgbakọ na, n’Ikpeazụ Baptism
N’April 1938, Nwanna Rutherford letara Australia. Mmegide siri ike nke ndị ụkọchukwu kpatara nkagbu nke nkwekọrịta e mere maka iji Sydney Town Hall eme ihe. Otú ọ dị, mgbe ọ fọrọ nnọọ nke nta ka oge ruo, e nwetara ikike iji Sports Grounds mee ihe. Mmanye a manyere ịgbanwe atụmatụ ghọrọ n’ezie ihe bara uru, ebe ọtụtụ puku ndị ọzọ pụrụ ịbata na Sports Grounds ahụ ka ibu. Ihe dị ka 12,000 bịara, o doro anya na a kpaliri mmasị ọtụtụ ndị site ná mmegide e megidere nzukọ anyị bụ́ nke ndị ụkọchukwu kpaliri.
N’ihe banyere nleta Nwanna Rutherford, e nwekwara mgbakọ were ọtụtụ ụbọchị n’otu ime obodo Sydney nke dị nso. Ọ bụ n’ebe ahụ ka m gosipụtara nraranye m nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri n’ikpeazụ. Ị̀ pụrụ icheli echiche ọṅụ m nwere n’ikpeazụ isoro ọtụtụ narị ụmụnna nwoke na nwanyị sitere na kọntinent Australia dum buru ibu zukọọ?
Ịlaghachi n’Ugwu Gambier
Mgbe m laghachiri ụlọ, enwere m nnọọ mmetụta nke onye nọ nanị ya, ma ekpebisiri m ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ime ihe m nwere ike ime n’ọrụ Alaeze ahụ. Nwa ntakịrị oge, m matara ezinụlọ Agnew—Hugh, nwunye ya, na ụmụ ha anọ. Ha bi n’obodo Millicent, nanị 50 kilomita site n’Ugwu Gambier, m ga-ejekwa 50 kilomita ọgịga na ọlụlọ na-eji ụgbọ nwere ụkwụ abụọ nke ịnyịnya na-adọkpụ iji duziere ha ọmụmụ Bible a na-enwechi anya. Mgbe ha nabatara eziokwu, e wepụrụ mmetụta m nke ịbụ onye nọ nanị ya.
N’oge na-adịghị anya, a haziri anyị n’otu ìgwè maka ịgba àmà a haziri ahazi. Mgbe ahụ, dị ka ihe na-eme obi ụtọ, nne m malitere inwe mmasị ma sonyere m na njem 100 kilomita ọgịga na ọlụlọ iji soro ìgwè ahụ e guzobere ọhụrụ mụọ ihe. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, Nne m na-agba m ume ma na-enyere m aka mgbe nile, ọ bụ ezie na afọ ole na ole gafere tupu e mee ya baptism. Mmetụta ịnọ nanị m adịkwaghị ugbu a!
Ìgwè nta anyị wepụtara ndị ọsụ ụzọ anọ, ụmụ agbọghọ atọ nke ezinụlọ Agnew—Crystal, Estelle, na Betty—na mụ. E mesịa, ná mmalite nke afọ ndị 1950, ụmụ agbọghọ atọ ahụ nile gachara Watchtower Bible School of Gilead. E kenyere ha ọrụ dị ka ndị ozi ala ọzọ n’India na Sri Lanka, bụ́ ebe ha nile jere ozi ruo na nso nso a, mgbe Estelle na-aghaghị ịlaghachi Australia n’ihi nsogbu ahụ ike dị njọ.
Na January 1941 a machibidoro ọrụ nke Ndịàmà Jehova iwu n’Australia, ya mere anyị mere ihe ngwa ngwa. Anyị tinyere ihe nile anyị ji eme ihe n’ozi—akwụkwọ, phonogragh dị mfe mbugharị, okwu ihu ọha dabeere na Bible ndị a gụnyere na tepu, na ihe ndị ọzọ—n’ime otu igbe ukwu e ji tin rụọ. Mgbe ahụ anyị busara igbe ahụ n’otu ụlọ akịrịka ma kpotajuo ahịhịa iji kpogide ya.
N’agbanyeghị mmachibido iwu ahụ, anyị gara n’ihu n’ọrụ nkwusa ụlọ n’ụlọ anyị, kama n’ụzọ akọ, na-eji nanị Bible mgbe anyị na-agwa ndị nwe ụlọ okwu. M ga-ezobe magazin na akwụkwọ nta n’okpuru ihe m ji anọkwasị n’elu ịnyịnya m ma wepụta ha nanị mgbe a chọpụtara ezi mmasị n’ozi Alaeze ahụ. N’ikpeazụ, na June 1943, e wepụrụ mmachibido iwu ahụ, anyị nwekwara ike inyefe akwụkwọ n’ihu ọha ọzọkwa.
Ọrụ Ọhụrụ
Na 1943, ewepụtara m onwe dị ka onye ọsụ ụzọ, n’afọ na-esokwanụ ahapụrụ m Ugwu Gambier maka ọrụ ọzọ. Nke mbụ, a kpọrọ m òkù ije ozi ruo nwa oge n’alaka ụlọ ọrụ Society dị na Strathfield. Mgbe nke a gasịrị anatara m ọrụ ọzọ n’obodo nta ndị dị na ndịda New South Wales na ọdịda anyanwụ Victoria. Otú ọ dị, otu n’ime ọrụ ime mmụọ kasị akwụghachi ụgwọ bụ nke m soro ọgbakọ ukwu dị n’obodo nke Melbourne rụọ. Ebe m sitere n’ime obodo dị ntakịrị, amụtara m ihe dị ukwuu site n’ije ozi n’ebe ahụ.
N’ọrụ m n’ógbè Gippsland nke Victoria, mụ na onye òtù ọsụ ụzọ m, bụ́ Helen Crawford, duziri ọtụtụ ọmụmụ Bible ma, ná mkpirikpi oge, hụ nguzobe nke otu ọgbakọ. Ógbè ahụ nwere ókèala ime ime obodo dị ukwuu, maka ime njem kwa, anyị nwere ụgbọ ala meworo ochie, nke a na-apụghị ịdabere na ya. Mgbe ụfọdụ anyị na-agba ya, ma ọtụtụ oge anyị na-akwa ya aka. Lee ka agụụ ịgba ịnyịnya si gụọ m! Mgbe ụfọdụ, m pụrụ ikwu n’eziokwu sị: “M ga-eji ihe ọ bụla (e wezụga Alaeze) gbanwere ịnyịnya!” N’ihe ka ọtụtụ n’ime obodo ndị dị n’ógbè ahụ taa, e nwegasịrị ọgbakọ ndị siri ike na ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Na 1969, e kenyere m ọrụ ịga Canberra, isi obodo Australia. Nke a bụ ebe na-ama aka na ebe e nwere ọnọdụ dịgasị iche iche a ga-eji gbaa àmà, ebe ọ bụ na mgbe mgbe anyị na-ejekwuru ndị ọrụ nke ọtụtụ ụlọ ọrụ na-anọchi anya mba ndị ọzọ. M ka na-eje ozi n’ebe a, ma n’oge ndị na-adịbeghị anya, nanị ebe m na-agba àmà bụ n’ógbè ebe a na-emepụta ihe nke obodo ukwu ahụ.
Na 1973, enwere m ihe ùgwù nke ịga mgbakọ ukwu dị iche iche na United States. Ihe ọzọ pụtara ìhè ná ndụ m bụ ịbụ onye so gaa mgbakọ na 1979 na ịga njem nlegharị anya n’Israel na Jordan. Ileta kpọmkwem ebe ndị a kpọrọ aha ha na Bible na ịtụgharị uche n’ihe ndị meworonụ ebe ndị ahụ bụ n’ezie ahụmahụ na-akpali akpali. Enwere m ike ịhụ ihe o yiri ka ya ise n’elu Osimiri Nwụrụ Anwụ, ya na mmiri ya nnú jupụtara, nakwa n’oge anyị letara Petra dị na Jordan, enwere m ohere otu ugbo ọzọ ịgba ịnyịnya. Nke a mere ka m chetaghachi ụbọchị ndị mbụ ahụ mgbe ịnyịnya nyewooro m aka iji ozi Alaeze ahụ ruo ebe ime ime obodo ndị gbasasịrị agbasasị.
Ije Ozi Oge Nile nke Gara n’Ihu
Ọchịchọ m ịnọgide n’ije ozi oge nile n’agbanyeghị na m na-aka nká anọgidewo na-ekpo ọkụ site n’ụdị ndokwa ndị pụrụ iche dị ka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ na nzukọ ndị ọsụ ụzọ a na-enwekọ ya na mgbakọ sekit, nakwa agbamume m nọgidere na-enweta site n’aka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị. M pụrụ ikwu n’eziokwu na Jehova ejiwo obi ọma mee ka ụbọchị ndị m nọ nanị m bụrụ ihe gara aga.
Adị m ugbu a 87 afọ, ka ihe dị ka 60 afọ nke ijere Jehova ozi gasịkwara, m nwere okwu agbamume maka ndị ọzọ pụkwara inwe nkwuwa okwu ma bụrụ ndị na-adabere n’onwe ha n’ụzọ siri ike: Na-anọ n’okpuru idu ndú Jehova mgbe nile. Ka Jehova nyere anyị aka ịchịkwa nkwuwa okwu anyị, ka ọ nọgidekwa na-echetara anyị na ọ bụ ezie na anyị pụrụ inwe mmetụta nke ịnọ nanị anyị mgbe mgbe, ọ gaghị ahapụ anyị ma ọlị.