Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 7/1 p. 30
  • “Ha Adịghị Ahapụ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ha Adịghị Ahapụ”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Inwe Ebe Ndị A Na-anọ Efe Jehova
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ụlọ Nzukọ Alaeze Gheere Oghe Nye Onye Ọ Bụla
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ị̀ Na-akwanyere Ebe Ofufe Gị Ùgwù?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ebe A Ka Anyị Na-anọ Efe Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 7/1 p. 30

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

“Ha Adịghị Ahapụ”

KEMGBE oge Jisọs Kraịst na ndị ozi ya, ndị ndú okpukpe ejiwo ụzọ nile ha nwere ike mee ihe ná mgbalị ha igbochi nkwusa nke ozi ọma Alaeze Chineke. Mgbe mgbe ndị isi obodo na Jerusalem ‘nyesiri ndị ozi iwu ike’ ka ha “ghara ikwu okwu n’aha Jisọs.” (Ọrụ 5:27, 28, 40) N’agbanyeghị nke ahụ, ihe ndekọ Bible kwuru na “okwu Chineke wee na-aga n’ihu; ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs na-abakwa ụba na Jerusalem hie nne.”—Ọrụ 6:7.

Narị afọ iri abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, anyị ka na-ahụ ndị ndú okpukpe n’Israel bụ́ ndị na-akpali ndị isi obodo igbochi ọrụ nke ezi ndị Kraịst ná mba ahụ. N’okpuru nrụgide nke ndị okpukpe na-agba ara, na November 1987, ndị isi obodo na Tel Aviv, Israel, nyere Ndịàmà iwu ịkwụsị inwe nzukọ ndị Kraịst n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society. Iwu ahụ malitere ịdị irè n’October 1989. Iji mee ihe ha kwuru, Ndịàmà ahụ zukọrọ n’ụlọ ndị a natara n’ego n’ógbè ahụ ruo afọ atọ ebe a na-adịghị eji Ụlọ Nzukọ Alaeze ha eme ihe.

Ka ọ dị mgbe ahụ, e mere ka okwu ruo Ụlọikpe Ukwu nke Israel ntị. Ụlọ ọrụ nke onye ọkà ikpe ukwu nke mba ahụ tụleghachiri arụmụka nke Ndịàmà nyere ma kwupụta na e nweghị ihe nzaghachi ọ bụla a pụrụ inwe megide arịrịọ ha n’ihi ịkpọasị okpukpe o metụtara. N’ihi ya, a manyere ndị isi obodo ịtụgharị mkpebi ha, Ndịàmà Jehova jikwa obi ụtọ laghachi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha.

Ọrụ nke ikwusa eziokwu Bible ọ̀ lara azụ n’afọ ndị ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! N’oge ahụ e mechiri Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, e nwere ọgbakọ abụọ na Tel Aviv na ìgwè ọmụmụ Bible dịpụrụ adịpụ n’obodo Lod dị nso. Afọ atọ n’ihu, mgbe e megheghachiri Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, Ndịàmà Jehova amụbawo gaa n’ọgbakọ anọ, ìgwè ọmụmụ Bible ọhụrụ na-ezukọkwa na Beersheba.

Uto a na-enwe n’Israel abụghị nanị nye ìgwè asụsụ ndị bụ isi, Arabic na Hibru. E nwewo nnubata nke ndị sitere mba ndị bụbu Soviet Union, ya mere Ndịàmà Jehova na-asụ asụsụ Russian ji ọrụ n’aka ugbu a n’isoro ha na-ekerịta ozi ọma ahụ. A na-enwe ụfọdụ nzukọ nke ndị na-asụ asụsụ Russian n’ọgbakọ atọ; ihe karịrị otu narị mmadụ zukọrọ ná nso nso a maka mgbakọ e nwere n’asụsụ Russian.

N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, ndị okpukpe nwere ịkpọasị ga-aga n’ihu n’ibu agha ha megide ezi ofufe. Ma ndị nkwusa Alaeze nọgidere na-eṅomi ndị Kraịst narị afọ mbụ ndị, n’agbanyeghị mmegide, “ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na Ọ bụ Kraịst.”—Ọrụ 5:42.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya