Ị̀ pụrụ Ịhụ Chineke n’Anya n’Ezie
“MMADỤ agaghị ahụ m anya, dịkwa ndụ,” ka Chineke na-ekwu. (Ọpụpụ 33:20) Ọzọkwa, eri oge Bible e nwebeghị ihe àmà ọ bụla gosiri na mmadụ ọ bụla sooro Chineke nwee nkwurịta okwu kpọmkwem. Ọ̀ bụ na o yighị ihe siri ike—ọbụna ihe a na-apụghị ime eme—ịzụlite mmetụta ịhụnanya dị omimi maka onye ị na-ahụtụbeghị anya ma ọ bụ nụ olu ya kpọmkwem? Ọ̀ ga-ekwe omume n’ezie iso Onye Okike nke eluigwe na ala nwee mmekọrịta ịhụnanya?
E kwesịghị inwe obi abụọ ọ bụla na ịzụlite mmekọrịta onwe onye na-ekpo ọkụ n’ebe Chineke nọ ga-ekwe omume. Na Deuterọnọmi 6:5, anyị na-agụ na e nyere mba Israel iwu, sị: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị n’anya.” Jisọs Kraịst mesịrị kwupụtaghachi iwu a gwa ndị na-eso ụzọ ya ma gbakwụnye, sị: “Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu.” (Matiu 22:37, 38) Bible ọ̀ ga-agba anyị ume ịhụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na a pụghị inweta ụdị mmekọrịta ahụ?
Ma Jehova ọ̀ na-atụ anya ka anyị hụ ya n’anya nanị n’ihi na o nyere iwu ime otú ahụ? Ee e. Chineke kenyere mmadụ abụọ mbụ ikike nke ịhụ ya n’anya. A manyeghị Adam na Iv isoro Onye Okike ha banye ná mmekọrịta ịhụnanya. Kama nke ahụ, Chineke ji ọnọdụ ndị dị mma gbaa ha gburugburu bụ́ ndị ha ga-anọ na ha zụlite mmetụta ịhụnanya dị omimi maka ya. Nhọrọ ahụ bụ nke ha—ịbịakwu Chineke nso ma ọ bụ ikewapụ onwe ha n’ebe ọ nọ.
Adam na Iv họọrọ inupụ isi. (Jenesis 2:16, 17; 3:6, 7) Otú ọ dị, ụmụ ha ga-enwe ikike maka iso Onye Okike zụlite mmekọrịta ịhụnanya.
Iso Ezi Chineke ahụ Na-eje Ije
Dị ka ihe atụ, n’ime Bible, e kwuru banyere Abraham dị ka “enyi” Chineke. (Jemes 2:23) Ma n’ezie ọ bụghị nanị Abraham bụ onye ya na Chineke nwere mmekọrịta chiri anya. Bible na-ekwu banyere ọtụtụ ụmụ mmadụ ndị ọzọ na-ezughị okè ndị gosipụtara ezi mmetụta ịhụnanya maka Jehova ma soro “Chineke yikọrọ na-ejegharị.”—Jenesis 5:24; 6:9; Job 29:4; Abụ Ọma 25:14; Ilu 3:32.
A mụkọtaghị ndị ohu Chineke nke oge ochie na ịhụnanya na mmetụta ịhụnanya maka Chineke. Ha aghaghị ịzụlite ya. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iji aha onwe onye ya, bụ́ Jehova, mara ya. (Ọpụpụ 3:13-15; 6:2, 3) Site n’ịmara banyere ịdị adị ya na ịbụ Chineke ya. (Ndị Hibru 11:6) Site n’ịdị na-atụgharị uche ugboro ugboro n’ọrụ ịhụnanya ya. (Abụ Ọma 63:6) Site n’ikwupụta ihe dị ha n’ime uche n’ekpere gwa Chineke. (Abụ Ọma 39:12) Site n’ịmụta banyere ịdị mma ya. (Zekaraịa 9:17) Site n’ịzụlite egwu ziri ezi nke imejọ ya.—Ilu 16:6.
Ị̀ pụrụ ịghọ enyi Chineke ma soro ya na-ejegharị? N’eziokwu, ị pụghị ịhụ Chineke anya ma ọ bụ nụ olu ya. Ka o sina dị, Jehova na-akpọ gị òkù ịbịa ghọọ ‘ọbịa n’ụlọikwuu ya,’ enyi ya. (Abụ Ọma 15:1-5) N’ụzọ dị otú a, ọ ga-ekwe gị omume ịhụ Chineke n’anya. Ma olee otú ị pụrụ isi zụlite mmekọrịta chiri anya na nke mmetụta ịhụnanya n’ebe ọ nọ?