Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 6/15 p. 20-25
  • Chụsoo Udo Chineke n’Ime Ndụ Ezinụlọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chụsoo Udo Chineke n’Ime Ndụ Ezinụlọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ Ezinụlọ Nọ n’Ihe Ize Ndụ
  • Gịnị Kpatara Ọgba Aghara Ezinụlọ?
  • Ụkpụrụ Anọ Dị Mkpa
  • Nọgide Na-achụso Udo Chineke
  • Nwetara Ezinụlọ Gị Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • È Nwere Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ?
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ
    Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ
  • Ezinụlọ—Ihe Dị Mmadụ Mkpa!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 6/15 p. 20-25

Chụsoo Udo Chineke n’Ime Ndụ Ezinụlọ

“Nyenụ Jehova, unu agbụrụ nke ndị nile dị iche iche, nyenụ Jehova nsọpụrụ na ike.”—ABỤ ỌMA 96:7.

1. Mmalite dị aṅaa ka Jehova nyere ndụ ezinụlọ?

JEHOVA malitere ndụ ezinụlọ n’ụzọ udo na obi ụtọ mgbe o jikọrọ nwoke mbụ na nwanyị mbụ n’alụmdi na nwunye. N’eziokwu, Adam nwere obi ụtọ nke ukwuu nke na o kwupụtara ọṅụ ya n’abụ uri mbụ e dekọrọ edekọ: “Ehee! nke a bụ nnọọ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m pụta, na anụ ahụ si n’anụ ahụ m pụta: nke a ka a ga-akpọ Nwanyị, n’ihi na e wepụtara nke a n’ahụ Nwoke.”—Jenesis 2:23.

2. Gịnị ka Chineke bu n’uche maka alụmdi na nwunye tinyere iwetara ụmụ ya bụ mmadụ obi ụtọ?

2 Mgbe Chineke guzobere alụmdi na nwunye na ndokwa ezinụlọ, o bu ihe karịrị nanị iwetara ụmụ ya bụ mmadụ obi ụtọ n’uche. Ọ chọrọ ka ha mee uche ya. Chineke gwara mmadụ abụọ mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:28) Ọrụ nke na-enyeghachi ụgwọ ọrụ n’ezie. Lee aha obi ụtọ Adam, Iv, na ụmụ ọdịnihu ha gaara enweworị ma ọ bụrụ na di na nwunye mbụ ahụ jiri nrubeisi mee uche Jehova!

3. Gịnị ka a chọrọ ka ezinụlọ wee jiri nsọpụrụ Chineke na-ebi ndụ?

3 Otú ọ dị, ọbụna taa, ezinụlọ na-enwekarịsị obi ụtọ mgbe ha na-arụkọ ọrụ ọnụ ime uche Chineke. Leekwa aha olileanya magburu onwe ya ezinụlọ ndị dị otú ahụ na-erube isi na-enwe! Pọl onyeozi dere, sị: “Nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Ezinụlọ ndị ji ezi nsọpụrụ Chineke ebi ndụ na-agbaso ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Jehova ma na-eme uche ya. Ha na-achụso udo Chineke ma si otú a na-enweta obi ụtọ ná “ndụ ugbu a.”

Ndụ Ezinụlọ Nọ n’Ihe Ize Ndụ

4, 5. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ndụ ezinụlọ n’ụwa nile nọ n’ihe ize ndụ?

4 N’ikwu eziokwu, anyị adịghị enweta udo na obi ụtọ n’ezinụlọ nile. N’ihota otu ihe ọmụmụ nke ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụba mmadụ nke a na-akpọ Kansụl Ụba Mmadụ mere, The New York Times na-ekwu, sị: “Ná mba ndị bara ọgaranya nakwa ndị dara ogbenye, ọdịdị nke ndụ ezinụlọ na-enwe mgbanwe ndị dị ukwuu.” E hotara onye hụrụ maka ihe ọmụmụ a dị ka onye sịrị: “Echiche nke na ezinụlọ bụ òtù kwụ chịm ma sie ike nke nna na-eje ozi na ya dị ka onye na-eweta ego, nne na-ejekwa ozi dị ka onye na-enye nlekọta mmetụta bụ echiche ụgha. Ihe bụ eziokwu bụ na ihe a na-ahụkarị dị ka ịbụ nne n’alụghị di, ịrị elu nke ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịgba alụkwaghịm, [na] ezinụlọ ndị ka pee mpe . . . na-eme n’ụwa nile.” N’ihi ihe ndị dị otú ahụ, ọtụtụ nde ezinụlọ na-enwe ụkọ nke nkwụsi ike, udo, na obi ụtọ, ọtụtụ na-etisasịkwa. Na Spain ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm rịrị elu ruo 1 n’ime alụmdi na nwunye 8 ná mmalite nke afọ iri ndị ikpeazụ nke narị afọ nke 20—oké ịrị elu site na 1 n’ime 100 nanị n’afọ 25 ndị bu ụzọ. A kọrọ na England nwere otu n’ime ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ịgba alụkwaghịm na Europe—4 n’ime alụmdi na nwunye 10 na-ada. Mba ahụ ahụwokwa oké ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna.

5 O yiri ka ọ na-adị ndị ụfọdụ ọkụ ọkụ ịgba alụkwaghịm. Ọtụtụ ndị na-enuga ‘n’Ókwù Arụsị Ntọsa Ihe Nkekọ’ nke dị nso na Tokyo, Japan. Ụlọ nsọ Shinto nke a na-anabata mkpesa maka ịgba alụkwaghịm na maka ntisa nke mmekọrịta ndị ọzọ a na-achọghị. Onye ofufe ọ bụla na-ede arịrịọ nke ya n’obere bọọdụ osisi, kobe ya n’ogige nke ókwù arụsị ahụ, ma kpee ekpere maka azịza. Otu akwụkwọ akụkọ Tokyo na-asị na mgbe e guzobere ókwù arụsị ahụ ihe dị ka otu narị afọ gara aga, “ndị nwunye nke ndị azụmahịa bara ọgaranya dere ekpere na-arịọ ka ndị di ha hapụ ndị iko ha ma laghachikwute ha.” Otú ọ dị, taa, ihe ka ọtụtụ n’arịrịọ bụ maka ịgba alụkwaghịm, ọ bụghị maka ịdịghachi n’otu. N’enweghị ajụjụ ọ bụla, ndụ ezinụlọ nọ n’ihe ize ndụ gburugburu ụwa. Nke a ò kwesịrị iju ndị Kraịst anya? Ee e, n’ihi na Bible na-eme ka anyị ghọta ọgba aghara ezinụlọ dị ugbu a.

Gịnị Kpatara Ọgba Aghara Ezinụlọ?

6. Mmetụta dị aṅaa ka 1 Jọn 5:19 nwere n’ọgba aghara ezinụlọ taa?

6 Otu ihe kpatara ọgba aghara ezinụlọ taa bụ nke a: “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya n’aka ajọ onye ahụ, bụ́ Setan Ekwensu? Ọ bụ onye ụgha ọjọọ, nke rụrụ arụ. (Jọn 8:44) Ka a sịkwa ihe mere ụwa ya ji jupụta n’aghụghọ na omume rụrụ arụ, ihe ndị na-ebibi nnọọ ndụ ezinụlọ! E wezụga n’ime nzukọ Chineke, mmetụta Setan na-eyi egwu ibibi ndokwa Jehova nke alụmdi na nwunye na ịkwụsị ndụ ezinụlọ nke udo.

7. Olee ụzọ àgwà nke ọtụtụ ndị na mgbe ikpeazụ a na-egosipụta pụrụ isi metụta ezinụlọ dị iche iche?

7 Ihe ọzọ kpatara nsogbu ezinụlọ nke na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti ugbu a bụ nke e gosiri na 2 Timoti 3:1-5. Okwu amụma Pọl e dekọrọ n’ebe ahụ na-egosi na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ.” Ezinụlọ apụghị inwe udo na obi ụtọ ma ọ bụrụ na ndị òtù ha bụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya.” Ezinụlọ apụghị inwe obi ụtọ n’ụzọ zuru ezu ma ọ bụrụ na ọbụna otu n’ime ndị òtù ya abụrụ onye ihe mmadụ ibe ya na-adịghị atọ ụtọ ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha n’obi. Olee otú ezinụlọ pụrụ isi nwee udo ma ọ bụrụ na otu onye n’ezinụlọ ahụ adị ka anụ ọhịa ma bụrụ onye na-adịghị agba ndụ? Nke ka njọ, olee otú a pụrụ isi nwee udo na obi ụtọ mgbe ndị òtù ezinụlọ bụ ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya? Ndị a bụ njimara nke ndị mmadụ n’ụwa nke a nke Setan na-achị. Ka a sịkwa ihe mere udo na obi ụtọ ezinụlọ ji bụrụ ihe a na-ejighị n’aka na mgbe ikpeazụ a!

8, 9. Mmetụta dị aṅaa ka akparamàgwà nke ụmụ ga-enwe n’obi ụtọ ezinụlọ?

8 Ihe ọzọkwa kpatara na ọtụtụ ezinụlọ enweghị udo na obi ụtọ bụ àgwà ọjọọ nke ụmụaka. Mgbe Pọl buru amụma ọnọdụ ndị ga-adị na mgbe ikpeazụ, o buru amụma na ọtụtụ ụmụaka ga-abụ ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, akparamàgwà gị ọ̀ na-enye aka ime ka ezinụlọ gị dị n’udo ma nwee obi ụtọ?

9 Ụfọdụ ụmụntakịrị abụghị ihe nlereanya n’akparamàgwà. Dị ka ihe atụ, otu nwata nwoke deere nna ya akwụkwọ ozi nke a na-akpasu iwe: “Ọ bụrụ na ị gaghị akpọ m gaa Alexandria agaghị m edetara gị akwụkwọ ozi, ma ọ bụ kwunyere gị okwu, ma ọ bụ sị gị gaa nke ọma, ọ bụrụkwa na ị gaa Alexandria agaghị m ejide aka gị ma ọ bụ kelee gị ọzọ. Nke a bụ ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ị gaghị akpọrọ m . . . Ma zitere m [ụbọ], m na-arịọ gị arịọ. Ọ bụrụ na i ziteghị, agaghị m eri nri ma ọ bụ ṅụọ ihe. Ekwusịa m!” Nke ahụ ọ̀ na-ada ka ihe a na-ahụ n’oge a? Akwụkwọ ozi ahụ bụ nke otu nwata nwoke degaara nna ya bụ́ nke e dere n’Ijipt oge ochie ihe karịrị afọ 2,000 gara aga.

10. Olee ụzọ ndị na-eto eto pụrụ isi nyere ezinụlọ ha aka ịchụsọ udo Chineke?

10 Omume nwa Ijipt ahụ na-eto eto akwaliteghị udo ezinụlọ. Otú ọ dị, ihe ndị ka nnọọ njọ na-ewere ọnọdụ n’ime ọtụtụ ezinụlọ na mgbe ikpeazụ a. Ma, unu ndị na-eto eto pụrụ inyere ezinụlọ unu aka ịchụso udo Chineke. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’irube isi na ndụmọdụ Bible nke a: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ihe nile, n’ihi na nke a bụ ihe na-atọ ezi ụtọ n’ime Onyenwe anyị.”—Ndị Kọlọsi 3:20.

11. Olee ụzọ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịghọ ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi?

11 Gịnị banyere unu ndị mụrụ ụmụ? Jirinụ ịhụnanya nyere ụmụ unu aka ịghọ ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi. “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị,” ka Ilu 22:6 na-ekwu. “Ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” Site ná nkụzi Akwụkwọ Nsọ dị mma na ezi ihe nlereanya nke ndị nne na nna, ọtụtụ ụmụ okoro na agbọghọ adịghị ewezụga onwe ha site n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe ha mere okenye. Ma ọ na-adaberekarị n’ụdị na ókè nke ọzụzụ Bible na n’obi nke onye ahụ na-eto eto.

12. N’ihi gịnị ka ebe obibi onye Kraịst kwesịrị iji dịrị n’udo?

12 Ọ bụrụ na ndị nile nọ n’ezinụlọ anyị na-agbalị ime uche Jehova, anyị kwesịrị ịdị na-enweta udo Chineke. Ebe obibi onye Kraịst kwesịrị ịbụ ebe ‘ndị udo’ jupụtara na ya. Luk 10:1-6 na-egosi na Jisọs bu ndị dị otú ahụ n’uche mgbe o zipụrụ ndị na-eso ụzọ 70 dị ka ndị ozi ma gwa ha, sị: “Ụlọ ọ bụla unu ga-aba n’ime ya, burunụ ụzọ sị, Udo dịrị ụlọ a. Ọ bụrụkwa na onye udo nọ n’ebe ahụ, udo unu ga-anọkwasị ya.” Ka ndị ohu Jehova ji “ozi ọma nke udo” na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’udo, ha na-achọ ndị udo. (Ọrụ 10:34-36; Ndị Efesọs 2:13-18) N’eziokwu, ezinụlọ onye Kraịst nke ndị udo mejupụtara kwesịrị ịdị n’udo.

13, 14. (a) Gịnị ka Naomi chọrọ maka Rut na Ọpa? (b) Ebe obibi onye Kraịst kwesịrị ịbụ ụdị ebe izu ike dị aṅaa?

13 Ebe obibi kwesịrị ịbụ ebe udo na izu ike. Agadi nwanyị ahụ di ya nwụrụ bụ́ Naomi nwere olileanya na Chineke ga-enye ndị nwunye ụmụ ya di ha nwụrụ, bụ́ Rut na Ọpa, ezumike na nkasi obi nke na-abịa site n’inwe di na ụlọ ọma. Naomi sịrị: “Jehova mee ka unu chọta izu ike, nwanyị ọ bụla n’ụlọ di ya.” (Rut 1:9) Banyere ọchịchọ Naomi, otu onye ọkà mmụta dere na n’ụlọ ndị dị otú ahụ Rut na Ọpa “ga-enwere onwe ha pụọ n’enweghị ezumike na nchekasị. Ha ga-achọta izu ike. Ọ ga-abụ ọnọdụ ebe ha pụrụ ịnọgide, nakwa ebe mmetụta ha ndị kasị nro na ọchịchọ ha ndị kasị mma ga-enweta afọ ojuju na ịdị jụụ. E gosipụtara ike pụrụ iche nke okwu Hibru ahụ nke ọma . . . site n’ọdịdị nke okwu ndị e jikọrọ ha na ya [n’Aịsaịa 32:17, 18].”

14 Biko rịba ama aka nke a e zoro n’Aịsaịa 32:17, 18. N’ebe ahụ anyị na-agụ, sị: “Ihe ezi omume ahụ ga-arụpụta bụ udo; ihe nke ga-esi n’ofufe ezi omume ahụ pụta bụkwa ịnọ jụụ na ntụkwasị obi ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m ga-anọkwa n’ụlọ obibi udo, na n’ebe obibi dị iche iche kwesịrị ntụkwasị obi, na n’ebe izu ike dị iche iche dị jụụ.” Ebe obibi onye Kraịst kwesịrị ịbụ ebe izu ike nke ezi omume, ịnọ jụụ, ịnọ ná ntụkwasị obi, na udo Chineke. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọnwụnwa, nghọtahie, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ ebilite? Mgbe ahụ ọ dị anyị mkpa karịsịa ịmara isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ.

Ụkpụrụ Anọ Dị Mkpa

15. Olee otú ị ga-esi akọwa isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ?

15 Ezinụlọ ọ bụla n’elu ala nwetara aha ya n’aka Jehova Chineke, Onye Okike nke ezinụlọ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ya mere ndị na-achọ obi ụtọ ezinụlọ kwesịrị ịchọ nduzi ya ma nye ya otuto, dị ka ọbụ abụ ahụ mere: “Nyenụ Jehova, unu agbụrụ nke ndị nile dị iche iche, nyenụ Jehova nsọpụrụ na ike.” (Abụ Ọma 96:7) Isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ dị n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, nakwa n’itinye ụkpụrụ ya n’ọrụ. Ezinụlọ nke na-etinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ ga-enwe obi ụtọ ma nụ ụtọ nke udo Chineke. Ka anyị lee anọ n’ime ụkpụrụ ndị a dị mkpa.

16. Òkè dị aṅaa ka njide onwe onye kwesịrị ikere ná ndụ ezinụlọ?

16 Otu n’ime ụkpụrụ ndị a hiwere isi na nke a: Njide onwe onye dị mkpa iji nwee udo Chineke ná ndụ ezinụlọ. Eze Solomọn sịrị: “Obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ.” (Ilu 25:28) Igbochi mmụọ anyị—igosi njide onwe onye—dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ezinụlọ nke udo na nke obi ụtọ. Ọ bụ ezie na anyị ezughị okè, ọ dị anyị mkpa inwe njide onwe onye, bụ́ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. (Ndị Rom 7:21, 22; Ndị Galetia 5:22, 23) Mmụọ ahụ ga-amịpụta njide onwe onye n’ime anyị ma ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka àgwà nke a, tinye ndụmọdụ Bible banyere ya n’ọrụ, ma soro ndị ọzọ na-egosipụta ya na-akpakọrịta. Ụzọ a ga-enyere anyị aka ‘ịgbanarị ịkwa iko.’ (1 Ndị Kọrint 6:18) Njide onwe onye ga-enyekwara anyị aka ịjụ ime ihe ike, izere ma ọ bụ imeri aṅụrụma, na iji ụzọ dị jụụ karị dozie ọnọdụ ndị siri ike.

17, 18. (a) Olee otú 1 Ndị Kọrint 11:3 si emetụta ndụ ezinụlọ ndị Kraịst? (b) Olee otú ịnakwere ịbụisi si akwalite udo Chineke n’ezinụlọ?

17 A pụrụ ikwu ụkpụrụ ọzọ dị mkpa n’ụzọ a: Ịnakwere ịbụisi ga-enyere anyị aka ịchụso udo Chineke n’ezinụlọ anyị. Pọl dere, sị: “Ana m achọ ka unu mata na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Nke a pụtara na nwoke na-edu ndú n’ezinụlọ, na nwunye ya na-eji ịnọgidesi ike n’ihe na-enye nkwado, nakwa na ụmụ na-erube isi. (Ndị Efesọs 5:22-25, 28-33; 6:1-4) Àgwà dị otú ahụ ga-akwalite udo Chineke ná ndụ ezinụlọ.

18 Ọ dị di bụ́ onye Kraịst mkpa icheta na ịbụisi nke Akwụkwọ Nsọ abụghị ọchịchị aka ike. Ọ ghaghị iṅomi Jisọs, bụ́ Isi ya. Ọ bụ ezie na ọ ga-abụ “isi n’elu ihe nile,” Jisọs “abịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi.” (Ndị Efesọs 1:22; Matiu 20:28) N’ụzọ yiri nke ahụ, nwoke bụ́ onye Kraịst na-abụ isi n’ụzọ ịhụnanya nke na-eme ka o kwe ya omume ilekọta ọdịmma nke ezinụlọ ya nke ọma. N’eziekwa nwunye bụ́ onye Kraịst kwesịrị isoro di ya na-arụkọ ọrụ. Dị ka “onye inyeaka kwesịrị” ya, ọ na-ewepụta àgwà ndị di ya na-enweghị ma si otú a na-enye ya nkwado dị mkpa. (Jenesis 2:20; Ilu 31:10-31) Ngosipụta kwesịrị ekwesị nke ịbụisi na-enyere ndị di na nwunye aka imeso onwe ha ihe ná nkwanye ùgwù ma na-akwali ụmụaka irube isi. Ee, ịnakwere ịbụisi na-akwalite udo Chineke ná ndụ ezinụlọ.

19. N’ihi gịnị ka ezi nkwurịta okwu ji dị mkpa maka udo na obi ụtọ ezinụlọ?

19 A pụrụ ikwupụta ụkpụrụ nke atọ dị mkpa n’okwu ndị a: Ezi nkwurịta okwu dị mkpa maka udo na obi ụtọ ezinụlọ. Jemes 1:19 na-agwa anyị, sị: “Ka mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” Ọ dị mkpa ka ndị òtù ezinụlọ na-ekwunyere ibe ha okwu ma na-ege ibe ha ntị n’ihi na nkwurịta okwu ezinụlọ bụ inye enye na ịnara anara. Otú ọ dị, ọbụna mgbe ihe anyị kwuru ziri ezi, o yiri ka ọ ga-emebi ihe karịa imezi ihe ma ọ bụrụ na e kwuru ya n’ụzọ obi ọjọọ, nganga, ma ọ bụ egosighị mmetụta. Okwu anyị kwesịrị ịdị ụtọ, “ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Ezinụlọ ndị na-agbaso ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ma na-ekwurịta okwu nke ọma na-achụso udo Chineke.

20. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na ịhụnanya dị mkpa iji nwee udo ezinụlọ?

20 Ụkpụrụ nke anọ bụ nke a: Ịhụnanya dị mkpa maka udo na obi ụtọ ezinụlọ. Ịhụnanya ndọrọ mmekọahụ pụrụ ikere òkè dị mkpa n’alụmdi na nwunye, mmetụta miri emi pụkwara itolite n’etiti ndị òtù ezinụlọ. Otú ọ dị, ọbụna nke ka mkpa bụ ịhụnanya nke okwu Grik bụ́ a·gaʹpe pụtara. Nke a bụ ịhụnanya nke anyị na-azụlite maka Jehova, maka Jisọs, na maka onye agbata obi anyị. (Matiu 22:37-39) Chineke gosipụtara ịhụnanya nke a n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ site n’inye “Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Lee ka o si dị ebube na anyị pụrụ igosi otu ụdị ịhụnanya ahụ maka ndị òtù ezinụlọ anyị! Ịhụnanya nke a e buliri elu bụ “ihe nkekọ nke izu okè.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Ọ na-ekekọ di na nwunye ọnụ ma na-akwali ha imere onwe ha na ụmụ ha ihe kasị mma. Mgbe ihe isi ike bilitere, ịhụnanya na-enyere ha aka iji ịdị n’otu dozie okwu. Anyị pụrụ ijide nke a n’aka n’ihi na “ịhụnanya [a]dịghị achọ ihe nke aka ya . . . Ọ na-anagide ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile. Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:4-8) Ezinụlọ nke ịhụnanya maka Jehova mere ka ịhụnanya maka ibe ha sie ike bụ nke obi ụtọ n’ezie!

Nọgide Na-achụso Udo Chineke

21. Gịnị ka o yiri ga-amụba udo na obi ụtọ nke ezinụlọ gị?

21 Ụkpụrụ ndị a nile na ndị ọzọ e wepụtara na Bible dị na mbipụta ndị Jehova jiworo obi ọma nye site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) Dị ka ihe atụ, a na-achọta ụdị ihe ọmụma ahụ n’akwụkwọ ahụ dị peji 192 bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke e wepụtara ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Ozi nke Udo Chineke” nke Ndịàmà Jehova e nwere gburugburu ụwa na 1996/1997. Ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ onwe onye na nke ezinụlọ site n’enyemaka nke ụdị mbipụta dị otú ahụ pụrụ ịrụpụta ọtụtụ abamuru. (Aịsaịa 48:17, 18) Ee, o yiri ka itinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ọ̀ ga-amụba udo na obi ụtọ nke ezinụlọ gị.

22. Na gịnị ka anyị kwesịrị ihiwe ndụ ezinụlọ anyị isi?

22 Jehova nwere ọtụtụ ihe dị ebube na-echere ezinụlọ nile na-eme uche ya, o kwesịkwara ịnara otuto na ozi anyị. (Mkpughe 21:1-4) Ya mere, ka ezinụlọ gị hiwe ndụ ya isi n’ofufe nke ezi Chineke ahụ. Ka Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, jirikwa obi ụtọ gọzie gị ka ị na-achụso udo Chineke ná ndụ ezinụlọ gị!

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Gịnị ka a chọrọ ma ọ bụrụ na ezinụlọ ga-eji nsọpụrụ Chineke na-ebi ndụ?

◻ N’ihi gịnị ka e ji nwee ọgba aghara ezinụlọ taa?

◻ Gịnị bụ isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ?

◻ Olee ụfọdụ ụkpụrụ ndị ga-enyere anyị aka ịkwalite udo na obi ụtọ ná ndụ ezinụlọ?

[Foto dị na peeji nke 24]

Ezi nkwurịta okwu na-enyere anyị aka ịchụso udo Chineke ná ndụ ezinụlọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya