Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 6/15 p. 26-29
  • Ileta Ubi Ozi Ala Ọzọ Dị n’Ụlọ Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ileta Ubi Ozi Ala Ọzọ Dị n’Ụlọ Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Imeri Ihe Mgbochi nke Asụsụ
  • Ozi Anyị Dịgasị Iche Iche
  • Ọdịbendị Dịgasị Iche
  • Atụmanya Magburu Onwe Ha
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 6/15 p. 26-29

Ileta Ubi Ozi Ala Ọzọ Dị n’Ụlọ Anyị

ÌGWÈ ọgbakọ ndị Kraịst m na-eleta na-akpọrọ m site na Portugal gaa China—ma ọ bụ otú ahụ ka o yiri. Ma, mụ na Olive, nwunye m ahapụtụbeghị Britain.

Anyị na-eleta ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-asụ asụsụ ndị mba ọzọ bụ́ ndị dị n’ebe dị iche iche ná mba a. Malite n’àgwàetiti Jersey, ihe dị ka kilomita 20 site n’ụsọ oké osimiri Normandy nke France, ebe anyị nwere otu ìgwè Portuguese, ruo obodo Sunderland n’ebe ugwu England, ebe anyị na-eleta ndị na-asụ Chinese bụ́ ndị nwere mmasị, anyị so arụ ọrụ n’ubi nwere ọtụtụ asụsụ na-eme nke ọma, na-abakwa ụba n’ụzọ ime mmụọ. Olee otú anyị si bịa nwee ọrụ a pụrụ iche? Ọ̀ bụkwa gịnị na-eme n’ubi ozi ala ọzọ dị n’ụlọ anyị? Ka m kọwaa.

Mụ na Olive ejewo ozi ihe dị ka afọ 20 n’ọrụ njegharị, na-eleta ọgbakọ dị iche kwa izu. Njem anyị akpọrọwo anyị site n’ugwu ruo na ndịda, ọwụwa anyanwụ ruo ọdịda anyanwụ, na Britain nile, n’oge na-adịbeghịkwa anya gakwuru ụmụnna anyị ndị Kraịst n’àgwàetiti Mediterranean bụ́ Malta, bụ́ ebe e lere anyị ọbịa n’ụzọ pụrụ iche. (Tụlee Ọrụ 28:1, 2.) Mgbe anyị nọsịrị afọ atọ na Malta, anyị malitere iche ebe ọzọ a ga-ekenye anyị ọrụ. Anyị chere na ikekwe anyị ga-eleta ógbè ime obodo England, anyị malitekwara ime ka uche anyị kwekọọ n’ihe a nwere ike ime. Lee ihe ijuanya ọ bụ mgbe anyị natara ọrụ anyị ilekọta sekit ọhụrụ a nke ìgwè na ọgbakọ ndị na-asụ asụsụ 23 dị iche iche mejupụtara!

Anyị chere otú anyị ga-esi nwee ihe ịga nke ọma. E wezụga ahụmahụ anyị na Malta, ọ dịbeghịkwa mgbe anyị na ndị nwere nzụlite na ọdịbendị dị iche mekọtachara ihe. Ànyị ga-enwe ike n’ezie inye ndị na-adịghị aghọta asụsụ Bekee nke ọma agbamume? Olee otú anyị pụrụ isi nwee nkwurịta okwu n’amaghị asụsụ ndị ọzọ? Gịnị banyere nri na omenala dịwagara iche nke ndị ọzọ? Ànyị ga-eme mgbanwe zuru ezu? Anyị tụgharịrị ajụjụ ndị dị ka ndị a n’uche ka anyị ji ekpere tụlee ịza ọkpụkpọ òkù Masedọnịa nke a.—Ọrụ 16:9, 10; 1 Ndị Kọrint 9:19-22.

Imeri Ihe Mgbochi nke Asụsụ

“Ná mmalite ọ dị m ka mụ erughị eru n’ihi na amaghị m asụsụ dị iche iche,” ka Olive na-akọwa. “Ahụghị m otú m pụrụ isi nyere ụmụnna nwanyị aka. Mgbe ahụ echetara m otú di na nwunye bu ụzọ mụọrọ anyị Bible si gbaa anyị ume ịghara ịjụ ọrụ e kenyere anyị ma ọlị. Ha kụziiri anyị na Jehova adịghị agwa anyị mgbe ọ bụla ime ihe anyị na-agaghị emeli.” Ya mere anyị abụọ ji obi dum nara ọrụ ahụ.

N’ileghachi anya azụ, anyị na-ahụ na amaghị asụsụ ọzọ enyeworo anyị aka imeso mmadụ nile n’otu ụzọ ahụ kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, ịga nzukọ ndị a na-eduzi n’asụsụ dị iche kwa izu emewo ka anyị ghọta otú ọ na-adị ụmụnna mgbe ha na-aghaghị ịnọ ná nzukọ asụsụ Bekee ebe ọ bụ nanị ihe dị nta n’ihe e kwuru ka ha ghọtara. Anyị aghaghị nnọọ ịkwadebe nke ọma maka nzukọ ka anyị wee nwee ike ịghọta ihe a na-akọwa. Olive na-aza mgbe nile otu n’ime ajụjụ ndị a jụrụ ná nzukọ. Ọ na-akwadebe azịza ya na Bekee, otu nwanna nwanyị ewee sụgharịa ya maka ya, na-edepụta nsụgharị ya otú e si ekwu ya. Ọ na-ekweta na ya na-alatụ azụ tupu ya ewelie aka ịza ajụjụ. Mgbe ụfọdụ mgbalị ya na-akpata ọchị. Ma nke a adịghị egbochi ya. “Amaara m na ụmụnna ndị ahụ nwere mmasị ná mgbalị m,” ka ọ na-ekwu. “N’ezie, mụ ịza ajụjụ na-agba ndị maara asụsụ ahụ nke ọma karị ume ikere òkè ná nzukọ.”

Nye m, ime ihe omume dịkwa iche, n’ihi na aghaghị m ịhapụrụ onye nsụgharị oge ná ngwụsị nke ahịrịokwu ọ bụla. Ọ na-adịrị m mfe nke ukwuu ịkpapụ n’echiche m. M na-achọpụta na aghaghị m ịtụkwasị uche n’ihe karị ma gbubilata ihe m ga-ekwu nke ukwuu. Ma ọ na-enye m obi ụtọ.

Ozi Anyị Dịgasị Iche Iche

N’ọtụtụ ebe mepere emepe na Britain, ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ nọgasị n’ebe dị iche iche, ikekwe mmadụ abụọ n’otu okporo ámá, mgbe ahụkwa ị ghaghị ịgate anya iji chọta ndị ọzọ. Ma, mgbe i kelere ha n’asụsụ ha ma hụ mmeghachi omume ha, ị na-ahụ na o ruru ya. Ọ bụrụ na nwanna mụ na ya so ejiri asụsụ onye nwe ụlọ zie ozi Alaeze ahụ, nzaghachi ya na-abụkarị ihe na-enye oké obi ụtọ.

N’ezie, ije ozi n’ubi asụsụ mba ọzọ bụ otu n’ime ihe kasị akpali akpali anyị meworo n’ime afọ 40 anyị nke ozi Alaeze. Ohere e nwere maka uto dị nnọọ ukwuu. Obi abụọ adịghị ya na ọtụtụ ndị na-amụta ihe ngwa ngwa karị, na-enwekwa ekele miri emi karị mgbe a kụziiri ha ihe n’asụsụ ala ha. (Ọrụ 2:8, 14, 41) Ọ na-emetụ n’ahụ nke ukwuu ịhụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha bu anya mmiri nke ọṅụ n’anya ná ngwụsị nke nzukọ, n’ọnọdụ ụfọdụ na nke mbụ ya na-abụ ndị nweworo ike ige ntị ma ghọta ihe omume ahụ dum.

Mgbe anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị na-agbalị ma ọ dịghị ihe ọzọ ikwu okwu mmalite n’asụsụ onye nwe ụlọ, ọ bụ ezie na anyị na-abanyetụ n’ihe isi ike. Dị ka ihe atụ, ihe a na-ekelekarị ezinụlọ Gujarati bụ Kemcho, nke na-apụta nanị “Kedụ?” O yiri ka ihe m kwuhiere n’otu oge dara ka a ga-asị na m na-akpọsa otu ụdị kọfị a ma ama nke ọma. Ka o sina dị, n’otu ebe obibi di na nwunye ahụ mụmụrụ ọnụ ọchị mgbe m kelere ha na Gujarati. Ha sịrị ka anyị bata ụlọ ozugbo ma jiri obi ọma nye anyị kọfị—ọ bụghị n’ihi mkpọhie okwu ọ bụla. Ọ dabara na ha bụ ndị ikwu nke ụfọdụ n’ime Ndịàmà Jehova nọ n’ìgwè ahụ anyị na-eleta, ha gosikwara ezi mmasị n’eziokwu ahụ.

Otu nwanna nwanyị na-asụ asụsụ Bekee hapụụrụ otu nwaada na-asụ Chinese magazin ugboro ugboro ruo ọtụtụ afọ. Ọ dịwo oge ndị a gwara nwaada ahụ ka e duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu, ma ọ jụrụ nke a. Otu ụbọchị nwanna nwanyị na-amụ Chinese sooro ya jee ma nyefee akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’asụsụ ahụ, bụ́ nke onye ahụ nwe ụlọ nwere mmasị naara n’egbughị oge.a Inwe akwụkwọ ahụ ugbu a n’asụsụ nke ya, o kweere inwe ọmụmụ Bible. Okwu ole na ole ahụ e kwuru n’asụsụ nwaada ahụ mere ka e nwee ọdịiche dị ukwuu.

Ọdịbendị Dịgasị Iche

Anyị amatabeghị na n’ọdịbendị ụfọdụ ndị ikom adịghị achọ ka ndị inyom ha na-apụ nanị ha n’abalị. Nke a na-eme ka o siere ọtụtụ ụmụnna nwanyị oké ike ịga nzukọ ndị a na-enwe n’uhuruchi. Ógbè Esia ụfọdụ kweere na ụmụ agbọghọ ha ndị na-achọghị ịlụ di ma nọgide na-ebi n’ụlọ na-akparị ezinụlọ ahụ. Nna otu nwanna nwanyị chọrọ iji nsí gbuo onwe ya mgbe ọ jụrụ ịlụ nwoke ezinụlọ ahụ họtaara ya. Ee, ihe ụmụnna nwanyị ndị ahụ na-aghaghị idi kwesịrị nnọọ ịrịba ama! Ma, mgbe ị hụrụ mmetụta eziokwu ahụ na-enwe ná ndụ ezinụlọ ahụ na otú nguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova nke ụmụnna nwanyị ndị ahụ si emetụ ndị mụrụ ha n’ahụ, ọ na-abụ ihe ijuanya n’ezie.

N’ịrụ ọrụ a, anyị emewo mgbanwe ụfọdụ. Tupu anyị amalite ọrụ njegharị, ihe oriri m bụ nri ọdịnala ndị England, ma ugbu a ihe oriri na-atọ ụtọ karị ma e tinye ya ihe ụtọ dị iche iche. Anyị na-akwa ụta ọtụtụ afọ ndị anyị hapụworo ka ha gafee tupu anyị amalite ịnụ ụtọ ụdị nri dị iche iche—malite n’azụ ndụ gaa n’ihe oriri e fesasịrị kọrị.

Atụmanya Magburu Onwe Ha

O yiri ka o dowo anya na ugbu a bụ oge ubi asụsụ mba ọzọ ga-eto n’ọtụtụ ebe. E nwere ọtụtụ mbipụta ugbu a n’asụsụ dị iche iche. Ị pụrụ ịhụta ngọzi Jehova ka a na-ahazi ọgbakọ ndị ọhụrụ. Ụmụnna ndị maara asụsụ ndị ọzọ na-esite n’ubi ndị tere anya na-abịa inye aka.

Otu ihe atụ gbara ọkpụrụkpụ abụrụwo nzaghachi a na-enwe n’iji French ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ. Ọtụtụ ndị na-asụ French gbara ọsọ ndụ sitere Zaire na mba Africa ndị ọzọ abịawo Britain n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Mgbe e hiwere ọgbakọ asụsụ French mbụ na London, ihe dị ka ndị nkwusa Alaeze 65 sonyere. Otu afọ ka e mesịrị ọnụ ọgụgụ ahụ maliri ruo 117, n’ime ndị a kwa, 48 jere ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile. Tupu ọ dịtee anya e guzobere ọgbakọ nke abụọ iji hụ maka mmasị na-arị elu. Ugbu a a pụrụ ilebakwuru ndị nwere mmasị anya, ndị 345 n’ime ha gara Ememe Ncheta nke 1995. Ndị bụbu ndị gụsịrị akwụkwọ na Gilead bụ́ ndị jeworo ozi na Benin, Côte d’Ivoire, Morocco, na Zaire ji ahụmahụ ha eme ihe ugbu a ịhụ maka ubi a na-eto eto, nzaghachi a na-enwe dịkwa ịtụnanya.

N’otu nleta m mere n’ọgbakọ French, eso m gaa iduziri otu nwa agbọghọ onye Africa ọmụmụ Bible. Mgbe anyị chọrọ ịla, nwa agbọghọ ahụ rịọrọ, sị: “Biko unu alala. Nọtụkwuonụ.” Ọ chọrọ nnọọ ịmatakwu ihe. O chetaara m Lidia nke narị afọ mbụ.—Ọrụ 16:14, 15.

Ọrụ mbụ anyị abụrụwo inyere obere ìgwè ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ aka ịghọ ọgbakọ. N’ebe ụmụnna na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwa izu, anyị maliteere ha Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke e gburu nkenke otu ugbo n’ọnwa. Nke a nyeere ha aka ikwuwa okwu nke ọma n’ozi ubi. Mgbe ahụ ha ji nwayọọ nwayọọ rụọ ọrụ iji na-enwe nzukọ ise dum nke ọgbakọ kwa izu. Ka ọ dị ugbu a anyị nwere ọgbakọ ọhụrụ ndị na-asụ Chinese (Cantonese), French, Gujarati, Japanese, Portuguese, Punjabi, Tamil, na Welsh.

Anyị enwewokwa ihe ùgwù nke ịga nzukọ nke ụmụnna ntị chiri. Ikiri ụmụnna ahụ ka ha ji aka ha na-abụ abụ bụ nnọọ ihe na-emetụ n’ahụ. N’ịmata na ha ji imegharị ahụ ekwu okwu n’ozi ha, mgbalị ha magburu onwe ya ikere òkè ná nkwusa Alaeze masịrị m. E nwere ọbụna ndị na-asụ asụsụ ndị ogbi na ndị ntị chiri maka ndị ntị chiri ma kpuokwa ìsì. O yiri ka Jehova na-eme ka e jide n’aka na ọ dịghị onye a hapụrụ.

Ọ bụrụ na ọ bụ otu ihe ka anyị na-aghaghị ịrịọ, ọ ga-abụ otu ihe ahụ Jisọs rịọrọ: “Na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” (Matiu 9:38) Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị na-anara ihe ịma aka nke ịmụta asụsụ nke ìgwè agbụrụ dị n’ókèala ọgbakọ ha. Ọ bụ ezie na e nyeghị anyị onyinye ọrụ ebube nke inwe ike ịsụ asụsụ dị iche iche, Jehova na-emeghe ozi ahụ n’ezie n’ubi ozi ala ọzọ a dị n’ụlọ—ubi chara acha maka owuwe ihe ubi. (Jọn 4:35, 36)—Dị ka Colin Seymour si kọọ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya