‘Werenụ Amara Na-agbaghara Onwe Unu’
“Na-anagiderịtanụ ibe unu, werekwanụ amara gbaghara onwe unu.”—NDỊ KỌLỌSI 3:13.
1. (a) Mgbe Pita tụrụ aro ka anyị gbaghara ndị ọzọ “ruo ugbo asaa,” n’ihi gịnị ka ọ pụrụ ijiwo chee na ya nwere obiọma? (b) Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe o kwuru na anyị kwesịrị ịgbaghara “ruo ugbo [iri asaa na asaa]”?
“ONYENWE anyị, ugbo ole ka nwanna m ga-emehie megide m, ewee m gbaghara ya? ruo ugbo asaa?” (Matiu 18:21) Pita pụrụ icheworị na o nwere nnọọ obiọma n’aro ya. N’oge ahụ, ọdịnala ndị rabaị kwuru na mmadụ ekwesịghị ịgbaghara karịa ugboro atọ maka otu mmejọ ahụ.a Mgbe ahụ chee echiche banyere ijuanya Pita, mgbe Jisọs zaghachiri, sị: “Asịghị m gị, Ruo ugbo asaa; kama, Ruo [ugbo iri asaa na asaa]”! (Matiu 18:22) Ikwughachi asaa bụ otu ihe ahụ ya na ịsị “mgbe ebighị ebi.” N’echiche Jisọs, a kpaghị nnọọ ókè ugboro ole onye Kraịst kwesịrị ịgbaghara ndị ọzọ.
2, 3. (a) N’ọnọdụ dịgasị aṅaa ka ọ pụrụ iyi ihe siri ike ịgbaghara ndị ọzọ? (b) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na ọ bụ maka ọdịmma anyị kasị mma ịgbaghara ndị ọzọ?
2 Otú ọ dị, itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ anaghị adị mfe mgbe nile. Ònye n’ime anyị ka mmeso ọjọọ na-emetụtabeghị? Ikekwe onye ị tụkwasịrị obi kpughere okwu nzuzo gị. (Ilu 11:13) Okwu a na-echeghị eche nke ezigbo enyi gị kwuru pụrụ ‘ịdụpuwo gị dị ka mma agha.’ (Ilu 12:18) Mmeso ọjọọ nke onye ị hụrụ n’anya ma ọ bụ tụkwasị obi pụrụ ịkpataworo gị oké mkpasu iwe. Mgbe ihe ndị dị otú ahụ mere, mmeghachi omume ebumpụta ụwa anyị pụrụ ịbụ iwe iwe. Anyị pụrụ ịchọ ịkwụsị ikwunyere onye ahụ mejọrọ anyị okwu, na-ezere ya kpam kpam ma ọ bụrụ na o kwere mee. Ọ pụrụ iyi ka ịgbaghara ya ga-abụ enyeghị ya ahụhụ maka imejọ anyị. Ma, site n’ịnọgide ná mkpasu iwe, anyị na-emerụ onwe anyị ahụ n’ikpeazụ.
3 N’ihi ya, Jisọs na-akụziri anyị ịgbaghara—“ruo ugbo [iri asaa na asaa].” N’ezie nkụzi ya agaghị emerụ anyị ahụ ma ọlị. Ihe nile ọ kụziri sitere na Jehova, ‘Onye na-ezi anyị ime ihe na-aba uru.’ (Aịsaịa 48:17; Jọn 7:16, 17) N’ụzọ ezi uche dị na ya, ịgbaghara ndị ọzọ aghaghị ịbụ maka ọdịmma anyị kasị mma. Tupu anyị atụlee ihe mere anyị kwesịrị iji gbaghara na otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ, ọ pụrụ inye aka ibu ụzọ mee ka o doo anya ihe mgbaghara bụ na ihe ọ na-abụghị. Echiche anyị banyere mgbaghara pụrụ inwe mmetụta ụfọdụ n’ikike anyị ịgbaghara ndị ọzọ mgbe e mejọrọ anyị.
4. Olee ihe ịgbaghara ndị ọzọ na-apụtaghị, ma olee otú e si kọwaa mgbaghara?
4 Ịgbaghara ndị ọzọ mmejọ ha mejọrọ anyị apụtaghị na anyị na-anabata ma ọ bụ na-ebelata ihe ha meworo; ọ pụtaghịkwa ikwe ka ndị ọzọ rigbuo anyị. E kwuwerị, mgbe Jehova na-agbaghara anyị, n’ezie ọ naghị eme ka mmehie anyị ghara ịbụ oké ihe, ọ gaghịkwa ekwe ma ọlị ka ndị mmadụ na-eme mmehie ledaa ebere ya anya. (Ndị Hibru 10:29) Dị ka Insight on the Scriptures si kwuo, a na-akọwa mgbaghara dị ka “omume nke ịgbaghara onye mejọrọ; ịkwụsị iwesa ya iwe n’ihi mmejọ ya na ịhapụ nzọrọ nile iji megwara.” (Mpịakọta nke 1, peji nke 861)b Bible na-agwa anyị ezi ihe ndị mere anyị ga-eji agbaghara ndị ọzọ.
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Gbaghara Ndị Ọzọ?
5. Olee ihe dị mkpa mere a ga-eji gbaghara ndị ọzọ nke e gosiri ná Ndị Efesọs 5:1?
5 E gosiri otu ihe dị mkpa mere a ga-eji gbaghara ndị ọzọ ná Ndị Efesọs 5:1: “Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” N’ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ‘ịbụ ndị na-eṅomi Chineke’? Okwu ahụ bụ́ “ya mere” na-ejikọta okwu ahụ n’amaokwu bu ụzọ, nke na-asị: “Nwerịtanụ obiọma n’ahụ ibe unu, nweenụ obi ọmịiko, werekwanụ amara gbaghara onwe unu, dị ka Chineke werekwaara amara gbaghara unu n’ime Kraịst.” (Ndị Efesọs 4:32, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, mgbe a bịara n’ihe banyere mgbaghara, anyị kwesịrị ịbụ ndị na-eṅomi Chineke. Dị ka nwa okoro nta na-agbalị ịdị nnọọ ka nna ya, anyị, dị ka ụmụntakịrị Jehova hụrụ n’anya nke ukwuu, kwesịrị ịchọ ịdị ka Nna anyị nke eluigwe nke na-agbaghara. Lee otú obi na-aghaghị isi na-atọ Jehova ụtọ ileda anya site n’eluigwe ma hụ ụmụ ya bi n’ụwa ka ha na-agbalị ịdị ka ya site n’ịgbaghara ibe ha!—Luk 6:35, 36; tụlee Matiu 5:44-48.
6. N’ụzọ dị aṅaa ka e nwere ọdịiche dị ukwuu n’agbata mgbaghara anyị na nke Jehova?
6 N’ikwu eziokwu, anyị apụghị ịgbaghara n’echiche zuru okè dị ka Jehova na-eme. Ma nke ahụ bụ ihe mere anyị ji kwesị ịgbaghara ibe anyị karị. Tụlee: E nwere ọdịiche dị ukwuu n’agbata mgbaghara nke anyị na nke Jehova. (Aịsaịa 55:7-9) Mgbe anyị gbaghaara ndị mehieworo megide anyị, ọ na-abụkarị ná nghọta nke na anyị pụrụ imesị chọọ ka ha gosighachi anyị ihu ọma ahụ site n’ịgbaghara anyị. N’ebe ụmụ mmadụ nọ, ọ na-abụkarị okwu nke ndị mmehie ịgbaghara ndị mmehie. Otú ọ dị, n’ebe Jehova nọ, mgbaghara bụ otu ụzọ mgbe nile. Ọ na-agbaghara anyị, ma o nweghị mgbe ọ ga-adị anyị mkpa ịgbaghara ya. Ọ bụrụ na Jehova, bụ́ onye na-adịghị eme mmehie, pụrụ ịgbaghara anyị n’ụzọ ịhụnanya na n’ụzọ zuru ezu otú a, ọ̀ bụ na anyị bụ ụmụ mmadụ na-eme mmehie ekwesịghị ịgbalị ịgbaghara ibe anyị?—Matiu 6:12.
7. Ọ bụrụ na anyị ajụ ịgbaghara ndị ọzọ mgbe e nwere ihe ndabere maka ebere, olee otú ọ pụrụ isi metụta mmekọrịta anyị na Jehova n’ụzọ dị njọ?
7 Ọbụna nke ka mkpa, ọ bụrụ na anyị ajụ ịgbaghara ndị ọzọ mgbe e nwere ihe ndabere maka ebere, ọ pụrụ inwe mmetụta dị njọ ná mmekọrịta anyị na Chineke. Jehova adịghị agwa anyị nanị ka anyị gbaghara ibe anyị; ọ na-atụ anya ka anyị mee otú ahụ. Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, akụkụ nke ihe ga-akpali anyị ịdị na-agbaghara bụ ka Jehova nwee ike ịgbaghara anyị ma ọ bụ n’ihi na ọ gbagharawo anyị. (Matiu 6:14; Mak 11:25; Ndị Efesọs 4:32; 1 Jọn 4:11) Mgbe ahụ, ọ bụrụ na anyị achọghị ịgbaghara ndị ọzọ mgbe e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji mee otú ahụ, ànyị pụrụ ịtụ anya n’ezie mgbaghara dị otú ahụ n’aka Jehova?—Matiu 18:21-35.
8. N’ihi gịnị ka ịdị na-agbaghara ji bụrụ maka ọdịmma anyị kasị mma?
8 Jehova na-ezi ndị ya “ezi ụzọ nke ha ga na-eje ije n’ime ya.” (1 Ndị Eze 8:36) Mgbe ọ na-ekwu ka anyị na-agbaghara ibe anyị, anyị pụrụ inwe obi ike na o bu ọdịmma anyị kasị mma n’obi. E nwere ezi ihe mere Bible ji gwa anyị ka anyị ‘chaara iwe ahụ ụzọ.’ (Ndị Rom 12:19) Iwe bụ ibu dị arọ iburu ná ndụ. Mgbe anyị bu ya n’obi, ọ na-erikpu echiche anyị, na-anapụ anyị udo, na-abịanyụkwa ọṅụ anyị. Iwe dịtere aka, dị ka ekworo, pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ahụ ike anyị. (Ilu 14:30) Ka nke a nile na-emekwa, onye ahụ mejọrọ anyị pụrụ ịgawara onwe ya n’amaghị nsogbu anyị nọ n’ime ya! Onye Okike anyị na-ahụ n’anya maara na ọ dị anyị mkpa ịgbaghara ndị ọzọ kpam kpam, ọ bụghị nanị maka abamuru ha kamakwa maka nke anyị. Ndụmọdụ Bible ịgbaghara bụ, n’ezie, ‘ezi ụzọ ije ije.’
“Na-anagiderịtanụ Ibe Unu”
9, 10. (a) Olee ụdị ọnọdụ ndị ọ na-adịchaghị mkpa inwe mgbaghara e kwupụtara ekwupụta? (b) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “na-anagiderịtanụ ibe unu” na-atụ aro ya?
9 Mmerụ ahụ anụ ahụ pụrụ ịbụ malite ná mmerụ ahụ ndị dị nta ruo n’ọnyá ndị miri emi, ọ bụghịkwa ha nile chọrọ otu ọ̀tụ̀tụ̀ nke nlebara anya. Otú ahụ ka ọ dị mkpasu iwe—iwe ụfọdụ na-emi emi karịa ndị ọzọ. Ọ̀ dị anyị mkpa n’ezie ise okwu n’ihi ntakịrị mmejọ ọ bụla anyị nwetara ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ? Ụmụ irighiri ihe mgbakasị ahụ, nlelị, na iwe bụ akụkụ nke ndụ, ọ dịchaghịkwa mkpa inwe mgbaghara e kwupụtara ekwuputa. Ọ bụrụ na a mara anyị dị ka ndị na-eze ndị ọzọ maka ntakịrị ndakpọ olileanya ọ bụla, mgbe ahụkwa bụrụ ndị na-esi ọnwụ na ha ga-arịọ mgbaghara tupu anyị emesoo ha n’ụzọ dị mma ọzọ, anyị pụrụ ịmanye ha iji oké nlezianya na-emeso anyị ihe—ma ọ bụ ịdị na-ezetụ anyị eze!
10 Kama, ọ kasị mma “ịbụ onye a maara maka inwe ezi uche.” (Ndị Filipaị 4:5, Phillips) Dị ka ndị e kere eke na-ezughị okè na-ejekọ ozi, anyị pụrụ n’ụzọ ezi uche dị na ya ịtụ anya na site n’oge ruo n’oge ụmụnna anyị pụrụ ichihịara anyị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, anyị pụkwara ime ha otu ihe ahụ. Ndị Kọlọsi 3:13 na-adụ anyị ọdụ, sị: “Na-anagiderịtanụ ibe unu.” Okwu ahụ na-enye echiche nke iji ndidi na-eso ndị ọzọ, na-anagide ihe ndị anyị kpọrọ asị n’ebe ha nọ ma ọ bụ àgwà ndị pụrụ ịdị na-agbakasị ahụ. Ndidi na ntachi obi dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ịnagide ntakịrị mmejọ ndị anyị nwetara ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ—n’akpaghasịghị udo nke ọgbakọ.—1 Ndị Kọrint 16:14.
Mgbe Ọnyá Ndị ahụ Miri Emi Karị
11. Mgbe ndị ọzọ mehiere megide anyị, gịnị pụrụ inyere anyị aka ịgbaghara ha?
11 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ndị ọzọ emehie megide anyị, na-akpata mkpasu iwe pụtara ìhè? Ọ bụrụ na mmehie ahụ adịghị oké njọ, anyị pụrụ inwe ihe isi ike dị nta n’itinye ndụmọdụ Bible bụ́ ‘iwere amara gbaghara onwe unu’ n’ọrụ. (Ndị Efesọs 4:32) Ịdị njikere dị otú ahụ ịgbaghara kwekọrọ n’okwu Pita ndị e ji mmụọ nsọ dee: “Nke bụ isi ihe nile meenụ ka ịhụnanya ahụ unu na-ahụrịta onwe unu dị ike; n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” (1 Pita 4:8) N’iburu n’uche na anyị bụkwa ndị mmehie ga-eme ka anyị nwee ike inye ohere maka mmehie ndị ọzọ. Mgbe anyị si otú a gbaghara, anyị ga-ahapụ iwe iwe kama ibu ya n’obi. N’ihi ya, mmekọrịta anyị na onye ahụ mejọrọnụ apụghị ịbụ nke e mebiri n’ụzọ na-adịgide adịgide, anyị enyekwa aka ichekwa udo dị oké ọnụ ahịa nke ọgbakọ. (Ndị Rom 14:19) Ka oge na-aga, ncheta nke ihe o mere pụrụ ịdajụ.
12. (a) Iji gbaghara onye mejọrọ anyị n’ụzọ miri emi, gịnị ka ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ mee? (b) Olee otú okwu ndị dị ná Ndị Efesọs 4:26 si egosi na anyị kwesịrị idozi okwu ngwa ngwa?
12 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide anyị n’ụzọ ka dị njọ, na-akpasu anyị iwe n’ụzọ miri emi? Dị ka ihe atụ, enyi ị tụkwasịrị obi pụrụ ikpughewo okwu dịịrị onwe onye nke ị kọsaara ya. Ọ na-ewute gị nke ukwuu, na-emenye gị ihere, na-emekwa gị onye a gbara n’anwụ. Ị nwawo ichezọ ya, ma okwu ahụ ekweghị nchezọ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ibu ụzọ mee ihe ụfọdụ iji dozie nsogbu ahụ, ikekwe site n’ịgwa onye ahụ mejọrọ gị okwu. Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime nke a tupu okwu ahụ enwee ohere ịka njọ. Pọl gbara anyị ume, sị: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe [ya bụ, site n’ibu iwe n’obi ma ọ bụ ime ihe n’iwe anyị]: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” (Ndị Efesọs 4:26) Eziokwu ahụ bụ na n’etiti ndị Juu, ọdịda nke anyanwụ na-aka akara mmechi nke otu ụbọchị na mmalite nke ụbọchị ọhụrụ na-atụkwasị ihe n’ihe okwu Pọl pụtara. N’ihi ya, okwu ndụmọdụ bụ: Dozie okwu ahụ ngwa ngwa!—Matiu 5:23, 24.
13. Mgbe anyị na-ejekwuru onye mejọworo anyị, gịnị kwesịrị ịbụ ebumnobi anyị, aro ndị dịkwa aṅaa pụrụ inyere anyị aka imezu ya?
13 Olee otú ị ga-esi jekwuru onye ahụ mejọrọ gị? “Chọọ udo, gbasookwa ya,” ka 1 Pita 3:11 na-ekwu. Mgbe ahụ, ebumnobi gị abụghị igosi iwe kama gị na nwanna gị ime udo. Iji mezuo nke ahụ, ọ kasị mma izere okwu na omume ndị na-akpasu iwe; nke a pụrụ ịkpali onye nke ọzọ imeghachi omume n’ụzọ yiri nke ahụ. (Ilu 15:18; 29:11) Ọzọkwa, zere okwu e kwubigara ókè dị ka, “Ị na-emekarị . . . !” ma ọ bụ, “Ọ dịghị mgbe ị . . . !” Okwu ndị e kwubigara ókè dị otú ahụ pụrụ nanị ime ya ka ọ zọwa onwe ya. Kama nke ahụ, ka olu okwu na ọdịdị ihu gị gosi na ị chọrọ idozi okwu nke wutere gị n’ụzọ miri emi. Kapịa okwu ọnụ mgbe ị na-akọwa mmetụta i nwere banyere ihe merenụ. Nye onye nke ọzọ ohere ịkọwa ihe ndị o mere. Gee ntị n’ihe o nwere ikwu. (Jemes 1:19) Ihe ọma dị aṅaa ka nke ahụ ga-emezu? Ilu 19:11 na-akọwa, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ; ọ bụkwa ịma mma ya ịgabiga njehie.” Ịghọta mmetụta onye nke ọzọ na ihe mere o ji mee ihe ndị o mere pụrụ iwepụ echiche na mmetụta na-ezighị ezi e nwere n’ebe ọ nọ. Mgbe anyị ji nzube nke ime udo zute ọnọdụ ahụ ma jigidesie àgwà ahụ ike, o yikarịrị nnọọ ka a pụrụ iwepụ nghọtahie ọ bụla, rịọ mgbaghara ndị kwesịrị ekwesị, gbagharakwa.
14. Mgbe anyị gbaghaara ndị ọzọ, n’echiche dị aṅaa ka anyị kwesịrị ichezọ?
14 Ịgbaghara ndị ọzọ ọ̀ pụtara na anyị aghaghị n’ezie ichezọ ihe merenụ? Cheta ihe nlereanya Jehova na nke a, dị ka a tụlere n’isiokwu bu ụzọ. Mgbe Bible na-ekwu na Jehova na-echezọ mmehie anyị, nke a apụtaghị na o nweghị ike icheta ha. (Aịsaịa 43:25) Kama, ọ na-echezọ n’echiche nke na ozugbo ọ gbaghaara, mmehie ndị ahụ adịghị emetụta otú o si ele anyị anya n’ọdịnihu. (Ezikiel 33:14-16) N’otu aka ahụ, ịgbaghara ụmụ mmadụ ibe anyị apụtachaghị na anyị agaghị enwe ike icheta ihe ha mere. Otú ọ dị, anyị pụrụ ichezọ n’echiche nke na anyị ejighị ya emegide onye ahụ mejọrọ ma ọ bụ welite ya ọzọ n’ọdịnihu. Mgbe e si otú a dozie okwu ahụ, ọ gaghị ekwesị ekwesị ịgba asịrị banyere ya; ọ gaghịkwa abụ ihe ịhụnanya ịdị na-eze onye ahụ mere mmejọ eze kpam kpam, na-emeso ya ka a ga-asị na a chụpụrụ ya n’ọgbakọ. (Ilu 17:9) N’ezie, ọ pụrụ iwetụ oge tupu mmekọrịta anyị na ya adịzie; e nwere ike anyị agaghị na-akpachi anya otú anyị kpachiburu. Ma anyị ka hụrụ ya n’anya dị ka nwanna onye Kraịst anyị, na-emekwa ike anyị dum iji nọgide na-enwe mmekọrịta udo.—Tụlee Luk 17:3.
Mgbe Ọ Na-eyi Ka A Pụghị Ịgbaghara
15, 16. (a) À na-achọ n’aka ndị Kraịst ịgbaghara onye mere ihe ọjọọ nke na-emeghị nchegharị? (b) Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ Bible a na-achọta n’Abụ Ọma 37:8 n’ọrụ?
15 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ndị ọzọ emehie megide anyị n’ụzọ na-akpata mkpasu iwe kasị mie emi, ma onye ahụ mejọrọ anyị ekwetaghịkwa mmehie ya, o chegharịghị, ọ rịọghịkwa mgbaghara? (Ilu 28:13) Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya na Jehova adịghị agbaghara ndị mmehie na-enweghị nchegharị, kpọrọ ekwo nkụ. (Ndị Hibru 6:4-6; 10:26, 27) Gịnị banyere anyị? Insight on the Scriptures na-ekwu, sị: “Ọ bụghị iwu na ndị Kraịst ga-agbaghara ndị kpachaara anya, jiri obi ọjọọ na-eme mmehie, n’enweghị nchegharị. Ndị dị otú ahụ na-aghọ ndị iro Chineke.” (Mpịakọta nke 1, peji nke 862) O kwesịghị ịdị ka a na-amanye onye Kraịst ọ bụla e mesoro mmeso ọjọọ, ihe arụ, ma ọ bụ ihe na-awụ akpata oyi amanye ịgbaghara onye ajọ omume nke na-enweghị nchegharị.—Abụ Ọma 139:21, 22.
16 N’ụzọ kwere nghọta, ndị e mesoworo ihe n’ụzọ obi ọjọọ pụrụ inwe mwute ma wee iwe. Otú ọ dị, cheta na ịnọgide na-ewe iwe pụrụ imerụ anyị ahụ nke ukwuu. Ịnọ na-echere maka nnakwere ma ọ bụ arịrịọ na-adịghị mgbe ha ga-abịa, anyị pụrụ nanị ịbụ ndị a kpasukwuru iwe. Ịtụkwasị uche n’emezighị emezi ahụ pụrụ ime ka iwe ahụ nọgide na-ere ka ọkụ n’ime anyị, na-enwe mmetụta na-ebibi ihe n’ahụ ike ime mmụọ, uche, na elu ahụ anyị. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị na-eme ka onye ahụ mejọrọ anyị nọgide na-emejọ anyị. N’ụzọ amamihe, Bible na-adụ ọdụ, sị: “Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma.” (Abụ Ọma 37:8) N’ihi ya, ụfọdụ ndị Kraịst achọpụtawo na ka oge na-aga ha enwewo ike ikpebi ịgbaghara n’echiche nke ịkwụsị ibu iwe n’obi—n’echeghị na ihe mere ha ziri ezi, kama na-ajụ ịbụ ndị iwe rikpuru. N’ịhapụ okwu ahụ kpam kpam n’aka Chineke nke ikpe ziri ezi, ha nwetara ahụ efe dị ukwuu, nweekwa ike ịdịrị ndụ ha na-aga.—Abụ Ọma 37:28.
17. Mmesi obi ike na-akasi obi dị aṅaa ka nkwa Jehova e dekọrọ ná Mkpughe 21:4 na-enye?
17 Mgbe mkpasu iwe miri emi nke ukwuu, e nwere ike anyị agaghị enwe ike ihichapụ ya n’uche anyị kpam kpam, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ bụghị n’usoro ihe a. Ma Jehova na-ekwe nkwa ụwa ọhụrụ bụ́ nke ọ ga-anọ na ya ‘hichapụ anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.’ (Mkpughe 21:4) Ihe ọ bụla anyị pụrụ icheta n’oge ahụ agaghị akpatara anyị oké mwute, ma ọ bụ ihe mgbu, bụ́ nke pụrụ ibo obi anyị ibu arọ ugbu a.—Aịsaịa 65:17, 18.
18. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịdị na-agbaghara ná mmekọrịta anyị na ụmụnna nwoke na nwanyị anyị? (b) Mgbe ndị ọzọ mehiere megide anyị, n’echiche dị aṅaa ka anyị pụrụ ịgbaghara ma chezọọ? (ch) Olee otú nke a si abara anyị uru?
18 Ka ọ dịgodị ugbu a, anyị aghaghị ibikọ ma rụkọọ ọrụ ọnụ dị ka ụmụnna nwoke na ndị nwanyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, na-eme mmehie. Anyị nile na-emehie ihe. Site n’oge ruo n’oge, anyị na-emechu ibe anyị ihu, ọbụnakwa mejọọ ibe anyị. Jisọs maara nke ọma na ọ ga-adị anyị mkpa ịgbaghara ndị ọzọ, ‘ọ bụghị, Ruo ugbo asaa, kama, Ruo ugbo [iri asaa na asaa]’! (Matiu 18:22) N’ezie, anyị apụghị ịgbaghara n’ụzọ zuru ezu dị ka Jehova na-eme. Ma, n’ihe ka ọtụtụ n’oge ụmụnna anyị mehiere megide anyị, anyị pụrụ ịgbaghara n’echiche nke imeri iwe, anyị pụkwara ichezọ n’echiche nke ejighị okwu ahụ megide ha ruo mgbe ebighị ebi n’ọdịnihu. Mgbe anyị si otú a na-agbaghara ma na-echezọ, anyị na-enye aka ichebe ọ bụghị nanị udo nke ọgbakọ kamakwa udo nke uche na obi anyị. Nke kasịnụ, anyị ga-anụ ụtọ udo nke nanị Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, pụrụ inye.—Ndị Filipaị 4:7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka Talmud ndị Babilọn si kwuo, otu ọdịnala ndị rabaị kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ejehie, n’oge nke mbụ, abụọ na atọ, a gbaghara ya, n’oge nke anọ, a gaghị agbaghara ya.” (Yoma 86b) Nke a daberetụụrụ ná nghọtahie nke akụkụ ihe odide ndị dị ka Emọs 1:3; 2:6; na Job 33:29.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Ajụjụ Maka Ntụleghachi
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji dị njikere ịgbaghara ndị ọzọ?
◻ Ọnọdụ ndị dị aṅaa chọrọ ka anyị ‘na-anagiderịta ibe anyị’?
◻ Mgbe mmehie ndị ọzọ wutere anyị n’ụzọ miri emi, gịnị ka anyị pụrụ ime iji dozie okwu ahụ n’udo?
◻ Mgbe anyị gbaghaara ndị ọzọ, n’echiche dị aṅaa ka anyị kwesịrị ichezọ?
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Mgbe anyị bu iwe n’obi, e nwere ike onye ahụ mejọrọ anyị amaghị nsogbu anyị nọ n’ime ya
[Foto dị na peeji nke 17]
Mgbe i jekwuuru ndị ọzọ ime udo, a pụrụ iwepụ nghọtahie n’ụzọ dị mfe