Iji Ozi Ọma Jekwuru Ọbụna Ọtụtụ Ndị Karị
KA M na-eche banyere ndị bi n’obodo m, achọpụtara m na ọtụtụ maara Ndịàmà Jehova nanị site n’akụkọ mgbasa ozi. E kwesịrị ịkpọtụrụ ndị a, ka m chere, ka ha wee nwee ike ịmata ndị Ndịàmà Jehova bụ na ihe ha kwere n’ezie. Ma olee otú m pụrụ isi nye aka? Di m bụ onye Kraịst bụ́ okenye, o nyekwara m nduzi na aro ndị amamihe dị na ha.
Anyị chọtara echiche gbara ọkpụrụkpụ n’isiokwu bụ́ “Magazin Ndị Na-enye Ezi Nkasi Obi,” nke e bipụtara ná mbipụta magazin Teta! nke January 8, 1995 (Bekee). Banyere ọrụ nke otu Onyeàmà, isiokwu ahụ na-asị: “Ọ nọwo na-ahụ na ọ nakọtara ụfọdụ magazin Teta! ndị ka mee ochie nke Ndịàmà ndị ọzọ nwejupụtaworo n’ụlọ. Mgbe ahụ ọ na-eleta ụlọ ọrụ ndị o chere na ha pụrụ igosi mmasị pụrụ iche n’ụfọdụ isiokwu ahụ.”
Site n’enyemaka di m, anakọtara m ọtụtụ narị magazin n’oge na-adịghị anya. Site n’ime ndị a enwere m ike ịhọta isiokwu dị iche iche dabara adaba maka ndị m ga-anwa ịkpọtụrụ.
N’iji akwụkwọ ntụziaka telifon na ihe ndekọ ọha na eze mee ihe, emere m ndepụta nke gụnyere ụlọ ọgwụ, ebe obibi maka ndị ntorobịa na-eme njem, na ebe a na-elekọta ndị ahụ na-adịghị ike. Edepụtakwara m ndị nduzi olili ozu, ndị nlekọta na ndị ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ, ndị nnyocha ọrịa na ahụ ike, na ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ na ụlọikpe. Ndepụta m gụnyere ndị nduzi ụlọ ọrụ ndị na-ahụ maka ndị aṅụrụma na ndị ọgwụ riri ahụ, òtù ndị na-ahụ maka okwu ndị metụtara gburugburu ebe obibi, maka ndị nwere nkwarụ na ndị agha mekpọrọ ọnụ, na maka nnyocha ihe ndị na-edozi ahụ. Elegharaghịkwa m ndị isi nke ọfịs ndị na-ahụ maka enyemaka, ijere ọha na eze ozi, na ihe ndị metụtara ezinụlọ anya.
Gịnị Ka M Ga-ekwu?
Ihe mbụ m na-eme mgbe m na-eme nleta bụ ịkọwa onye m bụ nke ọma. Mgbe ahụ ana m ekwu na nleta m ga-ewe nanị minit ole na ole.
Mgbe ọ bụla mụ na onye nọ n’isi zutere ihu na ihu, ana m asị: “Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, abịaghị m ebe a ikwurịta banyere okpukpe, bụ́ nke na-ekwesịghị ekwesị ma eleghị anya n’oge ọrụ.” Ọnọdụ na-aghọkarị nke na-eru ahụ ala karị. Mgbe ahụ, n’ịgbanwe okwu m gaa n’ọnọdụ dịnụ, ana m aga n’ihu: “Ihe mere m ji bịa dị ụzọ abụọ. Nke mbụ, achọrọ m ikwupụta ekele m maka ọrụ ọfịs gị na-ahazi. E kwuwerị, o kwesịghị ịbụ ihe a ga-eleda anya na mmadụ na-emefu oge na ume ya n’ihi ọdịmma ọha na eze. E kwesịrị ịja nke a mma n’ezie.” Ọtụtụ mgbe ọ na-eju onye e jekwuuru n’ụzọ a anya.
Ka ọ na-erule ugbu a onye ahụ yikarịsịrị ka ọ na-eche ihe bụ ihe nke abụọ mere m ji bịa. Ana m aga n’ihu: “Ihe nke abụọ mere m ji bịa bụ nke a: Site na magazin Teta! anyị, bụ́ nke a na-ebipụta ná mba dị iche iche, ahọpụtawo m isiokwu ụfọdụ na-atụle kpọmkwem banyere ụdị ọrụ gị na nsogbu ndị metụtara ya. Eji m n’aka na ị ga-achọ ịmara otú otu akwụkwọ na-agazu mba dị iche iche si ele nsogbu ndị a anya. Aga m enwe obi ụtọ ịhapụrụ gị mkpụrụ ole a.” A gwara m mgbe mgbe na e nwere mmasị ná mgbalị m.
Ihe Ndị Na-eju Anya ma Na-akwụghachi Ụgwọ Si na Ya Pụta
Mgbe m jiri ụzọ njekwu a mee ihe, ndị ka n’ọnụ ọgụgụ nabatara m n’ụdị enyi; nanị otu n’ime 17 jụrụ ịnabata m. Enwere m ọtụtụ ahụmahụ na-eju anya ma na-akwụghachi ụgwọ.
Dị ka ihe atụ, mgbe m jesịrị ugboro anọ ma were ndidi chere, emesịrị m zute onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ndị dị n’otu ógbè. Ọ bụ nwoke na-eji ọrụ n’aka nke ukwuu. Otú ọ dị, o gosiri nnọọ omume enyi ma soro m kwurịtatụ okwu. Mgbe m na-ala, ọ sịrị: “N’ezie mgbalị gị masịrị m, aghaghịkwa m iji nlezianya gụọ akwụkwọ gị.”
N’oge ọzọ, agara m n’otu ụlọikpe ógbè, wee zute nnukwu ọkàikpe ya, nwoke katatụrụ ahụ. Mgbe m banyere n’ọfịs ya, o welitere anya n’akwụkwọ ya dị ka a kpasuru ya iwe.
“Oge ọrụ bụ nanị ụtụtụ Tuesday, aga m anọkwa ya mgbe ahụ maka ihe ọmụma ọ bụla,” ka o ji iwe kwuo.
“Gbaghara m maka ịbịa n’oge na-ekwesịghị ekwesị,” ka m zaghachiri ngwa ngwa ma gbakwụnye, “Otú ọ dị, aga m enwe obi ụtọ ịbịaghachi n’oge ọzọ. Ma nleta m n’ezie bụ maka okwu onwe onye.”
Ugbu a ọkàikpe ahụ nwere ọchịchọ ịmata ihe. Ọ jụrụ, n’olu na-adịghị egosicha iwe, ihe m chọrọ. Ekwughachiri m na m ga-abịaghachi na Tuesday.
“Biko, were oche,” ka o kwusiri ike, n’ụzọ juru m nnọọ anya. “Gịnị ka ị chọrọ?”
Mkparịta ụka miri emi sochiri, ọ rịọkwara mgbaghara maka egositụghị omume enyi ná mmalite n’ihi na o ji ọrụ n’aka n’ezie.
“Ị̀ maara ihe na-amasị m n’ebe Ndịàmà Jehova nọ?” ka ọkàikpe ahụ jụrụ mgbe nwa oge gasịrị. “Ha nwere ụkpụrụ ndị e guzobere nke ọma bụ́ ndị ha na-adịghị esi na ha ewepụga onwe ha. Hitler nwara ihe ọ bụla ọ pụrụ ime, ma Ndịàmà emesịghị gaa agha.”
Mgbe anyị abụọ banyere n’otu ọfịs, ndị odeakwụkwọ nọ ebe ahụ matara anyị. Mgbe ahụ onye bụ nnukwu odeakwụkwọ kwulitere okwu n’ụzọ nwayọọ, “Onyeisi oche adịghị anabata òtù ọ bụla ma ọlị.”
“Ma ọ ga-anabata anyị,” ka m jiri nwayọọ zaghachi, “n’ihi na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Anyị abụghị ndị mkpesa, nleta anyị agaghịkwa akarị minit atọ.” N’ime obi m ekpesiri m ekpere ike, “O Jehova, biko ka nke a gaa nke ọma!”
Odeakwụkwọ ahụ zaghachiri n’ụzọ onye ihe na-agbasaghị, “Ngwanụ, ya bụrụ otú ahụ, aga m agbalị.” O wee pụọ. Mgbe ihe dị ka minit abụọ gasịrị, bụ́ nke yiri mgbe ebighị ebi nye m, ọ pụtaghachiri, onyeisi oche ahụ n’onwe ya na-esokwa ya n’azụ. N’ekwughị ihe ọ bụla, o butere ụzọ n’ịga n’ọfịs ya, na-agafe ọnụ ụlọ abụọ ọzọ.
Ka anyị malitere ịkparị ụka, o gosiwanyere omume enyi. O jiri obi ya nara mbipụta ndị pụrụ iche nke magazin Teta! mgbe anyị nyefere ha. Anyị kelere Jehova maka ohere a nke ịgba ezi àmà banyere nzube nke ọrụ anyị.
N’ileghachi anya azụ n’ọtụtụ ahụmahụ ahụ dị ịtụnanya, abịawo m ghọta ihe Pita onyeozi kwuru n’ụzọ zuru ezu karị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Uche Chineke bụ ka e nye mmadụ ndị sitere n’ọnọdụ, asụsụ, ma ọ bụ ọkwá ọha na eze nile ohere ịmara nzube ya maka ihe a kpọrọ mmadụ na maka ụwa.—Ọ bụ onye ọzọ dere ya.