Umeala n’Obi—Àgwà Na-amasị Jehova
NNWERE onwe pụọ ná nganga ma ọ bụ okomoko; obi dị umeala. Ọ bụghị adịghị ike kama ọ bụ ọnọdụ uche nke na-amasị Jehova.
N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e nwetara “umeala n’obi” site ná mkpọrọgwụ okwu bụ́ (ʽa·nahʹ) pụtara “onye e tiri ihe otiti, onye e wedara n’ala; onye e megburu emegbu.” A sụgharịrị okwu ndị sitere ná mkpọrọgwụ a n’ụzọ dị iche iche ịbụ “umeala n’obi,” “nwayọ n’obi,” “ihe otiti,” na ndị ọzọ. Ngwaa Hibru abụọ ọzọ metụtara “umeala n’obi” bụ ka·naʽʹ (n’ụzọ nkịtị, wetuo [onwe onye] ala) na sha·phelʹ (n’ụzọ nkịtị, dị ma ọ bụ ghọọ onye dị ala). N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst a sụgharịrị okwu bụ́ ta·pei·no·phro·syʹne ịbụ “umeala n’obi” na “obi dị umeala.” E nwetara ya site n’okwu ndị bụ́ ta·pei·noʹo, “mee ka a dị ala,” na phren, “uche.”
Mmadụ pụrụ inweta ọnọdụ nke ịdị umeala n’obi site n’ịtụgharị uche ná mmekọrịta ya n’ebe Chineke nọ na n’ebe ụmụ mmadụ ibe ya nọ, dị ka e depụtara na Bible, mgbe ahụzi na-etinye ụkpụrụ ndị ọ mụtara n’ọrụ. Otu okwu Hibru, bụ́ hith·rap·pesʹ, nke a sụgharịrị “weda onwe gị ala,” pụtara, n’ụzọ nkịtị, “kwee ka a zọtọọ gị n’ụkwụ.” Ọ na-ekwu nke ọma ihe omume nke onye amamihe ahụ dere akwụkwọ Ilu kọwara, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na ị nọworo mmadụ ibe gị ná mbé, . . . e jiwo okwu nile nke ọnụ gị maa gị n’ọnyà, . . . ị bawo n’ọbụ aka nke mmadụ ibe gị; jee kwee ka a zọtọọ gị n’ụkwụ [weda onwe gị ala], rịọchie mmadụ ibe gị ntị. . . . Napụta onwe gị.” (Ilu 6:1-5) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, tụfuo nganga gị, nakwere ihie ụzọ gị, mee ka ihe guzozie, ma chọọ mgbaghara. Jisọs nyere ndụmọdụ ka mmadụ weda onwe ya ala n’ihu Chineke dị ka nwata nakwa, kama ịdị na-agbalị ịbụ onye a ma ama, ka ọ na-ejere ụmụnna ya ozi.—Matiu 18:4; 23:12.
Ma ọ bụ, mmadụ pụrụ ịmụta ịdị umeala n’obi site n’ịbụ onye e weturu ala, onye ahụmahụ wedara ala. Jehova gwara Israel na ya wedara ha n’ala site n’ime ka ha jee ije afọ 40 n’ọzara iji nwaa ha ka o wee mara ihe dị n’obi ha na ime ka ha mara na “ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.” (Deuterọnọmi 8:2, 3) Ihe ịrụ ụka adịghị na ọtụtụ ndị Israel ritere uru site n’oké ahụmahụ a ma nweta ịdị umeala n’obi site na ya. (Tụlee Levitikọs 26:41; 2 Ihe E Mere 7:14; 12:6, 7.) Ọ bụrụ na mmadụ ma ọ bụ mba ajụ inwe obi umeala ma ọ bụ ịnara ịdọ aka ná ntị na-eme ka e nwee obi umeala, ndị dị otú ahụ ga-ata ahụhụ mweda n’ala mgbe oge ya ruru.—Ilu 15:32, 33; Aịsaịa 2:11; 5:15.
Ọ Na-amasị Chineke
Umeala n’obi nwere abamuru dị ukwuu n’anya Jehova. Ọ bụ ezie na Chineke ejighị ihe a kpọrọ mmadụ ụgwọ ihe ọ bụla, site n’ebere na-erughịrị mmadụ ọ dị njikere igosi ndị na-eweda onwe ha ala n’ihu ya ebere na ihu ọma. Ndị dị otú ahụ na-egosi na ha adịghị atụkwasị obi ma ọ bụ jiri onwe ha na-etu ọnụ kama na ha na-elegara ya anya ma na-achọ ime uche ya. Dị ka ndị Kraịst bụ́ ndị edemede n’ike mmụọ nsọ bụ́ Jemes na Pita na-ekwu: “Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.”—Jemes 4:6; 1 Pita 5:5.
Ọbụna ndị meworo mmehie ndị dị oké njọ n’oge gara aga, ọ bụrụ n’ezie na ha eweda onwe ha ala n’ihu Jehova ma rịọsie ya ike maka ebere, ọ ga-anụ olu ha. Site n’ịkwalite ofufe ụgha n’ala ahụ, Eze Manase nke Juda arafuwo ndị bi na Juda na Jerusalem “ime ihe ọjọọ karịa mba ọzọ, bụ́ ndị Jehova kpochapụrụ n’ihu ụmụ Israel.” Ma, mgbe Jehova mesịrị kwere ka eze Asiria dọrọ ya n’agha, Manase “ruru ala nke ukwuu n’ihu Chineke nke nna ya ha. O wee kpeere Ya; O wee kwee ka ọ rịọta ihe ọ rịọrọ, wee nụrụ arịrịọ amara ya, mee ka ọ lata na Jerusalem baa n’alaeze ya. Manase wee mara na Jehova, Ya onwe ya, bụ Chineke.” Manase si otú a mụta ịdị umeala n’obi.—2 Ihe E Mere 33:9, 12, 13; tụlee 1 Ndị Eze 21:27-29.
Ọ Na-enye Nduzi Ziri Ezi
Onye na-eweda onwe ya ala n’ihu Chineke pụrụ ịtụ anya inweta nduzi Chineke. Ezra nwere nnukwu ibu ọrụ n’idughachi ihe karịrị ndị ikom 1,500, e wezụga ndị nchụàjà, ndị Netinim, na ndị inyom na ụmụaka site Babilọn gaa Jerusalem. Ọzọkwa, ha bu ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ọlaedo na ọlaọcha iji chọọ ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem mma. Ha chọrọ nchebe ná njem ahụ, ma Ezra achọghị ịrịọ eze Peasia maka ndị agha idula ha, sikwa otú ahụ gosi ndabere ya n’ike mmadụ. E wezuga nke ahụ, o bula ụzọ gwa eze ahụ, sị: “Aka Chineke anyị dị n’ahụ ndị nile na-achọ Ya, ime ha mma.” Ya mere ọ kpọsara obubu ọnụ, ka ndị ahụ wee weda onwe ha ala n’ihu Jehova. Ha rịọrọ Chineke arịrịọ, o gekwara ntị ma chebe ha pụọ n’aka ndị iro zoro ezo n’ụzọ nke na ha jezuru njem ahụ dị ize ndụ n’enweghị nsogbu. (Ezra 8:1-14, 21-32) E gosiri Daniel onye amụma, nọ ná ndọta n’agha na Babilọn, ihu ọma dị ukwuu site na Chineke izigara ya otu mmụọ ozi nke ji otu ọhụụ, n’ihi na Daniel wedara onwe ya ala n’ihu Chineke n’ọchịchọ ọ chọrọ nduzi na nghọta.—Daniel 10:12.
Umeala n’obi ga-eduzi mmadụ n’ụzọ ziri ezi ma wetara ya nsọpụrụ, n’ihi na ọ bụ Chineke bụ onye na-ebuli mmadụ elu ma na-eme ka onye ọzọ dị ala. (Abụ Ọma 75:7) “N’ihu ntipịa ka obi mmadụ dị elu, ọ bụkwa n’ihu nsọpụrụ ka obi umeala na-aga.” (Ilu 18:12; 22:4) Ya mere, onye na-achọ nsọpụrụ site n’obi dị elu ga-ada, dị ka Eze Ụzaịa nke Juda dara, bụ́ onye dị nganga ma weghara ọrụ ndị nchụàjà n’ụzọ iwu na-akwadoghị: “Mgbe ọ dị ike, obi ya dị elu ruo mbibi, o wee mekpuo emekpu megide Jehova, bụ́ Chineke ya; o wee baa n’ụlọ ukwu Jehova isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” Mgbe o koro ọnụma megide ndị nchụàjà maka ịgbazi ya olu, e tiri ya ekpenta. (2 Ihe E Mere 26:16-21) Adịghị umeala n’obi mere ka e duhie Ụzaịa, ruo n’ọdịda ya.
Ọ Na-enyere Mmadụ Aka n’Oge Ahụhụ
Umeala n’obi pụrụ inyere mmadụ aka n’ụzọ dị ukwuu ịnagide ihe ịma aka nke ahụhụ. Ọ bụrụ na e nwee ọdachi, umeala n’obi na-eme ka mmadụ nọgidesie ike ma tachie obi tinyekwara ịnọgide n’ozi ọ na-ejere Chineke. Eze Devid gabigara ọtụtụ ahụhụ. Eze Sọl chụgharịrị ya dị ka onye na-emebi iwu. Ma ọ dịghị mgbe o mere mkpesa megide Chineke ma ọ bụ bulie onwe ya elu megide onye Jehova e tere mmanụ. (1 Samuel 26:9, 11, 23) Mgbe o mehiere megide Jehova ná mmekọrịta ya na Bat-sheba ma bụrụ onye onye amụma Chineke bụ́ Netan dọrọ aka ná ntị kasị dị ike, o wedara onwe ya ala n’ihu Chineke. (2 Samuel 12:9-23) E mesịa, mgbe otu onye Benjamin a kpọrọ Shimaị malitere ịkọcha Devid n’ihu ọha, ọchịagha Devid bụ́ Abishaị, chọọkwa igbu nwoke ahụ n’ihi akwanyereghị eze ùgwù, Devid gosiri umeala n’obi. Ọ gwara Abishaị, sị: “Lee, nwa m, nke siri n’afọ m pụta, na-achọ ndụ m: onye Benjamin nke a ọ̀ ga-esikwa aṅaa ghara ịchọkarị ya ugbu a? . . . Eleghị anya Jehova ga-elekwasị mweda m anya, Jehova ga-enyeghachikwa m ezi ihe n’ọnọdụ nkọcha ya taa.” (2 Samuel 16:5-13) E mesịa, Devid gụrụ ndị Israel ọnụ, n’ụzọ megidere uche Jehova. Ihe ndekọ ahụ na-agụ, sị: “Obi Devid wee taa ya ụta mgbe ọ gụsịrị ndị Israel. Devid wee sị Jehova, Emehiewo m nke ukwuu n’ihe m meworo. . . . Emewo m ihe nzuzu nke ukwuu.” (2 Samuel 24:1, 10) Ọ bụ ezie na o nwetara ntaramahụhụ, e wepụghị Devid dị ka eze; ịdị umeala n’obi ya rụrụ ọrụ dị ukwuu ná mweghachi ya gaa n’ihu ọma Jehova.