Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w00 1/1 p. 2-5
  • Okwukwe Pụrụ Ịgbanwe Ndụ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Okwukwe Pụrụ Ịgbanwe Ndụ Gị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okwukwe Pụrụ Ịgbanwe Ndụ Ezinụlọ
  • Okwukwe Na-enyere Ndị A Na-eleda Anya Aka
  • Ụdị Okwukwe Ziri Ezi
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Nwee Okwukwe nke Dabeere n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • “Nyekwuo Anyị Okwukwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Okwukwe Na-eme Ka Anyị Nwee Obi Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
w00 1/1 p. 2-5

Okwukwe Pụrụ Ịgbanwe Ndụ Gị

“N’EZIE ọ bụ nnọọ ihe kwere omume inwe ụkpụrụ ọma n’enweghị Chineke.” Nke a bụ ihe otu onye kwere na a pụghị ịmata Chineke amata kwuru. Ọ sịrị na ya ejiwo ụkpụrụ omume ndị dị elu zụlite ụmụ ya, na ha onwe ha ejiwokwa ụkpụrụ ndị dị elu yiri nke ahụ zụlite ụmụ nke ha—ha nile na-eme nke a n’enweghị okwukwe n’ebe Chineke nọ.

Nke a ọ̀ pụtara na inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ adịghị mkpa? O doro anya na onye a chere otú ahụ. Ọ bụkwa eziokwu na ọ bụghị onye ọ bụla nke na-ekwenyeghị na Chineke bụ onye ọjọọ. Pọl onyeozi kwuru banyere “ndị mba ọzọ” bụ́ ndị na-amaghị Chineke ma “na-eme ihe nile dị n’iwu site ka e si mụọ ha.” (Ndị Rom 2:14) Mmadụ nile—gụnyere ndị kwere na a pụghị ịmata Chineke amata—nwere akọ na uche site n’ọmụmụ. Ọtụtụ ndị na-anwa ịgbaso ihe akọ na uche ha gwara ha ọbụna ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị na Chineke nke nyere ha echiche ebumpụta ụwa ahụ nke ịmata ezi ihe na ihe ọjọọ.

Otú ọ dị, inwe okwukwe kwụ chịm n’ebe Chineke nọ—nke dabeere na Bible—bụ ikike dị nnọọ ike nke na-akpali ime ezi ihe karịa nduzi a na-achịkwaghị achịkwa nke akọ na uche. Okwukwe nke dabeere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-enye akọ na uche ihe ọmụma, na-eme ka ọ dịkwuo nkọ n’ịmata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. (Ndị Hibru 5:14) Ọzọkwa, okwukwe na-ewusikwu ndị mmadụ ike ịnọgide na-enwe ụkpụrụ ndị dị elu n’agbanyeghị nrụgide dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, na narị afọ nke 20, ọtụtụ mba nọ n’okpuru ike nke usoro ọchịchị rụrụ arụ, bụ́ nke manyere ụmụ mmadụ ndị o doro anya na ha nwere àgwà ọma, ime ihe ndị jọgburu onwe ha. Otú ọ dị, ndị nwere ezi okwukwe n’ebe Chineke nọ jụrụ imebi ụkpụrụ ha, ọbụna mgbe ndụ ha dị n’ihe ize ndụ. Tụkwasị na nke a, okwukwe dabeere na Bible pụrụ ịgbanwe ndị mmadụ. Ọ pụrụ iweghachi ndụ nke yiri ka o furu efu, nyekwara ndị mmadụ aka izere ihie ajọ ụzọ. Tụlee ihe atụ ole na ole.

Okwukwe Pụrụ Ịgbanwe Ndụ Ezinụlọ

“Site n’okwukwe unu, unu emewo ihe a na-apụghị ime eme.” Otú ahụ ka otu ọkàikpe bụ́ onye England kwuru mgbe o kwupụtara mkpebi ikpe ya banyere onye ga-akpọrọ ụmụ John na Tania. Mgbe ndị ọchịchị matara John na Tania, ha abụọ bi n’alụghị alụ, ndụ ha na-ebi n’ụlọ dịkwa egwu. John, bụ́ onye nwere nsogbu nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ na àgwà nke ịgba chaa chaa, tinyere isi na mpụ iji na-enweta ego ọ ga-eji na-akwado omume ya rụrụ arụ. O leghaara ụmụ ya na nne ha anya. Ya mere, olee “ọrụ ebube” merenụ?

Otu ụbọchị, John nụrụ ka nwa nwanne ya na-eto eto na-ekwu banyere Paradaịs. N’ịbụ onye nke a kpaliri mmasị ya, ọ jụrụ nne na nna nwa okoro ahụ ajụjụ. Nne na nna nwa okoro ahụ bụ Ndịàmà Jehova, ha nyekwaara John aka ịmụta banyere ya site na Bible. Nke nta nke nta, John na Tania zụlitere okwukwe dabeere na Bible bụ́ nke gbanwere ndụ ha. Ha nyere njikọ ha nkwado iwu site n’alụmdi na nwunye, meriekwa omume ha rụrụ arụ. Ndị ọchịchị bụ́ ndị nyochara ezinụlọ ha hụrụ ihe gaara eyiwo ihe na-apụghị ime eme ná ntakịrị oge tupu mgbe ahụ—inwe ezinụlọ nwere obi ụtọ nke bi n’ebe obibi dị ọcha, bụ́ ebe dị mma ịzụlite ụmụaka. Ọkàikpe ahụ ziri ezi n’ikwu na “ọrụ ebube” a bụ n’ihi okwukwe ọhụrụ John na Tania.

Ọtụtụ puku kilomita site n’England, otu nwa agbọghọ a na-alụ alụ nke bi na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa fọrọ nke nta ka aha ya banye n’otu ihe ndekọ dị nnọọ njọ. Ọ nọ na-eme atụmatụ isonye n’ọtụtụ nde ndị alụmdi na nwunye ha na-ejedebe n’ịgba alụkwaghịm kwa afọ. Ọ mụtara otu nwa, ma di ya tọrọ ya nnọọ atọ. N’ihi nke a, ndị ikwu ya nọ na-agba ya ume ịgba alụkwaghịm, ọ malitekwala ime nkwadebe iji mee otú ahụ n’ezie. Otú ọ dị, ya na otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ na-amụ Bible. Mgbe Onyeàmà ahụ nụrụ banyere ọnọdụ ahụ, ọ kọwara ihe Bible na-ekwu banyere alụmdi na nwunye—dị ka ihe atụ, na alụmdi na nwunye bụ onyinye sitere n’aka Chineke, ọ bụghịkwa ihe a ga-atụfu n’ụzọ dị mfe. (Matiu 19:4-6, 9) Nwanyị ahụ chere n’ime obi ya sị, ‘Ọ bụ ihe a na-adịghị ahụkebe na nwanyị a, bụ́ onye si esi bịa, na-agbalị ichebe ezinụlọ anyị ebe ndị ikwu m na-achọ itisa ya.’ Okwukwe ọhụrụ ya nyeere ya aka ichebe alụmdi na nwunye ya.

Otu ihe ndekọ dị njọ nke na-emetụta ndụ ezinụlọ bụ isikwopụ afọ ime. Otu akụkọ nke Mba Ndị Dị n’Otu, mere atụmatụ na kwa afọ, ọ dịkarịa ala a na-ama ụma esikwopụ ụmụaka dị nde 45. Nke ọ bụla n’ime ihe omume ndị dị otú ahụ bụ ọdachi. Ihe ọmụma Bible nyeere otu nwanyị nọ na Philippines aka izere ịtụnye ụtụ n’ihe ndekọ ahụ.

Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ nwanyị ahụ, ọ naara otu broshuọ e ji amụ Bible nke isiokwu ya bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?,a ma malite ịmụ Bible. Ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị, ọ kọwara ihe mere o jiri mee otú ahụ. Nwanyị ahụ dị ime mgbe Ndịàmà ahụ letara ya na nke mbụ ya, ma ya na di ya ekpebiwo isikwopụ nwa ahụ. Otú ọ dị, foto nke nwa ọhụrụ a na-amụbeghị amụ nke dị na peji nke 24 nke broshuọ ahụ metụrụ nwanyị ahụ n’obi. Nkọwa dabeere na Bible nke na-eso ya bụ́ na ndụ dị nsọ n’ihi na ‘n’ebe Chineke nọ ka isi iyi ndụ dị’ mere ka o kweta ịmụ nwa ahụ. (Abụ Ọma 36:9) Ugbu a ọ bụ nne nke nwa ọhụrụ mara mma ma gbasie ike.

Okwukwe Na-enyere Ndị A Na-eleda Anya Aka

N’Etiopia, ndị ikom abụọ yi nkịrịka uwe bịara nzukọ ofufe nke Ndịàmà Jehova. Ná ngwụsị nke nzukọ ahụ, otu Onyeàmà ji omume enyi kọwaara ha onwe ya. Ndị ikom ahụ rịọrọ ka ọ chọọrọ ha ihe. Onyeàmà ahụ nyere ha, ọ bụghị ego, kama ihe ka mma. Ọ gbara ha ume ịzụlite okwukwe n’ebe Chineke nọ, bụ́ nke “dịkarịrị ọlaedo oké ọnụ ahịa nke ukwuu.” (1 Pita 1:7) Otu n’ime ha meghachiri omume n’ụzọ dị mma ma malite ịmụ Bible. Nke a gbanwere ndụ ya. Ka ọ na-eto n’okwukwe, ọ kwụsịrị ise sịga, ịṅụ oké mmanya, omume rụrụ arụ, na iji khat (akwụkwọ ndụ na-eme ka e nwee mkpali) eme ihe. Ọ mụtara otú ọ ga-esi na-akwado onwe ya kama ịrịọ arịrịọ, ọ na-ebikwa ndụ dị ọcha na nke na-arụpụta ihe ugbu a.

N’Itali, a mara otu nwoke dị afọ 47 ikpe ịga mkpọrọ afọ iri, a kpọchikwara ya n’ụlọ ọgwụ ndị isi mgbaka dị n’ogige ụlọikpe. Otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ́ onye e nyere ikike ibanye n’ụlọ mkpọrọ iji nyere ndị mkpọrọ aka n’ụzọ ime mmụọ sooro nwoke ahụ mụọ Bible. Nwoke ahụ nwere ọganihu dị ngwa. Okwukwe gbanwere ndụ ya nke ukwuu nke na ndị mkpọrọ ndị ọzọ na-echigharịkwuru ya ugbu a maka ndụmọdụ banyere otú ha ga-esi dozie nsogbu ha. Okwukwe ya dabeere na Bible emewo ka ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ na-akwanyere ya ùgwù, na-asọpụrụ ya, ma na-atụkwasị ya obi.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ akwụkwọ akụkọ akọwo banyere agha obodo n’Africa. Nke kasị atụ ụjọ bụ akụkọ banyere ụmụ okoro ndị a na-azụ dị ka ndị soja. A na-enyeju ụmụaka ndị a ọgwụ ọjọọ afọ, mekpọọ ha ọnụ, ma manye ha itinye aka n’akparamàgwà afọ ịta mmiri megide ndị ikwu ha iji jide n’aka na ọ bụ nanị òtù ahụ ha na-alụrụ agha ka ha na-eguzosiri ike n’ihe. Okwukwe dabeere na Bible ò siruru ike nke ịgbanwe ndụ ndị na-eto eto dị otú ahụ? Ọ dịkarịa ala, o siruru ike otú ahụ n’ọnọdụ abụọ.

Na Liberia, Alex jere ozi dị ka nwa okoro na-eje ozi n’ọlta na Chọọchị Katọlik. Ma mgbe ọ dị afọ 13, o sonyeere òtù agha ma ghọọ nwatakịrị soja a ma ama. Iji mee ka ọ na-enwe obi ike n’ọgụ, ọ malitere iri amoosu. Alex hụrụ ka e gburu ọtụtụ n’ime ndị enyi ya, ma e gbughị ya onwe ya. Na 1997, o zutere Ndịàmà Jehova ma chọpụta na ha eledaghị ya anya. Kama nke ahụ, ha nyeere ya aka ịmụta ihe Bible na-ekwu banyere ime ihe ike. Alex hapụrụ usuu ndị agha ahụ. Ka okwukwe ya malitere ito, ọ gbasoro iwu Bible bụ́: “Ya sikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya, mee ezi ihe; ya chọọ udo, gbasookwa ya.”—1 Pita 3:11.

Ka ọ dị mgbe ahụ, otu onye bụbu nwatakịrị soja nke aha ya bụ Samson si n’obodo ebe Alex bi ugbu a na-agafe. Ọ bụbu nwa okoro so n’òtù ukwe ma na 1993 ọ ghọrọ onye soja ma tinye aka n’ịṅụ ọgwụ ọjọọ, mgbaasị, na omume rụrụ arụ. Na 1997 a chụrụ ya n’ọrụ soja. Samson nọ na-aga Monrovia iji banye n’otu òtù ndị agha nchebe pụrụ iche mgbe otu enyi ya mere ka o kwenye isoro Ndịàmà Jehova mụọ Bible, n’ihi ya kwa, ọ zụlitere okwukwe dabeere na Bible. Nke a nyere ya obi ike ịgbahapụ ụzọ ndụ ya nke ịlụ ọgụ. Ma Alex ma Samson na-ebizi ndụ udo na nke ziri ezi. Ọ̀ dị ihe ọzọ pụrụ ịgbanwe ndụ ndị e mekpọrọ ọnụ otú ahụ ma e wezụga okwukwe dabeere na Bible?

Ụdị Okwukwe Ziri Ezi

Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ọtụtụ ihe atụ ndị a pụrụ ihota iji gosi ikike ezi okwukwe dabeere na Bible nwere. N’ezie, ọ bụghị onye ọ bụla nke na-azọrọ na o kwenyere na Chineke na-ebi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị dị elu nke Bible. N’ezie, ụfọdụ ndị na-ekweghị na Chineke pụrụ ibi ndụ dị mma karịa ụfọdụ ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst. Nke ahụ bụ n’ihi na okwukwe dabeere na Bible na-agụnye ihe karịrị nanị mmadụ ịzọrọ na o kwere na Chineke.

Pọl onyeozi kpọrọ okwukwe “ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya.” (Ndị Hibru 11:1) N’ihi ya, okwukwe na-agụnye ikwenyesi ike—na-adabere n’ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha—n’ihe ndị a na-ahụghị anya. Karịsịa, ọ na-agụnye enweghị obi abụọ ọ bụla na Chineke dị adị, na o nwere mmasị n’ebe anyị nọ, nakwa na ọ ga-agọzi ndị na-eme uche ya. Onyeozi ahụ sịkwara: “Onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.”—Ndị Hibru 11:6.

Ọ bụ ụdị okwukwe a gbanwere ndụ John, Tania, na ndị ọzọ a kpọtụrụ aha n’isiokwu a. O dugara ha n’iji obi ike zuru ezu leba anya n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, maka nduzi n’ime mkpebi. O nyeere ha aka ịchụ àjà nwa oge iji ghara ịgbaso ụzọ dịịrị ha mfe ma bụrụ nke na-ezighị ezi. N’agbanyeghị otú ahụmahụ nke ọ bụla si dị iche, ha nile malitere n’otu ụzọ. Otu n’ime Ndịàmà Jehova so nke ọ bụla n’ime ndị a mụọ Bible, ha bịakwara hụ eziokwu nke ihe Bible na-ekwu: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike.” (Ndị Hibru 4:12) Ikike nke Okwu Chineke nyeere onye nke ọ bụla aka iwulite okwukwe siri ike nke gbanwere ndụ ya n’ụzọ ka mma.

Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ ike n’ihe karịrị ala 230 na n’àgwàetiti nile nke oké osimiri. Ha na-akpọ gị òkù inwe ọmụmụ Bible. N’ihi gịnị? N’ihi na ha kwenyesiri ike na okwukwe dabeere na Bible pụkwara iweta mgbanwe ndị dị ukwuu ná ndụ gị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Okwukwe dabeere na Bible na-agbanwe ndụ n’ụzọ ka mma

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

Kaadị bú aha Bible bụ́ Biblia nieświeska nke Szymon Budny sụgharịrị, 1572

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya