Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 7/15 p. 32
  • “Ihe M Na-atụ Anya Ya Emechaala Mee”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ihe M Na-atụ Anya Ya Emechaala Mee”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gwa Ha na Ị Hụrụ Ha n’Anya
    Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • “Ọ Dịtụbeghị Mgbe E Gosiri M Ụdị Ịhụnanya A”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • “Ebere Gị Dị Mma Karịa Ndụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Site n’Ịda Mbà n’Obi Gaa n’Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 7/15 p. 32

“Ihe M Na-atụ Anya Ya Emechaala Mee”

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Emilia bụbu ọsụ ụzọ oge niile, ma ọ kwụsịrị ịsụ ụzọ afọ iri na ise gara aga. N’oge na-adịbeghị anya, ọ malitere ịtụgharị uche n’otú obi si adị ya ụtọ mgbe ọ bụbu ọsụ ụzọ. Ọ chọrọ ịmalitekwa ịsụ ụzọ.

Ma, ọrụ Emilia na-arụ na-eri ya oge. N’ihi ya, obi anaghị adị ya mma. Otu ụbọchị ya na ndị ọrụ ibe ya nọ, o kwuru, sị: “Ọ dị m ka ya bụrụ na anaghị m arụ ọrụ ọtụtụ awa!” Onyeisi ya nụrụ ihe o kwuru ma jụọ ya ma ò si ya n’obi. Emilia gwara ya na o si ya n’obi. Ma, ndị isi ụlọ ọrụ ahụ chọrọ ka ndị niile na-arụrụ ha ọrụ jiri oge ha niile na-arụ ya. N’ihi ya, ọ bụrụ na Emilia ga-enweta ihe ọ chọrọ, ọ ga-anatarịrị ikike n’aka otu n’ime ndị isi ahụ. Nwanna nwaanyị ahụ jikeere ịga hụ otu n’ime ndị isi ahụ, kpeekwa ekpere ka Jehova nye ya obi ike ma mee ka obi ruo ya ala.

Mgbe Emilia gakwuuru onyeisi ahụ, o weturu obi ma gwa ya n’ezoghị ọnụ na ya achọghịzi ịna-arụru ọrụ awa ole ọ na-arụbu. Ọ gwakwara onyeisi ahụ na ya na-eji oge ọ bụla ya na-abịaghị ọrụ enyere ndị ọzọ aka. Emilia kwuru, sị: “Abụ m Onyeàmà Jehova. M na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta Baịbụl. Taa, ọtụtụ ndị anaghịzi akpa àgwà ọma. E kwesịrị inyere ha aka ịghọta ihe ha kwesịrị ịna-eme. Ihe m si na Baịbụl akụziri ha ga-abara ha ezigbo uru. Achọghị m ka ihe m na-eme mgbe m gbasara ọrụ mee ka m ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma n’ụlọ ọrụ a, ma m chọrọ inwekwu ohere ịna-enyere ndị ọzọ aka. N’ihi ya, achọghịzi m ịna-arụru ọrụ awa ole m na-arụbu.”

Onyeisi ahụ gere nwanna nwaanyị ahụ ntị nke ọma ma kwuo na ya chọburu ịna-arụ ọrụ ebere. O kwuru, sị: “N’ihi ihe a i kwuru, m ga-emere gị ihe ị rịọrọ. Ma, ò doro gị anya na a ga-ewepụ ihe n’ego a na-akwụ gị?” Emilia kwuru na ya ma nakwa na ya ga-amụta ime ka obere ego ya nwere na-ezuru ya. O kwukwara, sị: “Ihe kacha m mkpa bụ ime ihe ga-abara ndị ọzọ ezigbo uru.” Onyeisi ahụ gwara ya, sị: “Obi na-adị m ụtọ ma m hụ ndị na-ewepụta oge ha inyere ndị ọzọ aka.”

O nwetụbeghị onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ e meere ụdị ihe ọma ahụ. Emilia na-arụzi ọrụ naanị ụbọchị anọ n’izu. Ma, ihe ọzọ juru ya anya bụ na a tụkwasịrị ihe n’ego a na-akwụ ya. N’ihi ya, a na-akwụzi ya ego ole ahụ a na-akwụbu ya! O kwuru, sị: “Ihe m na-atụ anya ya emechaala mee. M nweziri ike ịmalitekwa ịsụ ụzọ!”

Ì chetụla echiche ma ị̀ ga-agbanwe ihe ụfọdụ ị na-eme ka i nwee ike ịmalite ịsụ ụzọ? Ọ bụrụ na ị bụbu ọsụ ụzọ, ì nwere ike ịmalitekwa?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 32]

Onyeisi ahụ gwara ya, sị: “Obi na-adị m ụtọ ma m hụ ndị na-ewepụta oge ha inyere ndị ọzọ aka”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya