Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w13 1/1 p. 3
  • Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
w13 1/1 p. 3

Maka Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

E bidoro ibipụta magazin a ị na-agụ ugbu a n’ọnwa Julaị nke afọ 1879. Ọtụtụ ihe agbanweela kemgbe ahụ, otú ahụ ka ọ dịkwa Ụlọ Nche a. (Lee foto ndị dị n’elu.) Malite n’Ụlọ Nche a ị na-agụ ugbu a, ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ anyị gbanwere n’otú Ụlọ Nche na-adịbu. Olee ihe ndị anyị gbanwere?

N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ọtụtụ ndị na-agazi n’Ịntanet agụ ihe ọ bụla ha chọrọ ịgụ. Ha pịhaala aka na maụs kọmputa ha, ha ahụ ihe ha chọrọ ịgụ bụ́ ndị dị naanị n’Ịntanet. E nwere ọtụtụ akwụkwọ na magazin ndị mmadụ nwere ike ịgụ n’Ịntanet.

Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-agazi n’Ịntanet agụ akwụkwọ ugbu a, anyị agbanweela otú ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ www.pr2711.com na-adịbu. Anyị emeela ka ọ matụkwuo mma, meekwa ka ọ dịkwuoro ndị mmadụ mfe ịnọ na ya chọta ihe ha na-achọ. Ndị gara na ya nwere ike ịgụ akwụkwọ anyị n’ihe karịrị narị asụsụ anọ na iri atọ. Ma, malite n’ọnwa Jenụwarị 2013, ndị na-aga na www.pr2711.com nwekwara ike ịnọ ebe ahụ gụọ isiokwu ụfọdụ ndị na-agbabu n’Ụlọ Nche. Isiokwu ndị ahụ ga na-agbazi naanị n’Ịntanet.a

Ebe ọ bụ na ọtụtụ isiokwu ndị na-agbabu n’Ụlọ Nche a anyị na-ebipụtara ọhaneze ga na-agbazi naanị n’Ịntanet malite n’Ụlọ Nche nke a gawa, Ụlọ Nche a ga na-adị naanị peeji iri na isii, ọ bụzighị peeji iri atọ na abụọ. A na-ebipụta Ụlọ Nche a na narị asụsụ abụọ na anọ. Ebe ọ bụ na ọ ga na-adịzi peeji iri na isii, ọ ga-adị mfe ugbu a ịsụgharịkwu ya n’asụsụ ndị ọzọ.

Anyị na-atụ anya na ihe ndị a anyị gbanwere ga-eme ka anyị kwusakwuoro ọtụtụ ndị ozi ọma, bụ́ nke ga-eme ka a zọpụta ndị mmadụ. Anyị kpebisiri ike na anyị ka ga na-ebipụta isiokwu ndị ga na-amasị gị ma na-abara gị ezigbo uru. Anyị ga na-ebipụta ha n’akwụkwọ, ha ga na-agbakwa n’Ịntanet. Nke a ga-abara ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị uru, bụ́ ndị na-akwanyere Baịbụl ùgwù ma chọọ ịmata ihe Baịbụl na-akụzi.

Ndị Bipụtara Ụlọ Nche A

a Isiokwu ga na-agbazi naanị n’Ịntanet bụ: “Maka Ndị Na-eto Eto.” Isiokwu a ga-enyere ndị na-eto eto aka ịna-amụ Baịbụl. Isiokwu ọzọ ga na-agbakwa naanị n’Ịntanet bụ: “Ihe E Ji Akụziri M Baịbụl.” E wepụtara isiokwu a ka ndị nne na nna were ya na-akụziri ụmụ ha ndị dị afọ atọ gbadawa ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya