Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Disemba 15, 2014
© 2014 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
NKE A NA-AMỤ AMỤ
FEBỤWARỊ 2-8, 2015
‘Geenụ Ntị, Ghọtakwanụ Ihe Okwu Ndị A Pụtara’
FEBỤWARỊ 9-15, 2015
FEBỤWARỊ 16-22, 2015
Anyị Kwesịrị Ịna-emekọ Ihe Ọnụ Ka Ọgwụgwụ Ụwa A Na-eru Nso
FEBỤWARỊ 23, 2015–MACH 1, 2015
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ
▪ ‘Geenụ Ntị, Ghọtakwanụ Ihe Okwu Ndị A Pụtara’
▪ Ị̀ ‘Ghọtara Ihe Ọ Pụtara’?
Olee otú anyị ga-esi mata ma ànyị ghọtara ihe ihe atụ ndị Jizọs mere pụtara? Isiokwu abụọ a ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi chebara ihe atụ asaa Jizọs mere echiche. Ha ga-enyekwara anyị aka ịghọta otú anyị nwere ike isi mee ihe ndị anyị mụtara n’ihe atụ ndị ahụ ma anyị gaa ozi ọma.
▪ Anyị Kwesịrị Ịna-emekọ Ihe Ọnụ Ka Ọgwụgwụ Ụwa A Na-eru Nso
▪ Ì Ji Ihe Jehova Nyere Gị Kpọrọ Ihe?
Ọtụtụ ndị na-eto eto n’ụwa taa na-achọ naanị ọdịmma onwe ha. Gịnị mere ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iji gbaa mbọ ka ha na ndị Chineke dịrị n’otu? N’isiokwu abụọ a, anyị ga-eleba anya n’ihe Baịbụl kọrọ gbasara ụfọdụ ndị mere ihe ziri ezi na ụfọdụ ndị mere ihe na-ezighị ezi. Ọ ga-enyere ma ndị na-eto eto ma ndị agadi aka ime ihe ziri ezi.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
4 Jehova Na-agọzi Ndị Ji Obi Ha Niile Na-ejere Ya Ozi
16 Ì Chetara?
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: Ebe ụfọdụ ndị bịara ịtụrụ ndụ n’ebe a na-akpọ Tamarindo, nke dị na Kosta Rika, n’akụkụ Oké Osimiri Pasifik. Obi tọrọ ha ụtọ mgbe ha mụtara na ụwa dum ga-emecha ghọọ paradaịs anyị ga na-elekọta ma biri na ya
KOSTA RIKA
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA
29,185
NDỊ ỌSỤ ỤZỌ OGE NIILE
2,858
Ihe a na-akpọ aha Chineke bụ́ Jehova bụ
Jéoba
n’asụsụ Bribri. A na-akpọ ya
Jehová
n’asụsụ Kabika
Ọgbakọ abụọ na ìgwè nta abụọ na-aghọbeghị ọgbakọ na-amụ ihe n’asụsụ Bribri. Ọgbakọ atọ na ìgwè nta anọ na-aghọbeghị ọgbakọ na-amụ ihe n’asụsụ Kabika. A na-asụcha asụsụ abụọ a na Kosta Rika