Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/96 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka May

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka May
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite May 6
  • Izu Na-amalite May 13
  • Izu Na-amalite May 20
  • Izu Na-amalite May 27
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 5/96 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka May

Izu Na-amalite May 6

Abụ 153 (225)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee “Ùnu Mezuru Ya n’April?”

15 min: “Jiri Obi Gị Dum!” Ajụjụ na azịza. Dị ka oge nyere ohere ya, tụlee “Isi-ihe Ndi Agekwurita Dika Ezi-na-ulo,” nke dị n’Ụlọ Nche nke April 15, 1982, peji nke 17.

20 min: “Na-agwa Onye Agbata Obi Gị Eziokwu.” Ajụjụ na azịza. Tụlee ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a tụrụ aro ha. Gbaa ndị ọhụrụ ume ikere òkè ná nkesa magazin, na-eji ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ dị mkpirikpi amalite. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ.

Abụ 148 (74) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 13

Abụ 63 (32)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

18 min: “Anyị Enwetụbeghị Ezi Ihe Otú A n’Ụzọ Ime Mmụọ!” Ajụjụ na azịza. Mee ka ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ, tinyere otu onye nọ n’afọ iri na ụma, kwuo ụfọdụ n’ime ngọzi ha. Mechie site n’igosi otú ekele bara ụba si akpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi eme ihe n’ozi dị nsọ.

22 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Ozi nke Udo Chineke’ nke Ndịàmà Jehova nke 1996.” Ntụle ajụjụ na azịza nke odeakwụkwọ ga-eme. N’akụkụ bụ́ “A Chọrọ Nkwado Unu,” kwusie ike na ụkpụrụ Bible nke ime ihe n’eziokwu, nrubeisi, nchegbu ịhụnanya maka ndị ọzọ, na ihe ndị ọzọ, na-emetụta ọnọdụ nile nke ndị na-eji ụlọ obibi nke Society mere ndokwa ya eme ihe. Jaa ndị na-akwado ndokwa ụlọ obibi Society mere mma.

Abụ 193 (6) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 20

Abụ 126 (92)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Tụlee ndokwa ndị e mere maka ije ozi ubi ná ngwụsị izu. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè ná nkesa magazin.

15 min: “Nọgide Na-ekwu Eziokwu.” Mesie ike mkpa ọ dị ime nletaghachi, na-enwe ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ ihe. Nyefee ndị gosiri ezi mmasị ụtụ. Mee ihe ngosi abụọ dị mkpirikpi.

20 min: “Gịnị Ka Ọ Na-ewe Iji Mee Gị Obi Ụtọ?” Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke June 1, 1993, peji nke 19-22.

Abụ 28 (5) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite May 27

Abụ 121 (68)

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Inyefe Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na June. Onye nlekọta ije ozi eburu ụzọ tụlee ihe mere e ji bipụta akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mgbe ahụ ya esoro ndị nkwusa abụọ ruru eru ma ọ bụ atọ tụlee isi ihe ụfọdụ dị n’ime ya. Akwụkwọ ahụ na-aza ajụjụ banyere ọdịnihu anyị, nhụjuanya ụmụ mmadụ, Alaeze Chineke, àgwà nsọpụrụ Chineke, ndụ ezinụlọ, na abamuru nke ekpere. Mmadụ abụọ dịgasi iche n’ìgwè ahụ egosi ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ a pụrụ iji mee ihe iji malite ọmụmụ ihe n’ọbịbịa nke mbụ ma ọ bụ ná nletaghachi. Mgbe ahụ onye nlekọta ije ozi atụlee isi ihe ndị na-esonụ. E nwere mkpa nke iduzi ọmụmụ Bible ndị dị irè karị n’oge ka mkpirikpi. E dokwara akwụkwọ a n’ụzọ pụrụ iche maka nzube ahụ. Ọ na-ewepụta eziokwu n’ụzọ ziri ezi, ma dịrị mfe. Ajụjụ maka paragraf nke ọ bụla, tinyekwara ndị dị ná ngwụsị nke isiakwụkwọ nke ọ bụla, na-enyere anyị aka ilekwasị anya n’ihe ndị bụ isi. Akwụkwọ ahụ na-atụlezu azịza nye ajụjụ a na-ajụ ndị ọhụrụ raara onwe ha nye na-achọ ime baptism. Gbaa mmadụ nile ume ịrụ ọrụ na-enwe ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ ihe na June.

10 min: Igbe Ajụjụ. Gụọ ma soro ndị na-ege ntị tụlee ya.

15 min: “Ì Ji Ọrụ n’Aka Gabiga Ókè?” Ajụjụ na azịza. Dị ka oge nyere ohere ya, tinye okwu ndị sitere na Teta! nke October 8, 1991, peji nke 24-26. Mee ka otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ kọọ ná mkpirikpi otú ha siworo nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide usoro ihe omume chiri anya nke ọchịchị Chineke.

Abụ 155 (49) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya