Anyị Enwetụbeghị Ezi Ihe Otú A n’Ụzọ Ime Mmụọ!
1 Ọnụ ọgụgụ ka ọtụtụ n’ime ụmụ mmadụ na-elepụ anya maka ụbọchị ha pụrụ ịsị, “Anyị enwetụbeghị ezi ihe otú a!” N’uche ha, ụbọchị ahụ ga-abịa mgbe ha ga-enwe ụba nke ihe onwunwe, na-enye ha ohere ‘izu ike, iri ihe, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na obi ịtọ ha ụtọ.’ (Luk 12:19) N’ụzọ dị iche, ka ọ dị ugbu a anyị nwere ike ikwu na, n’ụzọ ime mmụọ, ọ dịghị ezi ihe ọ bụla na-akọ anyị. (Abụ Ọma 34:10) Olee otú nke ahụ si ekwe omume?
2 Ilu 10:22 na-ekwupụta na “ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya.” Anyị bụ ndị na-enwe ihu ọma dị otú ahụ nke Chineke pụrụ ikwu n’ezie na Chineke “na-ewere akụ̀ Ya nye anyị ihe nile ka ha bụrụ ihe ga-atọ anyị ụtọ.” (1 Tim. 6:17) Nke a na-eme anyị ndị kasị baa ọgaranya n’ụwa!
3 Ịgụkọ Ngọzi Anyị: Ole na ole n’ime anyị nwere ụba nke ihe onwunwe. Ma, anyị bụ ndị a gọziri agọzi n’ihi na anyị adịghị echegbu onwe anyị gabiga ókè banyere ihe ndị na-akpa anyị kwa ụbọchị. Jehova maara ihe ndị dị anyị mkpa, ọ na-ekwekwa nkwa inye ha. (Mat. 6:31-33) Mmesi obi ike ya na-enye anyị udo nke uche, bụ́ nke dị oké ọnụ ahịa n’ezie.
4 Otú ọ dị, ngọzi ime mmụọ anyị dị ọbụna ukwuu karị. Ndụ anyị na-adabere ná nri ime mmụọ sitere n’aka Jehova. (Mat. 4:4) Ndị na-elegara isi iyi nke ụwa anya maka nri ime mmụọ na-akwụ agụụ ebe anyị na-eriju afọ, na-aṅụjukwa afọ. (Aịsa. 65:13) “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” na-emeghepụrụ anyị ụzọ nke nkwakọba na-adịghị agwụ agwụ nke ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Mat. 24:45; Jọn 17:3.
5 Òtù ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ nke dị oké ọnụ ahịa na-enye anyị mkpakọrịta na-ekpo ọkụ nke ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị bi n’akụkụ nile nke ụwa. (Jọn 13:35) Ọgbakọ anyị bụ ebe nchebe nke udo, ebe anyị pụrụ ịchọta nkasi obi na izu ike. Ndị okenye na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi anyị, na-enyere anyị aka ịnagide ọtụtụ ụdị nsogbu. (Hib. 13:17) Anyị ịnọ ụmụnna anyị nso na-arụpụta nkasirịta obi, na-enye anyị ume ịga n’ihu.—Rom 1:11, 12.
6 Ọbụna ọrụ anyị bụ ngọzi. Ọtụtụ ọrụ ego siri ike, ndị na-adịghị enye afọ ojuju. Ikerịta ozi ọma ahụ na-ewetara ndị ọzọ ọṅụ, na-enyekwa anyị onwe anyị obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Anyị na-enwe ike n’ezie ịhụ ezi ihe n’ime ndọgbu nile anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ.—Ekli. 2:24.
7 Nke kasịnụ, anyị nwere olileanya dị ebube maka ọdịnihu. (Rom 12:12) Anyị na-elepụ anya maka ụwa ọhụrụ zuru okè nke ezi omume, ebe anyị na ndị anyị hụrụ n’anya ga-ebi n’obi ụtọ na udo ruo mgbe ebighị ebi! Olileanya a bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa nke karịrị ihe ọ bụla ụwa a nwere inye.—1 Tim. 6:19.
8 Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Gosi Ekele Anyị? Ọ dịghị mgbe anyị pụrụ ịkwụghachi Jehova ụgwọ maka ihe o mewooro anyị. Anyị pụrụ nanị igosipụta ekele anyị site (1) n’ikele ya kwa ụbọchị maka ebere ya na-erughịrị mmadụ (Efe. 5:20), (2) igosipụta ịhụnanya anyị site n’irube isi (1 Jọn 5:3), (3) ido aha ya nsọ site n’ikwusa ozi ọma (Abụ Ọma 83:18), na (4) ịkwado ọgbakọ ndị Kraịst site n’iji obi anyị dum na-eso ya arụkọ ọrụ.—1 Tim. 3:15.
9 Anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji bụrụ ndị kasị nwee obi ụtọ n’elu ụwa. (Abụ Ọma 144:15b) Ka àgwà, omume, na ozi anyị gosipụta ọṅụ anyị nwere na paradaịs ime mmụọ anyị. Anyị enwetụbeghị ezi ihe otú a!