Nzukọ Ije Ozi Maka October
Izu Na-amalite October 6
Abụ 39
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.
15 min: “Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya?” Ajụjụ na azịza. Tụleghachi isi ihe dị n’Akụkọ Alaeze nke 35. Gosi ihe mere ndị mmadụ n’ókèala unu ga-eji rite uru site na traktị a. Mesie mkpa ọ dị ike ime atụmatụ ugbu a iji kere òkè zuru ezu ná nkesa ya na ịdị uchu n’isochi mmasị nile a chọtara.
20 min: “Kesaa Akụkọ Alaeze nke 35 n’Ụzọ Sara Mbara.” Okwu mmeghe nke onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Tụlecha paragraf nke 5 ruo na nke 8 site n’ajụjụ na azịza. Tụlee ndokwa ọgbakọ maka ọrụ a gbasawanyere. Tụlee ụzọ dị iche iche isi jide n’aka na a rụzuru ókèala nile. Ndị nkwusa pụrụ iji Akụkọ Alaeze nke 35 mee ihe mgbe a na-agbara ndị mmadụ àmà n’ebe bọs na-akwụsị, n’ahịa na n’ebe achụmnta ego ndị na-ebughị ibu, n’ebe ndọba ụgbọala, n’ụgbọ njem ọha na eze, na n’ebe ndị ọzọ. Tụọ aro ụzọ isi nyere ndị ọhụrụ chọrọ ịmalite ọrụ nkwusa aka. Gụnye ihe ọmụma sitere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1995, peji nke 3, paragraf nke 9. N’ókèala ụfọdụ ọ pụrụ ịba uru mmadụ ịrụ nanị ya na ịghara ibu akpa mgbe a na-ekesa Akụkọ Alaeze. Mee ihe ngosi abụọ ma ọ bụ atọ dị nkenke nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ.
Abụ 126 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 13
Abụ 41
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee isi ihe ndị a ga-eji nwee nkwurịta okwu dị ná mbipụta ndị kasị ọhụrụ nke Ụlọ Nche na Teta! Chetara mmadụ nile na n’ọrụ ngwụsị izu, a ga-enyefe magazin tinyere Akụkọ Alaeze nke 35. Anyị kwesịrị isochi mmasị nile e gosiri.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
18 min: “Olee Otú I Si Azaghachi n’Omume Ọ̀ Gbasara M?” Nkwurịta okwu n’etiti ndị okenye abụọ. Gụnye okwu sitere n’ihe dị n’okpuru isiokwu nta bụ́ “How You Can Attack Apathy” [Otú Ị Pụrụ Isi Lụsoo Omume Ọ̀ Gbasara M Ọgụ] n’Ụlọ Nche July 15, 1974 (Bekee), peji nke 445-446.
Abụ 130 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 20
Abụ 42
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: Tụlee ụfọdụ ahụmahụ sitere na 1996 Yearbook, peji nke 6-8, n’isiokwu bụ́ “Global Distribution of Kingdom News” [Nkesa Zuru Ụwa Ọnụ nke Akụkọ Alaeze]. Mee ka mgbalị ndị nkwusa tinyere n’otu n’otu ná nkesa gara aga nke Akụkọ Alaeze pụta ìhè. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè zuru ezu n’ikesa Akụkọ Alaeze nke 35.
15 min: “Ị̀ Bụ Onyeàmà Oge Nile?” Okwu onye okenye ga-ekwu.
Abụ 133 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 27
Abụ 43
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee ọganihu nke nkesa Akụkọ Alaeze nke 35. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị na-agba ume. Kọọ ókè a rụruworo ókèala na ihe a ga-achọ iji rụzuo ya mgbe ọ na-erule November 16. Ngwa ngwa a rụzuru ókèala, anyị ga-enyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma n’ụbọchị ndị fọdụrụ n’ọnwa. Mesie ike nzube nke ịmalite ọmụmụ ihe mgbe e mere nletaghachi n’ebe e nwere nzaghachi dị mma maka Akụkọ Alaeze.
15 min: Ụzọ Isi Nweta Olileanya n’Oge Obi Nkoropụ. Okwu onye okenye ga-ekwu dabere n’Ụlọ Nche, May 15, 1997, peji nke 22-25.
18 min: Mee Ka Ìhè Gị Na-enwu. Okwu na mkparịta ụka n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 84-88. Mee ndokwa tupu oge eruo ka ndị nkwusa kwuo okwu kpọmkwem banyere ajụjụ ndị na-esonụ: (1) N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ? (2) Ruo n’ókè hà aṅaa ka e jiri usoro a mee ihe na narị afọ mbụ? (3) N’ihi gịnị ka e ji nwee mkpa dị ngwa ịnọgide na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ? (4) Ọnọdụ ndị dị aṅaa nwere ike ime ka o siere anyị ike ikerechi òkè anya? (5) Olee otú anyị pụrụ isi nweta enyemaka iji nọgidesie ike? (6) Olee otú e si agọzi anyị site n’ime ka ìhè anyị nwuo? (7) Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nwekwuo ihe ịga nke ọma n’ịkpọtụrụ ndị mmadụ? Mee ka o doo anya site n’ime ka ndị nkwusa atọ ma ọ bụ anọ kọọ ahụmahụ ndị na-agba ume ha nwetara mgbe ha na-arụ ọrụ site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa ma ọ bụ mgbe ha na-agba àmà okporo ámá.
Abụ 136 na ekpere mmechi.