Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/97 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka November

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka November
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite November 3
  • Izu Na-amalite November 10
  • Izu Na-amalite November 17
  • Izu Na-amalite November 24
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 11/97 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka November

Izu Na-amalite November 3

Abụ 48

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. “Ozi Ọma n’Internet.” Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi July maka mba a na ọgbakọ unu.

15 min: “Ọnụ Ụzọ Dị Ukwuu Na-eduga n’Ịrụ Ọrụ Ghere Oghe.” Okwu onye okenye ga-ekwu, tinyere okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Gbaa mmadụ nile ndị nwere ike ume iru eru maka ikere òkè ka ukwuu n’ọrụ nkwusa. Tinye ụfọdụ okwu ndụmọdụ e nyere n’Ụlọ Nche, August 15, 1988, peji nke 22.

20 min: “Sochie Mmasị E Gosiri n’Akụkọ Alaeze.” Ajụjụ na azịza. Mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị na paragraf nke 6. N’otu n’ime ha, gosi ka a na-amalite ọmụmụ Bible.

Abụ 144 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 10

Abụ 51

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gwa ọgbakọ banyere ókèala a na-ejibeghị Akụkọ Alaeze nke 35 rụzuo. Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè zuru ezu n’izu ikpeazụ a nke mkpọsa a pụrụ iche.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: “Ruo Ndị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Na-abụghị Ndịàmà.” Nkwurịta okwu n’etiti ndị okenye abụọ ndị nwere nchegbu banyere ịmatakwu ndị di ma ọ bụ nwunye na-ekweghị ekwe n’ọnọdụ nke aka ha. Ha atụleekwa aro ndị a tụrụ n’Ụlọ Nche, May 15, 1989, peji nke 17-18, paragraf nke 6-9. Tinye ahụmahụ ndị sitere n’Ụlọ Nche, October 1, 1995, peji nke 10-11, paragraf nke 11-12.

Abụ 148 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 17

Abụ 53

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Kọwapụta ndokwa ozi ubi maka ngwụsị izu. Kọọ ahụmahụ ụfọdụ e nwere n’ógbè unu site ná mkpọsa nke Akụkọ Alaeze nke 35.

20 min: Jiri Ohere A Pụrụ Iche Mee Ihe! Okwu dabeere n’Ụlọ Nche, November 15, 1996, peji nke 21-23.

15 min: “Gịnị Ka M Ga-ekwu?” Ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Gụọ paragraf nke mbụ na peji nke 8 nke akwụkwọ Reasoning, na-akọwa otú e si hazie akwụkwọ ahụ iji nyere anyị aka ịgba àmà n’ụzọ dị irè n’isiokwu Bible dịgasị iche iche. Jiri otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ a kwadebere nke ọma mee ihe atụ.

Abụ 151 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite November 24

Abụ 56

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: Àgwà Ọma n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Anyị nwere ekele maka afọ ọma nke ezinụlọ ndị wepụtara ụlọ ha maka ọmụmụ akwụkwọ. Nke a nwere ike ịgụnye nkwadebe na enweghị ntụsara ahụ dị ukwuu. Mgbe anyị na-aga, anyị kwesịrị igosipụta àgwà ndị dị mma ma gosi nkwanye ùgwù na nchebara echiche, bụ́ ndị ga-agụnye ihe ndị na-esonụ: (1) Anyị kwesịrị iji nlezianya hichaa ụkwụ anyị tupu na-abanye, iji zere imetọ ala ụlọ ma ọ bụ kapet. (2) Ndị nne na nna kwesịrị ilebara ụmụ ha anya, na-ejide n’aka na ha na-akpa ezi àgwà ma nọrọ n’akụkụ ebe obibi nke e wepụtara maka ọmụmụ akwụkwọ ahụ. (3) Ọ bụ ezie na ìgwè ahụ pụrụ ịdị ntakịrị, ọnọdụ ya adịtụkwa ka nke ndị enyi, nke a bụ nzukọ ọgbakọ, anyị kwesịkwara iji ejiji dị ka anyị na-eme mgbe anyị na-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. (4) Mkpakọrịta mgbe e mechiri nzukọ kwesịrị ịdị nkenke ka ezinụlọ ahụ nwee ike inwe oge nke aka ha maka onwe ha. (5) Ọ bụ ezie na onye nwe ụlọ ebe a na-enwe ọmụmụ ihe ahụ pụrụ ịhọrọ site n’oge ruo n’oge inye oriri ntụrụndụ mgbe e mechiri ọmụmụ ihe, mmadụ nile kwesịrị ịghọta na a tụghị anya ma ọ bụ chọọ ihe dị otú ahụ.

22 min: Mee Ndị Na-eso Ụzọ, Na-ezi Ha Ihe. Onye okenye eduzie nkwurịta okwu nke ya na ìgwè ndị nkwusa atọ ma ọ bụ anọ, na-aza ajụjụ ndị dabeere n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 88-92: (1) N’ihi gịnị ka ime nletaghachi ji dị oké mkpa maka ozi dị irè? Olee otú mmadụ pụrụ isi nagide ihe ịma aka nke ọrụ ime nletaghachi? (2) N’ihi gịnị ka anyị ji ekwusi okwu ike nke ukwuu banyere ịmalite ọmụmụ Bible? Olee otú anyị pụrụ isi ghọọ ndị nwere nkà n’iduzi ọmụmụ ihe? (3) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa iduzi ndị a na-amụrụ ihe gaa ná nzukọ a? Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Ìgwè ahụ akọwaa otú ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị na-adịbeghị anya nke June 1996 na March na April 1997 siworo nyere ha aka n’akụkụ ndị a.

Abụ 160 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya