Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/00 p. 2
  • Usoro Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite January 10
  • Izu Na-amalite January 17
  • Izu Na-amalite January 24
  • Izu Na-amalite January 31
  • Izu Na-amalite February 7
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 1/00 p. 2

Usoro Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite January 10

Abụ nke 107

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Ime Ka A Mara Aha Jehova n’Ụwa Nile.” Ntụle ajụjụ na azịza. Gụnye ihe e kwuru banyere ịgba àmà mberede nke dị n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 93-94.

20 min: Oge Eruwo Maka Idejupụta Kaadị Advance Medical Directive/Release nke ọhụrụ. (Ọrụ 15:28, 29) Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke okenye ruru eru ga-ekwu. A gbasachaa nzukọ a, Ndịàmà e mere baptism pụrụ inweta kaadị Advance Medical Directive/Release ọhụrụ, ndị nwekwara obere ụmụaka a na-emebeghị baptism pụrụ ịnata otu Identity Card maka nwatakịrị nke ọ bụla. A gaghị edejupụta kaadị ndị a n’uhuruchi a. E kwesịrị iji nlezianya dejupụta ha n’ụlọ ma A GAGHỊ abịanye aka na ha. Ịbịanye aka, ịgba akaebe, na ide akara ụbọchị n’ime kaadị nile ga-abụ ma e nwechaa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-esonụ, site n’enyemaka nke onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ, n’ebe ọ dị mkpa. Tupu ị bịanye aka, jide n’aka na e dejupụtara kaadị ndị ahụ nke ọma. Ndị na-abịanye aka dị ka ndị akaebe kwesịrị ịhụ onye nwe kaadị ahụ mgbe ọ na-abịanye aka na ya. Site n’ime ka okwu sitere na kaadị a daba n’ọnọdụ na n’ihe ha kwenyere, ndị nkwusa a na-emebeghị baptism pụrụ idejupụta okwu nduzi nke ha bụ́ nke ha na ụmụ ha ga-eji na-eme ihe. Ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ijide n’aka na ndị nile nọ n’ìgwè ha nwetara enyemaka dị ha mkpa iji dejupụta kaadị Advance Medical Directive/Release. Iji nwee nchebe iwu kasị mma, e kwesịrị idejupụta kaadị a. Chetara ndị nkwusa ka ha na-eji kaadị a mgbe nile. Akụkọ egosiwo na ụfọdụ adịghị eji kaadị a mgbe ha na-aga ụlọ ọgwụ maka ọgwụgwọ. Nke a emewo ka ha na ụlọ ọgwụ nwee ọtụtụ nsogbu.

Abụ nke 155 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 17

Abụ nke 12

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: “Jiri Traktị Malite Mkparịta Ụka.” Tụlee traktị anọ ọ bụla a na-ejikarị eme ihe n’ókèala unu. Jụọ otu ajụjụ a zara na traktị nke ọ bụla. Gwa ndị na-ege ntị ka ha tuo aro otú a pụrụ isi jiri ajụjụ ahụ malite mkparịta ụka nke pụkwara iduje n’ọmụmụ Bible. Jiri trakti abụọ n’ime ha mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi mee nke a.

Abụ nke 57 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 24

Abụ nke 110

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na ahụmahụ ndị e nwere n’ozi ubi.

15 min: “Tụlee Okwu Jehova Kwa Ụbọchị!” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Gbaa mmadụ nile ume iji Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchi—2000 mee ihe n’ụzọ dị mma. Gụnye okwu sitere n’okwu nkọwa, dị na peji nke 3-4. Kpọọ ndị nkwusa ka ha kọọ otú ha si agba mbọ pụru iche iji tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị na nkọwa ha kwa ụbọchị.

20 min: Ha Mere Nhọrọ Dị Mma. Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke October 15, 1997, peji nke 19-21, paragraf nke 3-16. Kwuo ihe ndị ọsụ ụzọ kwuru, bụ́ ndị na-egosi ihe mere ha ji chee na ha ejiriwo ndụ ha mee ihe n’ụzọ kasị akwụghachi ụgwọ ma baa uru. Gbaa ndị nile na-ege ntị ume ịtụle ohere ha nwere maka ịsụ ụzọ.

Abụ nke 182 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 31

Abụ nke 16

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka January. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na February: akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ. Mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi jiri ajụjụ atọ dị n’igbe dị na peji nke 12 nke akwụkwọ ahụ malite isoro mmadụ nwee mkparịta ụka.

15 min: Azịza Nye Ajụjụ A Jụrụ Banyere ‘Nrịba Ama.’ Okwu onye okenye ga-ekwu, nke dabeere n’Ụlọ Nche nke July 15, 1999, peji nke 29-31.

18 min: Ụzọ Isi Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịchọta Ezi Okpukpe. Nkwurịta okwu ga-adị n’etiti ohu na-eje ozi ruru eru na ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru banyere otú ndị mmadụ pụrụ isi nwee mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ ọ bụ ezie na ha aghọtachaghị ọdịiche dị n’etiti okpukpe ndị ọzọ na nke anyị. Tụleghachi isi ihe iri ahụ e kwuru okwu ha na Teta! nke May 8, 1995, peji nke 10. Kọwaa otú ịmata ihe ndị a pụrụ isi nyere onye nwere obi eziokwu aka ịhụ ma ọdịiche dị n’etiti ezi ofufe na ofufe ụgha ma mkpa ọ dị ịmụta ihe site n’aka ndị Jehova nakwa iso anyị na-akpakọrịta.

Abụ nke 60 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 7

Abụ nke 113

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

20 min: “Ekwela Ka Ikike Gị Ghọọ Adịghị Ike Gị.” Okwu onye okenye ga-ekwu, nke dabeere n’Ụlọ Nche nke December 1, 1999, peji nke 26-29.

15 min: “Ndị Inyom Ndị Na-adọgbu Onwe Ha n’Ọrụ n’Ime Onyenwe Anyị.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Gụnye okwu dị n’Ụlọ Nche nke September 15, 1996, peji nke 14-15, paragraf nke 18-19. Jaa ụmụnna nwanyị mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ maka nkwado ha ji afọ ofufo na-enye, ozi ndị bara uru ha na-ejere ndị ọzọ, na ime nkwusa ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme.

Abụ nke 82 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya