Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/00 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite June 19
  • Izu Na-amalite June 26
  • Izu Na-amalite July 3
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 6/00 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite June 12

Abụ nke 136

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Ndọgbu Unu Na-adọgbu Onwe Unu n’Ọrụ Abụghị Ihe Efu.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Gụnye okwu ndị dị n’ahụmahụ a kọrọ n’Ụlọ Nche nke June 15, 1996, peeji nke 32.

22 min: Iji Broshuọ Na-achọ Amalite Ọmụmụ Bible. Okwu, na-atụleghachi isiokwu dị n’Ozi Alaeze Anyị nke January 1999 peeji nke 4. Mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu ahụ a tụrụ aro ya na paragraf nke 6. Mee ka otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ kọọ ná mkpirikpi banyere ihe ịga nke ọma ha nweworo n’ịmalite ọmụmụ ihe, na-ekwu otú ha si malite ọmụmụ ihe ahụ na ihe ha mere iji mee ka ọmụmụ ihe ahụ na-aga n’ihu site n’izu ruo n’izu.

Abụ nke 209 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 19

Abụ nke 14

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego na ịma ọkwa banyere ngụzigharị ihe ndekọ ego a na-eme kwa ọnwa atọ. Ọ bụrụ na ọgbakọ nwere akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ ma ọ bụ Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ, mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe n’ụzọ bara uru n’ozi.

8 min:  Igbe Ajụjụ. Okwu onye okenye ga-ekwu.

25 min: “M Ga-esi Aṅaa . . . Ma Ọ Bụrụ na Ọ dịghị Onye Ga-edu M?” Ntụle ajụjụ na azịza nke onye nlekọta ije ozi ga-eduzi. Kwuo ka a gụpụtạ paragraf nile, gụọkwa akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị na paragraf nke 3, 4, na nke 7. Mgbe a na-atụle paragraf nke 6, kọwaa ọrụ onye nlekọta ije ozi na-arụ n’ikpebi ma è kwesịrị ịmaliteghachiri ndị e mere baptism ọmụmụ Bible ma ọ bụ na e kwesịghị.—Lee Igbe Ajụjụ nke Ozi Alaeze Anyị nke November 1998.

Abụ nke 89 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 26

Abụ nke 39

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa inye akụkọ ozi ubi maka June. Tụleghachi akwụkwọ a ga-enyefe na July. Gosi broshuọ ndị meworo ochie karị bụ́ ndị unu nwere n’ọgbakọ unu, ma kọwapụta nzube nke ọ bụla n’ime ha ná nkenke. Mee ihe ngosi a kwadebere nke ọma nke na-egosi otú a ga-esi enyefe nke ọ bụla n’ime ha n’ozi.

17 min: “Na-emesapụ Aka, Na-adị Njikere Ikerịta Ihe.” Ajụjụ na azịza. Gụnye ihe anọ bụ́ “Ihe Mere Anyị Ji Enye Ihe,” bụ́ ndị a kọwapụtara n’Ụlọ Nche nke November 1, 1996, peeji nke 29-30.

18 min: Mara Otú Ị Na-aghaghị Isi Zaghachi. (Kọl. 4:6) Okwu na ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Gịnị ka ị na-eme mgbe i zutere onye welitere arụmụka megidere ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ? Akwụkwọ Reasoning na-enyekarị aka site n’ịtụ aro ndị dị irè banyere ụzọ isi jiri akọ zaa ajụjụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ezie na anyị na-ewere ọnwụ dị ka onye iro a ga-emeri site n’ihe mgbapụta Kraịst, ndị ọzọ kwenyere na ọ dịghị ihe ga-ewepụ ihe ndabara a, ọbụna na-enwe okwukwe n’echiche ụgha nke ịlọ ụwa. Tụlee nzaghachi ndị e nwere n’akwụkwọ Reasoning n’akụkụ bụ́ “If Someone Says—” (“Ọ Bụrụ na Mmadụ Asị—”) nke dị na peeji nke 103-104 na 321. Gbaa mmadụ nile ume ijiri akwụkwọ ahụ n’ozi ubi.

Abụ nke 44 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite July 3

Abụ nke 213

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gwa ndị nkwusa maliteworo ọmụmụ ihe na broshuọ Na-achọ ka ha kọọ otú ha si mee nke a.

15 min: “Ị̀ Ga-anọ Ebe Ahụ?” Okwu na ahụmahụ dị iche iche, nke onye okenye ga-eduzi. Mgbakọ ukwu dị iche iche arụwo ọrụ dị ukwuu n’iwusi ndị Chineke ike site n’oge Bible ruo n’oge anyị. (Lee akwụkwọ Proclaimers peeji nke 254, paragraf nke 1-3, na Insight, Mpịakọta nke 1, peeji nke 821, paragraf nke 5.) Gbaa mmadụ nile ume ka ha malite mewe nkwadebe ugbu a iji gaa ụbọchị atọ dum nke mgbakọ distrikti afọ a. Kpọọ ndị na-ege ndị òkù ịkọ ahụmahụ ndị na-egosi na ha ritere uru n’ụzọ ime mmụọ site ná mbọ ha gbasiri ike ịnọ ya n’oge ndị gara aga.

20 min: Itinye Ụkpụrụ Bible n’Ọrụ Na-ewusi Ndụ Ezinụlọ Ike. Nkwurịta okwu ga-adị n’etiti ụmụnna nwoke abụọ, nke dabeere n’isi ihe asatọ a kọwara n’akwụkwọ Reasoning peeji nke 253-254. Kọwaa mkpa ọ dị inyere ndị a na-amụrụ Bible aka ịmata na isi ihe na-akpata obi ụtọ ezinụlọ dabeere n’ịghọta na itinye ụkpụrụ ndị dị n’Okwu Chineke n’ọrụ. N’iji ihe ọmụmụ nke 8 na broshuọ Na-achọ eme ihe, mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi mee nke a. Ezinụlọ ndị tinyere ndụmọdụ Bible n’ọrụ na-abụ ndị dị n’otu ma na-enweta ọṅụ dị ukwuu ná nkekọ chịrị anya nke ịhụnanya na ịdị n’otu. Kọọ ahụmahụ dị n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ isi nke 13, paragraf nke 1, 21-22.

Abụ nke 51 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya