Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/00 p. 3
  • Ị̀ Ga-anọ Ebe Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ga-anọ Ebe Ahụ?
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbakọ Distrikti “Nnapụta Dị Nso!” nke Ndịàmà Jehova nke 2006
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Mgbakọ Distrikti “Ụzọ Ndụ nke Chineke” nke 1998
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Ị̀ Ga-aga?
    Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Ị̀ Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 6/00 p. 3

Ị̀ Ga-anọ Ebe Ahụ?

1 Otu onye bụworo Onyeàmà ruo ọtụtụ afọ kwuru otu mgbe, sị: “Ọ bụrụ na ụbọchị mbụ nke mgbakọ akwaa gị, ọtụtụ ihe akwawo gị!” N’ihi gịnị ka o ji kwuo otú ahụ? N’ihi na ụbọchị mbụ bụ mmalite nke nri ime mmụọ bara ụba nke nzukọ Jehova kwadebeere anyị. (Aịsa. 25:6) Anyị ịnọ ebe ahụ site ná mmalite na-egosi na anyị kweere ná mmetụta ọbụ abụ ahụ nwere: “Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m, Ka anyị jee n’ụlọ Jehova.”—Abụ Ọma 122:1.

2 Otú ọ dị, n’ụfọdụ Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” e nwere n’afọ gara aga, ndị gara na Friday dị nnọọ ala karịa ndị gara na Saturday na Sunday. Nke a pụtara na ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụnna anyị anụghị akụkụ ihe omume mgbakọ ahụ nke nyere ihe ọmụma ndị dị mkpa banyere okwu amụma ahụ. Iso ndị kwere ekwe ibe ha nwee mkpakọrịta na-enye ọṅụ kwakwara ha.

3 Ekwela Ka Ọrụ Ego Gị Gbochie Gị: Mmadụ ichegbu onwe ya banyere ịbụ onye a chụrụ n’ọrụ ọ na-arụ pụrụ ịbụ ihe mere ụfọdụ na-ejighị aga na Friday. Otú ọ dị, ọtụtụ Ndịàmà achọpụtawo na ndị were ha n’ọrụ dị njikere ikwere ka ha ghara ịga ọrụ ma ọ bụrụ na ha arịọ ha tupu oge eruo. Otu onye were mmadụ n’ọrụ nwere mmasị dị ukwuu n’ihi mkpebi siri ike nke otu nwanna nwanyị bụ́ onye ọsụ ụzọ mere ịga nzukọ nile nke ọgbakọ na mgbakọ dị iche iche nke na ọ nọrọ otu ụbọchị zuru ezu ná mgbakọ nwanna nwanyị ahụ gara!

4 I kwesịghị iche na onye were gị n’ọrụ agaghị ekwe enye gị ohere ịhapụ ọrụ, i kwesịghịkwa ikwubi na ịhapụ otu ụbọchị nke mgbakọ adịghị ihe o mere. Site ná nkwenye sitere n’ala ala obi, kwadebe iji akọ gosi onye were gị n’ọrụ site n’Akwụkwọ Nsọ ihe mere ịga mgbakọ dị iche iche ji bụrụ akụkụ dị mkpa nke ofufe ị na-efe. (Hib. 10:24, 25) Mgbe ahụ, nwee obi ike zuru ezu ná nkwa Jehova, na-aghọta na a ga-enye gị ihe onwunwe ọ bụla dị gị mkpa ma ọ bụrụ na i debe mkpa ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ gị.—Mat. 6:33; Hib. 13:5, 6.

5 Ihe bụ́ isi bụ inwe ekele maka “ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10, 11, NW; Abụ Ọma 27:4) Nke a na-akwali anyị ime atụmatụ iji rite uru zuru ezu ná ndokwa a dị mkpa sitere n’aka Jehova. Malite ime atụmatụ doro anya ugbu a, ma kpebisie ike na ị ga-anọ ebe ahụ n’ụbọchị atọ ahụ nile!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya