Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite April 8
Abụ nke 39
13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ka ha kirie vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? iji kwadebe maka ịtụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke April 22. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ihe ngosi abụọ dị iche iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke April 15 na Teta! nke May 8. Mgbe ị na- enyefe Teta! nke May 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. Na nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi merie ihe na-egbochi nkwurịta okwu bụ́ “Enwere m okpukpe nke m.”—Lee Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 10.
12 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Na-eme Ihe Ọma n’Ebe Mmadụ Nile Nọ”a Mgbe i mesịrị ntụle nke ajụjụ na azịza, gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị ga-ekwu otú ha si na-agbasawanye ozi ha.
Abụ nke 157 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 15
Abụ nke 101
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: Ndị Ọsụ Ụzọ Nọgidenụ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka. Onye nlekọta ije ozi eduzie nkwurịta okwu nke ìgwè nke onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, onye ọsụ ụzọ, na onye nkwusa mejupụtara. Onye nlekọta ije ozi atụleghachi usoro ihe omume bụ́ Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka dị ka a kọwapụtara ya n’Ozi Alaeze Anyị nke September 1998, peeji nke 8. Ya esorozie onye nke ọ bụla nọ n’ìgwè ahụ tụlee òkè ọ na-ekere n’usoro ihe omume ahụ na otú o si emezu nzube ya. Gịnị ka e meworo iji mee ka ọ gaa nke ọma? Onye nlekọta ije ozi agwa ndị nkwusa nile ka ha mee ka ya mara ma ọ bụrụ na ha achọọ inweta enyemaka n’ozi. A pụrụ ịgụnye ndị e nyeere aka n’oge gara aga ọzọ maka inwetakwu enyemaka n’akụkụ ọzọ nke ozi ahụ.
20 min: “Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Mee ka isi ihe ndị dị na ya pụta ìhè ma gosipụta otú mmadụ nile pụrụ isi nweta agbamume site n’akwụkwọ ozi a.
Abụ nke 199 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 22
Abụ nke 90
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ka otu ohu na-eje ozi mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke May 1, meekwa ka nwanna nwanyị gosi ụzọ isi chee ihe n’ihu mmadụ na-eji ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ sitere na Teta! nke May 8 mee ihe. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, kwughachi otu ahịrịokwu mmeghe ma ọ bụ abụọ bụ́ ndị e jiri mee ihe iji kpalie mmasị nke onyenwe ụlọ.
10 min: Bịa n’Oge! Okwu. Ihe omume ndị metụtara ofufe na ozi anyị bụ ihe ndị dị mkpa, na-achọ ‘oge a kara aka.’ (Ekli. 3:1) Anyị chọrọ inweta abamuru kasịnụ ná ndokwa ndị e mere maka ijere Chineke ozi. Nzukọ ọgbakọ na nzukọ maka ozi kwesịrị ịmalite kpọmkwem n’oge a kara aka. Jehova adịghị eme ihe omume ya n’azụ oge. (Hab. 2:3) Ọ̀ dị mkpa ka anyị meziwanye ihe n’akụkụ a? Ndị mmadụ pụrụ ịbụ ndị e gburu oge n’ụzọ a na-apụghị izere ezere site n’oge ruo n’oge. Ma site n’ịhazi ihe nke ọma, anyị agaghị adị na-eme ihe n’azụ oge mgbe nile, na-erute mgbe abụ na ekpere mmeghe nke nzukọ gasịrị ma ọ bụ mgbe e mesịworo ndokwa maka ozi ubi. Tụlee ụzọ ndị bara uru isi zụlite àgwà ndị ka mma bụ́ ndị ga-eme ka anyị na-abịa n’oge maka ihe omume ime mmụọ anyị nile.—Lee Ụlọ Nche nke June 15, 1990, peeji nke 29.
25 min: “Nzaghachi Na-ekpo Ọkụ!”b Na paragraf nke 1, kwee ka ọgbakọ kwutụ okwu banyere vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? Malitezie ntụle ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ajụjụ nke ọ bụla e depụtara na paragraf nke 2-7. Na June anyị ga-atụle vidio bụ́ Our Whole Association of Brothers. N’ọnọdụ ya, tụlee “Nzukọ Jehova Dị Anyị Mkpa,” bụ́ nke sitere n’Ụlọ Nche nke January 1, 2000, peeji nke 30-31.
Abụ nke 191 nke ekpere mmechi.
Izu Na-amalite April 29
Abụ nke 162
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka April.
20 min: “Nkwusa Alaeze Na-enye Aka Azọpụta Ndụ!”c Mee ka ndị na-ege ntị kwuo otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ si daba adaba.
15 min: Tụlee “Nọgide Na-erite Uru site n’Ụlọ Nche na Teta!” Mesie ike mkpa ọ dị iwulite mmasị e gosiri na ịmalite ọmụmụ Bible.
Abụ nke 28 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 6
Abụ nke 141
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
10 min: Ime Atụmatụ Maka Oge Ezumike Tupu Oge Eruo. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Kọwapụta ihe omume ndị a na-emekarị atụmatụ ha maka oge ezumike: ịga mgbakọ, ịsụ ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ karịa, imeziwanye ihe n’ụlọ, na ikekwe ịga ezumike ma ọ bụ ịtụrụ ndụ. Kpọọ mmadụ ole na ole ka ha kọọ atụmatụ ndị ha meworo maka oge ezumike na otú ha ga-esi jide n’aka na ha agaghị eleghara ọmụmụ ihe ezinụlọ ha, nzukọ ọgbakọ, na ozi ubi, anya, ọbụna ma ọ bụrụ na ha emee njem. Ọ bụrụ na ọgbakọ nwere ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ na ya, maa ọkwa ndokwa ndị a na-eme iji rụzuo ya n’oge ezumike. Chetara mmadụ nile ịhụ na onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nwetara akụkọ ozi ubi ha ná ngwụsị ọnwa ọ bụla, n’agbanyeghị ma hà nọ n’ụlọ ma ha mere njem.
25 min: “Ezinụlọ Ndị Siri Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ—E Si Aṅaa Enwe Ha?”d Mgbe ị tụlesịrị isiokwu a, kọọ ahụmahụ ụfọdụ sitere n’Ụlọ Nche nke February 15, 1999, peeji nke 10-12.
Abụ nke 17 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.