Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/03 p. 1
  • Ndị E Nyefere Ozi Ọma ahụ n’Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị E Nyefere Ozi Ọma ahụ n’Aka
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Gịnị Ka Ị Na-ebute Ụzọ?
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • E Nwere Ozi Ọma Mmadụ Niile Kwesịrị Ịnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Olee Ụzọ Oziọma ahụ Pụrụ Isi Baara Gị Uru?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 5/03 p. 1

Ndị E Nyefere Ozi Ọma ahụ n’Aka

1 Lee ihe ùgwù anyị nwere ịbụ ndị e nyefere ozi ọma nke Chineke n’aka! (1 Tesa. 2:4) Ọ bụ ezie na ụfọdụ pụrụ ịjụ ozi a nwere mmetụta dị ike, a na-adọta ndị nwere obi eziokwu n’ebe ọ dị dị ka ihe na-esi ísì ụtọ. (2 Kọr. 2:14-16) Ọ pụtara nzọpụta nye ndị nabatara ozi ọma ahụ ma rube isi na ya. (Rom 1:16) Olee ihe anyị kwesịrị iji ihe a e nyefere anyị n’aka mee?

2 Jizọs na Ndịozi Ya: Jizọs butere nkwusa nke ozi ọma ahụ ụzọ. (Luk 4:18, 43) Ọbụna mgbe ike gwụrụ ya, mgbe agụụ na-agụkwa ya, ịhụnanya o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ na ojiji o ji ozi ahụ kpọrọ ihe kpaliri ya ịkọrọ ya ndị ọzọ. (Mak 6:30-34) Site n’okwu na omume, o mesiri ịdị mkpa nke ọrụ nkwusa Alaeze ahụ ike n’uche ndị na-eso ụzọ ya.—Mat. 28:18-20; Mak 13:10.

3 N’iṅomi Jizọs, ndịozi ahụ ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi Alaeze ahụ. Ọbụna mgbe a pịara ha ihe ma nye ha iwu ka ha kwụsị ime nkwusa, “ha nọgidere n’esepụghị aka na-ezi ihe ma na-akpọsa ozi ọma” ahụ. (Ọrụ 5:40-42) Pọl onyeozi rụsiri ọrụ a ike. (1 Kọr. 15:9, 10; Kọl. 1:29) O ji ihe ùgwù nke ikwusa ozi ọma ahụ tụnyere ụgwọ o ji ndị mmadụ ibe ya, ma dị njikere ịhapụ inwe ntụsara ahụ́ nke ya iji jezuo ozi ya.—Ọrụ 20:24; Rom 1:14-16.

4 Ihe Ùgwù Anyị Nwere Taa: Inwe ekele maka ọrụ a dị nsọ e nyere anyị ga-akpali anyị ịchọ ụzọ isi mụbaa òkè anyị na-ekere n’ọrụ nkwusa ahụ. (Rom 15:16) Edward, bụ́ onye na-anọ n’oche nkwagharị mgbe nile, na-anọdụ n’ọnụ ụzọ mbata nke otu ụlọ oriri na-agwa ndị na-abịa ebe ahụ okwu banyere okwukwe ya. Otú ọ dị, ebe o nwere ọchịchọ ịmụba ozi ya, o wunyere otu ihe pụrụ iche n’elu ụgbọala pikọp ya ma jiri ya sụọ ụzọ ruo ọtụtụ afọ, gaa ọtụtụ puku kilomita ka ọ na-eme nke ahụ. Dị ka Edward, ọtụtụ ndị taa edozigharịwo ọnọdụ ha iji kerekwuo òkè n’izisa ozi ọma ahụ.

5 N’iṅomi Jizọs na ndịozi ya, ka anyị onwe anyị taa na-ebute ọrụ ime nkwusa ahụ ụzọ ná ndụ anyị mgbe nile. Site n’ime otú ahụ, anyị na-egosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ nakwa ekele anyị nwere maka ozi ọma ahụ e nyefere anyị n’aka.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya