Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/03 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite August 11
  • Izu Na-amalite August 18
  • Izu Na-amalite August 25
  • Izu Na-amalite September 1
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 8/03 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite August 11

Abụ nke 101

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ dịgasị iche nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke August 15 na Teta! nke September 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke September 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ụzọ a pụrụ isi zaghachi ndị pụrụ ịbụ ndị nkwụsị nkwurịta okwu bụ́ ndị na-asị “Eji m ọrụ n’aka.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 11.

15 min: “Ṅomie Ịdị Mma Jehova.”a Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ dị mkpirikpi nke na-egosi otú igosipụta ịdị mma siworo megheere ha ụzọ ịgba àmà. Jaa ọgbakọ mma maka mgbalị ndị ha meworo inyere ndị kwere ekwe ibe ha aka.

20 min: “Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ.”b Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Gwa otu ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ abụọ ka ha kwuo ngọzi ndị ha nwetaworo n’ọrụ ọsụ ụzọ. Kwuo na onye ọ bụla nke nwere mmasị n’ịsụ ụzọ pụrụ inweta akwụkwọ ndejupụta n’aka odeakwụkwọ.

Abụ nke 11 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 18

Abụ nke 82

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi maka ọkara nke mbụ nke ọnwa August.

15 min: “Ọrụ nke Na-enye Ume Ọhụrụ.”c Mee ndokwa tupu oge eruo ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo otú ozi Ndị Kraịst si enye ha ume ọhụrụ.

20 min: “Ka Anyị Na-edebe Ebe Anyị Na-anọ Efe Ofufe n’Ọnọdụ Dị Mma.”d (Paragraf nke 1-5) Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Mgbe a na-atụle paragraf nke 3 na nke 4, tụleghachi ndokwa ndị e mere n’ọgbakọ unu maka idebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha. Dọrọ uche gaa n’ihe ọ bụla chọrọ nlebara anya. Jaa ọgbakọ mma maka mgbalị ndị ha na-eme ịhụ na ha nwere ebe dị mma maka ezi ofufe.

Abụ nke 114 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 25

Abụ nke 175

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 eme ihe, mee ihe ngosi abụọ nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke September 1 na Teta! nke September 8. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke September 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, e kwesịrị inyefekọta magazin abụọ ahụ, ọ bụ ezie na ọ bụ nanị otu ka a ga-ekwu okwu na ya. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ebe nne ma ọ bụ nna na nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwanyị dị afọ iri na ụma na-amụgharị ụzọ ha ga-esi enyefe magazin n’ozi. Ha eburu ụzọ tụleghachi n’ụzọ dị nkenke, aro nke ọ bụla a tụrụ maka ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ, tupu ha emee ihe ngosi ya.

15 min: “Nwee Uche Zuru Okè Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso.”e Mgbe a na-atụle paragraf nke 3 na nke 4, kpọọ ndị nkwusa ka ha kọọ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị ha na-achụso ugbu a. Kwuokwa okwu n’ihe dị n’akwụkwọ Fee Chineke Ofufe, peeji nke 176.

20 min: Nwee Nkwuwa Okwu Iji Na-eme Nkwusa. (1 Tesa. 2:2) Okwu nke nwere akụkụ ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Kọọ ihe mere ọtụtụ mmadụ ji atụ ụjọ iji ozi Alaeze ahụ gakwuru ndị ọzọ. Ọ dị otú a ọbụna n’ebe ndị jeworo ozi ruo ọtụtụ afọ nọ. Kọọ ụfọdụ n’ime ahụmahụ ndị dị n’Ụlọ Nche nke December 1, 1999, peeji nke 25; Ụlọ Nche nke December 15, 1999, peeji nke 25; na Ụlọ Nche nke April 1, 1996, peeji nke 31. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha siworo nwee ike inwe nkwuwa okwu iji kwusaa ozi ọma ahụ n’oge ndị ụjọ tụrụ ha. Jiri agbamume e nyere inweta ike n’aka Jehova, bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche December 15, 1999, peeji nke 23-24, mechie.

Abụ nke 125 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 1

Abụ nke 84

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi maka ọkara nke abụọ nke ọnwa August. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa September.

10 min: Mkpa ọgbakọ.

12 min: Ị̀ Na-emezu Nkwa I Kwere Ịlaghachi? Okwu nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke September 15, 1999, peeji nke 10-11, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Ụzọ Ndị Ọzọ Isi Mezuo Nkwa Anyị.” Mgbe anyị hụrụ ndị nwere mmasị n’ozi anyị, anyị na-emekarị ndokwa ịga n’ihu ná mkparịta ụka ahụ n’oge ọzọ. Ànyị na-eme dị ka anyị kwere ná nkwa site n’ịlaghachi? Tụleghachi ụkpụrụ Bible ndị kwesịrị ịkwali anyị imezu nkwa anyị. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị na-egosi ngọzi ndị ha nwetaworo n’ihi ịlaghachi kpọmkwem n’oge ha kwere nkwa ịlaghachi.

18 min: “Ka Anyị Na-edebe Ebe Anyị Na-anọ Efe Ofufe n’Ọnọdụ Dị Mma.”f (Paragraf nke 6-12) Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Kwusie okwu ike banyere mkpa ọ dị ịhụ na e debere Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ọnọdụ dị mma, na-eme ka ihe ndị dị n’igbe dị na peeji nke 5 pụta ìhè. N’ụzọ dị mkpirikpi, kwuo okwu banyere otú Ụlọ Nzukọ Alaeze unu dị, kwuokwa atụmatụ ọ bụla e mere iji rụzie ma ọ bụ mee ka ihe ka mma na ya.

Abụ nke 41 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

f Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya