Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/04 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite December 13
  • Izu Na-amalite December 20
  • Izu Na-amalite December 27
  • Izu Na-amalite January 3
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 12/04 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite December 13

Abụ nke 47

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ na Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa December. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge iji kwadebe maka ịtụle ya n’izu na-esonụ. Kọwapụta ndokwa pụrụ iche e mere maka ozi ubi na December 25 nakwa na January 1. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ọ dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi chee Ụlọ Nche nke December 15 na Teta! nke January 8 n’ihu mmadụ. Mgbe a na-enyefe Teta! nke January 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ iche ihe n’ihu ndị ọzọ dabara n’ókèala unu mee ihe. Na nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche a pụrụ isi mee ihe banyere okwu na-egbochi nkwurịta okwu bụ́ “Amataworị m ọrụ unu nke ọma.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 12.

15 min: “Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi—Ọnụ Ụzọ Buru Ibu nke Na-eduga n’Ịrụ Ọrụ.” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Webata ihe ndị e kwuru na 2004 Yearbook, peeji nke 239-240. Kwuo okwu banyere nzukọ a na-enwe maka ndị nwere mmasị ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi bụ́ nke a na-enwe ná mgbakọ sekit. Gbaa ndị ruru eru ume ka ha gaa nzukọ a.

20 min: “Ịgbara Ndị Ikwu Àmà—n’Ụzọ Dị Aṅaa?”a Jiri ajụjụ ndị e depụtara mee ihe. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ná mkpirikpi, ụzọ ha siworo nwee ike ịkpali mmasị ndị ikwu ha na ịgbara ha àmà.

Abụ nke 17 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 20

Abụ nke 68

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: “Ndokwa Ọhụrụ Maka Ịtụleghachi Usoro Ihe Omume Mgbakọ.” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, nke dabeere n’isiokwu dị na peeji nke 4. Kwuo ụbọchị ndị unu ga-enwe mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ọzọ ma ọ bụrụ na a matawo ha. Ndị chọrọ ka e mee ha baptizim kwesịrị ime ka onyeisi oche ndị nlekọta mara nke a n’ezi oge.

25 min: “Rite Uru Site na Vidio Bụ́ No Blood—Medicine Meets the Challenge.” Mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, nke dabeere na vidio bụ́ No Blood, na-eji ajụjụ ndị e depụtara na peeji nke 8 eme ihe. Mgbe e mesịrị, gụọ paragraf ikpeazụ. Gbaa mmadụ nile ume ịbịa nzukọ n’izu ọzọ maka ntụle nke ihe ọhụrụ e wepụtara iji nyere anyị aka izere ọbara. Ọ bụrụ na ọnọdụ agaghị ekwe ka a tụlee vidio ahụ, jiri isiokwu bụ́ Nduzi Chineke Banyere Ọbara dochie anya ya. Okwu okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke June 15, 2004, peeji nke 19-23, paragraf nke 1-15.

Abụ nke 50 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite December 27

Abụ nke 36

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa December. N’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ọ dabara n’ókèala unu) eme ihe, mee ihe ngosi nke ụzọ isi chee Ụlọ Nche January 1 ma ọ bụ Teta! nke January 8 n’ihu mmadụ. Ọ bụrụ na ị na-enyefe Teta! nke January 8, jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya mee ihe.

25 min: Irube Isi n’Iwu Chineke Bụ́ Ka E Zere Ọbara. Okwu okenye ga-ekwu, na-eji okwu a ga-agụ agụ nke alaka ụlọ ọrụ wetara na-eme ihe. Kwuo ná mmalite na a gaghị edejupụta kaadị DPA ahụ taa. Mgbe ọ na-agụ okwu ahụ, ọkà okwu pụrụ ịgbakwụnye okwu ndị dị mkpirikpi iji mesie isi ihe ụfọdụ ike, ma o kwesịghị ịgbakwụnye ihe atụ ma ọ bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ n’okwu ahụ. A pụrụ ịgụ ma ọ bụ hota akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’okwu ahụ ruo ókè oge kwere mee. N’oge ndị kwesịrị ekwesị, dọrọ uche gaa n’okwu ndị dị n’igbe bụ́ “Ihe Ọhụrụ E Wepụtara Iji Nyere Anyị Aka Izere Ọbara.” Odeakwụkwọ kwesịrị inye ndị nkwusa nile e mere baptizim kaadị DPA na akwụkwọ “Ntụziaka Maka Idejupụta Kaadị DPA” iji nyere ha aka ịgbaso ihe a na-ekwu mgbe a na-eme ihe omume a. Odeakwụkwọ kwesịkwara ịhụ na e nwere Identity Card zuru ezu.

10 min: Òkè Akọ na Uche Gị Na-ekere. Okwu okenye ga-ekwu, nke dabeere n’Ụlọ Nche nke June 15, 2004, peeji nke 23-24, paragraf nke 16-19. Mesie ya ike na mkpebi anyị na-eche ihu n’ihe ndị metụtara akọ na uche abụghị obere okwu, ebe ọ bụ na ha metụtara mmekọrịta anyị na Jehova.

Abụ nke 8 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 3

Abụ nke 27

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo akwụkwọ ndị a ga-enyefe na January.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 4.” Mgbe e kwusịrị okwu mmeghe nke na-agaghị akarị otu minit, bụ́ nke ga-adabere na paragraf nke mbụ, mee ihe ngosi nke ga-ewe minit ise dabere na paragraf nke 2-3, bụ́ nke na-egosi ebe onye na-eduzi ọmụmụ Bible na-egosi onye ọ na-amụrụ ihe otú e si akwadebe maka ọmụmụ ihe. Jiri otu paragraf n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ na broshụọ Na-achọ mee ihe n’ihe ngosi ahụ. Jiri ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 2-5 sochie ya, na-eme ka isi ihe ndị dị n’ihe ngosi ahụ pụta ìhè.

Abụ nke 79 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya