Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite October 10
Abụ nke 17
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa October. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke October 15 na Teta! nke November 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke November 8, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. Mgbe e mesịrị nke ọ bụla n’ime ihe ngosi ndị ahụ, mee ka ihe ụfọdụ dị mma e gosiri na ya pụta ìhè. Tụkwasị na nke ahụ, dọrọ uche gaa n’isiokwu ndị ọzọ dị n’ime magazin ndị ahụ bụ́ ndị pụrụ ịdọrọ mmasị ndị bi n’ókèala unu.
15 min: Ì Nwere Àgwà Dị Mma Ma A Bịa n’Ịgụ Ihe? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 21-26. Olee akwụkwọ ndị anyị pụrụ ịgụnye ná ndị anyị ga na-agụchi anya? (p. 21, igbe) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-agụ akwụkwọ ndị òtù ohu ahụ wepụtara? (p.23, para. 2) Olee isi ihe na-eme ka a nọgide na-enwe usoro ihe omume dị mma nke ịgụ ihe? (p. 26, para. 3-4) Olee otú i si ewepụta oge iji na-agụ magazin Ụlọ Nche na Teta!? Olee otú nke a siworo baara gị uru?
20 min: “Nọgide Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu.”a Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ọnọdụ ndị ọ pụrụ isiri mmadụ ike na ha ịkata obi ịgba àmà. Olee ihe nyewooro ha aka ime otú ahụ?
Abụ nke 78 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 17
Abụ nke 36
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Jiri Ozi Alaeze Anyị nke November 2004, peeji nke 4, tụleghachi otu isi ihe ma ọ bụ abụọ banyere otú a pụrụ isi jiri Akwụkwọ Nsọ mee ihe nke ọma mgbe a na-eduzi ọmụmụ Bible.
15 min: Zere Nsogbu A Na-enweta n’Intanet. Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere na Teta! nke December 8, 2004, peeji nke 16-19.
20 min: “Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Obiọma.”b Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú anyị pụrụ isi gosi ndị ọzọ obiọma mgbe anyị nọ n’ozi ubi. N’isiokwu ndị ka ga-apụta n’Ozi Alaeze Anyị, a ga-atụle ụzọ ndị ọzọ anyị pụrụ isi gosi mmasị n’ebe ndị anyị na-ekwusara ozi ọma nọ.
Abụ nke 2 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 24
Abụ nke 68
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri otu n’ime aro ndị a tụrụ n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, ma ọ bụ ụzọ ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee akwụkwọ a ga-eji jee ozi n’ọnwa November.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, p. 8, para. 5.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: Igosipụta Ụkpụrụ Chineke n’Uwe na Ejiji Anyị. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke okenye ga-ekwu. Ọ ga-adabere n’Ụlọ Nche nke August 1, 2002, peeji nke 17-19. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú anyị iji ejiji dị mma pụrụ isi meghee ụzọ maka ịgba àmà.
Abụ nke 153 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite October 31
Abụ nke 209
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa October. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke November 1 na Teta! nke November 8. Mgbe a na-enyefe Teta! nke November 8, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, tọọ ntọala maka ịgaghachi site n’ịdọrọ uche gaa n’igbe bụ́ “N’ime Mbipụta Anyị Ọzọ.”—Lee Ozi Alaeze Anyị nke October 1998, p. 8, para. 7-8.
15 min: Na-akpali Mmasị Ndị Mmadụ Mgbe Ị Na-ewegara Ha Magazin. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’Ozi Alaeze Anyị nke May 2005, peeji nke 8. Olee otú anyị pụrụ isi nweta onye anyị ga na-ewegara magazin mgbe nile? (para. 1) Olee otú anyị pụrụ isi na-akwadebe okwu ga-adabere n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke anyị ga-ekwu mgbe ọ bụla anyị gara na nke ya? (para. 3) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ọ ghara ịbụ nanị ọgụgụ ka anyị ga-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ anyị họọrọ? (para. 4) Olee otú onye anyị na-ewegara magazin mgbe nile pụrụ isi ghọọ onye anyị na-eduziri ọmụmụ Bible? (para. 5) Gụnye ihe ngosi nke ebe onye nkwusa so onye ọ na-ewegara magazin mgbe nile na-enwe mkparịta ụka dabeere n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ.
20 min: Ndị Ntorobịa Ndị Bụ́ A Kwaa A Kwụrụ Ma Na-akwanyekwara Mmadụ Ùgwù. Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke September 15, 2002, peeji nke 23-24, n’okpuru isiokwu bụ́ “Jiri Nkwanye Ùgwù Jụ Ya.” Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye na-eto eto ma ọ bụ abụọ kwuo ihe ịma aka ndị ha nwetaworo n’ụlọ akwụkwọ na ihe nyeere ha aka imeri ha.
Abụ nke 222 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 7
Abụ nke 39
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
20 min: Mee Ka Otú I Si Ege Ntị ná Nzukọ Ka Mma. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke September 15, 2002, peeji nke 12-14, paragraf nke 11-14. Tụlee aro ndị a tụrụ, ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe nyewooro ha aka ịdị na-erite uru nke ọma ná nzukọ ọgbakọ.
20 min: “Zụlite Nkà n’Iso Ndị Ọzọ Atụgharị Uche.”c Gwa ndị nkwusa ole na ole ị họọrọ ka ha kwuo otú ha siworo kọwaara ndị si ebe dịgasị iche iche, bụ́ ndị nọ n’ókèala unu, ihe n’ụzọ mere ka ha chee echiche.
Abụ nke 50 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.