Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite na December 26, 2005. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu November 7 ruo December 26, 2005. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji hụ na ndụmọdụ anyị na-enye ‘dabeere n’ịhụnanya’? (Faịl. 9) [be-IB p. 266]
2. Olee ụzọ ndị anyị pụrụ isi ‘dụsie ọdụ ike site n’ozizi na-enye ezi ndụ’? (Taị. 1:9) [be-IB p. 267 para. 1-2]
3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mee ka okwu anyị bụrụ nke na-agba ume, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee nke a? [be-IB p. 268 para. 1-3, igbe]
4. Dị ka Mozis mere, olee otú anyị inyere ndị ọzọ aka icheta ihe Jehova mewooro ndị ya ga-esi mee ka e nwee obi ike? (Deut. 3:28; 31:1-8) [be-IB p. 268 para. 5–p. 269 para. 2]
5. N’ihi gịnị ka iji obi ụtọ na-ekwu banyere ihe ndị Jehova na-eme ugbu a na ihe ndị ọ ga-eme n’ọdịnihu ga-eji bụrụ ihe na-agba ume nye ndị na-ege anyị ntị? [be-IB p. 270-271]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee otú anyị pụrụ isi gbaa ndị kwere ekwe ibe anyị ume? [w03-IB 5/15 p. 22 para. 5–p. 23 para. 2]
7. Olee ụdị inye ihe na-amasị Chineke? [w03-IB 6/1 p. 5 para. 2]
8. Olee otú mmadụ na-esi amụta ịhụ n’anya? [w03-IB 7/1 p. 4 para. 1; p. 5 para. 4]
9. Olee ụzọ ndị dị irè anyị pụrụ isi na-emere ndị ọzọ ihe ọma? (Gal. 6:9, 10) [w03-IB 7/15 p. 7 para. 2-3]
10. Kwuo ụkpụrụ nduzi atọ dabeere na Bible bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka ime mkpebi ndị amamihe dị na ha. [w03-IB 10/15 p. 4, 5]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Na Jehova ekweghị ka Devid rụọ ụlọ nsọ ahụ ọ̀ na-egosi na Jehova akwadoghị agha ndị ahụ Devid lụrụ? (1 Ihe 22:6-10)
12. N’ekpere Solomọn kpere mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ ahụ nye, olee otú o si gosi na Jehova na-eleba anya, ọ bụghị nanị ná mkpa ndị ohu ya dị ka otu ìgwè kamakwa na ọ na-eleba anya ná mkpa onye nke ọ bụla na-atụ egwu ya? (2 Ihe 6:29, 30)
13. Olee ihe ndị bụ́ “mkpi” ahụ a kpọtụrụ aha ná 2 Ihe E Mere 11:15?
14. Ebe ọ bụ na Beasha malitere ịchị “n’afọ nke atọ nke Esa” ma chịa nanị afọ 24, olee otú anyị pụrụ isi mee ka nke a kwekọọ n’ihe e kwuru bụ́ na Beasha bịara “imegide Juda” “n’afọ nke iri atọ na isii nke Eze Esa”? (1 Eze 15:33; 2 Ihe 16:1)
15. Olee otú 2 Ihe E Mere 20:22, 23 si kọwaa nnọọ n’ụzọ doro anya, ihe gaje ime ụwa Setan?