Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
IHE ỊRỊBA AMA: Otu ọnwa ma ọ bụ abụọ ọgbakọ unu gasịrị Mgbakọ Distrikti “Irubere Chineke Isi,” e kwesịrị iwepụta minit 15 ruo 20 ná Nzukọ Ije Ozi (ikekwe oge e nyere maka ịtụle mkpa ọgbakọ) iji tụleghachi isi ihe ndị e kwuru ná mgbakọ ahụ bụ́ ndị ndị nkwusa chọpụtaworo na ọ na-abara ha uru n’ozi ubi. Akụkụ a pụrụ iche ná Nzukọ Ije Ozi ga-enye anyị ohere ịkọwa otú anyị si na-eji ihe ndị anyị mụtara ná mgbakọ distrikti na-eme ihe nakwa otú o siworo na-enyere anyị aka ịrụpụtakwu ihe n’ozi anyị.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke September 2005, p. 2.
Izu Na-amalite na December 12
Abụ nke 32
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa December. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke December 15 na Teta! nke January-March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. Mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla, kwuo otú a pụrụ isi webata akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ dị mfe mgbe a na-enyefe magazin ndị ahụ.
Minit 15: “Ụlọ Akwụkwọ nke Na-enyere Anyị Aka Itinye Ihe Ndị Anyị Na-amụta n’Ọrụ.” Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Gụnye ihe e kwuru n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke October 2005.
Minit 20: “Ozizi nke Na-eduba ná Ndụ.”a Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ma ọ bụ abụọ kwuo otú ha siworo rite uru n’ihe Chineke na-ezi ha.
Abụ nke 101 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na December 19
Abụ nke 160
Minit 5: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo ndokwa pụrụ iche e mere maka ije ozi ubi na December 25 nakwa na January 1. Chetara mmadụ nile ka ha jiri Teta! nke January-March 2006 bịa Nzukọ Ije Ozi nke izu ọzọ.
Minit 15: “Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịdị Na-eme Mgbanwe.”b Gụnye ihe ngosi dị mkpirikpi nke na-egosi otú onye nkwusa pụrụ isi gbanwee okwu ya mgbe ọ na-ezi ozi ọma dabere n’ihe onye nwe ụlọ kwuru.
Minit 25: “Nwa Gị Ọ̀ Pụrụ Ime Mkpebi Rijuru Afọ?”c Ọ bụ okenye ga-ekwu ya. Gwa nwanna nwoke ma agụ ihe nke ọma ka ọ gụpụta paragraf ndị ahụ. Tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile e zoro aka na ha. Mgbe a tụlesịrị paragraf nke 2, gosi ọdịiche dị n’etiti mmadụ abụọ ahụ na-eto eto e kwuru banyere ha na paragraf nke 16-17 nakwa n’igbe dị na peeji nke 17 nke Ụlọ Nche June 15, 1991. Ná mmechi, gbaa ndị nne na nna ume ịtụleghachi isiokwu ahụ dum dị ka o si dị n’Ụlọ Nche ahụ na iso ụmụ ha kparịta banyere iwu ndị dabeere na Bible banyere ọbara, na-eme ka ha nwee ike iji obi ike kwupụta ihe ndị ha kweere. Ndị isi ezinụlọ kwesịrị ijide n’aka na nwa ha ọ bụla e mere baptizim na-eji kaadị DPA nakwa na nwa ha ọ bụla a na-emebeghị baptizim na-eji kaadị Identity Card. Mgbe ọ bụla e nyere mmadụ àkwà n’ụlọ ọgwụ, ihe a na-ekwu abụrụ na a ga-amịnye ya ọbara, ndị okenye kwesịrị ịkpọtụrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ nke nọ n’ógbè unu maka enyemaka.
Abụ nke 56 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na December 26
Abụ nke 85
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa December. Ọ bụrụ na a ga-agbanwe oge ọgbakọ unu ji amụ ihe maka afọ ọhụrụ a, mee ka ọgbakọ mara oge ọhụrụ ahụ. Kwuo akwụkwọ a ga-eji jee ozi na January, kwuokwa ebe a pụrụ ịhụ ụzọ ndị a tụrụ aro isi nyefee ya.
Minit 15: Mkpa ọgbakọ.
Minit 20: Ihe Ọhụrụ Ndị A Ga Na-etinye na Teta! Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Kwuo mgbanwe ndị e mere na Teta! bụ́ ndị a mara ọkwa ha n’Ozi Alaeze Anyị nke March 2005, peeji nke 1, paragraf nke 5-6. Gụnye ihe ndị e kwuru n’isiokwu bụ́ “Nye Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị” bụ́ nke dị na Teta! nke January-March 2006, peeji nke 3-4. Nye ihe atụ nke otú magazin ahụ si eduru nnọọ ndị na-agụ ya aga na Bible. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo okwu banyere ihe ọhụrụ ahụ e tinyere na Teta! bụ́ nke dị na peeji nke 31. Anyị ga-anọgide na-enyefekọta Ụlọ Nche na Teta! ọnụ n’oge mbụ anyị zutere mmadụ. Ọ bụ nanị otu Teta! ka anyị ga na-enyefe ndị anyị na-ewegara magazin mgbe nile nakwa ndị ọzọ na-anatakarị magazin anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke January 1 na Teta! nke January-March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’Ozi Alaeze Anyị nke January, a ga-enwe ụzọ ọzọ a tụrụ aro isi nyefee Teta! nke January-March. A ga-esi n’otu n’ime isiokwu ndị dị n’ime ya nweta ya. A pụrụ iji ụzọ atọ ahụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe n’ọnwa ahụ dum.
Abụ nke 222 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na January 2
Abụ nke 5
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Minit 15: “Ị̀ Na-eji Mpempe Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Maka Nzukọ Ọgbakọ Eme Ihe?” Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ezi ihe iji mpempe akwụkwọ a eme ihe na-arụpụta. Gụnye ihe ngosi dị mkpirikpi nke ebe onye nkwusa ji mpempe akwụkwọ a na-agba onye nwere mmasị ume ịbịa nzukọ ọgbakọ.
Minit 20: “Jiri Akwụkwọ Anyị Ndị Dabeere na Bible Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya.”d Gụnye ihe e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2002, peeji nke 1.
Abụ nke 109 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.