Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite na January 14
Abụ nke 41
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa January. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche January 1 na Teta! January-March. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro nke mbụ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi.
Nkeji 15: “Jiri Oge I Ji Gaa Ozi Ọma Mee Ihe Nke Ọma.”a Gbaa otu nwanna nwoke bụ́ ezi ihe nlereanya n’iduzi nzukọ maka ozi ubi ajụjụ ọnụ. Olee ihe ndị ọ na-eme iji kwadebe maka iduzi nzukọ maka ozi ubi na iji mee ka ụmụnna jiri oge ha ji gaa ozi ọma mee ihe nke ọma?
Nkeji 20: ‘Ka Okwu Unu Bụrụ Ihe E Ji Nnu Mee Ka Ọ Dị Ụtọ Mgbe Niile.’b Mgbe a na-atụle paragraf nke 2, gụọ Jọn 4:7-15, 39.
Abụ nke 85
Izu Na-amalite na January 21
Abụ nke 215
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na February, meekwa ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee otu n’ime ha. Gbaa mmadụ niile ume ka ha lee vidio bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights iji kwadebe maka ntụle a ga-atụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke February 4.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 25: ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ.’c (Para. 1-10) Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Gbaa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ime otu afọ gara aga n’agbanyeghị na ọrụ ha anaghị enye ha ohere ma ọ bụ na ha nwere nkwarụ. Olee otú ha si nwee ike ime ya? Olee ihe ndị nyere ha ọṅụ? Mgbe a na-atụle paragraf nke 7, kwuo nzukọ maka ozi ubi ndị a haziri maka ọnwa March, April, na May.
Abụ nke 177
Izu Na-amalite na January 28
Abụ nke 52
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa January. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Gị na ndị na-ege ntị tụlee Ụlọ Nche nke February 1 na Teta! nke January-March. Mgbe i kwusịrị isi ihe magazin nke ọ bụla n’ime ha na-ekwu, jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu na ihe mere ha ji chee otú ahụ. Jụọ ndị na-ege ntị kpọmkwem ihe ndị dị n’isiokwu ndị ha chọrọ iji enyefe magazin ndị ahụ. Olee ajụjụ e nwere ike ịjụ iji malite nkwurịta okwu? Olee amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu ahụ e nweziri ike ịgụ? Olee otú e nwere ike isi jikọta ihe amaokwu ahụ kwuru na isiokwu ahụ? Jiri aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi nyefee magazin nke ọ bụla. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro nke abụọ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi.
Nkeji 20: ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma Ahụ.’d (Para. 11-17) Mgbe a na-atụle paragraf nke 14, kee ndị na-ege ntị akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche maka Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ bụrụ na unu enwetala ya. Kwuo ndokwa ọgbakọ unu mere iji hụ na e nyere mmadụ niile bi n’ókèala unu akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ.
Nkeji 15: “Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ịghọ Ndị Nkwusa nke Ozi Ọma Alaeze.”e Dabere n’oge e nwere, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọwaa amaokwu Baịbụl ndị dị n’isiokwu ahụ.
Abụ nke 22
Izu Na-amalite na February 4
Abụ nke 161
Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee Igbe Ajụjụ.
Nkeji 10: Ị̀ Na-eji Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị Atụle Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-adabere n’okwu mmalite nke Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2008. Kwuo uru ọ bara ịdị na-ewepụta oge kwa ụbọchị iji tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na nkọwa ha. Jụọ ndị na-ege ntị ndokwa ha mere maka ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị na uru ndị ha riterela. E nwere ike ibu ụzọ gwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’oge ka ha kwadebe ihe ha ga-ekwu. Tụletụ isiokwu dịịrị afọ 2008.
Nkeji 25: “Ị̀ Na-eyigharị Ya?” Ọ bụ okenye ga-eme ya. Malite ozugbo jụwa ndị na-ege ntị ajụjụ ndị dị n’isiokwu a, bụ́ nke dabeere na vidio bụ́ Patient Needs and Rights. Ná mmechi, gụọ paragraf ikpeazụ ma gbaa mmadụ niile ume ka ha gụọ isiokwu ndị ahụ e zoro aka na ha bụ́ ndị dị n’Ụlọ Nche na n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo otú mmadụ nwere ike isi jiri ihe e dere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke December 2006 kpebie ma ọ̀ ga-achọ ka e jiri nke ọ bụla n’ime ihe ndị e si n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ọbara nweta gwọọ ya ọrịa ma o mebeghị otú ahụ. Kwuokwa otú mmadụ nwere ike isi jiri ihe e dere n’ihe ntinye ahụ kpebie otú a ga-esi gwọọ ya ma deba ihe ndị o kpebiri na kaadị DPA. Ndị dejupụtacharala kaadị DPA ha, a bịanyechaakwa aka na ha nwere ike ịtụleghachi mkpebi ndị ha meburu, ya bụrụkwa na ọ dị mkpa, ha edejupụta ọzọ. Ma ọ bụkwanụ unu atụlee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche nke June 15, 2001.
Abụ nke 4
[Ihe odide ala ala peeji]
a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
d Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.
e Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.