Nyere Ndị Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ịghọ Ndị Nkwusa nke Ozi Ọma Alaeze
1 Ọrụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, nke e dekọrọ na Matiu 28:19, 20, abụtụghị obere ọrụ. A gwara ndị na-eso ụzọ Kraịst ka ha mee ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, bụ́kwa ndị ga-emecha soro ha na-arụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. A ga-azụ ndị ọhụrụ bụ́ ndị ga-eso ná nkwusa zuru ụwa ọnụ a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’oge pụrụ iche a ga-enwe na mgbe ọgwụgwụ, bụ́ oge a anyị bi na ya taa.—Mat. 24:14.
2 Ndị anyị na-amụrụ Baịbụl nwere ike ịbụ ụmụ anyị ma ọ bụ ndị ọzọ nwere mmasị ka anyị mụọrọ ha Baịbụl. Anyị chọrọ nnọọ inyere ndị dị otú ahụ aka ịghọta na ọ bụ ọrụ dịịrị ha n’otu n’otu inyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst.—Luk 6:40.
3 Kwadebe Ha Ịgba Àmà: Gbaa ndị ị na-amụrụ ihe ume ka ha na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị ha na-amụta. Na-akọrọ ha ahụmahụ ndị na-agba ume i nwetara n’ozi ubi. Malite mgbe ụmụ gị ka dị obere kụziwere ha otú e si ekwusa ozi ọma nke ọma dabere n’otú ike ha hà. (Ọma 148:12, 13) Ka okwu ọnụ gị na ihe nlereanya gị na-egosi na i ji ozi gị kpọrọ ihe.—1 Tim. 1:12.
4 Ọ bụ naanị ndị na-ebi ndụ otú Jehova chọrọ ka ọ na-eji arụ ọrụ. Ọ bụ eziokwu na ndị nkwusa ọhụrụ agaghị ama ọtụtụ ihe dị ka ndị nkwusa nwerela ahụmahụ, ndị raarala onwe ha nye, e meekwa ha baptizim, ma ndị ọhụrụ ahụ aghaghị ikwere ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi ma nwee ike ịkọwara ha ndị ọzọ. (Lee Ndị A Haziri, p. 79-82.) Ha ga-ekewapụ onwe ha kpamkpam pụọ na “Babịlọn Ukwu ahụ” na n’ụdị ndọrọ ndọrọ ọchịchị niile ma na-abịachi ọmụmụ ihe ọgbakọ anya.—Mkpu. 18:2, 4; Jọn 17:16; Hib. 10:24, 25.
5 Ozugbo i chere na onye ị na-amụrụ Baịbụl eruola ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, i kwesịrị ịgwa onyeisi oche ndị nlekọta. Ọ ga-eme ndokwa ka gị na onye ahụ ị na-amụrụ ihe na ndị okenye abụọ zukọọ iji mara ma ò ruru eru iso ọgbakọ na-ekwusa ozi ọma Alaeze dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ị ga-enwezi ihe ùgwù nke ịzụkwu onye ahụ ị na-amụrụ Baịbụl ka gị na ya so na-aga ozi ọma.