Ntụleghachi nke Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na February 23, 2009. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri abụọ, ọ ga-adaberekwa n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu nke January 5 ruo February 23, 2009.
1. Olee otú Chineke pụrụ isiwo mee ka ìhè dị n’ụbọchị nke mbụ ma ọ bụrụ na e meghị ihe ndị na-enye ìhè ruo n’ụbọchị nke anọ? (Jen. 1:3, 16) [w04 1/1 p. 28 para. 5]
2. N’ihi gịnị ka Noa ji bụọ Kenan ọnụ? (Jen. 9:20-25) [w04 1/1 p. 31 para. 2]
3. Olee ụbọchị ọgbụgba ndụ Ebreham malitere ịdị irè, ogologo oge hakwa aṅaa ka ọ dịruru? (Jen. 12:1-4) [w04 1/15 p. 26 para. 4; w01 8/15 p. 17 para. 13]
4. Gịnị na-egosi na Nimrọd na ndị gbasoro nduzi ya erughị ihe mgbaru ọsọ ha nke bụ́ ‘imere onwe ha aha na-ewu ewu’? (Jen. 11:4) [w98 3/15 p. 25]
5. Ebe ọ bụ na a kpọrọ Lọt onye “ezi omume” na 2 Pita 2:7, olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere o ji kwuo ka ya nye ìgwè ahụ na-eme ihe rụrụ arụ ụmụ ya ndị nwaanyị? (Jen. 19:8) [w05 2/1 p. 26 para. 15-16; w04 1/15 p. 27 para. 3]
6. Gịnị ka ndị di na nwunye nwere ike ịmụta site n’otú Ebreham si dozie okwu dị n’etiti Hega na Sera banyere Ishmel? (Jen. 21:10-14; 1 Tesa. 2:13) [w06 4/15 p. 6 para. 5-8]
7. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta site ná mgbalị Elieza mere ime ihe otú Jehova si chọọ ya mgbe ọ na-achọtara Aịzik nwunye? (Jen. 24:14, 15, 17-19, 26, 27) [w97 1/1 p. 31 para. 2]
8. Nrọ Jekọb rọrọ ebe ọ hụrụ ka ndị mmụọ ozi ‘na-arịgo ma na-arịdata n’ubube,’ gịnị ka ọ pụtara? (Jen. 28:10-13) [w03 10/15 p. 29 para. 1; leekwa it-2-E p. 189]
9. Gịnị mere Rechel ji chọọ nnọọ inweta mkpụrụ Mandrek nke nwa Lia? (Jen. 30:14, 15) [w04 1/15 p. 28 para. 7]
10. Olee otú ihe atụ Daịna si gosi na ọ dị njọ iru nnọọ ihe ize ndụ nso? (Jen. 34:1, 2, 19) [w04 10/15 IB p. 21 para. 6; p. 22 para. 5; g82 2/22 p. 19 para. 8-10]