Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na March 30
IZU NA-AMALITE NA MARCH 30
Abụ nke 217
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 3 ¶8-15, igbe dị na peeji nke 30
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 1-6
Nke 1: Ọpụpụ 1:1-19
Nke 2: Jizọs Akụziere Anyị Ụzọ Isi Kpee Ekpere (lr isi nke 12)
Nke 3: Gịnị Mere Anyị Kwesịrị Iji Jụ Ụdị Mgbaasị Niile? (td 27CH)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Maa ọkwa ikpeazụ ndị e nwere maka Ncheta Ọnwụ Jizọs. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa March.
Nkeji 15: Jikere Inyere Ndị Nwere Mmasị Bụ́ Ndị Bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs Aka. Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu, nke ọ ga-anọ na ya chetara ndị nkwusa na ọ bụ ọrụ ha inyere ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs aka, nke gụnyere ndị ha na-amụrụ Baịbụl, ndị nkwusa na-adịghị ejekwa ozi ọma, na ndị ọzọ, dị ka ndị enyi ha na ndị ezinụlọ ha. (Lee Ozi Alaeze Anyị nke March 2008, peeji nke 4.) Mee ihe ngosi dị mkpirikpi otú e nwere ike isi malite ịmụrụ onye nwere mmasị bịaranụ Baịbụl. Chetara mmadụ niile ka ha gụọ Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs, bụ́ nke a ga-amalite ịgụ na Sunday, April 5. E nwere ike ịtụ aro ndị ga-enyere ndị na-ege ntị aka ime nke a.
Nkeji 15: “Baịbụl—Akwụkwọ Eziokwu na Akwụkwọ Amụma.” Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza. Ya bụrụ na unu agaghị eme ya, tụlee isi nke atọ na broshuọ bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, paragraf nke 8-17.
Abụ nke 213