Baịbụl—Akwụkwọ Eziokwu na Akwụkwọ Amụma
Fim nke mbụ n’ime fim atọ dị na DVD bụ́ The Bible—A Book of Fact and Prophecy (Baịbụl—Akwụkwọ Eziokwu na Akwụkwọ Amụma) bụ Mankind’s Oldest Modern Book (Akwụkwọ Kacha Ochie nke Baara Ụmụ Mmadụ Uru n’Oge A). I kirichaa vidio a, zaa ajụjụ ndị a:
(1) Olee ihe ndị e kwuru na Baịbụl ha na ihe sayensị nke oge a kwuru kwekọrọ? (2) Olee ihe ndị ga-eme ka anyị kweta na ihe dị na Baịbụl ndị anyị nwere ugbu a na ihe dị na Baịbụl ndị e ji asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl dee bụ otu? (3) Olee otu ihe dị mkpa nke pụtara ìhè n’ihe odide Baịbụl ndị ochie ndị e nwere? (4) Olee otú John Wycliffe, Johannes Gutenberg, William Tyndale, John Hus, Martin Luther, Casiodoro de Reina, na Charles Taze Russell si nye aka hụ na Okwu Chineke gbasara ebe niile n’ụwa, oleekwa otú chọọchị si megide Baịbụl n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ? (5) Olee otú ndụmọdụ ndị bara uru dị na Baịbụl si enyere ndị na-arịa ọrịa (Ọma 34:8), ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́ (1 Tim. 6:9, 10), ndị ha na nwunye ma ọ bụ di ha gbasara na ndị na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha (1 Kọr. 13:4, 5; Efe. 5:28-33), na ndị ji ndụ ha na-achụ akụnụba, aka (Mat. 16:26)? (6) Olee ihe na-egosi na ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nwere ike inyere mmadụ aka ịkwụsị ịkpọ ndị agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị obodo ọzọ asị (Luk 10:27)? (7) Olee otú irube isi n’ihe Baịbụl kwuru si mee ka i nwekwuo obi ụtọ? (8) Olee otú i nwere ike isi jiri vidio a nyere ndị ọzọ aka?—Lee Ozi Alaeze Anyị nke February 2006, peeji nke 8.