Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
1. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’iwu ahụ dị n’Ọpụpụ 23:19? [w06 4/1 p. 31 para. 1-5]
2. Gịnị bụ Ìhè ahụ (Yurim) na Izu Okè ahụ (Tọmịm), oleekwa ihe ndị Izrel oge ochie ji ya mee? (Ọpụ. 28:30) [w06 1/15 p. 18; w01 9/1 p. 27]
3. Olee otú Jehova si gwa Mozis okwu “ihu na ihu”? (Ọpụ. 33:11, 20) [w04 3/15 p. 27]
4. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta site n’otú ndị Izrel si jiri mmesapụ aka nye ngwá ọrụ na nkà ha mgbe a na-ewu ụlọikwuu ahụ? (Ọpụ. 35:5, 10) [w99 11/1 p. 31 para. 1-2]
5. Gịnị ka ákwà ngebichi ahụ e kwuru okwu ya n’Ọpụpụ 40:28 na-anọchi anya ya ná nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke? [w00 1/15 p. 15 para. 7-8]
6. Olee ihe “àjà nsure ọkụ” nke a na-achụ n’ozuzu ya n’elu ebe ịchụàjà na-echetara anyị banyere àjà Jizọs? (Lev. 1:13) [w04 5/15 p. 21 para. 3]
7. Gịnị ka eziokwu ahụ bụ́ na “ọ bụ Jehova nwe abụba niile”na-akụziri anyị? (Lev. 3:16, 17) [w04 5/15 p. 22 para. 2]
8. Gịnị dị ịrịba àmà banyere ịwụsa ọbara na ntọala ebe ịchụàjà na ịtasa ya n’ihe dị iche? (Lev. 9:9) [w04 5/15 p. 22 para. 5]
9. Olee ihe Levitikọs 12:8 na-enyere anyị aka ịghọta banyere nne na nna Jizọs, oleekwa ihe nke a na-akụziri anyị? [w98 12/15 p. 6 para. 5]
10. Gịnị ka àjà anụmanụ a na-achụ n’Izrel kwa afọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie na-anọchi anya ya n’ihe gbasara àjà mgbapụta Jizọs? (Lev. 16:11-16) [w98 2/15 p. 12 para. 2]