Usoro Ihe Omume Maka Izu Nke June 29
IZU NA-AMALITE NA JUNE 29
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Levitikọs 14-16
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọnwa June.
Nkeji 10: Ọdịdị Onwe Onye Dị Mma—Gịnị Mere O Ji Dị Mkpa? Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 131-134.
Nkeji 10: Họrọ Isiokwu Ndị Si na Baịbụl Maka “Ụdị Mmadụ Niile.” (1 Kọr. 9:22) Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Mgbe unu na-atụle ajụjụ ndị na-esonụ, ndị na-ege ntị nwere ike ikwu ahụmahụ ndị ha nwerela. Olee isiokwu ị chọpụtarala na-amasị ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị agadi, ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwaanyị, ma ọ bụ ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche? Olee otú anyị nwere ike isi na-ahọrọ isiokwu ndị ga-amasị ụdị mmadụ dị iche iche n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu (nke dị na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ)? Olee otú anyị nwere ike isi gbanwee isiokwu anyị bu n’obi iji zie ozi ọma mgbe ọ na-adabaghị iji ya zie onye nwe ụlọ ozi ọma?
Nkeji 10: Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa July na August. Kwuo akwụkwọ ndị a ga-enyefe. Mee ihe ngosi abụọ ma ọ bụ atọ nke otú e nwere ike isi nyefee ha ndị bi n’ókèala unu.
Abụ nke 215