Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọgọst 2
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 2
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ndị Eze 18-20
Nke 1: 1 Ndị Eze 18:21-29
Nke 2: Olee Otú O Si Bụrụ na Eluigwe na Ụwa Ga-agabiga? (Mkpu. 21:1)
Nke 3: Olee Ndị Ga-aga Eluigwe? (td 11A)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Ụzọ Ndị Ị Pụrụ Isi Mụbaa Ozi Gị—Nkebi nke Anọ. Okwu si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 116, paragraf nke 1-4. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị nyerela aka wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ Ụlọ Mgbakọ. Gwa ha ka ha kwuo ihe tọrọ ha ụtọ n’ihe ùgwù ahụ ha nwetara.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Ahụmahụ E Nwetara n’Ịmalitere Ndị Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Kwuo ihe ndị a rụzuru n’ókèala unu n’ụbọchị ahụ pụrụ iche e wepụtara iji malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Jụọ ndị na-ege ntị ka ha kọọ ihe ndị tọrọ ha ụtọ n’ụbọchị ndị ahụ. Ha kọchaa, i nwere ike gwa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ, ndị ihe ha kọrọ tọrọ ụtọ, ka ha mee ihe ngosi otú o si mee. Tupu i mechie, gwa otu onye nkwusa ka o mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ e ziri onye ahụ ozi ọma.